Isi 61
A Gwọrọ Nwa Mmụọ Ọjọọ Ji
MGBE Jisọs, Pita, Jemes, na Jọn pụrụ apụ, ma eleghị anya n’elu otu nkebi nke Ugwu Hemọn, ndị na-eso ụzọ ndị ọzọ zutere otu ihe isi ike. Mgbe ọ lọghachiri, Jisọs hụrụ ozugbo ahụ na ala adịchaghị mma. E nwere ìgwè mmadụ gbakọtara gburugburu ndị na-eso ụzọ ya, ndị odeakwụkwọ sokwa ha na-arụrịta ụka. Mgbe ha hụrụ Jisọs, ndị ahụ nwere oké ihe ijuanya, ha wee gbara ọsọ jee ikele ya. Ọ na-ajụ sị, “Ajụjụ gịnị ka unu na-ajụ ha?”
Otu nwoke si n’ìgwè mmadụ ahụ bịara n’ihu Jisọs, wee gbunye ikpere ma na-akọwa, sị: “Onye ozizi, ekuteere m gị nwa m nwoke, nke nwere mmụọ na-adịghị ekwu okwu; ebe ọ bụla o jidere ya, o wee tie ya n’ala: ọ na-asụkwa ụfụfụ n’ọnụ, na-atakwa ikikere eze, na-atakwa ahụ: m wee gwa ndị na-eso ụzọ gị ka ha chụpụ ya, ma ha enweghị ike.”
O doro anya na ndị odeakwụkwọ ji ohere nke a na-eme ihe ebe ndị na-eso ụzọ ahụ na-enweghị ike ịgwọ nwa ahụ, ma eleghị anya na-akwa mgbalị nile ha emo. Kpọmkwem n’oge ihe isi ike nke a, Jisọs batara. Ọ na-ekwu sị, “Unu ọgbọ na-enweghị okwukwe, ruo ole mgbe ka mụ na unu ga-anọ? Ruo ole mgbe ka m ga-anagide unu?”
O yiri ka Jisọs ọ na-agwa ndị nile nọ n’ebe ahụ okwu, ma ihe ịrụ ụka adịghị ya na ọ na-ekwu kpọmkwem gwa ndị ode akwụkwọ ahụ, ndị nọworo na-enye ndị na-eso ụzọ ya nsogbu. Ọzọ, Jisọs kwuru banyere nwa ahụ sị: “Unu kutara m ya.” Ma ka nwa ahụ na-abịakwute Jisọs, mmụọ ahụ nke dị n’ime ya tụdara ya n’ala wee dọsie ya ike. Nwa okoro ahụ dara n’ala na-atụrụgharị, na-asụkwa ụfụfụ n’ọnụ.
Jisọs na-ajụ sị, ‘Ogologo oge ha aṅaa ka ihe a nọworo na-eme ya?’
Nna nwa ahụ na-aza sị, “Site na nwata. Ọtụtụ mgbe [mmụọ ọjọọ ahụ] tụbakwara ya n’ọkụ na n’ime mmiri, ịla ya n’iyi.” Nna nwa ahụ wee rịọ arịrịọ, sị: “Ọ bụrụ na ị pụrụ ime ihe, nwee ọmịiko n’ahụ anyị, nyere anyị aka.”
Ma eleghị anya, nna nwa ahụ anọgidewo na-achọ enyemaka ruo ọtụtụ afọ. Ugbu a kwa, mgbe ndị na-eso ụzọ Jisọs na-enweghị ike inyere ya aka, mwute ọ na-enwe adịwo ukwuu. N’ịdabere n’arịrịọ o ji obi ya nile rịọ, Jisọs kwuru n’ụzọ agbamume, sị: “Ọ bụrụ na ị pụrụ! Onye nke kwere pụrụ ime ihe nile.”
Ngwa ngwa, nna nwatakịrị ahụ tiri mkpu sị, “Ekwe m!” wee rịọkwa arịrịọ, sị: “Nyere ekweghị ekwe m aka.”
Mgbe Jisọs hụtara na ìgwè mmadụ ahụ na-agbakọta gburugburu ha, ọ baara mmụọ ọjọọ ahụ mba, sị: “Gị mmụọ na-adịghị ekwu okwu na nke ntị chiri, mụ onwe m na-enye gị iwu, si n’ime ya pụta, abakwala n’ime ya ọzọ.” Ka mmụọ ọjọọ ahụ na-apụ, o mekwara ka nwa okoro ahụ tie mkpu ọzọ, ma dọsie ya ike. Nwa okoro ahụ wee tọgbọrọ n’ala n’emegharịghị ahụ, nke mere na ọtụtụ ndị nọ ebe ahụ malitere ikwu, sị: “Ọ nwụrụwo.” Ma Jisọs jidere nwa ahụ n’aka, o wee bilie.
Tupu mgbe ahụ, mgbe e zipụrụ ndị na-eso ụzọ ya ije kwusaa ozi ọma, ha chụpụrụ ndị mmụọ ọjọọ. Ya mere, ugbu a, mgbe ha banyere n’otu ụlọ, ha jụrụ Jisọs, sị: “Gịnị mere anyị onwe anyị apụghị ịchụpụ mmụọ ahụ?”
Ka ọ na-egosi na ọ bụ n’ihi enweghị okwukwe ha, Jisọs zara, sị: “Aha mmụọ nke a apụghị ịpụta site n’ihe ọ bụla, ma ọ bụghị site n’ekpere.” Ihe àmà gosiri na a chọrọ ime nkwadebe iji chụpụ mmụọ ọjọọ nke a siri oké ike. Okwukwe siri ike dị mkpa ya na ekpere iji rịọ enyemaka Chineke nke na-enye ike.
Jisọs wee kwuokwa, sị: “Ọ bụrụ na unu nwere okwukwe dị ka mkpụrụ mustard, unu ga-asị ugwu a, Si n’ebe a gabiga n’ebe ahụ; ọ ga-agabigakwa; ihe ọ bụla agaghị adịkwa nke unu na-apụghị ime.” Lee ka okwukwe pụrụ isi dị ike!
Ihe mgbochi na ihe isi ike ndị na-egbochi inwe ọganihu n’ozi Jehova pụrụ iyi ihe a na-apụghị imeri emeri na ihe a na-apụghị iwepụ ewepụ dị ka oké ugwu nkịtị. Ma, Jisọs na-egosi na ọ bụrụ na anyị azụlite okwukwe n’ime obi anyị, na-akwọsa ya mmiri, na-agbakwa ya ume ito eto, ọ ga-agbasa ruo ná ntozu okè, nweekwa ike inyere anyị aka imeri ihe mgbochi na ihe isi ike ndị dị otú ahụ yiri oké ugwu. Mak 9:14-29; Matiu 17:19, 20; Luk 9:37-43.
▪ Ọnọdụ dị aṅaa ka Jisọs na-ezute ka o si n’Ugwu Hemọn na-alọghachi?
▪ Agbamume dị aṅaa ka Jisọs na-enye nna nke nwa okoro ahụ mmụọ ọjọọ ji?
▪ N’ihi gịnị ka ndị na-eso ụzọ ya na-enweghị ike ịchụpụ mmụọ ọjọọ ahụ?
▪ Ike ha aṅaa ka Jisọs na-egosi na okwukwe pụrụ inwe?