Isi 47
E Mere Ka Ịkwa Akwa Ghọọ Oké Ọṅụ
MGBE Jaịrọs hụrụ ka a gwọrọ nwanyị ahụ nwere oruru ọbara, o doro anya na okwukwe o nwere n’ike Jisọs nwere ịrụ ọrụ ebube mụbawanyere. N’ụtụtụ ụbọchị ahụ, Jaịrọs arịọworị Jisọs ka ọ bịa nyere nwa ya nwanyị ọ hụrụ n’anya aka, bụ́ onye dị afọ 12, nke nọ n’ọnụ ọnwụ. Otú ọ dị, ugbu a, ihe Jaịrọs na-atụsi egwu ike ka ọ ghara ime mere. Mgbe Jisọs ka nọ na-agwa nwanyị ahụ okwu, ụfọdụ ndị ikom bịarutere ma jiri nwayọọ gwa Jaịrọs, sị: “Nwa gị nwanyị anwụrụwo: gịnị mere ị na-esogbu onye ozizi a ọzọkwa?”
Lee nnọọ ka ozi a si bụrụ ozi ọjọọ! Chee nnọọ echiche: ọ dịkwaghị ihe ọzọ nwoke a pụrụ ime, bụ́ onye a na-asọpụrụ nke ukwuu n’ógbè ahụ, mgbe ọ nụrụ na nwa ya nwanyị anwụwo. Otú ọ dị, Jisọs nụpetere nkwurịta okwu ahụ. Ya mere, ọ tụgharịkwuuru Jaịrọs, wee sị ya n’ụzọ agbamume: “Atụla egwu, kwere nanị.”
Jisọs wee soro nwoke ahụ nọ n’iru újú laghachi n’ụlọ ya. Mgbe ha rutere, ha hụrụ ka a na-eme oké mkpọtụ nke ịkwa akwá na iti mkpu. Ìgwè mmadụ agbakọtawo, ha nọ na-akwa akwá n’iru újú. Mgbe Jisọs batara, ọ jụrụ, sị: “Gịnị mere unu na-atụ ụzụ, na-akwakwa akwá? Nwatakịrị ahụ anwụghị anwụ, kama ọ na-arahụ ụra.”
Mgbe ha nụrụ nke a, ndị mmadụ ahụ malitere ịchị Jisọs ọchị n’ụzọ ịkwa emo n’ihi na ha maara na nwatakịrị ahụ nwụrụ anwụ n’ezie. Otú ọ dị, Jisọs sịrị na ọ bụ nanị ụra ka ọ na-arahụ. Site n’iji ike Chineke nyere ya mee ihe, ọ ga-egosi na a pụrụ ime ka ndị nwụrụ anwụ dịghachi ndụ dị ka ọ dị mfe ịkpọte ha n’oké ụra.
Jisọs mere ka a kpọpụsịa mmadụ nile n’èzí ma e wezụga Pita, Jemes, Jọn, na nne na nna nwatakịrị ahụ nwụrụ anwụ. Mgbe ahụ ọ kpọọrọ mmadụ ise ndị a banye n’ebe nwa agbọghọ nta ahụ dina. Jisọs jidere ya n’aka wee sị: “Talʹi·tha cuʹmi,” nke pụtara ma a sụgharịa ya, “Nwa agbọghọ nta, asị m gị, Bilie”! Ozugbo ahụkwa, nwata ahụ biliri wee malite ijegharị! Mgbe ndị mụrụ ya hụrụ nke a, ha nwere oké ọṅụ.
Mgbe ọ gwasịrị ha ka ha nye nwata ahụ ihe oriri, Jisọs gwara Jaịrọs na nwunye ya ka ha ghara ịgwa onye ọ bụla ihe meworonụ. Ma n’agbanyeghị ihe Jisọs kwuru, a kọsara akụkọ banyere ya n’ógbè ahụ nile. Nke a bụ mbilite n’ọnwụ nke abụọ nke Jisọs meworo. Matiu 9:18-26; Mak 5:35-43; Luk 8:41-56.
▪ Akụkọ dị aṅaa ka Jaịrọs natara, oleekwa otú Jisọs si gbaa ya ume?
▪ Gịnị na-eme mgbe ha rutere n’ụlọ Jaịrọs?
▪ Gịnị mere Jisọs ji sị na nwata ahụ nwụrụ anwụ na-arahụ nanị ụra?
▪ Olee mmadụ ise sonyeere Jisọs bụ́ ndị hụrụ mbilite n’ọnwụ ahụ?