Isi 79
Otu Mba Furu, ma Ọ Bụghị Ha Dum
NWA obere oge site na mgbe Jisọs na ndị ahụ zukọtara n’èzí nke ụlọ onye Farisii ahụ nwesịrị mkparịta ụka, ndị ụfọdụ kọọrọ ya banyere “ndị Galili ahụ, ndị [onye ọchịchị Rom bụ Pọntiọs] Paịlet weere ọbara ha gwakọta n’àjà ha.” Ndị Galili ndị a bụ ma eleghị anya ndị ahụ e gburu mgbe ọtụtụ puku ndị Juu biliri megide Paịlet iwere ego sitere n’ụlọ nsọ ahụ mee ihe n’iwu ọwa mmiri iji webata mmiri n’ime Jerusalem. Ọ pụrụ ịbụ na ndị ahụ na-akọrọ Jisọs akụkọ a bu n’uche na ndị Galili ahụ nwetara ọdachi ahụ n’ihi ajọ omume nke onwe ha.
Otu ọ dị, Jisọs mere ka ha guzozie, na-asị: “Ùnu na-eche na ndị Galili ndị a bụ ndị mmehie karịa ndị Galili nile, n’ihi na ha ahụwo ahụhụ ndị a?” Jisọs na-aza sị, “Asị m unu, Ee e.” Ya mere, o jiri ihe ahụ mere dọọ ndị Juu aka ná ntị, sị: “Ọ bụrụ na unu echegharịghị, unu nile ga-ala n’iyi otú ahụ.”
N’ịga n’ihu, Jisọs chetaghachiri ihe ọzọ mere n’obodo ahụ, ma eleghị anya ọ bụkwa ihe e jikọtara ya na owuwu nke ọwa mmiri ahụ. Ọ jụrụ, sị: “Ma ọ bụ mmadụ iri na asata ahụ, ndị ụlọ elu dị na Saịloam dakwasịrị ha, wee gbuo ha, ùnu na-eche na ndị ahụ bụ ndị ji ụgwọ karịa mmadụ nile ndị bi na Jerusalem?” Jisọs na-asị na ọ bụghị n’ihi ajọ omume nke ndị a ma ọlị ka ha ji nwụọ. Kama nke ahụ, “mgbe na ihe ndapụta” bụ ihe na-ewetakarị ọnọdụ ndị dị otú ahụ. Otú ọ dị, Jisọs ji ohere ahụ dọọ aka ná ntị ọzọ, sị: “Kama ọ bụrụ na unu echegharịghị, unu nile ga-ala n’iyi otú a.”
Mgbe ahụ Jisọs gara n’ihu ịtụ otu ilu dabara nke ọma, na-akọwa, sị: “Otu onye nwere osisi fig a kụrụ n’ubi vine ya; o wee bịa na-achọ mkpụrụ n’elu ya, ma ọ hụghị. O wee sị onye ọrụ vine ya, Lee, site n’afọ atọ ruo ugbu a ka m na-abịa na-achọ mkpụrụ n’osisi fig a, ma ahụghị m: gbutuo ya; gịnị mere ọ na-emekwa ka ala laa n’iyi? O wee zaa, sị ya, Onyenwe anyị, hapụkwa ya afọ a, ruo mgbe m ga-egwu ala ya gburugburu, wụsakwa ya nsị́ anụ: ọ bụrụkwa na ọ mịa mkpụrụ site n’ugbu a, ọ dị mma; ma ọ bụrụ na ọ mịghị, ị ga-egbutu ya.”
Jisọs anọọla ihe karịrị afọ atọ na-agbalị ịzụlite okwukwe n’etiti mba ndị Juu. Ma nanị narị ole na ole bụ ndị na-eso ụzọ ya ka a pụrụ ịgụ dị ka mkpụrụ si ná ndọgbu n’ọrụ ya pụta. Ugbu a, n’ime afọ nke anọ nke ije ozi ya, ọ na-eme ka mgbalị ya siwanye ike, n’ụzọ ihe atụ, na-egwu ala ma na-etinye nsị́ anụ gburugburu osisi fig nke ndị Juu ahụ site n’iji ịnụ ọkụ n’obi na-ekwusa ma na-ezi ihe na Judia na Perea. Ma nke a enweghị isi! Obodo ahụ jụrụ ichegharị ma si otú a bụrụ ndị a ga-ebibi. Nanị ihe fọdụrụ ná mba ahụ gere ntị.
Nwa oge mgbe nke ahụ gasịrị, Jisọs na-ezi ihe n’ụlọ nzukọ n’Ụbọchị Izu Ike. N’ebe ahụ, ọ hụrụ otu nwanyị onye, n’ihi mmụọ ọjọo nke na-emekpa ya ahụ, abụrụwo onye hudara ala kemgbe afọ 18. N’ụzọ ọmịiko, Jisọs gwara ya okwu, sị: “Nwanyị, e mewo gị ka ị pụọ na nrịanrịa gị.” Ka o kwuru nke a, o wee bikwasị ya aka ya abụọ, ozugbo ahụ, o guzozie ọtọ ma malite ito Chineke.
Otú ọ dị, iwe were onye isi oche nke ụlọ nzukọ ahụ. O mere mkpesa sị, “Ụbọchị isii dị nke mmadụ aghaghị ịrụ ọrụ n’ime ha: ya mere, bịanụ n’ime ha ka e mee ka ahụ unu dị ike, unu abịakwala n’ụbọchị izu ike.” Otú a, onye isi ahụ kwetara na Jisọs nwere ike ịgwọ ọrịa kama na-akatọ ndị ahụ n’ihi na ha na-abịa ka a gwọọ ha ọrịa n’Ụbọchị Izu Ike!
Jisọs na-azaghachi sị, “Ndị ihu abụọ; onye ọ bụla n’ime unu, ọ́ dịghị atọpụ ehi ya ma ọ bụ ịnyịnya ibu ya n’ụlọ anụ n’ụbọchị izu ike, duru ya gaa ime ka ọ ṅụọ mmiri? Ma nwanyị a, ebe ọ bụ nwa Abraham, onye Setan kere agbụ, lee, afọ iri na asatọ, ó kwesịghị ka a tọpụ ya n’agbụ a n’ụbọchị izu ike?”
Ma, mgbe ha nụrụ nke a, ihere malitere ime ndị ahụ na-emegide Jisọs. Otú ọ dị, ìgwè mmadụ ahụ ṅụrịrị ọṅụ n’ihi ọrụ ebube nile ha hụrụ Jisọs na-arụ. Ná nzaghachi Jisọs tụghachiri ilu abụọ nke amụma banyere Alaeze Chineke, bụ́ ndị ahụ ọ tụrụ n’ime ụgbọ mmiri n’Osimiri Galili ihe dị ka otu afọ tupu mgbe ahụ. Luk 13:1-21; Eklisiastis 9:11; Matiu 13:31-33.
▪ Ọdachi ndị dị aṅaa ka e kwuru okwu ha n’ebe a, oleekwa ihe mmụta Jisọs si n’ime ha wepụta?
▪ Gịnị ka a pụrụ iji tụnyere osisi fig ahụ na-adịghị amị mkpụrụ, nakwa mgbalị ndị e mere iji mee ka ọ mịa mkpụrụ?
▪ Olee otú onye isi ụlọ nzukọ ahụ si gosipụta na ya kwere na Jisọs nwere ike ịgwọ ọrịa, ma Jisọs si aṅaa na-ekpughe ihu abụọ nke nwoke ahụ?