Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • gt isi 78
  • Dịrịnụ Njikere!

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Dịrịnụ Njikere!
  • Nwoke Kasị Ukwuu nke Dịworo Ndụ
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Onye Ahụ Na-elekọta Ụlọ, Onye Kwesịrị Ntụkwasị Obi, Kwesịrị Ịdị Njikere
    Jizọs Bụ Ụzọ, Eziokwu, na Ndụ
  • Jiri Amamihe Kwadebe Maka Ọdịnihu
    Jizọs Bụ Ụzọ, Eziokwu, na Ndụ
  • Jizọs Ejiri Ihe Atụ Talent Kụziere Ndị Na-eso Ụzọ Ya Ịdị Uchu n’Ọrụ
    Jizọs Bụ Ụzọ, Eziokwu, na Ndụ
  • ‘Ohu Ahụ Kwesịrị Ntụkwasị Obi’ Na Òtù Na-Achị Isi Ya
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Nwoke Kasị Ukwuu nke Dịworo Ndụ
gt isi 78

Isi 78

Dịrịnụ Njikere!

MGBE ọ dọsịrị ìgwè mmadụ ahụ aka ná ntị megide anyaukwu, ma dụsịa ndị na-eso ụzọ ya ọdụ megide ichebiga echiche ókè banyere inweta ihe onwunwe, Jisọs na-agba ume, sị: “Atụla egwu, ìgwè atụrụ nta; n’ihi na ọ dị Nna unu ezi mma inye unu alaeze ya.” O si otú a gosi na ọ bụ nanị ọnụ ọgụgụ dị nnọọ nta (nke e mesịrị ghọta na ọ bụ 144,000) ga-anọ n’Alaeze eluigwe ahụ. Ihe ka ukwuu ná ndị ga-anata ndụ ebighị ebi ga-ebi n’ụwa nke Alaeze ahụ ga-achị.

Lee onyinye dị ukwuu “alaeze ya” bụ! N’ịkọwa mmeghachi omume kwesịrị ekwesị nke ndị na-eso ụzọ ya ga-enwe banyere ịnabata ya, Jisọs gbara ha ume, sị: “Reenụ ihe unu nwere, were ha rụọ ọrụ ebere.” Ee, ha kwesịrị iji ihe ndị ha nwere mee ihe ka ọ baara ndị ọzọ uru n’ụzọ ime mmụọ, ma si otú a kpakọba “akụ na-adịghị agwụ agwụ n’eluigwe.”

E mesịa, Jisọs dụrụ ndị na-eso ụzọ ya ọdụ ka ha dị njikere maka nlọghachite ya. Ọ sịrị: “Ka e kee unu ihe okike n’úkwù, ka oriọna unu na-enwukwa; unu onwe unu, yiekwanụ ndị na-eche onyenwe ha, mgbe ọ ga-esi n’oriri ọlụlụ nwunye laghachi; ka, mgbe ọ ga-abịa kụọ aka n’ọnụ ụzọ, ka ha wee megheere ya ngwa ngwa. Ngọzi [“Obi ụtọ,” NW] na-adịrị ndị ohu ahụ, ndị, mgbe onyenwe ha ga-abịa, ọ ga-ahụ ka ha na-eche nche: n’ezie asị m unu, na ọ ga-eke onwe ya ihe okike n’úkwù, mee ka ha nọdụ ná nri, ọ ga-abịakwa jeere ha ozi.”

N’ihe atụ nke a, ịdị njikere nke ndị ohu ahụ maka nlọghachi nke onyenwe ha bụ nke e gosiri site na ha ịchịli uwe mwụda ha dị ogologo elu ma jiri ihe okike ha kegidesie ya ike n’úkwù, nakwa ha ịnọgide na-eje ozi ha ruo ime abalị site n’ìhè nke si n’oriọna ha a gbanyere mmanụ nke ọma. Jisọs na-akọwa, sị: ‘Ọ bụrụ na onye ahụ nwe ha abịa na nche nke abụọ [site n’ihe dị ka elekere itoolu nke abalị ruo ime abalị], ọbụna ọ bụrụ nke atọ [site n’ime abalị ruo ihe dị ka elekere atọ n’ụtụtụ], hụkwa ha ka ha dị njikere, [“obi ụtọ,” NW] na-adịrị ha!’

Onye ahụ nwe ha na-akwụghachi ha ụgwọ n’ụzọ pụrụ iche. Ọ na-eme ka ha nọdụ ná nri ma malite ijere ha ozi. Ọ na-emeso ha, ọ bụghị dị ka ndị ohu, kama dị ka ndị enyi na-eguzosi ike n’ihe. Lee ezi ihe nkwụghachi ụgwọ ọ bụ n’ihi na ha nọgidere na-arụrụ onyenwe ha ọrụ n’abalị ahụ nile ebe ha na-eche nlọghachi ya! Jisọs kwubiri, sị: “Unu onwe unu bụrụkwa ndị e doziworo. n’ihi na n’oge hour nke unu na-echeghị ka nwa nke mmadụ ga-abịa.”

Ugbu a Pita jụrụ, sị: “Onyenwe anyị, ọ̀ bụ anyị ka ị na-atụrụ ilu a, ma ọ bụ mmadụ nile kwa?”

Kama ịza ya kpọmkwem, Jisọs tụrụ ilu ọzọ. Ọ na-ajụ sị, “Ònyekwa bụ onye ahụ na-achị ezinụlọ, onye kwesịrị ka a tụkwasị ya obi, nke nwekwara uche, nke onyenwe ya ga-eme onye isi ezinụlọ ya, inye ha òkè nri ha n’oge ya? Ngọzi [“Obi ụtọ,” NW] na-adịrị ohu ahụ, onye, mgbe onyenwe ya ga-abịa, ọ ga-ahụ ya ka ọ na-eme otú a. N’ezie asị m unu, na ọ ga-eme ya onye isi ihe nile o nwere.”

N’ụzọ doro anya, “onyenwe” ahụ bụ Jisọs Kraịst. “Onye ahụ na-achị ezinụlọ” na-ese onyinyo “ìgwè atụrụ nta” ahụ nke ndị na-eso ụzọ dị ka otu ìgwè, “ezinụlọ ya” na-ezokwa aka n’ebe otu ìgwè a nke 144,000 nọ, bụ́ ndị natara Alaeze eluigwe ahụ, ma okwu nke a na-egosipụta ọrụ ha n’otu n’otu. “Ihe nile o nwere” nke e mere ohu ahụ kwesịrị ka a tụkwasị ya obi onye nlekọta ha, bụ ọdịmma elu ala nke ịchịisi onyenwenụ ahụ, bụ́ nke gụnyere ndị Alaeze ahụ ga-achị n’elu ụwa.

N’ịga n’ihu n’ihe atụ ahụ, Jisọs gosipụtara na ọ pụrụ ikwe mee na ọ bụghị ndị nile so n’òtù onye isi ezinụlọ ahụ ma ọ bụ ohu ahụ ga-ekwesị ntụkwasị obi, na-akọwa, sị: “Ma ọ bụrụ na ohu ahụ ga-asị n’obi ya, Onyenwe m na-anọ ọdụ dị anya ịbịa; ọ bụrụkwa na ọ ga-amalite iti ndị ikom na ndị inyom na-eje ozi aka, na iri ihe oriri na ịṅụ ihe ọṅụṅụ, na ịṅụbiga mmanya ókè; onyenwe ohu ahụ ga-abịa n’ụbọchị ọ na-eleghị anya ya, . . . ọ ga-egbubikwa ya mkpirikpi abụọ [“ga-atakwa ya ahụhụ kasị ukwuu,” NW].”

Jisọs na-ekwu na ọbịbịa ya ewetaworo ndị Juu oge oké ule, ebe ụfọdụ nabatara ozizi ya ma ndị ọzọ jụrụ ha. Ihe karịrị afọ atọ tupu mgbe ahụ, e mere ya baptism na mmiri, ma ugbu a, baptism ya banye n’ọnwụ na-abịaru nso ná ngwụsị ya karị, dịkwa ka o kwuru, sị: “Ọ na-egbukwa m mgbu n’obi nke ukwuu ruo mgbe a ga-emezu ya.”

Mgbe ọ gwasịrị ndị na-eso ụzọ ya okwu ndị a, Jisọs gwakwara ìgwè mmadụ ahụ okwu ọzọ. Ọ kwara arịrị n’ihi ọjụjụ ha ji ekweghị ekwe jụ ịnabata ihe àmà doro anya nke onye ọ bụ nakwa mkpa ọ dị. Ọ na-asị, “Mgbe ọ bụla unu hụrụ igwe ojii ka o si n’ọdịda anyanwụ na-arịgo, ngwa ngwa unu na-asị, Nsha nsha mmiri na-abịa; o wee mee otú a. Mgbe ọ bụla unu hụkwara ifufe ndịda ka ọ na-efe, unu na-asị, Ifufe dị ọkụ ga-adị, o wee mee. Ndị ihu abụọ, unu matara ịtụle ihu ala na eluigwe; ma olee ka o si dị na unu amataghị ịtụle oge a?” Luk 12:​32-⁠59.

▪ Mmadụ ole mejupụtara “ìgwè atụrụ nta” ahụ, gịnịkwa ka ha na-anata?

▪ Jisọs si aṅaa mesie mkpa ọ dị ike na ndị ohu ya ga-adị njikere?

▪ N’ilu Jisọs, olee ndị bụ “onyenwe,” “onye ahụ na-achị ezinụlọ,” “ezinụlọ,” na “ihe nile o nwere”?

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya