Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • gt isi 46
  • O Metụrụ Uwe Ya Aka

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • O Metụrụ Uwe Ya Aka
  • Nwoke Kasị Ukwuu nke Dịworo Ndụ
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ọ Gbakere Mgbe O Metụrụ Uwe Jizọs Aka
    Jizọs Bụ Ụzọ, Eziokwu, na Ndụ
  • Jizọs Akpọlite Ndị Nwụrụ Anwụ
    Akwụkwọ M nke Akụkọ Bible
  • Anyị Pụrụ Isi n’Ọnwụ Bilie!
    Mụta Ihe Site n’Aka Onye Ozizi Ukwu Ahụ
  • Jizọs Rụrụ Ọtụtụ Ọrụ Ebube
    Ihe Ị Ga-amụta n’Akụkọ Baịbụl
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Nwoke Kasị Ukwuu nke Dịworo Ndụ
gt isi 46

Isi 46

O Metụrụ Uwe Ya Aka

AKỤKỌ nke bụ na Jisọs esiwo na Dikapọlis lọghachi ruru Kapanaum, ìgwè mmadụ wee gbakọtakwa n’ụsọ oké osimiri ịnabata ya. Ihe ịrụ ụka adịghị ya na ha anụwo na o mere ka oké ebili mmiri kwụsị, gwọọkwa ndị ikom mmụọ ọjọọ ji. Ugbu a, mgbe ọ na-arịgopụta n’elu ala, ha gbara ya gburugburu jiri oké ịnụ ọkụ n’obi na-ele anya ya.

Otu n’ime ndị ahụ na-atụsi anya ike ịhụ Jisọs bụ Jaịrọs, bụ́ onye isi ụlọ nzukọ dị n’ebe ahụ. Ọ dara n’ụkwụ Jisọs wee nọgide na-arịọ ya, sị: “Nwa m nwanyị nta na-anwụnyụ anya: arịọ m gị ka ị bịa bikwasị ya aka gị abụọ, ka e wee zọpụta ya, o wee dị ndụ.” Nwata nwanyị ahụ dị nnọọ Jaịrọs oké mkpa, ebe ọ bụ nanị nwa ọ mụrụ nke dịkwa nanị afọ 12.

Jisọs kwere, ìgwè mmadụ ahụ wee sonyere ya, ha wee jee n’ụlọ Jaịrọs. Anyị pụrụ iji uche hụ otú obi ndị mmadụ ahụ haruru ka ha na-atụ anya ịhụ ọrụ ebube ọzọ. Ma ihe dịgodi otu nwanyị n’ime ìgwè mmadụ ahụ mkpa bụ oké nsogbu nke ya onwe ya.

Nwanyị a arịawo ọrịa oruru ọbara ruo ogologo afọ 12. Ọ gawo na nke ọtụtụ ndị dọkịta, na-emefu ego nile o nwere iji gwọọ onwe ya. Ma a gwọbeghị ya; kama nke ahụ, nsogbu ya na-akawanye njọ.

Dị ka ị pụrụ ịghọta ma eleghị anya, e wezụga ime ya ka ọ gharakwa inwe ike ọ bụla, ọrịa ya bụkwa nke na-asọ oyi, na-emekwa ihere. Mmadụ anaghị akọta akụkọ ụdị ọrịa ahụ n’ihu ọha. Ọzọkwa, n’okpuru Iwu Mosis, oruru ọbara na-eme ka nwanyị ghara ịdị ọcha, onye ọ bụla metụkwara ya ma ọ bụ uwe ya nke ọbara tetọrọ aka ka a na-ele anya ịsacha onwe ya, wee bụrụkwa onye na-adịghị ọcha ruo mgbede.

Nwanyị ahụ anụwo akụkọ ọrụ ebube nile nke Jisọs, wee chọtakwa ebe ọ nọ ugbu a. N’ihi ịbụ onye na-adịghị ọcha, o si n’etiti ìgwè mmadụ ahụ gafee, na-ezo onwe ya ruo ókè o nwere ike, na-agwa onwe ya, sị: “Ọ bụrụ na emetụ m nanị uwe ya aka, a ga-azọpụta m [“ahụ m ga-adị m mma,” NW].” Mgbe o mere otú ahu, ngwa ngwa, ọ chọpụtara na oruru ọbara ya akwụsịwo!

“Ònye bụ onye ahụ nke metụrụ m aka?” Lee nnọọ otú okwu ndị ahụ Jisọs kwuru na-aghaghị isiworị mee ka nwanyị ahụ kụja! Olee otú o si mata? Pita sịrị, ‘Nna anyị, ìgwè mmadụ ndị a na-adagide gị na-akpagbukwa gị, ị̀ na-asịkwa, Ònye metụrụ m aka?’

Mgbe ọ na-elegharị anya ka ọ hụ nwanyị ahụ, Jisọs kọwara, sị: “Mmadụ metụrụ m aka: n’ihi na mụ onwe m maara na ike esiworị n’ahụ m pụta.” N’ezie, nke a abụghị mbitụ aka efu, ebe ọ bụ na ọgwụgwọ ahụ si na nke a pụta dọọrọ ike Jisọs.

Mgbe ọ hụrụ na a matawo ihe o mere, nwanyị bịara wee daa n’ihu Jisọs, na-atụ egwu, na-amakwa jijiji. O kwuru eziokwu nile banyere ọrịa ya na otú e siworo gwọọ ya ugbu a n’ihu ndị nile nọ n’ebe ahụ.

N’ịbụ onye a kwaliri n’ihi nkwupụta ya zuru ezu, Jisọs ji ọmịiko kasie ya obi, sị: “Nwa m nwanyị, okwukwe gị azọpụtawo gị; laa n’udo, si n’ajọ ọrịa gị nwee ahụ dị ike.” Lee ka o si dị mma ịmara na Onye ahụ nke Chineke họpụtara ịchị ụwa nile bụ onye nwere oké ọmịiko dị otú ahụ, onye nwere mmetụta n’ebe ndị mmadụ nọ, nweekwa ike inyere ha aka! Matiu 9:​18-22; Mak 5:​21-34; Luk 8:​40-48; Levitikọs 15:​25-⁠27.

▪ Ònye bụ Jaịrọs, gịnịkwa mere o ji bịakwute Jisọs?

▪ Gịnị bụ nsogbu nke otu nwanyị nwere, gịnịkwa mere ịbịakwute Jisọs maka enyemaka ji bụrụ ihe siere ya ike nke ukwuu?

▪ Olee otú e si gwọọ nwanyị ahụ, oleekwa otú Jisọs si kasie ya obi?

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya