Isi 81
Mgbalị Ndị Ọzọ E Mere Iji Gbuo Jisọs
EBE ọ bụ oge oyi, Jisọs na-aga n’akụkụ ebe ahụ nwere ndò nke a maara dị ka ị̀bà Solomọn. Ọ dị n’akụkụ ụlọ nsọ ahụ. N’ebe a, ndị Juu gbara ya gburugburu ma malite ịsị: “Ị̀ na-akwụba mkpụrụ obi anyị n’elu ruo ole mgbe? Ọ bụrụ na gị onwe gị bụ Kraịst anyị, gwawaa anyị.”
Jisọs na-azaghachi sị, “Agwara m unu, ma unu adịghị ekwe.” Jisọs agwabeghị ha kpọmkwem na ya bụ Kraịst ahụ dị ka ọ gwaworo nwanyị Sameria ahụ n’olulu mmiri. Ma o kpughewo onye ọ bụ n’ezie mgbe ọ kọwaara ha na ya sitere n’eluigwe ma dịakwa adị tupu Abraham.
Otú ọ dị, Jisọs chọrọ ka ndị mmadụ ruo ná nkwubi okwu n’onwe ha na ya onwe ya bụ Kraịst ahụ site n’ijiri ihe Bible buru n’amụma na Kraịst ahụ ga-arụzu tụlee ọrụ ya dị iche iche. Ọ bụ ya mere na o bu ụzọ gwa ndị na-eso ụzọ ya ka ha ghara ịgwa onye ọ bụla na ya bụ Kraịst ahụ. Ọ bụkwa ya mere o ji gaa n’ihu ugbu a ịgwa ndị Juu ahụ na-emeso ya mmeso ọjọọ, sị: “Ọrụ nke mụ onwe m na-arụ n’aha Nna m, ndị a na-agbara m àmà. Ma unu onwe unu adịghị ekwe.”
Gịnị mere na ha adịghị ekwe? Ọ̀ bụ n’ihi enweghị ihe àmà na Jisọs bụ Kraịst ahụ? Ee e, kama ọ bụ n’ihi ihe ahụ Jisọs kwuru mgbe ọ sịrị ha: “Unu adịghị n’ime atụrụ nke m. Atụrụ nke m na-anụ olu m, mụ onwe m makwaara ha, ha na-esokwa m: mụ onwe m na-enyekwa ha ndụ ebighi ebi; ha agaghị alakwa n’iyi ma ọlị ruo mgbe ebighị ebi, ọ dịghịkwa onye ọ bụla ga-anapụ ha n’aka m. Nna m, nke nyeworo m ha, bụ Onye ukwu nke kachasị ihe nile; ọ dịghịkwa onye ọ bụla pụrụ ịnapụ ihe n’aka Nna m.”
Mgbe ahụ Jisọs kọwara mmekọrịta chiri anya nke ya na Nna ya, na-asị: “Mụ onwe m na Nna m bụ otu.” Ebe ọ bụ na Jisọs nọ n’ụwa ma Nna ya nọ n’eluigwe, n’ụzọ pụtara ìhè, ọ dịghị asị na ya na Nna ya bụ otu n’ụzọ nkịtị ma ọ bụ n’anụ ahụ. Kama, ọ na-asị na ha bụ otu ná nzube, na ha dị n’otu.
N’ịbụ ndị okwu Jisọs kpasuru iwe, ndị Juu ahụ tụtụụrụ nkume ịtụgbu ya, ọbụna dị ka ha meworo na mbụ n’oge Ememe Ụlọ Ikwuu ma ọ bụ Ụlọ Ntu. Site n’iji obi ike chee ndị ahụ ga-emesịa gbuo ya ihu, Jisọs na-asị: “Ọtụtụ ọrụ ọma ka m gosiri unu site ná Nna m; n’ihi aha ọrụ gịnị n’ime ndị a ka unu na-atụ m nkume?”
