Isi 118
Nrara Nye na Njide
Ọ GAFEWO nnọọ etiti abalị mgbe Judas duuru nnukwute ìgwè ndị agha, ndị isi nchụàjà, ndị Farisii, na ndị ọzọ wee bata n’ogige Getsemane ahụ. Ndị nchụàjà ahụ ekwerewo ịkwụ Judas 30 mkpụrụ ego ọlaọcha iji wee rara Jisọs nye n’aka ha.
Tupu mgbe ahụ, mgbe a chụpụrụ Judas n’oriri Ememe Ngabiga ahụ, ihe àmà gosiri na o jewo kpọmkwem na nke ndị isi nchụàjà. Ozugbo ahụ, ndị a chịkọtara ndị na-ejere ha ozi, tinyekwara otu ìgwè ndị agha. Ma eleghị anya Judas bu ụzọ duru ha jee n’ebe Jisọs na ndị ozi ya nọrọ mee Ememe Ngabiga ahụ. Mgbe ha chọpụtara na ha ahapụwo ebe ahụ, nnukwute ìgwè mmadụ ahụ ndị jicha ihe agha, chịrịkwa oriọna na ọwa sooro Judas hapụ Jerusalem wee gabiga Ndagwurugwu Kedrọn.
Mgbe Judas duuru ìgwè mmadụ ahụ na-agbago Ugwu Olive, o ji n’aka na ya maara ebe ya ga-achọta Jisọs. N’ime otu izu gara aga, ka Jisọs na ndị ozi ya na-esite Betani na-aga Jerusalem, na-alaghachikwa, ha na-akwụsịkarị n’ogige Getsemane izuru ike na ịkparịta ụka. Ma ugbu a, ebe ọ pụrụ ịbụ na ọchịchịrị nke gbachiri n’okpuru osisi olive ndị ahụ ga-ekpuchi Jisọs, olee otú ndị agha ahụ ga-esi mata onye nke ọ bụ? Ọ pụrụ ịbụ na ha ahụtụbeghị ya mbụ. Judas nyere ha ihe àmà, na-asị: “Onye ọ bụla m ga-esutụ ọnụ, onye ahụ bụ ya; jidenụ ya, lezienụ anya duru ya jee.”
Judas duuru ìgwè mmadụ ahụ banye n’ogige ahụ, hụ Jisọs ka ya na ndị ozi ya nọ, wee jekwuru ya kpọmkwem. O wee sị, “Ekele, Rabaị,” wee sutụ ya ọnụ nke ukwuu.
Jisọs zaghachiri sị, “Enyi, ọ̀ bụ nzube dị aṅaa ka i ji bịa ebe a?” (NW) Mgbe ahụ, n’ịza ajụjụ ahụ ya onwe ya jụrụ, ọ sịrị: “Judas, ì ji isutụ ọnụ na-arara Nwa nke mmadụ nye?” Ma, nke ahụ ezuworo onye ahụ na-arara ya nye! Jisọs pụtara n’ìhè nke ọwa na oriọna ndị ahụ na-enwu enwu, wee jụọ, sị: “Ònye ka unu na-achọ?”
Ha zaghachiri ya, sị, “Jisọs onye Nazaret.”
Jisọs zaghachiri sị, “Mụ onwe m bụ ya,” ka o ji obi ike guzoro n’ihu ha nile. N’ịbụ ndị anya ike ya juru anya, ha amaghịkwa ihe ha ga-atụ anya ya, ndị ikom ahụ lara azụ wee daa n’ala.
Jisọs jiri nwayọọ gaa n’ihu ikwu, sị, “Agwara m unu na mụ onwe m bụ ya: ya mere, ọ bụrụ na unu na-achọ m, ka ndị a laa.” N’oge na-adịghị anya tupu mgbe ahụ, mgbe ha nọ n’ime ọnụ ụlọ ahụ dị n’elu, Jisọs agwawo Nna ya n’ekpere na ya edebewo ndị ozi nile kwesịrị ntụkwasị obi, ọ dịghịkwa otu nke ọ bụla n’ime ha fuworonụ “ma ọ bụghị nwa nke ịla n’iyi ahụ.” Ya mere, ka e wee mezuo okwu ya, ọ rịọrọ ka a hapụ ndị na-eso ụzọ ya ka ha laa.
Ka ndị agha ahụ nwetaghachiri onwe ha, bilite, wee malite ike Jisọs agbụ, ndị ozi ahụ matara ihe na-achọ ime. Ha jụrụ, sị, “Onyenwe anyị, ànyị ga-ewere mma agha gbuo?” Tupu Jisọs na-azaghachi, Pita mịpụtara otu n’ime mma agha abụọ ndị ahụ ndị ozi ahụ wetara, wee wakwasị Malkọs, bụ́ ohu nke onye isi nchụàjà. Ogbugbu mma nke Pita egbuteghị isi ohu ahụ, kama o bepụrụ ntị aka nri ya.
Jisọs gbochiri ya, wee sị, “Kweenụ ya ruo nke a.” N’imetụ ntị Malkọs aka, o mere ka ọnyá ahụ lachie. Mgbe ahụ, o nyere otu ihe mmụta dị mkpa, na-enye Pita iwu, sị: “Mịghachi mma agha gị n’ọnọdụ ya: n’ihi na mmadụ nile ndị weere mma agha ga-ala n’iyi site ná mma agha. Ma ọ̀ bụ ị̀ na-eche na apụghị m ịrịọ Nna m, ọ ga-ezitekwara m ọbụna ugbu a karị legion iri na abụọ n’ime ndị mmụọ ozi?”
Jisọs dị njikere ka e jide ya, n’ihi na ọ kọwara, sị: “Ihe e deworo n’Akwụkwọ nsọ ga-esikwa aṅaa mezuo, na ọ ghaghị ime otú a?” O wee kwuokwa, sị: “Iko nke Nna m nyeworo m, ḿ gaghị aṅụ ya?” O kwenyezuru nnọọ ná nzube Chineke maka ya!
Mgbe ahụ, Jisọs gwara ìgwè mmadụ ahụ okwu. Ọ jụrụ, sị, “Ùnu pụtara chịrị mma agha na osisi ijide m, dị ka imegide onye na-apụnara mmadụ ihe? Kwa ụbọchị m nọdụrụ n’ụlọ ukwu Chineke na-ezi ihe, ma unu ejideghị m. Ma e mewo ihe a dum, ka ihe nile ndị amụma dere n’akwụkwọ wee mezuo.”
Mgbe o kwuru nke ahụ, ìgwè ndị agha ahụ na onye ọchịagha ahụ na ndị ahụ na-ejere ndị Juu ozi jidere Jisọs wee kee ya agbụ. Mgbe ha hụrụ nke a, ndị ozi ahụ hapụrụ Jisọs wee gbafusịa. Otú ọ dị, otu nwa okorobịa—ma eleghị anya ọ bụ Mak onye na-eso ụzọ—nọgidere n’etiti ìgwè mmadụ ahụ. Ọ pụrụ ịbụ na ọ nọ n’ụlọ ebe ahụ Jisọs nọ mee Ememe Ngabiga ahụ, mesịakwa soro ìgwè mmadụ ahụ site n’ebe ahụ. Otú ọ dị, ugbu a, a matara onye ọ bụ, e wee nwaa ijide ya. Ma ọ gbahapụrụ uwe elu ya wee gbapụ n’eyighị uwe zuru ezu. Matiu 26:47-56; Mak 14:43-52; Luk 22:47-53; Jọn 17:12; 18:3-12.
▪ N’ihi gịnị ka Judas ji jide n’aka na ya ga-ahụ Jisọs n’ogige Getsemane?
▪ Olee ụzọ Jisọs si gosipụta nchegbu ya banyere ndị ozi ya?
▪ Gịnị ka Pita mere iji chebe Jisọs, ma gịnị ka Jisọs gwara Pita banyere ya?
▪ Olee ụzọ Jisọs si gosipụta na ya kwenyezuru ná nzube Chineke maka ya?
▪ Mgbe ndị ozi ahụ gbahapụrụ Jisọs, olee onye nọgiderenụ, gịnịkwa mere ya?