Isi 90
Olileanya Mbilite n’Ọnwụ
JISỌS mesịrị rute ebe mpụga Betani, bụ́ obodo nta dị ihe dị ka maịlụ abụọ site na Jerusalem. Ọ bụ nanị ụbọchị ole na ole mgbe ọnwụ na olili Lazarọs gasịrị, ụmụnne ya ndị inyom bụ Meri na Mata ka na-erukwa újú, ọtụtụ ndị abịawokwa n’ụlọ ha ịkasi ha obi.
Ka ha na-eru újú, otu onye gwara Mata na Jisọs na-abịa. Ya mere ọ gbapụrụ ma mee ngwa izute ya, o yikwara ka ọ bụ na ọ gwaghị nwanne ya nwanyị. Ka ọ na-erute Jisọs nso, Mata kwughachiri ihe ya na nwanne ya nwanyị na-aghaghị ikwuworị ọtụtụ ugbo n’abalị anọ gara aga: “Ọ bụrụ na ị nọrịị n’ebe a, nwanne m nwoke agaghị anwụworị.”
Otú ọ dị, Mata gosipụtara olileanya, na-egosi echiche nke bụ na Jisọs ka pụrụ ime ihe banyere nwannne ya nwoke. O kwuru sị, “Amatara m na, ka ihe ị ga-arịọ n’aka Chineke hà, Chineke ga-enye gị.”
Jisọs kwere nkwa sị, “Nwanne gị nwoke ga-esi n’ọnwụ bilie.”
Mata ghọtara na Jisọs na-ekwu banyere mbilite n’ọnwụ lọghachi n’ụwa, nke ga-eme n’ọdịnihu, bụ́ nke Abraham na ndị ozi Chineke ndị ọzọ na-elekwa anya ya. Ya mere ọ zaghachiri, sị: “Amatara m na ọ ga-esi n’ọnwụ bilie ná mbilite n’ọnwụ n’ụbọchị ikpeazụ.”
Otú ọ dị, Jisọs nyere olileanya maka mgbapụta a ga-enwe ozugbo ahụ, na-azaghachi, sị: “Mụ onwe m bụ mbilite n’ọnwụ na ndụ.” O chetaghachiiri Mata na Chineke enyewo ya ike megide ọnwụ, na-asị: “Onye na-ekwere na mụ, ọbụna ma a sị na ọ nwụrụ anwụ, ọ ga-adị ndụ ọzọ: ọzọ, onye ọ bụla nke na-adị ndụ, nke na-ekwerekwa na mụ, ọ gaghị anwụ ma ọlị ruo mgbe ebighị ebi.”
Jisọs adịghị agwa Mata na ndị dị ndụ n’oge ahụ, bụ́ ndị na-ekwesị ntụkwasị obi agaghị anwụ anwụ ma ọlị. Ee e, ihe ọ na-ekwu bụ na inwe okwukwe n’ebe ọ nọ pụrụ iduba ná ndụ ebighị ebi. Ọtụtụ mmadụ ga-enwe ndụ dị otú ahụ n’ihi ịbụ ndị a kpọlitere n’ọnwụ n’ụbọchị ikpeazụ. Ma ndị ọzọ nwere okwukwe ga-alanarị ọgwụgwụ nke usoro ihe ndị a nke dị n’ụwa, nyekwa ndị a, okwu Jisọs ga-abụ eziokwu n’ụzọ nkịtị nnọọ. Ha agaghị anwụ ma ọlị! Mgbe o kwusịrị okwu a dị ịrịba ama, Jisọs jụrụ Mata, sị, “Ì kwere nke a?”
Ọ zara sị, “Ee, Onyenwe anyị: mụ onwe m ekwerewo na gị onwe gị bụ Kraịst anyị, Ọkpara Chineke, onye na-abịa n’ụwa.”
Mgbe ahụ Mata ji ọsọ laghachi azụ ịkpọ nwanne ya nwanyị, na-agwa ya otú nanị ya ga-anụ, sị: “Onye ozizi nọ n’ebe a, ọ na-akpọkwa gị.” Ozugbo ahụ Meri hapụrụ ụlọ. Mgbe ndị ọzọ hụrụ ka ọ na-apụ, ha soo ya, na-eche na ọ na-aga n’ili nwanne ya.
Ka o rutere Jisọs nso, Meri dara n’ụkwụ ya na-ebe akwá. “Onyenwe anyị, ọ bụrụ na ị nọrịị n’ebe a, nwanne m nwoke agaghị anwụworị,” ka o kwuru. A kpaliri Jisọs nke ukwuu mgbe ọ hụrụ na Meri na ìgwè ndị na-eso ya na-ebe akwá. Ọ jụrụ sị, “Olee ebe unu tọgbọworo ya?”
Ha zara sị, “Onyenwe anyị, bịa, leekwa.”
Anya mmiri pụkwara Jisọs n’anya, na-eme ka ndị Juu kwuo, sị: “Lee otú ọ hụrụ ya n’anya!”
Ụfọdụ chetara na Jisọs, n’oge Ememe Ụlọ Ikwuu n’ọnwa ole na ole tupu mgbe ahụ, agwọworị otu nwa okoro kpuru ìsì site n’ọmụmụ, ha wee jụọ, sị: “Onye a, nke meghere anya onye ahụ kpuru ìsì, ọ́ pụghị imekwa ka nwoke a ghara ịnwụ anwụ?” Jọn 5:21; 6:40; 9:1-7; 11:17-37.
▪ Olee mgbe Jisọs mesịrị rute Betani, gịnị bụkwa ọnọdụ e nwere n’ebe ahụ?
▪ Ihe ndabere dị aṅaa ka Mata nwere iji kwere ná mbilite n’ọnwụ?
▪ Olee otú ọnwụ Lazarọs si metụta Jisọs?