Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • dg akụkụ 5 p. 10-12
  • Onyinye Dị Ebube nke Inwe Onwe Ime Mkpebi

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Onyinye Dị Ebube nke Inwe Onwe Ime Mkpebi
  • Chineke Ọ̀ Na-eche Banyere Anyị n’Ezie?
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Otú E Si Mee Anyị
  • Mmalite Kasị Mma
  • Nnwere Onwe nke A Kpaara Ókè
  • Iwu Ònye?
  • Jiri Ikike Chineke Nyere Gị Ịna-ekpebi Ihe Ị Ga-eme Kpọrọ Ihe
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2017
  • Nnwere Onwe nke Ndị Na-efe Jehova Ofufe Nwere
    Fee Onye Nanị Ya Bụ Ezi Chineke ahụ Ofufe
  • Otú Anyị Ga-esi Enweta Ezigbo Nnwere Onwe
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2018
  • Ekwela Ka Nzube nke Nnwere Onwe nke Chineke Nyere Funarị Gị
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1992
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Chineke Ọ̀ Na-eche Banyere Anyị n’Ezie?
dg akụkụ 5 p. 10-12

Akụkụ nke 5

Onyinye Dị Ebube nke Inwe Onwe Ime Mkpebi

1, 2. Onyinye dị aṅaa magburu onwe ya bụ akụkụ nke ihe mejupụtara anyị?

IJI ghọta ihe mere Chineke ji kwere ka ahụhụ dịrị na ihe ọ ga-eme banyere ya, ọ dị anyị mkpa ịghọta otú o si mee anyị. O mere ihe karịrị nanị iji anụ ahụ na ụbụrụ kee anyị. O jikwa àgwà uche na nke mmetụta ndị pụrụ iche kee anyị.

2 Akụkụ bụ isi nke ihe mejupụtara uche na mmetụta anyị bụ inwe onwe ime mkpebi. Ee, Chineke kụnyere n’ime anyị, ikike nke inwe onwe ime nhọrọ. N’ezie, ọ bụ onyinye magburu onwe ya nke sitere n’aka ya.

Otú E Si Mee Anyị

3-5. N’ihi gịnị ka anyị ji enwe mmasị n’inwe onwe ime mkpebi?

3 Ka anyị tụlee otú inwe onwe ime mkpebi si metụta nkwere Chineke kwere ka ahụhụ dịrị. Iji malite, chee echiche banyere nke a: Ọ na-amasị gị inwere onwe gị ịhọrọ ihe ị ga-eme na ihe ị ga-ekwu, ihe ị ga-eri na ihe ị ga-eyi n’ahụ, ụdị ọrụ ị ga-arụ, na ebe ị ga-ebi na otú ị ga-esi bie? Ka ị̀ ga-achọ ka onye ọzọ gwa gị ihe ị na-aghaghị ikwu na ihe ị na-aghaghị ime n’oge nile nke ndụ gị?

4 Ọ dịghị onye ọ bụla isi zuru okè nke chọrọ ka a na-apụ ya nchịkwa nke ndụ ya kpam kpam. N’ihi gịnị? N’ihi otú Chineke si mee anyị. Bible na-agwa anyị na Chineke ‘kpụrụ mmadụ n’onyinyo ya, dị ka oyiyi ya si dị,’ otu n’ime ikike ndị Chineke n’onwe ya nwere bụkwa inwere onwe ya ime nhọrọ. (Jenesis 1:26; Deuterọnọmi 7:⁠6) Mgbe o kere ụmụ mmadụ, o nyere ha otu ikike ahụ magburu onwe ya​—⁠onyinye nke inwe onwe ime mkpebi. Ọ bụ ya bụ otu ihe mere o ji agbakasị anyị ahụ ịbụ ndị e mere ka ha bụrụ ohu n’okpuru ndị ọchịchị aka ike.

5 Ya mere ọchịchọ nke nnwere onwe abụghị ihe bịara n’ọghọm, n’ihi na Chineke bụ Chineke nke nnwere onwe. Bible na-asị: “Ebe mmụọ nke Onyenwe anyị [“Jehova,” NW] nọ, n’ebe ahụ ka mmadụ nweere onwe ha.” (2 Ndị Kọrint 3:17) N’ihi nke a, Chineke nyere anyị inwe onwe ime mkpebi dị ka akụkụ nke otú e si mee anyị. Ebe ọ maara otú uche na mmetụta anyị ga-esi rụọ ọrụ, ọ maara na anyị ga-enwe obi ụtọ karịsịa ma anyị nwere onwe anyị ime mkpebi.

6. Olee otú Chineke si kee ụbụrụ anyị ịrụ ọrụ n’ụzọ kwekọrọ n’inwe onwe ime mkpebi?

6 Tụkwasị n’onyinye nke inwe onwe ime mkpebi, Chineke nyekwara anyị ike iche echiche, ịtụle ihe, ime mkpebi, na ịma ezi ihe na ihe ọjọọ. (Ndị Hibru 5:14) Otú a, e zubere ka inwere onwe ime mkpebi dabere ná nhọrọ e ji ọgụgụ isi mee. E meghị anyị dị ka ígwè ọrụ robot na-enweghị uche, bụ́ ndị na-enweghị ọchịchọ nke onwe ha. E keghịkwa anyị ime ihe site ná mkpali dị ka ụmụ anụmanụ. Kama nke ahụ, e mere ụbụrụ anyị dị ịtụnanya ịrụ ọrụ n’ụzọ kwekọrọ n’nnwere onwe anyị ime nhọrọ.

Mmalite Kasị Mma

7, 8. Mmalite dị mma dị aṅaa ka Chineke nyere nne na nna mbụ anyị?

7 Iji gosi otu Chineke si bụrụ onye na-eche banyere anyị, tụkwasị n’onyinye nke inwe onwe ime mkpebi, e nyere nne na nna mbụ anyị, bụ́ Adam na Iv, ihe nile kwesịrị ekwesị onye ọ bụla pụrụ ịchọ. E tinyere ha ná nnukwu paradaịs yiri ubi. Ha nwezuru ihe ndị e ji ebi ndụ n’ụba. Ha nwere uche na ahụ zuru okè, ya mere ha agaghị aka nká, rịa ọrịa ma ọ bụ nwụọ​—⁠ha gaara adịrụ ebighị ebi. Ha gaara enwe ụmụ zuru okè bụ́ ndị gaara enwewokwarị ọdịnihu ebighị ebi nke obi ụtọ. Ọnụ ọgụgụ mmadụ nke na-abawanye ụba gaara enwekwa ọrụ na-enye afọ ojuju nke imesị mee ka elu ala nile ghọọ paradaịs.​—⁠Jenesis 1:26-⁠30; 2:⁠15.

8 Banyere ihe e nyere, Bible na-akọ, sị: “Chineke wee hụ ihe nile ọ bụla o mere, ma, lee, ọ dị mma nke ukwuu.” (Jenesis 1:31) Bible na-ekwukwa banyere Chineke, sị: “Ihe zuru okè ka ọrụ ya bụ.” (Deuterọnọmi 32:⁠4) Ee, Onye Okike ahụ nyere ezinụlọ mmadụ mmalite zuru okè. Ọ dịghị otú a gaara esi mee ya ọ kara mma. Lee Chineke na-eche banyere mmadụ nke o gosiri onwe ya ịbụ!

Nnwere Onwe nke A Kpaara Ókè

9, 10. N’ihi gịnị ka a na-aghaghị iji chịkwaa inwe onwe ime mkpebi nke ọma?

9 Otú ọ dị, Chineke ò zubere ka inwe onwe ime mkpebi bụru nke a na-akparaghị ókè? Chee echiche banyere obodo ukwu ọtụtụ ụgbọ ala na-agba na ya nke na-enweghị iwu ọ bụla nke okporo ụzọ, ebe onye ọ bụla pụrụ ịkwọ ụgbọ ala gaa n’akụkụ ọ bụla n’ọ̀tụ̀tụ̀ ịgba ọsọ ọ bụla. Ị̀ ga-achọ ịkwọ ụgbọ ala n’ọnọdụ ndị dị otú ahụ? Ee e, nke ahụ ga-abụ ọnọdụ nke enweghị iwu okporo ụzọ, ọ ghaghịkwa ịkpata ọtụtụ ihe ọghọm.

10 Otú a ka ọ dịkwa n’onyinye Chineke nke inwe onwe ime mkpebi. Inwe onwe a na-akparaghị ókè ga-apụta enweghị ụkpụrụ ọchịchị n’ọha mmadụ anyị. A ghaghị inwe iwu iji duzie ihe omume mmadụ. Okwu Chineke na-asị: “Meenụ dị ka ndị nweere onwe ha, unu ejikwala nnwere onwe unu mee ihe ngọpụ maka mmebi iwu.” (1 Pita 2:​16, JB) Chineke chọrọ ka inwe onwe ime mkpebi bụrụ nke a chịkwara maka ọdịmma mmadụ nile. O zubere ka anyị nwee, ọ bụghị nnwere onwe nke na-enweghị njedebe, kama, nnwere onwe a kpaara ókè, nke dabeere n’ụkpụrụ iwu.

Iwu Ònye?

