Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • gt isi 101
  • Na Betani, n’Ụlọ Saịmọn

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Na Betani, n’Ụlọ Saịmọn
  • Nwoke Kasị Ukwuu nke Dịworo Ndụ
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Jizọs Agaa Betani Rie Nri n’Ụlọ Saịmọn
    Jizọs Bụ Ụzọ, Eziokwu, na Ndụ
  • Jizọs Kpọlitere Lazarọs n’Ọnwụ
    Ihe Ị Ga-amụta n’Akụkọ Baịbụl
  • Ihe Mere Jizọs Agaghị Ngwa Ngwa
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2010
  • Ememe Ngabiga Ikpeazụ nke Jisọs Adịwo Nso
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Nwoke Kasị Ukwuu nke Dịworo Ndụ
gt isi 101

Isi 101

Na Betani, n’Ụlọ Saịmọn

MGBE Jisọs hapụrụ Jeriko, o jewere Betani. Njem ahụ were akụkụ ka ukwuu nke ụbọchị ahụ, ebe ọ bụ ịrịgo ugwu ruo ihe dị maịlụ 12 gabiga ala na-adịghị larịị. Jeriko ji ihe dị ka 820 amaụkwụ dị ala site n’ọ̀tụ̀tụ̀ ịdị elu nke oké osimiri, ma Betani ji ihe dị ka 2,500 amaụkwụ dịrị elu karịa ọ̀tụ̀tụ̀ ịdị elu nke oké osimiri. Ị pụrụ icheta na Betani bụ obodo Lazarọs na ụmụnne ya ndị inyom. Obodo nta ahụ dị ihe dị ka maịlụ abụọ site na Jerusalem, ọ dịkwa na ndagwurugwu ebe ọwụwa anyanwụ nke Ugwu Olive.

Ọtụtụ ndị abịaruteworị Jerusalem maka Ememe Ngabiga. Ha abịawo n’oge iji mee onwe ha ka ha dị ọcha n’ụzọ usoro ihe omume. Ma eleghị anya ha ebitụwo ozu aka ma ọ bụ mee ihe ọzọ nke mere ka ha bụrụ ndị na-adịghị ọcha. Ya mere ha na-agbaso ụkpụrụ ahụ e setịpụrụ iji mee onwe ha ka ha dị ọcha iji nwee ike ime Ememe Ngabiga ahụ n’ụzọ a na-anara nke ọma. Ka ndị ahụ bịarutere n’oge na-ezukọ n’ụlọ nsọ ahụ, ọtụtụ ndị malitere ịtụgharị uche ma Jisọs ọ̀ ga-abịakwa Ememe Ngabiga ahụ.

Jerusalem bụ ebe a na-enwe nrụrịta ụka ndị siri ike banyere Jisọs. Ọ bụ ihe a mazuru ebe nile na ndị ndú okpukpe chọrọ ijide ya ka ha wee gbuo ya. N’ezie, ha enyewo iwu na ọ bụrụ na onye ọ bụla amata ebe ọ nọ, o kwesịrị ịbịa kọọrọ ha. Ugbo atọ n’ọnwa ndị na-adịbeghị anya tupu mgbe ahụ​—⁠n’Ememe Ụlọ Ikwuu, n’Ememe Nraranya, nakwa mgbe ọ kpọlitesịrị Lazarọs n’ọnwụ​—⁠ndị ndú ndị a agbalịwo igbu ya. Ya mere ndị mmadụ nọ na-eche echiche ma Jisọs ọ̀ ga-apụta n’ihu ọha ọzọ? Ha na-ajụrịta ibe ha, na-asị, “Gịnị ka unu na-eche?”

Ka ọ dị ugbu a, Jisọs bịarutere na Betani ụbọchị isii tupu Ememe Ngabiga ahụ, bụ́ nke dabara na Nisan 14 dị ka kalenda ndị Juu si dị. Jisọs rutere na Betani n’ihe dị ka uhuruchi ụbọchị Friday, nke bụ ná mmalite nke Nisan 8. Ọ pụghị imeworị njem ahụ garuo Betani na Saturday n’ihi na ịga njem n’Ụbọchị Izu Ike​—⁠malite n’ọdịda anyanwụ nke Friday ruo nke Saturday​—⁠bụ nke iwu ndị Juu machibidoro. Ma eleghị anya Jisọs jere n’ụlọ Lazarọs, dị ka o meworo ná mbụ, wee nọọ ọnọdụ abalị Friday n’ebe ahụ.

