Isi 88
Ọgaranya ahụ na Lazarọs
JISỌS anọwo na-akọrọ ndị na-eso ụzọ ya banyere ụzọ ziri ezi a pụrụ isi jiri akụ na ụba mee ihe, na-akọwa na anyị apụghị ịbụ ohu nye ihe ndị a ma n’otu oge ahụ bụrụkwa ohu nye Chineke. Ndị Farisii ahụ na-egekwa ntị, ha malitekwara ịchị Jisọs ọchị n’ụdị ịkwa emo, n’ihi na ha bụ ndị hụrụ ego n’anya. Ya mere ọ gwara ha, sị: “Unu onwe unu bụ ndị na-agụ onwe unu ná ndị ezi omume n’anya mmadụ; ma Chineke maara obi unu: n’ihi na ihe dị elu n’etiti mmadụ bụ ihe arụ n’anya Chineke.”
Oge abịawo maka ikpugharị ihe ihu n’ebe ndị ahụ bara ọgaranya n’ihe onwunwe nke ụwa, ike ọchịchị, na ikike nke ịbụ ndị nduzi na ndị a na-asọpụrụ n’okpukpe nọ. A ga-eweda ha n’ala. Ma ndị ahụ matara mkpa ime mmụọ ha ka a ga-ebuli elu. Jisọs rụtụrụ aka n’ụdị mgbanwe ahụ mgbe ọ gara n’ihu ịgwa ndị Farisii, sị:
“Iwu Chineke na ndị amụma ya dị ruo oge Jọn [Onye Na-eme Baptism]: site n’oge ahụ a na-ezisa ozi ọma alaeze Chineke, mmadụ nile n’otu n’otu weere ihe ike na-aba n’ime ya. Ma ọ ka mfe ka eluigwe na ala gabiga, karịa na otu ihe dịkarịsịrị nta n’Iwu ahụ ga-ada.”
Ndị odeakwụkwọ na ndị Farisii ahụ na-ebuli onwe ha elu n’ihi nkwere ha kwere na ha na-eme ihe dị ka Iwu Mosis si dị. Cheta na mgbe Jisọs ji ọrụ ebube weghachi ịhụ ụzọ nke otu nwoke na Jerusalem, ha turu ọnụ, sị: “Anyị onwe anyị bụ ndị na-eso ụzọ Mosis. Anyị onwe anyị matara na Chineke agwawo Mosis okwu.” Ma ugbu a, Iwu Mosis emezuwo nzube e ji guzobe ya nke bụ iduga ndị nwere obi umeala n’ebe Eze Chineke họpụtara nọ, bụ́ Jisọs Kraịst. Ya mere, site na mmalite nke ozi Jọn, ụdị mmadụ nile, karịsịa ndị nwere obi umeala na ndị bụ ogbenye, na-agbalịsi ike ịbụ ndị Alaeze Chineke ga-achị.
Ebe ọ bụ na a na-emezu Iwu Mosis ahụ ugbu a, a ga-ewepụ ibu ọrụ nke idebe ya. Iwu ahụ kwadoro ịgba alụkwaghịm n’ọnọdụ dị iche iche, ma ugbu a Jisọs na-asị: “Nwoke ọ bụla nke na-ahapụ nwunye ya, nke lụrụkwaara nwanyị ọzọ, ọ na-akwa iko: onye na-alụ nwanyị nke di ya hapụworo na-akwakwa iko.” Lee otú ụdị nkwupụta okwu dị otú a na-aghaghị isiworị kpasuo ndị Farisii ahụ iwe, karịsịa ebe ọ bụ na ha na-akwado ịgba alụkwaghịm n’ọtụtụ ọnọdụ!
N’ịga n’ihu n’okwu ya nye ndị Farisii, Jisọs kọrọ otu ihe atụ banyere ndị ikom abụọ ndị ọkwá ha, ma ọ bụ ọnọdụ ha mesịrị n’ikpeazụ gbanwee n’ụzọ dị ịrịba ama. Ị̀ pụrụ ịchọpụta ndị ndị ikom ahụ na-anọchite anya ha na ihe mgbanwe ọnọdụ ha pụtara?
