Isi 82
Jisọs Na-agaghachikwa Jerusalem Ọzọ
N’OGE na-adịghị anya, Jisọs na-amalitekwa njem ọzọ, na-ezi ihe site n’obodo ruo n’obodo, sitekwa n’obodo nta ruo n’obodo nta ọzọ. Ihe àmà gosiri na ọ nọ n’ógbè Perea, n’ofe ọzọ nke Osimiri Jọdan site na Judia. Ma ebe ọ na-eje bụ Jerusalem.
Eleghị anya ọ bụ nkà ihe ọmụma ndị Juu nke bụ na nanị mmadụ ole na ole ga-eru eru inweta nzọpụta kpaliri otu nwoke ịjụ, sị: “Onyenwe anyị, ndị a na-azọpụta hà dị mmadụ ole na ole?” Site n’azịza ya, Jisọs mere ka ndị ahụ chee echiche banyere ihe dị mkpa iji nweta nzọpụta: “Jisienụ ike [ya bụ, gbalịsienụ ike, ma ọ bụ dọgbuonụ onwe unu n’ọrụ] isi n’ọnụ ụzọ dị warara baa.”
Dị ka Jisọs gara n’ihu ikwu, mgbalịsi ike dị otú ahụ dị oké mkpa “n’ihi na ọtụtụ mmadụ . . . ga-achọ ịba n’ime ya, ma ha agaghị enwe ike.” Gịnị mere ha agaghị enwe ike ịba? Ọ na-akọwa na ‘mgbe nna nwe ụlọ ga-ebiliworị wee mechie ọnụ ụzọ ya, ndị mmadụ wee guzoro n’èzí na-akụ aka sị, “Onyenwe anyị, megheere anyị ụzọ;” ọ ga-asị: “Amataghị m ebe unu si bịa; pụọnụ n’ihu m, ndị nile na-arụ ọrụ ajọ omume.”’
Ọ ghaghị ịbụ na ndị ahụ a kpọchibidoro ụzọ n’èzí bịara nanị mgbe ọ dịrị ha mma. Ma mgbe ahụ, a kwachiwo ma kpọchie ọnụ ụzọ nke ohere ime ihe. Iji wee banye, ha kwesịrị ịbịaworị n’oge, ọ bụ ezie na ọ pụrụ ịbụ na ọ dịghịrị ha mfe ime otú ahụ n’oge ahụ. N’eziokwu, ihe dị mwute na-echere ndị ahụ na-amaliteghị n’oge ime ka ofufe Jehova bụrụ nzube bụ isi ná ndụ ha!
Ruo n’ókè dị ukwuu, ndị Juu ahụ e zijeere Jisọs ka o jeere ozi ejighị ohere ọma ha nwere ịnakwere ndokwa Chineke mere maka nzọpụta mee ihe. Ya mere Jisọs kwuru na ha ga-akwa akwá, taakwa ikikere eze mgbe a tụpụrụ ha n’èzí. N’aka nke ọzọ, ndị mmadụ sitere “n’ọwụwa anyanwụ na ọdịda anyanwụ, sikwa n’ugwu na ndịda bịa,” ee, site ná mba nile, ‘ga-anọdụkwa n’alaeze Chineke.’
Jisọs gara n’ihu ikwu, sị: “Ndị ikpeazụ dị [ndị a kpọrọ asị na-abụghị ndị Juu, tinyekwara ndị Juu e wedara n’ala] ndị ga-ebu ụzọ, ndị bu ụzọ dịkwa [ndị Juu ihe na-agara nke ọma n’ụzọ ihe onwunwe na n’ụzọ okpukpe] ndị ga-abụ ndị ikpeazụ.” Ha ịbụ ndị ikpeazụ pụtara na ndị dị otú a, bụ́ ndị na-adịghị eme ngwa, ndị na-adịghị egosikwa ekele agaghị abata n’Alaeze Chineke ma ọlị.
