Isi 57
Imere Ndị E Wedara n’Ala Ebere
MGBE ọ katọsịrị ndị Farisii maka omenala ndị ha ji achọ ọdịmma onwe ha, Jisọs na ndị na-eso ụzọ ya hapụrụ ebe ahụ. Ị pụrụ icheta na n’oge na-adịghị anya tupu nke a, e mebiri mgbalị o mere ịkpọrọ ha pụọ ije zurutụ ike mgbe ìgwè mmadụ zutere ha. Ugbu a, ya na ndị na-eso ụzọ ya sooro jee n’ógbè Taịa na Saịdọn, nke dị ọtụtụ maịlụ n’ebe ugwu. Ihe àmà gosiri na nke a bụ nanị njem Jisọs na ndị na-eso ụzọ ya so jee nke gabigara ókèala nile nke Israel.
Mgbe ha chọtasịrị ụlọ ha ga-anọ na ya, Jisọs mere ka a mara na ya achọghị ka onye ọ bụla mara ebe ya nọ. Ma, ọbụna n’ógbè nke a na-abụghị nke ndị Israel, ọ pụghị izo ezo. Otu nwanyị onye Grik, bụ́ onye a mụrụ n’ebe a na Finisia nke Siria, hụrụ ya wee malite ịrịọ ya arịrịọ, sị: “Meere m ebere, Onyenwe anyị, Nwa Devid; mmụọ ọjọọ na-ejisi nwa m nwanyị ike.” Otú ọ dị, Jisọs azaghị ya okwu ọ bụla.
Mgbe e mesịrị, ndị na-eso ụzọ ya gwara Jisọs, sị: “Zilaga ya; n’ihi na ọ na-etiso anyị mkpu.” N’ịkọwa ihe mere o ji gbachi ya nkịtị, Jisọs sịrị: “E ziteghị m ma ọ bụghị ijekwuru atụrụ furu efu nke ụlọ Israel.”
Otú ọ dị, nwanyị ahụ akwụsịghị. Ọ bịakwutere Jisọs, na-ada n’ihu ya. Ọ na-arịọ, sị: “Onyenwe anyị, nyere m aka.”
Lee nnọọ ka oké arịrịọ nke nwanyị a ga-esiworị metụta Jisọs n’obi! Ma, o kwukwara okwu ọzọ banyere ibu ọrụ ya bụ isi ijere ndị Chineke bụ Israel ozi. N’otu oge ahụ, iji lee okwukwe ya ule, o kwuru okwu banyere ịkpọasị nke ndị Juu ji ele ndị mba ọzọ anya, na-arụ ụka, sị: “Ọ dịghị mma ịnara nri ụmụ tụpụrụ ụmụ nkịta.”
Site n’ụda olu ya dị nro na otú o debere ihu ya, o doro anya na Jisọs kpughere mmetụta obi ọma o nwere n’ebe ndị na-abụghị ndị Juu nọ. Ọbụna na o mere ka ihe atụ ahụ a na-eme n’iji ndị Jentaịl tụnyere nkịta dị nro site n’ịkpọ ha “ụmụ nkịta.” Kama ịbụ onye a kpasuru iwe, nwanyị ahụ weere izo aka ahụ Jisọs mere n’ebe ịkpọasị ndị Juu nọ wee kwuo okwu obi umeala nke a, sị: “Ee, Onyenwe anyị: n’ihi na ọbụna ụmụ nkịta na-eri ụfọdụ n’ime irighiri nke na-adapụta na table nke ndị nwe ha.”
Jisọs na-azaghachi sị, “Nwanyị, okwukwe gị dị ukwuu: ka e meere gị dị ka ị na-achọ.” Otú ahụ ka o mekwara! Mgbe ọ lọghachiri n’ụlọ ya, ọ hụrụ nwa ya nwanyị n’elu àkwà, ahụ adịsịwo ya mma.
Site n’ógbè ahụ dị n’ụsọ osimiri nke Saịdọn, Jisọs na ndị na-eso ụzọ ya chere ihu n’akụkụ ọzọ nke mba ahụ, na-eje n’ebe isi mmiri nke Osimiri Jọdan. Ọ ghaghị ịbụ na ha ji ụkwụ gafee Jọdan n’otu ebe dị n’ebe ugwu nke Osimiri Galili, wee banye n’ógbè Dikapọlis, n’ebe ọwụwa anyanwụ nke osimiri ahụ. N’ebe ahụ ha rịgoro otu oké ugwu, ma ìgwè mmadụ ahụ chọtara ha wee butere Jisọs ndị dara ngwụrọ, ndị ìsì, ndị ogbi, na ọtụtụ ndị na-arịa ụdị ọrịa ndị ọzọ na ndị nwere nkwarụ. Ha na-atụsa ha n’ụkwụ Jisọs, o wee gwọọ ha. Ọ tụrụ ndị ahụ n’anya mgbe ha na-ahụ ndị ogbi ka ha na-ekwu okwu, ndị ngwụrọ ka ha na-aga ije, na ndị ìsì ka ha na-ahụ ụzọ, ha wee too Chineke nke Israel.
Jisọs nyere otu nwoke ntị chiri nke na-asụkwa nsụ nlebara anya pụrụ iche. Ihere na-emekarị ndị ntị chiri, karịsịa n’ebe ígwè mmadụ nọ. Ọ pụrụ ịbụ na Jisọs hụtara ahụ erughị ala nke nwoke a nwere. N’ihi ya Jisọs ji obi ebere kpọrọ ya pụọ n’ebe ìgwè mmadụ ahụ nọ. Mgbe nanị ha nọ, Jisọs kọwara ihe ọ gaje imere ya. O wee tinye mkpịsị aka ya ná ntị ya abụọ, mgbe ọ gbụpụsịkwara ọnụ mmiri, o metụ ire ya aka. Mgbe ahụ, ka ọ na-ele anya n’eluigwe, Jisọs sụrụ ude, wee sị: “Ghere oghe.” Ozugbo ahụ, e weghachiri ikike ịnụ ihe nke nwoke ahụ, o nwekwara ike ikwu okwu nke ọma.
Mgbe Jisọs gwọsịworo ọtụtụ ọrịa ndị a, ìgwè mmadụ ahụ ji obi ekele zaghachi. Ha sịrị: “O mewo ihe nile nke ọma: ọ na-eme ọbụna ndị ntị chiri ka ha nụ ihe, meekwa ndị na-apụghị ikwu okwu ka ha kwuo.” Matiu 15:21-31; Mak 7:24-37.
▪ N’ihi gịnị ka Jisọs na-ejighị gwọọ nwa nwanyị Grik ahụ ozugbo?
▪ Mgbe nke a gasịrị, olee ebe Jisọs kpọjere ndị na-eso ụzọ ya?
▪ Olee ụzọ Jisọs si jiri obi ebere mesoo nwoke ahụ ntị chiri bụ́ onye na-asụ nsụ omume?