Ha na-aza sị, “Ọ bụghị n’ihi ọrụ ọma ka anyị na-atụ gị nkume, kama ọ bụ n’ihi nkwulu; n’ihikwa na gị onwe gị, ebe ị bụ mmadụ, ị na-eme onwe gị Chineke [“chi,” NW].” Ebe ọ bụ na Jisọs ekwughị mgbe ọ bụla na ya bụ chi, gịnị mere ndị Juu ji kwuo nke a?
O doro anya na ọ bụ n’ihi na Jisọs sịrị na ya nwere ike ndị ha kwere na ha dịịrị nanị Chineke. Dị ka ihe atụ, ọ ka kwusịrị nnọọ okwu banyere “atụrụ” ahụ sị, “mụ onwe m na-enyekwa ha ndụ ebighị ebi,” nke bụ ihe mmadụ ọ bụla na-apụghị ime. Otú ọ dị, ndị Juu ahụ leghaara eziokwu ahụ anya nke bụ na Jisọs na-eme ka a mata na ya natara ike n’aka Nna ya.
Na Jisọs na-asị na ya dị ala karịa Chineke ka ọ gara n’ihu igosi site n’ịjụ, sị: “É deghị ya n’iwu unu [n’Abụ Ọma 82:6], sị, Mụ onwe m sịrị, Chi ka unu bụ? Ọ bụrụ na ọ kpọrọ ndị ahụ chi, ndị okwu Chineke bịaruru . . . , unu onwe unu nà-ekwu okwu banyere onye ahụ Nna m doro nsọ zitekwa n’ụwa, sị, Ị na-ekwulu Chineke, n’ihi na asị m, Abụ m Ọkpara Chineke?”
Ebe ọ bụ na Akwụkwọ nsọ kpọrọ ọbụna ụmụ mmadụ na-ekpe ikpe na-ezighị ezi “chi,” olee mmehie ndị Juu ndị a ga-achọta n’ebe Jisọs nọ n’ihi na ọ sịrị, “Abụ m Ọkpara Chineke”? Jisọs kwukwara, sị: “Ọ bụrụ na arụghị m ọrụ Nna m, unu ekwela m. Ma ọ bụrụ na arụọ m ha, ọbụna ma a sị na unu ekweghị mụ onwe m, na-ekwerenụ ọrụ m: ka unu wee mara na-amagidekwa na Nna m dị n’ime m, na mụ onwe m dịkwa n’ime Nna m.”
Mgbe Jisọs kwuru nke a, ndị Juu nwara ijide ya. Ma ọ gbapụrụ, ọbụna dị ka o meworo na mbụ n’Ememe Ụlọ Ikwuu ahụ. Ọ hapụrụ Jerusalem ma mee njem gafere Osimiri Jọdan gaa ebe Jọn malitere ime baptism ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ afọ anọ gara aga. Ihe ịrụ ụka adịghị ya na ebe a adịghị anya site n’ụsọ osimiri nke ebe ndịda nke ụsọ Osimiri Galili, bụ́ ihe dị ka njem ụbọchị abụọ site na Jerusalem.
Ọtụtụ ndị mmadụ bịakwutere Jisọs n’ebe a ma malite ịsị: “N’ezie ọ dịghị ihe ịrịba ama Jọn mere: ma ka ha hà, bụ́ ihe nile Jọn kwuru banyere onye a, bụ eziokwu.” Otú a, ọtụtụ kwere na Jisọs n’ebe a. Jọn 10:22-42; 4:26; 8:23, 58; Matiu 16:20.
▪ N’ụzọ dị aṅaa ka Jisọs chọrọ ka ndị mmadụ si mara ya dị ka Kraịst ahụ?
▪ Olee otú Jisọs na Nna ya si bụrụ otu?
▪ Gịnị ka o doro anya mere ndị Juu ji sị na Jisọs na-eme onwe ya ka ọ bụrụ chi?
▪ Olee otú nhota Jisọs hotara Abụ Ọma si egosi na ọ dịghị asị na ya na Chineke hà?