Isi 48
Ịhapụ Ụlọ Jaịrọs na Ijeghachi Nazaret
JISỌS ezughị ike n’ụbọchị ahụ—njem oké osimiri site na Dikapọlis, ịgwọ nwanyị ahụ nke nwere oruru ọbara, ịkpọlite ada Jaịrọs n’ọnwụ. Ma ụbọchị ahụ agafechabeghị. Ihe àmà na-egosi na mgbe Jisọs na-ahapụ ụlọ Jaịrọs, ndị ìsì abụọ sooro ya n’azụ, na-eti mkpu, sị: “Meere anyị ebere, Nwa Devid.”
Site n’ịkpọ Jisọs “Nwa Devid,” ndị ikom ndị a si otú a na-egosipụta na ha kwere na Jisọs bụ onye nketa nke ocheeze Devid, nke bụ na ọ bụ Mesaịa ahụ e kwere ná nkwa. Otú ọ dị, o yiri ka Jisọs lefuuru arịrịọ enyemaka ha anya, eleghị anya iji nwalee nnọgidesi ike ha. Ma ndị ikom ahụ akwụsịghị. Ha sooro Jisọs ruo ebe ọ nọ, mgbe ọ bakwara n’ụlọ, ha sooro ya banye.
N’ebe ahụ Jisọs jụrụ ha, sị: “Ùnu kwere na apụrụ m ime ihe a?”
Ha ji obi ike zaa, sị, “Ee, Onyenwe anyị.”
Ya mere, n’ịmetụ anya ha aka, Jisọs sịrị: “Dị ka okwukwe unu si dị ka e meere unu.” Ngwa ngwa, ha malitere ịhụ ụzọ! Mgbe ahụ Jisọs dọsiri ha aka ike ná ntị, sị: “Lezienụ anya ka onye ọ bụla ghara ịma ya.” Ma n’ihi oké obi ụtọ, ha lefuuru iwu Jisọs anya wee kọsaa akụkọ banyere ya n’ala ahụ nile.
Ngwa ngwa ndị ikom ahụ na-apụ, e kuteere ya onye mmụọ ji, nke mmụọ ọjọọ ahụ mewokwara ka ọ daa ogbi. Jisọs chụpụrụ mmụọ ọjọọ ahụ, ngwa ngwa, nwoke ahụ malitekwara ikwu okwu. Ibubo wee nwụọ ìgwè mmadụ ahụ n’ahụ n’ihi ọrụ ebube ndị a, ha wee sị: “Ọ dịghị mgbe ọ bụla e gosiri ya otú a n’Israel.”
Ndị Farisii nọkwa n’ebe ahụ. Ha apụghị ịgọnahụ ọrụ ebube ndị ahụ, ma n’ihi obi ọjọọ ha nke ekweghị ekwe, ha nọgidekwara n’ebubo ha banyere ebe Jisọs si nweta ike o ji arụ ọrụ ndị a siri ike, na-asị: “N’ike onyeisi ndị mmụọ ọjọọ ka ọ na-achụpụ ndị mmụọ ọjọọ.”
Ngwa ngwa ihe ndị a mesịrị, Jisọs na-alaghachi n’obodo ya bụ Nazaret, ya na ndị na-eso ụzọ ya so ugbu a. Ihe dị ka otu afọ tupu ugbu a, o jewo n’ụlọ nzukọ, ziekwa ihe n’ebe ahụ. Ọ bụ ezie na ná mmalite, ibubo nwụrụ ha n’ahụ n’ihi okwu ọma ndị ọ na-ekwu, ma ha mesịrị malite iwe iwe n’ozizi ya ma chọọkwa igbu ya. Ugbu a, site n’obi ebere, Jisọs gbakwara mbọ ọzọ inyere ndị agbata obi ya mbụ aka.
Ebe ndị mmadụ na-agbakọta ebe Jisọs nọ n’ebe ndị ọzọ, o doro anya na ọ dịghị otú ahụ n’ebe a. Ya mere, n’Ụbọchị Izu Ike, o jere ụlọ nzukọ izi ihe. Ibubo nwụrụ ọtụtụ n’ime ndị na-ege ya ntị n’ahụ. Ha jụrụ sị, “Ole ebe ka nwoke a nwere amamihe a na ọrụ ndị a dị ike? Nwoke a, ọ́ bụghị nwa onye ọkà anyị? Á dịghị akpọ nne ya Meri? na ụmụnne ya ndị ikom Jemes, na Josef, na Saịmọn, na Judas? Na ụmụnne ya ndị inyom, [ọ̀ bụ na] ha nile anọghị n’etiti anyị? Ole ebekwa [ka] nwoke a nwere ihe ndị a nile?”
Ha na-eche sị, ‘Jisọs bụ mmadụ nkịtị dị ka anyị onwe anyị. Anyị hụrụ mgbe ọ na-eto, marakwa ezinụlọ ya. Olee otú ọ ga-esi bụrụ Mesaịa ahụ?’ Ya mere, n’agbanyeghị ihe àmà nile ahụ—oké amamihe na ọrụ ebube ya—ha jụrụ ya. N’ihi na ha maara ya nke ọma, ọbụna ndị ikwu ya na-asụ ngọngọ n’ihi ya, nke mere Jisọs ji kwubie, sị: “Onye amụma abụghị onye a na-adịghị asọpụrụ, ma ọ bụghị n’ala nke aka ya, na n’ụlọ nke aka ya.”
N’ezie, enweghị okwukwe ha juru Jisọs anya. Ya mere, ọ rụghị ọrụ ebube ọ bụla n’ebe ahụ e wezụga ibikwasị mmadụ ole na ole ahụ na-esighị ike aka na ịgwọ ha. Matiu 9:27-34; 13:54-58; Mak 6:1-6; Aịsaịa 9:7.
▪ Site n’ịkpọ Jisọs “Nwa Devid,” gịnị ka ndị ikom ahụ kpuru ìsì gosiri na ha kwere?
▪ Olee otú ndị Farisii ahụ si kọwaa ọrụ ebube ndị Jisọs rụrụ?
▪ N’ihi gịnị ka o ji bụrụ obi ebere Jisọs ịlaghachi nyere ndị ahụ nọ na Nazaret aka?
▪ Olee otú e si nabata Jisọs na Nazaret, n’ihi gịnịkwa?