Jisọs na-akọwa sị, “Ma otu ọgaranya dị, ọ na-eyikwa uwe odo odo na ezi ákwà ọcha, ọ na-emekwa ka obi na-atọ ya ụtọ nke ọma kwa ụbọchị: ma a tọgbọrọrịị otu ogbenye n’ọnụ ụzọ ámá ya, aha ya bụ Lazarọs, nke ọnyá juru ya n’ahụ, onye ọ na-agụkwa ka e were irighiri nri nke si na table nke ọgaranya ahụ dapụ mee ka afọ ju ya; ee, ọbụna nkịta na-abịa rachaa ọnyá ya.”
N’ebe a Jisọs ji ọgaranya ahụ mee ihe atụ nke ndị ndú okpukpe ndị Juu, ndị gụnyere, ọ bụghị nanị ndị Farisii na ndị odeakwụkwọ, kamakwa ndị Sadusii na ndị isi nchụàjà. Ha nwere ọtụtụ ihe ùgwù na ohere dị iche iche nke ihe ime mmụọ, ha na-emekwa onwe ha dị ka ọgaranya ahụ mere. Uwe ha e ji ákwà odo odo nke onye eze mee na-anọchite anya ezi ọnọdụ nke ha nwere, ezi ákwà ọcha ahụ na-esekwa onyinyo ọgụgụ ha na-agụ onwe ha ná ndị ezi omume.
Òtù nke a nke onye ọgaranya ahụ dị mpako na-eji nlelị dị ukwuu na-ele ndị ogbenye bụ ndị nkịtị anya, na-akpọ ha ‛am ha·’aʹrets, ma ọ bụ ndị ụwa. Ya mere onye arịrịọ ahụ bụ Lazarọs si otú a na-anọchite anya ndị a ndị ndú okpukpe napụrụ ezi nri na ihe ùgwù ime mmụọ dị iche iche. Otú a kwa, dị ka Lazarọs ọnyá jupụtara n’ahụ, a na-eleda ndị nkịtị anya dị ka ndị nwere ọrịa ime mmụọ, ndị kwesịkwara ka ha na nanị nkịta na-akpakọrịta. Ma, ndị òtù Lazarọs ahụ na-enwe agụụ na akpịrị ịkpọ nkụ maka nri ime mmụọ, wee si otú a na-anọrọ n’ọnụ ụzọ ámá na-arịọ ka e nye ha nwa mpekere nri ime mmụọ ọ bụla nke pụrụ isi na table onye ọgaranya ahụ dapụ.
Ugbu a Jisọs gara n’ihu ịkọwa mgbanwe e nwere n’ọnọdụ nke ọgaranya ahụ na Lazarọs. Gịnị bụ mgbanwe ndị a, gịnịkwa ka ha nọchiri anya ha?
Ọgaranya ahụ na Lazarọs Enwee Mgbanwe
Ogaranya ahụ na-anọchite anya ndị ndú okpukpe, bụ́ ndị nwere ihe ùgwù na ohere ime mmụọ dị iche iche, Lazarọs na-esekwa onyinyo ndị nkịtị bụ́ ndị agụụ nri ime mmụọ na-agụ. Jisọs gara n’ihu n’akụkọ ya, na-akọwa mgbanwe dị ịrịba ama n’ọnọdụ nke ndị ikom ndị a.
Jisọs na-asị, “O wee ruo na ogbenye ahụ nwụrụ, ndị mmụọ ozi wee bupụ ya gaa n’ebe ọ dabeere n’obi Abraham: ọgaranya ahụ nwụkwara, e wee lie ya. N’ime Hedis o wee welie anya ya elu, ebe ọ nọ ná mmekpa ahụ, ọ hụ Abraham n’ebe dị anya, na Lazarọs ka ọ dabeere n’obi ya.”
