Isi 59
Ònye n’Ezie Ka Jisọs Bụ?
MGBE ụgbọ bu Jisọs na ndị na-eso ụzọ ya kwụsịrị na Betsaịda, ndị mmadụ kpọtara otu nwoke kpuru ìsì ma na-arịọ ka o metụ ya aka wee gwọọ ya. Jisọs ji aka duru nwoke ahụ pụọ n’ime obodo, mgbe ọ bụsasịkwara ọnụ mmiri n’anya ya, ọ jụrụ: “Ọ̀ dị ihe ị hụrụ?”
Nwoke ahụ na-azaghachi sị, “Ahụrụ m mmadụ; n’ihi na ahụrụ m ha dị ka osisi, ha na-ejegharị.” Ka o bikwasịrị aka n’elu anya nwoke ahụ, Jisọs weghachiri ikike ịhụ ụzọ ya ka o wee hụ ụzọ nke ọma. Jisọs zilagara nwoke ahụ ka ọ laa ma nye ya iwu ka ọ ghara ịbanye n’ime obodo.
Ugbu a Jisọs na ndị na-eso ụzọ ya hapụrụ ma gaa n’ime obodo nta dị iche iche nke Sizaria Filipaị n’ebe ugwu nke Palestine. Ọ bụ elu ugwu dị ogologo nke ruru 30 maịlụ tupu e ruo n’ókèala ahụ mara mma nke Sizaria Filipaị, bụ́ obodo ji 1,150 amaụkwụ dị elu karịa ọ̀tụ̀tụ̀ ịdị elu nke oké osimiri. Ma eleghị anya njem ahụ were ụbọchị ole na ole.
N’ụzọ, Jisọs kpapụụrụ onwe ya iche ikpe ekpere. Nanị ihe dị ka ọnwa itoolu ma ọ bụ iri fọdụrụ tupu ọnwụ ya, ọ na-echegbukwa onwe ya banyere ndị na-eso ụzọ ya. Ọtụtụ ahapụworị iso ya. Ndị ọzọ nwekwara obi abụọ na nkụda aka n’ihi na ọ jụrụ mgbalị ndị mmadụ mere iji mee ya eze na n’ihi na o nyeghị ha ihe àmà site n’eluigwe na ya bụ eze mgbe ndị iro ya mara ya aka. Ònye ka ndị na-eso ụzọ ya kwere na ọ bụ? Mgbe ha bịara n’ebe ọ na-ekpe ekpere, Jisọs jụrụ: “Ònye ka [ndị] mmadụ na-asị na mụ onwe m bụ?”
Ha zara sị, “Ụfọdụ sị, Jọn Baptist; ma ndị ọzọ sị, Elaịja; ma ibe ha sị, Jeremaịa ma ọ bụ otu n’ime ndị amụma.” Ee, ndị ahụ chere na Jisọs bụ otu n’ime ndị a nke si n’ọnwụ bilie!
Jisọs na-ajụ sị, “Ma ọ̀ bụ ònye ka unu onwe unu sị na mụ bụ?”
Pita zara ngwa ngwa, sị: “Gị onwe gị bụ Kraịst ahụ, Ọkpara Chineke dị ndụ.”
Ka ọ kwadosịrị azịza Pita, Jisọs sịrị: “Mụ onwe m sịkwa gị, na gị onwe gị bụ Pita, ọ bụkwa n’elu oké nkume a ka m ga-ewu nzukọ m dị ka ụlọ; ọnụ ụzọ nile [nke] Hedis agaghị akakwa ya n’ike.” N’ebe a, na nke mbụ ya, Jisọs mara ọkwà na ya ga-ewu otu nzukọ, nakwa na ọbụna ọnwụ agaghị ejigide ndị so na ya mgbe ha jesịrị ozi ha n’ikwesị ntụkwasị obi n’elu ụwa. Mgbe ahụ ọ gwara Pita, sị: “M ga-enye gị mkpịsị ugodi nke alaeze eluigwe.”
