Isi 44
Ịkwụsị Oké Ifufe
JISỌS arụwo ọtụtụ ọrụ n’ụbọchị a, na-agụnye ịkụziri ìgwè mmadụ ahụ ihe n’akụkụ osimiri na mgbe e mesịrị, ịkọwara ndị na-eso ụzọ ya ihe atụ ndị ahụ na nzuzo. Mgbe o ruru uhuruchi, o kwuru, sị: “Ka anyị gabiga n’ofè ọzọ.”
N’akụkụ ebe ọwụwa anyanwụ nke Osimiri Galili, e nwere ógbè a na-akpọ Dikapọlis, nke sitere n’okwu Grik bụ deʹka, nke pụtara “iri” na poʹlis, nke pụtara “obodo.” Obodo ndị ahụ nke Dikapọlis bụ isi ebe nke omenala ndị Grik, ọ bụ ezie na ha aghaghị ịbụworị obodo nke ọtụtụ ndị Juu. Otú ọ dị, ọrụ Jisọs n’ógbè ahụ dị nta nke ukwuu. Ọbụna n’ọbịbịa ya nke a, dị ka anyị ga-ahụ, e gbochiri ya ịnọ ogologo oge.
Mgbe Jisọs kwuru ka ha gaa n’ofè nke ọzọ nke ụsọ osimiri ahụ, ndị na-eso ụzọ ahụ buuru ya n’ụgbọ. Otú ọ dị, ndị mmadụ matara na ha na-apụ. Nwa oge mgbe nke a mesịrị, ndị ọzọ banyere n’ụgbọ nke aka ha isonyere ha. Ọ dịghị anya ịgabiga n’ofè nke ọzọ. N’ezie, Osimiri Galili bụ nanị ọdọ mmiri buru ibu nke dị ihe dị ka maịlụ 13 n’ogologo na, ma ọ dịkarịsịa ukwuu, maịlụ 7 1/2 n’obosara.
Ọ bụ ihe kwere nghọta na ike gwụrụ Jisọs. Ya mere, mgbe ha kwọpụsịrị, ọ dina ala n’azụ ụgbọ ahụ, tụkwasị isi ya n’elu ihe nhibe isi, ma malite ihi ụra ozugbo. Ọtụtụ n’ime ndị ozi ahụ bụ ndị nwerela ahụmahụ n’ịkwọ ụgbọ mmiri, ebe ọ bụ na ha akụwo azụ nke ukwuu n’Osimiri Galili. Ya mere ha weere ọrụ nke ịkwọ ụgbọ ahụ.
Ma nke a agaghị abụ njem dị mfe. N’ihi ịdị ṅaraṅara nke elu mmiri ahụ, bụ́ nke ji ihe dị ka 700 amaụkwụ dị ala karịa ọ̀tụ̀tụ̀ ịdị elu nke oké osimiri, na ikuku ka jụọ oyi nke na-eku n’elu ugwu ndị dị ya nso, oké ifufe na-efedata mgbe ụfọdụ ma mee ka e nwee oké ebili mmiri n’ọdọ mmiri ahụ na mberede. Nke a bụ ihe na-ewere ọnọdụ ugbu a. N’oge na-adịghị anya, ebili mmiri ahụ malitere itikwasị ụgbọ ahụ ma na-enubata n’ime ya nke na ọ fọrọ nke nta ka mmiri ahụ rikpuo ya. Ma, Jisọs nọgidere na-ehi ụra!
Ndị ikom ahụ bụ aka ochie n’ịkwọ ụgbọ mere ihe nile ha maara iduzi ụgbọ ahụ. Ihe ịrụ ụka adịghị ya na ha akwọrọwo ụgbọ gafere ebili mmiri na mbụ. Ma ugbu a, ha emechaala ihe nile ha pụrụ ime. N’ihi egwu maka ndụ ha, ha kpọtere Jisọs. Ha tiri mkpu sị, ‘Onyenwe anyị, ọ́ dịghị emetụ gị n’obi? Anyị na-emikpu emikpu! Zọpụta anyị, mmiri na-achọ irikpu anyị?’
Ka ọ na-eteta, Jisọs na-enye oké ifufe na osimiri ahụ iwu, sị: “Dị jụụ, kpuchie ọnụ gị.” Ifufe ahụ na-efesi ike kwụsịkwara, osimiri ahụ wee jụrụkwa. Ka ọ na-eche ndị na-eso ụzọ ya ihu, ọ jụrụ, sị: “Gịnị mere unu na-atụ ụjọ? Ùnu akanweghị okwukwe?”
Ka nke ahụ mere, oké ụjọ jidere ndị na-eso ụzọ ahụ. Ha jụrịtara onwe ha, sị, ‘Nwoke a bụ ònye, nke na ọ na-enye ọbụna ifufe na mmiri iwu, ha na-aṅakwa ya ntị?’
Lee ụdị ikike dị ukwuu Jisọs na-egosipụta! Lee ihe na-emesi obi ike ọ bụ ịmata na Eze anyị nwere ike n’ebe ihe ndị sitere n’okike dị, nakwa na mgbe o chere ihu kpọmkwem n’ụwa n’oge ọchịchị Alaeze ya, mmadụ nile ga-ebi ná nchebe pụọ n’ọdachi ndị ọ na-abụghị mmadụ kpatara!
N’otu oge mgbe ebili mmiri ahụ dajụsịrị, Jisọs na ndị na-eso ụzọ ya bịarutere n’ofè ebe ọwụwa anyanwụ nke ụsọ osimiri ahụ n’udo. Ma eleghị anya, ụgbọ ndị ọzọ ezuteghị ebili mmiri ahụ, ha bịarutekwara n’udo. Mak 4:35–5:1; Matiu 8:18, 23-27; Luk 8:22-26.
▪ Gịnị bụ Dikapọlis, oleekwa ebe ọ dị?
▪ Olee ihe ndị na-akpata oké ebili mmiri nke na-eme n’Osimiri Galili?
▪ Mgbe nkà ha n’ịkwọ ụgbọ na-apụghị ịzọpụta ha, gịnị ka ndị na-eso ụzọ ahụ mere?