Ebe ọgaranya ahụ na Lazarọs na-abụghị ndị mmadụ nkịtị kama ndị na-anọchite anya òtù ndị mmadụ dị iche iche, ọ bụ ihe ezi uche dị na ya na ọnwụ ha bụkwa ihe atụ. Gịnị ka ọnwụ ha na-anọchi anya ya ma ọ bụ na-ese onyinyo ya?
Jisọs ka kwusịrị nnọọ banyere mgbanwe ọnọdụ ndị e nwere site n’ịsị na ‘Iwu ahụ na Ndị Amụma ya dị ruo oge Jọn Onye Na-eme Baptism, site n’oge ahụ a na-ezisa ozi ọma alaeze Chineke.’ N’ihi nke a, ọ bụ site ná nkwusa ozi ọma nke Jọn na Jisọs Kraịst ka ma ọgaranya ahụ ma Lazarọs si nwụọ n’ihe banyere ọnọdụ ha nọ na ya na mbụ.
Ndị ahụ dị umeala, bụ́ ndị nwere obi nchegharị, ndị so n’òtù Lazarọs, nwụrụ n’ihe banyere ọnọdụ nke enweghị ihe ime mmụọ ha nọ na ya na mbụ ma bata n’ọnọdụ nke inwe ihu ọma Chineke. Ebe ha legaworo anya na mbụ n’ebe ndị ndú okpukpe nọ maka mpekere nri ime mmụọ ọ bụla nke ga-esi na table ha dapụ, ugbu a eziokwu dị n’Akwụkwọ nsọ nke Jisọs na-enye ne-emeju mkpa ha. E si otú a webata ha n’ọnọdụ nke ịdabere n’obi ma ọ bụ ọnọdụ nke inweta ihu ọma nke Abraham ahụ Ka Ukwuu, bụ́ Jehova Chineke.
N’aka nke ọzọ, ndị ahụ mejupụtara òtù ọgaranya ahụ enwetaghị ihu ọma Chineke n’ihi ịnọgide na-ajụ ịnabata ozi Alaeze ahụ nke Jisọs na-ezi. Ha si otú a nwụọ n’ihe banyere ọnọdụ mbụ ha nke yiri ọnọdụ inweta ihu ọma. N’ezie, a na-ekwu banyere ha dị ka ndị nọ ná mmekpa ahụ n’ụzọ ihe atụ. Gee ntị ugbu a ka ọgaranya ahụ na-ekwu okwu, sị:
“Nna, Abraham, meere m ebere, zite Lazarọs, ka o detụ ọnụ ọnụ mkpịsị aka ya na mmiri, wee mejụọ ire m; n’ihi na anọ m n’ahụ ụfụ n’ime ire ọkụ a.” Ozi ikpe ọmụma Chineke kpụ ọkụ n’ọnụ nke ndị na-eso ụzọ Jisọs na-ekwusa bụ ihe na-emekpa ndị mmadụ nọ n’òtù ọgaranya ahụ ahụ. Ha chọrọ ka ndị na-eso ụzọ ahụ hapụ ikwusa ozi ọma ndị a, si otú a na-eme ka ha nweretụ onwe ha pụọ ná mmekpa ahụ ha.
“Ma Abraham sịrị, Nwa m, cheta na ị naara ezi ihe gị ná ndụ gị, otú ahụ Lazarọs narakwaara ajọ ihe ya: ma ugbu a a na-akasi ya obi n’ebe a, ma gị onwe gị nọ n’ahụ ụfụ. Ma n’ihe ndị a nile, e mewo ka oké olulu dịsie ike n’agbata anyị na unu, ka ndị na-achọ isi n’ebe a gabiga ijekwuru unu wee ghara inwe ike, ka onye ọ bụla gharakwa isi n’ebe ahụ gabiga bịakwute anyị.”
Lee ikpe ziri ezi na ihe kwesịrị ekwesị ọ bụ na mgbanwe ọnọdụ nke a dị ịrịba ama weere ọnọdụ n’etiti ndị òtù Lazarọs na ndị òtù Ọgaranya ahụ! Mgbanwe ọnọdụ ndị ahụ bụ nke e mezuru mgbe ọnwa ole na ole gasịrị na Pentikọst 33 O.A., mgbe e ji ọgbụgba ndụ ọhụrụ dochie anya ọgbụgba ndụ ochie ahụ nke Iwu. Mgbe ahụ ọ ghọrọ ihe doro anya nke ọma na ọ bụ ndị na-eso ụzọ Jisọs nwetara ihu ọma Chineke, ọ bụghị ndị Farisii na ndị ndú okpukpe ndị ọzọ. Ya mere “oké olulu” nke na-ekewa ọgaranya ihe atụ ahụ na ndị na-eso ụzọ Jisọs na-anọchi anya ikpe ezi omume Chineke nke na-adịghị agbanwe agbanwe.
Ọgaranya ahụ gara n’ihu ịrịọ sị, “Nna Abraham”: “Ziga [Lazarọs] n’ụlọ nna m; n’ihi na enwere m ụmụnne ise.” Ọgaranya ahụ si otú a kwupụta na ya nwere mmekọrịta ka chie anya n’ebe nna ọzọ nọ, onye bụ Setan Ekwensu n’ezie. Ọgaranya ahụ na-arịọ ka Lazarọs ghara izi ozi ikpe ọmụma Chineke n’ụzọ o kwesịrị ka o wee ghara itinye “ụmụnne ise” ya, bụ́ ndị njikọ aka okpukpe ya, “n’ebe mmekpa ahụ a.”
“Ma Abraham sịrị, Ha nwere Mosis na ndị amụma; ka ha nụrụ olu ha.” Ee, ọ bụrụ na “ụmụnne ise” ahụ ga-alanarị mmekpa ahụ, ihe ha ga-eme bụ ige ntị n’ihe nile Mosis na ndị amụma dere ndị gosipụtara Jisọs dị ka Mesaịa ahụ ma ghọọkwa ndị na-eso ụzọ ya. Ma ọgaranya ahụ jụrụ ajụ, na-asị: “Ee e, nna Abraham: kama ọ bụrụ na otu onye esite na ndị nwụrụ anwụ jekwuru ha, ha ga-echegharị.”
Otú ọ dị, a gwara ya, sị: “Ọ bụrụ na ha anụghị olu Mosis na ndị amụma, agaghị emekwa ka ha kwenye, a sị na otu onye esi ná ndị nwụrụ anwụ bilie.” Chineke agaghị enye ihe àmà ma ọ bụ ọrụ ebube ndị pụrụ iche iji mee ka ndị mmadụ kwere. Ha aghaghị ịgụ ma jiri ihe e dere n’Akwụkwọ nsọ mee ihe ma ọ bụrụ na ha ga-anata ihu ọma ya. Luk 16:14-31; Jọn 9:28, 29; Matiu 19:3-9; Ndị Galetia 3:24; Ndị Kọlọsi 2:14; Jọn 8:44.
▪ N’ihi gịnị ka ọnwụ ọgaranya ahụ na Lazarọs na-aghaghị iji bụrụ n’ụzọ ihe atụ, gịnịkwa ka ọnwụ ha sere onyinyo ya?
▪ Site ná mmalite ozi Jọn, mgbanwe dị aṅaa ka Jisọs sịrị na ọ na-ewere ọnọdụ?
▪ Gịnị ka a ga-ewepụ mgbe Jisọs nwụrụ, oleekwa otú nke a ga-esi metụta okwu banyere ịgba alụkwaghịm?
▪ N’ilu Jisọs, ole ndị ka ọgaranya ahụ na Lazarọs na-anọchi anya ha?
▪ Gịnị bụ mmekpa ahụ nke ọgaranya ahụ nwetara, ọ̀ bụkwa n’ụzọ dị aṅaa ka ọ na-arịọ ka e si mee ka ihe dịtụrụ ya mfe?
▪ Gịnị ka “oké olulu” ahụ nọchiri anya ya?
▪ Ònye bụ nna ọgaranya ahụ n’ezie, ole ndị bụkwa ụmụnne ya ise?