N’ụzọ dị otú a, Jisọs gosiri na a ga-enye Pita ihe ùgwù ndị pụrụ iche. Ee e, e nyeghị Pita ọnọdụ mbụ n’etiti ndị ozi, e meghịkwa ya ntọala nke nzukọ ahụ. Jisọs n’onwe ya bụ Oké Nkume ahụ nke a ga-ewukwasị nzukọ ya n’elu ya. Ma a ga-enye Pita mkpịsị ugodi atọ nke ọ ga-eji meghee ohere nye òtù dị iche iche nke ndị mmadụ ịbanye n’Alaeze nke eluigwe, dị ka a pụrụ isi kwuo ya.
Pita ga-eji mkpịsị ugodi nke mbụ mee ihe na Pentikọst nke 33 O.A. iji gosi ndị Juu nwere obi nchegharị ihe ha na-aghaghị ime ka ha wee bụrụ ndị a ga-azọpụta. Ọ ga-eji nke abụọ mee ihe ngwa ngwa mgbe nke ahụ gasịrị iji megheere ndị Sameria nwere okwukwe ụzọ ịbanye n’Alaeze Chineke. E mesịa, na 36 O.A, ọ ga-eji mkpịsị ugodi nke atọ mee ihe imeghere ndị Jentaịl a na-ebighị úgwù, bụ́ Kọniliọs na ndị enyi ya, otu ohere ahụ.
Jisọs gakwara n’ihu ná mkparịta ụka ya na ndị na-eso ụzọ ya. Ọ kụdara ha obi site n’ịgwa ha banyere ahụhụ na ọnwụ nke ọ ga-eche ihu mgbe na-adịghị anya na Jerusalem. Ebe ha na-aghọtaghị na a ga-eme ka Jisọs bilie gaa ná ndụ eluigwe, Pita kpọpụtara Jisọs n’akụkụ. Ọ na-asị, “Meere onwe gị ebere Onyenwe anyị; ị gaghị enwe [ihe ndabara] nke a ma ọlị.” (NW) Ka ọ tụgharịrị azụ ya, Jisọs zara, sị: “Gaa n’azụ m, Setan: ị bụ ihe na-eme ka m maa n’ọnyà: n’ihi na ị dịghị atụkwasị uche gị n’ihe Chineke, kama ọ bụ n’ihe mmadụ.”
O doro anya na e wezụga ndị ozi Jisọs, ndị ọzọ sokwa ya na-eje njem, ya mere ugbu a, ọ kpọrọ ha ka ọ kọwaara ha na ọ gaghị adị mfe ịbụ onye na-eso ụzọ ya. Ọ na-asị, “Ọ bụrụ na onye ọ bụla chọrọ iso m n’azụ, ya jụ onwe ya, ma bulie osisi ịta ahụhụ ya, nọgidekwa na-eso m. N’ihi na onye ọ bụla nke chọrọ ichebe mkpụrụ obi ya ga-atụfu ya; ma onye ọ bụla nke tụfuru mkpụrụ obi ya n’ihi m ga-achọta ya.”—NW.
Ee, ka ha wee gosipụta onwe ha ịbụ ndị kwesịrị inweta ihu ọma ya, ndị na-eso ụzọ Jisọs aghaghị inwe obi ike ma bụrụ ndị na-achụ onwe ha n’àjà. O kwuru, sị: “N’ihi na onye ọ bụla ihere mụ onwe m na okwu m nile ga-eme n’ọgbọ a nke na-akwa iko, nke na-emehiekwa, ihere onye ahụ ga-eme Nwa nke mmadụ mgbe ọ ga-abịa n’ebube nke Nna ya, ya na ndị mmụọ ozi ya.” Mak 8:22-38; Matiu 16:13-28; Luk 9:18-27.
▪ Gịnị mere Jisọs ji echegbu onwe ya banyere ndị na-eso ụzọ ya?
▪ Echiche dịgasị aṅaa banyere onye Jisọs bụ ka ndị mmadụ na-enwe?
▪ Olee mkpịsị ugodi ndị e nyere Pita, oleekwa otú ọ ga-esi jiri ha mee ihe?
▪ Mgbazi olu dị aṅaa ka e nyere Pita, n’ihi gịnịkwa?