Ndị Farisii wee bịakwute Jisọs ugbu a ma sị: “Pụọ, si n’ebe a laa: n’ihi na Herọd [Antipas] na-achọ igbu gị.” Ọ pụrụ ịbụ na Herọd malitere àsị̀rị̀ nke a n’onwe ya iji mee ka Jisọs gbapụ n’ókèala ahụ. Ọ pụrụ ịbụ na egwu na-atụ Herọd ka aka ya ghara ịdịkwa n’ọnwụ nke onye amụma ọzọ nke Chineke dị ka aka ya dị n’ogbugbu e gburu Jọn Onye Na-eme Baptism. Ma Jisọs gwara ndị Farisii ahụ, sị: ‘Gaanụ, sị nkịta ọhịa ahụ, Lee, ana m achụpụ ndị mmụọ ọjọọ, na-arụzukwa ọrụ ime ka ahụ dị mmadụ ike taa na echi, ụbọchị nke atọ e meekwa ka m zuo okè [“m ga-arụzukwa ọrụ m n’ebe a,” NW].”
Mgbe ọ rụzuru ọrụ ya n’ebe ahụ, Jisọs gara n’ihu na njem ya iga Jerusalem, n’ihi na dị ka ọ kọwara, “a pụghị ikwe ka onye amụma laa n’iyi n’ebe na-abụghị Jerusalem.” N’ihi gịnị ka a pụrụ iji tụọ anya na a ga-egbu Jisọs na Jerusalem? Ọ bụ n’ihi na Jerusalem bụ isi obodo, ebe Sanhedrin ahụ nke nwere 71 ndị òtù nwere ọnọdụ ya, ọ bụkwa ebe a na-achụ àjà anụmanụ dị iche iche. N’ihi ya, ọ bụ ihe a na-agaghị ekwere ka a nọrọ n’ebe ọzọ na-abụghị Jerusalem gbuo “Nwa Atụrụ Chineke.”
Jisọs kwara arịrị sị, “Jerusalem, Jerusalem, nke na-egbu ndị amụma, nke na-ewerekwa nkume atụ ndị e zitewooro ya! Ọtụtụ mgbe ole ka m chọrọ ịchịkọ ụmụ gị, ọbụna dị ka nnekwu ọkụkọ na-achịkọ ụmụ nke aka ya n’okpuru nkù ya abụọ, ma unu achọghị! Lee, a na-ahapụrụ unu ụlọ unu!” N’ihi ịjụ Ọkpara Chineke, mbibi na-eche mba ahụ ihu!
Ka Jisọs gara n’ihu ije Jerusalem, a kpọrọ ya òkù ịbịa n’ụlọ nke otu onye ọchịchị ndị Farisiị. Ọ bụ Ụbọchị Izu Ike, ndị ahụ lekwasịkwara ya anya, ebe ọ bụ na e nwere otu nwoke nọ n’ebe ahụ onye nwere ọrịa ahụ mmiri, nke bụ mmiri itojupụta ma eleghị anya n’aka ma ọ bụ n’ụkwụ ya. Jisọs gwara ndị Farisii na ndị bụ ọkà n’Iwu, bụ́ ndị nọ n’ebe ahụ okwu, na-ajụ, sị: “Ò ziri ezi n’iwu ime ka ahụ mmadụ dị ike n’ụbọchị izu ike, ma ọ bụ na o zighị ezi?”
Ọ dịghị onye kwuru ihe ọ bụla. Jisọs wee gwọọ nwoke ahụ ma zipụ ya. O wee jụọkwa, sị: “Ọ̀ bụ nwa nwoke ma ọ bụ ehi nke ònye n’etiti unu ga-adaba n’olulu mmiri, ma onye ahụ agaghị adọkpụlite ya elu ngwa ngwa n’ụbọchị izu ike?” Ọzọkwa, ọ dịghị onye kwuru okwu ọ bụla ná nzaghachi. Luk 13:22–14:6; Jọn 1:29.
▪ Gịnị ka Jisọs gosiri na ọ dị mkpa maka nzọpụta, n’ihi gịnịkwa ka e ji kpọchibido ọtụtụ ndị ụzọ n’èzí?
▪ Olee ndị bụ “ndị ikpeazụ” ndị ghọrọ ndị mbụ, oleekwa ndị bụ “ndị mbụ” ndị ghọrọ ndị ikpeazụ?
▪ Gịnị pụrụ ịbụ ihe kpatara e ji si na Herọd chọrọ igbu Jisọs?
▪ N’ihi gịnị ka o ji bụrụ ihe a na-agaghị ekwe, ka e gbuo onye amụma n’ebe na-abụghị Jerusalem?