11. Iwu ndị nke ònye ka e mere anyị irube isi na ha?

11 Iwu ndị nke ònye ka e mere anyị irube isi na ha? Akụkụ ọzọ nke ihe odide ahụ dị na 1 Pita 2:16 (JB) na-asị: “Unu abụghị ohu onye ọ bụla ma ọ bụghị Chineke.” Nke a apụtaghị ịgba ohu n’okpuru ọchịchị aka ike, kama nke ahụ, ọ pụtara na e mere anyị inwe obi ụtọ karịsịa mgbe anyị nọ n’okpuru iwu Chineke. (Matiu 22:​35-40) Iwu ya, karịa iwu ọ bụla ụmụ mmadụ mepụtara, na-enye nduzi kasị mma. “Mụ onwe m bụ Jehova, Chineke gị, Onye na-ezi gị ime ihe na-aba uru, Onye na-eme ka ị zọọ ije n’ụzọ ị ga-ejeso.”​—⁠Aịsaịa 48:⁠17.

12. Nnwere onwe dị aṅaa nke ime nhọrọ ka anyị nwere n’ime iwu Chineke?

12 N’otu mgbe ahụkwa, iwu Chineke na-eme ohere maka oké nnwere onwe ime nhọrọ n’agabigaghị ebe njedebe ya. Nke a na-eme ka e nwee ụdị dị iche iche ma na-eme ka ezinụlọ ihe a kpọrọ mmadụ bụrụ nke na-akpali akpali. Chee echiche banyere ụdị dị iche iche nke ihe oriri, ákwà, egwu, ọrụ nkà, na ebe obibi gburugburu ụwa. N’ezie ọ na-amasịkarị anyị ime nhọrọ n’ihe ndị dị otú ahụ kama ikwe ka onye ọzọ kpebiere anyị.

13. Iwu okike ndị dị aṅaa ka anyị na-aghaghị irube isi na ha maka ọdịmma nke anyị?

13 Otú a, e kere anyị inwetakarịsị obi ụtọ mgbe anyị nọ n’okpuru iwu dị iche iche nke Chineke maka omume. O yiri ịnọ n’okpuru iwu okike nke Chineke. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na anyị eleghara iwu nke ike ndọda anya ma si n’ebe dị elu mapụ, anyị ga-emerụ ahụ ma ọ bụ nwụọ. Ọ bụrụ na anyị eleghara iwu ndị dị n’ime ahụ anyị anya ma kwụsị iri nri, ịṅụ mmiri, ma ọ bụ iku ume, anyị ga-anwụ.

14. Olee otú anyị si mara na e keghị mmadụ ịnọrọ onwe ya pụọ n’okpuru Chineke?

14 Otú ahụ ịrụ ụka na-adịghị ya na anyị bụ ndị e kenyere n’ime ha, mkpa nke irube isi n’iwu okike nke Chineke, e kenyekwara mkpa nke irube isi n’iwu Chineke nke omume, na nke mmekọrịta mmadụ na ibe ya. (Matiu 4:⁠4) E keghị ụmụ mmadụ ịnọrọ onwe ha pụọ n’okpuru Onye Mere ha ma nwee ihe ịga nke ọma. Onye amụma ahụ bụ́ Jeremaịa sịrị: “Ọ bụghị onye ọ bụla na-eje ije nwe ime ka nzọụkwụ ya guzosie ike. Dọọ m aka ná ntị, Jehova.” (Jeremaịa 10:​23, 24) Ya mere n’ụzọ nile, e kere ụmụ mmadụ ịdị ndụ n’okpụrụ ịchịisi Chineke, ọ bụghị nke onwe ha.

15. Iwu Chineke nile hà gaara abụ ibu arọ nye Adam na Iv?

15 Irube isi n’iwu Chineke agaraghị abụ ihe dị arọ nye nne na nna mbụ anyị. Kama nke ahụ, ọ gaara akwalite ọdịmma ha na nke ezinụlọ nile nke mmadụ. A sị na mmadụ abụọ mbụ ahụ agafeghị ebe njede nke iwu Chineke, ihe nile gaara adị mma. N’ezie, anyị gaara ebi n’ime paradaịs obi ụtọ dị ebube dị ka otu ezinụlọ mmadụ nke na-ahụ n’anya, dịkwa n’otu! Agaraghị enwe ajọ omume, ahụhụ na ọnwụ.

[Foto dị na peeji nke 11]

Onye Okike ahụ nyere ụmụ mmadụ mmalite zuru okè

[Foto dị na peeji nke 12]

Ị̀ ga-achọ ịkwọ ụgbọ ala n’ebe e nwere ọtụtụ ụgbọ ala ma ọ bụrụ na e nweghị iwu okporo ụzọ?

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya