Isi 53
Eze A Na-achọsi Ike nke Ka Mmadụ Elu
MGBE Jisọs sitere n’ụzọ ọrụ ebube zụọ ọtụtụ puku ndị mmadụ, ọ tụrụ ndị mmadụ ahụ n’anya. Ha sịrị, “N’ezie onye a bụ onye amụma ahụ nke na-abịa n’ụwa.” Ha ruru ná nkwubi okwu, ọ bụghị nanị na Jisọs bụ onye amụma ahụ nke ka Mosis ukwuu, kama na ọ ga-abụkwa onye ọchịchị kasị mma. Ha wee mee atụmatụ ijide ya mee ya eze.
Otú ọ dị, Jisọs maara ihe ha na-eme atụmatụ ime. Ya mere, o wezụgara onwe ya ngwa ngwa ka ha ghara ijide ya n’ike. O zilagara ìgwè mmadụ ahụ wee rụgide ndị na-eso ụzọ ya ka ha banye n’ụgbọ ha laghachi azụ na Kapanaum. Mgbe ahụ, o jere n’elu ugwu ikpe ekpere. N’abalị ahụ, Jisọs nọrọ n’ebe ahụ nanị ya.
Nwa oge nta tupu chi ọbụbọ, Jisọs si n’ebe ahụ dị elu wee hụ ka oké ifufe na-ebugharị ebili mmiri nke osimiri ahụ. Site n’ìhè nke ọnwa fọrọ nke nta ka ọ gbazuo, ebe ọ bụ na oge na-eru maka Ememe Ngabiga, Jisọs hụrụ ụgbọ ahụ ka ndị na-eso ụzọ ya na-agbalịsi ike ịkwọrọ ya gabiga ebili mmiri ahụ. Ndị ikom ahụ ji ikike ha nile na-akwọ ụgbọ ahụ.
Mgbe ọ hụrụ nke a, Jisọs rịdatara n’ugwu ahụ wee malite ije n’ebe ụgbọ ahụ dị, gabiga oké ebili mmiri ahụ. Ụgbọ ahụ agaala ihe dị ka maịlụ atọ ma ọ bụ anọ mgbe Jisọs bịarutere n’ebe ọ nọ. Otú ọ dị, ọ nọgidere na-eje ije dị ka a ga-asị na ọ ga-agafe ha. Mgbe ndị na-eso ụzọ ahụ hụrụ ya, ha tiri mkpu, sị: “Ọ bụ mmụọ”!
Jisọs na-azaghachi n’ụzọ nkasị obi, sị: “Ọ bụ m: unu atụla egwu.”
Ma Pita sịrị: “Onyenwe anyị, ọ bụrụ na ọ bụ gị onwe gị, sị m bịakwute gị n’elu mmiri.”
Jisọs na-azaghachi sị, “Bịa”!
Ozugbo ahụ, Pita si n’ụgbọ ahụ pụta wee malite ije ije n’elu mmiri ahụ ijekwuru Jisọs. Ma mgbe o lere anya n’oké ifufe ahụ, egwu jidere Pita, mgbe ọ malitekwara imikpu ná mmiri, o tiri mkpu, sị: “Onyenwe anyị, zọpụta m.”
Ngwa ngwa, Jisọs setịrị aka ya, jide ya, sị ya: “Onye okwukwe nta, n’ihi gịnị ka i ji nwee obi abụọ?”
Mgbe Pita na Jisọs banyeghachiri n’ime ụgbọ ahụ, ifufe ahụ kwụsịrị, nke ahụ tụkwara ndị na-eso ụzọ ahụ n’anya. Ma ò kwesịrị ịtụ ha n’anya? A sị na ha ghọtara “ọrụ ebube nke ogbe achịcha ise” site n’inwe obi ekele n’ọrụ ebube nke Jisọs rụrụ na hour ole na ole tupu mgbe ahụ, mgbe o jiri ogbe achịcha ise na azụ abụọ zụọ ọtụtụ puku ndị mmadụ, mgbe ahụ ọ garaghị abụ ihe ịtụnanya na o jere ije n’elu mmiri wee mee ka ifufe dajụọ. Ma na nke ugbu a, ndị na-eso ụzọ ya kpọrọ isiala nye ya, na-asị: “Ị bụ Ọkpara Chineke n’ezie.”
N’oge na-adịghị anya, ha rutere Genesaret, bụ́ obodo mara mma, nke na-eme ihe omume, nke dịkwa nso Kapanaum. N’ebe ahụ ka ha kwụsịrị ụgbọ ahụ. Ma mgbe ha gbagotere n’ala, ndị mmadụ matara Jisọs wee jee n’ime obodo ndị dị n’ebe ahụ, na-achọ ndị ahụ na-adịghị ike. Mgbe e butere ndị a n’elu ihe ndina nta ha, ha wee metụ ọnụ uwe Jisọs aka, ha na-abụ ndị a gwọrọ ọrịa ha kpamkpam.
Ka ọ dị ugbu a, ìgwè mmadụ ahụ ndị hụrụ ọrụ ebube nke ịzụ ọtụtụ puku ndị mmadụ chọpụtara na Jisọs agawo n’ebe ọzọ. Ya mere, mgbe ụgbọ nta ndị si Taịberia rutere, ha banyere na ha wee jee Kapanaum ịchọ Jisọs. Mgbe ha chọtara ya, ha jụrụ ya, sị: “Rabaị, olee mgbe ị bịara n’ebe a?” Jisọs baara ha mba, dị ka anyị ga-ahụ n’oge na-adịghị anya. Jọn 6:14-25; Matiu 14:22-36; Mak 6:45-56.
▪ Mgbe Jisọs jisịrị ọrụ ebube zụọ ọtụtụ puku ndị mmadụ, gịnị ka ndị ahụ chọrọ ime ya?
▪ Gịnị ka Jisọs hụrụ site n’elu ugwu ebe ahụ o wezụgara onwe ya gaa, gịnịkwa ka o mere mgbe ahụ?
▪ N’ihi gịnị ka ihe ndị a o mere na-ejighị kwesị ịtụ ndị na-eso ụzọ ya n’anya?
▪ Gịnị mere mgbe ha ruru n’ụsọ oké osimiri ahụ?