Isi 105
Mmalite nke Ụbọchị Dị Oké Mkpa
MGBE Jisọs hapụrụ Jerusalem n’uhuruchi Monday, ọ laghachiri Betani n’ebe ndịda ọwụwa anyanwụ nke Ugwu Olive. Ụbọchị abụọ nke ozi ikpeazụ ya na Jerusalem agwụsịwo. Ihe ịrụ ụka adịghị ya na Jisọs nọkwara ọnọdụ abalị n’ụlọ enyi ya bụ Lazarọs. Kemgbe o si Jeriko bịarute na Friday, nke a bụ abalị nke anọ ya na Betani.
Ugbu a, n’isi ụtụtụ Tuesday, Nisan 11, ya na ndị na-eso ụzọ ya nọ n’ụzọ ọzọ. Nke a ghọrọ ụbọchị dị oké mkpa n’ije ozi Jisọs, bụ́ nke ọ rụrụ ọrụ na ya karịa ka ọ rụrụ n’ụbọchị ndị ọzọ ruo ugbu a. Ọ bụ ụbọchi ikpeazụ nke ọ gara n’ụlọ ukwu ahụ. Ọ bụkwa ụbọchị ikpeazụ nke ozi ihu ọha ya tupu e kpee ya ikpe ma gbuo ya.
Jisọs na ndị na-eso ụzọ ya sooro otu ụzọ ahụ gabigara Ugwu Olive ịga Jerusalem. N’ụzọ ahụ site na Betani, Pita hụrụ osisi ahụ Jisọs bụrụ ọnụ n’ụtụtụ ụnyaahụ. O tiri mkpu sị, “Rabaị, lee, osisi fig nke ị bụrụ ọnụ akpọnwụwo.”
Ma n’ihi gịnị ka Jisọs ji gbuo osisi ahụ? O gosiri ihe kpatara ya mgbe ọ gara n’ihu ikwu, sị: “N’ezie asị m unu, Ọ bụrụ na unu nwere okwukwe, ghara inwe obi abụọ, ọ bụghị nanị ihe e mere osisi fig nke a ka unu ga-eme, ma ọ bụrụ na unu ga-asị ọbụna ugwu a [bụ́ Ugwu Olive nke ha na-eguzo n’elu ya], Ka e welie gị, tụba gị n’ime oké osimiri, a ga-eme ihe ahụ. Ihe nile, ka ha hà, bụ́ nke unu ga-arịọ n’ekpere, ma a sị na unu kwere, unu ga-anatakwa ha.”
Ya mere site n’ime ka osisi ahụ kpọnwụọ, Jisọs na-enye ndị na-eso ụzọ ya ihe mmụta a na-ahụ anya banyere mkpa ọ dị ha inwe okwukwe na Chineke. Dị ka o kwuru: “Ihe nile, ka ha hà, bụ́ nke unu na-ekpe n’ekpere rịọkwa, kweenụ na unu anatawo ha, ha ga-adịrị unu.” Lee ihe mmụta dị oké mkpa ọ bụụrụ ha inweta, karịsịa n’ihi oké ule ha gaje izute mgbe na-adịghị anya! Ma e nwere njikọ ọzọ n’etiti mkpọnwụ nke osisi fig ahụ na ụdịdị nke okwukwe.
Mba Israel, dị ka osisi fig nke a, nwere ụdịdị nke na-eduhie eduhie. Ọ bụ ezie na mba ahụ nọ ná mmekọrịta ọgbụgba ndụ nke ya na Chineke, ọ pụkwara ịdị ka ọ na-edebe iwu nduzi ya nile, e gosiwo na o nweghị okwukwe, ọ dịghị ezi mkpụrụ ọ bụla o nwere. N’ihi enweghị okwukwe, ọ nọ ọbụna n’ụzọ nke ịjụ Ọkpara Chineke n’onwe ya! Ya mere, site n’ime ka osisi fig ahụ na-adịghị amị mkpụrụ kpọnwụọ, Jisọs ji ihe atụ na-egosi ihe ga-adapụtara mba nke a na-adịghị amị mkpụrụ, nke na-enweghị okwukwe.
Ngwa ngwa mgbe nke a gasịrị, Jisọs na ndị na-eso ụzọ ya banyere Jerusalem, dịkwa ka ha na-emekarị, ha gara n’ụlọ ukwu ahụ, ebe Jisọs malitere izi ihe. Ndị isi nchụàjà na ndị okenye nke ndị ahụ, ndị ọ na-aghaghị ịbụ na ha bu n’uche ihe Jisọs mere n’ụbọchị gara aga megide ndị na-agbanwe ego, mara ya aka, sị: “Ọ̀ bụ n’aha ike gịnị ka ị na-eme ihe ndị a? Ònye nyekwara gị ike a?”
Ná nzaghachi, Jisọs sịrị: “Mụ onwe m ga-ajụkwa unu otu okwu, ọ bụrụ na unu agwa m ya, mụ onwe m ga-agwakwa unu aha ike m ji eme ihe ndị a. Baptism nke Jọn, olee ebe o si pụta? Ò sitere n’eluigwe, ma ọ bụ na ò sitere n’aka mmadụ?”
Ndị nchụàjà na ndị okenye ahụ malitere ịgbarịta izu n’etiti onwe ha otú ha ga-esi zaa ya. “Ọ bụrụ na anyị asị, O sitere n’eluigwe; ọ ga-asị anyị, N’ihi gịnịkwa ka unu na-ejighị kwere ya? Ma ọ bụrụ na anyị asị, O sitere n’aka mmadụ, anyị na-atụ egwu ìgwè mmadụ; n’ihi na mmadụ nile na-agụ Jọn dị ka onye amụma.”
Ndị ndú ahụ amaghị ihe ha ga-aza. Ya mere ha zara Jisọs, sị: “Anyị amataghị.”
Jisọs, n’akụkụ nke ya kwuru, sị: “Mụ onwe m agaghị agwakwa unu aha ike m ji eme ihe ndị a.” Matiu 21:19-27; Mak 11:19-33; Luk 20:1-8.
▪ Gịnị kwesịrị ịrịba ama banyere Tuesday, Nisan 11?
▪ Ihe mmụta ndị dị aṅaa ka Jisọs nyere mgbe o mere ka osisi fig ahụ kpọnwụọ?
▪ Olee otú Jisọs si zaghachi ndị jụrụ banyere ebe o si nweta ikike ime ihe ndị ọ na-eme?