Otú ọ dị, onye ọzọ bi na Betani kpọrọ Jisọs na ndị ya na ha so òkù ka ha bịa rie nri n’ụlọ ya n’anyasị Saturday. Nwoke ahụ bụ Saịmọn, onye bụbu onye ekpenta, onye ọ pụrụ ịbụ na Jisọs agwọwo ya tupu mgbe ahụ. Dị ka àgwà ịrụsị ọrụ ike ya si dị, Mata nọ na-ejere ndị ọbịa ahụ ozi. Ma, dịkwa ka ọ na-emebu, Meri nọ na-ege Jisọs ntị n’ụzọ nke kpaliri esemokwu ugbu a.

Meri mepere otu ite alabasta ma ọ bụ karama nta nke ihe na-adị n’ime ya na-abụ ihe dị ka otu pound nke mmanụ na-esi ísì ụtọ, bụ́ “ezi nard.” Nke a bụ ihe dị oké ọnụ ahịa. N’ezie, ọnụ ahịa ya bụ ihe dị ka ụgwọ ọrụ otu afọ! Mgbe Meri wụkwasịrị mmanụ ahụ n’isi Jisọs na n’ụkwụ ya ma jiri agịrị isi ya hichaa ụkwụ ya, ísìsì ọma ya jupụtara ụlọ ahụ.

Ndị na-eso ụzọ ahụ were iwe wee jụọ, sị: “E ji ịla n’iyi nke a mee gịnị?” Mgbe ahụ, Judas Iskarịọt sịrị: “N’ihi gịnị ka a na-ereghị mmanụ otite ahụ [narị shilling atọ], were ya nye ndị ogbenye?” Ma ihe bụ mkpa Judas n’ezie abụghị ndị ogbenye, n’ihi na ọ nọworị na-ezuru ego site n’igbe ego ndị na-eso ụzọ ahụ na-edebe.

Jisọs malitere ịgbachitere Meri. O nyere iwu sị, “Hapụnụ ya; gịnị mere unu na-esogbu ya? Ọ rụrụ ọrụ ọma n’ahụ m. N’ihi na unu nwere ndị ogbenye n’etiti unu mgbe nile, mgbe ọ bụla unu chọrọ unu pụrụ imekwa ha ihe ọma: ma unu enweghị mụ onwe m mgbe nile. O mere ihe o nwere ike ime: o buru ụzọ tee ahụ m mmanụ otite ka e wee dozie m n’olili. Ma n’ezie asị m unu, Ebe ọ bụla a ga-ekwusa ozi ọma nke a n’ụwa dum, a ga-ekwutekwa ihe nke nwanyị a mere, ka ọ bụrụ ihe ncheta ya.”

Ugbu a, Jisọs anọwo na Betani ihe karịrị 24 hour, a gbasawokwa okwu banyere ọnụnọ ya. N’ihi ya, ọtụtụ ndị bịara n’ụlọ Saịmọn ịhụ Jisọs, ha bịakwara ịhụ Lazarọs, onye nọkwa n’ebe ahụ. Ya mere ndị isi nchụàjà wee gbaa izu igbu, ọ bụghị nanị Jisọs, kamakwa Lazarọs. Nke a bụ n’ihi na ọtụtụ ndị na-etinye okwukwe n’ebe Jisọs nọ n’ihi ịhụ na onye ahụ o si ná ndị nwụrụ anwụ kpọlite ka dị ndụ! N’eziokwu, lee nnọọ ka ndị ndú okpukpe ndị a si bụrụ ndị ajọ mmadụ! Jọn 11:​55–12:11; Matiu 26:​6-13; Mak 14:⁠3-⁠9; Ọrụ 1:⁠12.

▪ Mkparịta ụka dị aṅaa na-aga n’ihu n’ụlọ nsọ dị na Jerusalem, ọ bụkwa n’ihi gịnị?

▪ N’ihi gịnị ka ọ na-aghaghị ijiworị bụrụ na Jisọs rutere Betani na Friday kama ịbụ na Saturday?

▪ Mgbe Jisọs rutere Betani, olee ebe o yikarịrị ka ọ nọrọ Ụbọchị Izu Ike?

▪ Omume dị aṅaa nke Meri kpaliri esemokwu, oleekwa otú Jisọs si gbachitere ya?

▪ Gịnị na-egosi oké obi ọjọọ nke ndị isi nchụàjà ahụ nwere?

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya