Akụkụ nke 9
Otú Anyị Si Mara na Anyị Nọ na “Mgbe Ikpeazụ”
1, 2. Olee otú anyị pụrụ isi mara ma ànyị na-ebi na mgbe ikpeazụ?
OLEE otú anyị pụrụ isi jiri n’aka na anyị na-ebi n’oge mgbe Alaeze Chineke ga-eme ihe megide usoro ọchịchị mmadụ nke dị ugbu a? Olee otú anyị si mara na anyị nọ nso n’oge mgbe Chineke ga-eweta mmebi iwu na ahụhụ ná njedebe?
2 Ndị na-eso ụzọ Jisọs chọrọ ịmata ihe ndị ahụ. Ha jụrụ ya ihe ga-abụ “ihe ịrịba ama” nke ọnụnọ ya n’ike Alaeze na “nke ọgwụgwụ usoro ihe nke a.” (Matiu 24:3) Jisọs zaghachiri site n’inye nkọwa zuru ezu nke ihe omume ndị ga-eme ka ụwa mee mkpọtụ na ọnọdụ ndị ga-ejikọ aka ọnụ iji gosi na ihe a kpọrọ mmadụ abanyewo na “mgbe nke ọgwụgwụ,” “mgbe ikpeazụ” nke usoro ihe ndị a. (Daniel 11:40; 2 Timoti 3:1) Ànyị ahụwo ihe ịrịba ama ndị ahụ na-abịakọ ọnụ na narị afọ nke a? Ee, anyị ahụwo ya n’ọ̀tụ̀tụ̀ dị ukwuu!
Agha Ụwa
3, 4. Olee otú agha dị iche iche nke narị afọ nke a si kwekọọ n’amụma Jisọs?
3 Jisọs buru amụma na “mba ga-ebili imegide mba ọzọ, alaeze ga-ebilikwa imegide alaeze ọzọ.” (Matiu 24:7) Na 1914 ụwa banyere n’agha nke hụrụ iji mba na alaeze dị iche iche eme ihe n’ụzọ dị iche n’agha ọ bụla bu ya ụzọ. N’ịmata eziokwu nke a, ndị ọkọ akụkọ ihe mere eme n’oge ahụ kpọrọ ya Agha Ukwu ahụ. Ọ bụ agha nke mbụ dị otú ahụ n’akụkọ ihe mere eme, agha ụwa nke mbụ. Ihe dị ka 20,000,000 ndị agha na ndị nkịtị tụfuru ndụ ha, bụ́ nke karịrị otú e nwere n’agha ọ bụla ọzọ.
4 Agha Ụwa nke Mbụ kara akara mmalite nke mgbe ikpeazụ. Jisọs sịrị na nke a na ihe omume ndị ọzọ ga-abụ “mmalite ihe mgbu.” (Matiu 24:8) Nke ahụ mesịrị bụrụ eziokwu, ka Agha Ụwa nke Abụọ gburu ọbụna karị, ihe dị ka 50,000,000 ndị agha na ndị nkịtị tụfuru ndụ ha. N’ime narị afọ nke 20 nke a, e gbuwo ihe karịrị nnọọ 100,000,000 ndị mmadụ n’agha dị iche iche, nke karịrị okpukpu anọ nke ihe nile e gburu n’ime 400 afọ ndị bu ya ụzọ! Lee oké ihe amamikpe ọ bụ nye ọchịchị mmadụ!
Ihe Àmà Ndị Ọzọ
5-7. Olee ihe àmà ndị ọzọ e nwere na anyị na-ebi na mgbe ikpeazụ?
5 Jisọs tinyere akụkụ ndị ọzọ ndị ga-eso mgbe ikpeazụ: “Oké ala ọma jijiji ga-adịkwa, oké ụnwụ na ajọ ọrịa na-efe efe [ntiwapụ nke ọrịa dị iche iche] ga-adịkwa n’ebe dị iche iche.” (Luk 21:11) Nke ahụ kwekọrọ nnọọ n’ihe ndị na-eme kemgbe 1914, n’ihi na e nwewo oké ịrị elu nke nhụju anya sitere n’ọdachi ndị dị otú ahụ.
6 Ala ọma jijiji ndị buru ibu bụ ihe a na-ahụ mgbe nile, na-ewere ndụ ọtụtụ ndị. Nanị oké ahụ ọkụ si Spain gburu ihe dị ka 20,000,000 ndị mmadụ ozugbo Agha Ụwa nke Mbụ gasịrị—ngụkọ ụfọdụ ndị e mere na-asịkwa na ọ dị 30,000,000 ma ọ bụ karịa. Ọrịa AIDS ewerewo ọtụtụ narị puku ndụ ma ka pụọkwa iwerekwu ọtụtụ nde ndị ọzọ n’ọdịnihu dị nso. Kwa afọ ọtụtụ nde ndị mmadụ na-anwụ n’ihi ọrịa obi, ọrịa cancer, na ọrịa ndị ọzọ. Ọtụtụ nde ndị ọzọ na-anwụ nwayọọ nwayọọ n’ihi agụụ. Ihe ịrụ ụka adịghị ya na ‘ndị na-anọkwasị n’ịnyịnya nke Apọkalips,’ ha na agha ha, ụkọ nri, na ntiwapụ nke ọrịa, anọwo na-egbu ọnụ ọgụgụ dị ukwuu nke ndị ezinụlọ mmadụ kemgbe 1914.—Mkpughe 6:3-8.
7 Jisọs bukwara amụma banyere ịrị elu n’imempụ nke a na-ahụ n’ala nile. Ọ sịrị: “N’ihi na ihe na-emebi iwu ga-aba ụba, ịhụnanya nke ndị ka n’etiti mmadụ ga-ajụkwa oyi.”—Matiu 24:12.
8. Olee otú amụma ahụ dị na 2 Timoti isi nke 3 si kwekọọ n’oge anyị?
8 Gaakwa n’ihu, amụma Bible kwuru banyere ndakpọ nke ọnọdụ omume nke a na-ahụ n’ụwa nile taa, sị: “Oge dị oké egwu ga-abịa na mgbe ikpeazụ. N’ihi na mmadụ ga-abụ ndị na-ahụ nanị onwe ha n’anya, ndị na-ahụ ego n’anya, ndị na-anya isi, ndị mpako, ndị nkwulu, ndị na-ekwenyeghị ndị mụrụ ha, ndị na-enweghị ekele, ndị na-adịghị ọcha n’obi, ndị ihe mmadụ ibe ha na-adịghị atọ ụtọ, ndị na-adịghị agba ndụ, ndị na-ebo ebubo ụgha, ndị na-adịghị ejide onwe ha, ndị dị ka anụ ọhịa, ndị na-adịghị ahụ ezi ihe n’anya, ndị na-arara mmadụ nye n’aka ndị iro ha, ndị isi ike, ndị a fuliworo elu, ndị na-ahụ ihe ụtọ n’anya kama ịhụ Chineke n’anya; ndị na-enwe ụdị nke nsọpụrụ Chineke, ma ha agọwo ike ya . . . Ma ajọ mmadụ nile na ndị aghụghọ ga na-aga n’ihu n’ịjọkarị njọ.” (2 Timoti 3:1-13) Ihe ndị ahụ nile emezuwo n’ihu anyị.
Ihe Ọzọ Kpatara Ya
9. Olee ihe mere n’eluigwe nke dabakọrọ ná mmalite nke mgbe ikpeazụ n’ụwa?
9 E nwere ihe ọzọ kpatara ịrị elu ahụ dị ukwuu n’ịta ahụhụ na narị afọ nke a. N’ịdabakọ n’otu oge ahụ nke mmalite mgbe ikpeazụ na 1914, ọ dị ihe mere iji tinye ihe a kpọrọ mmadụ n’ihe ize ndụ dị njọ ọbụna karị. N’oge ahụ, dị ka otu amụma dị n’akwụkwọ ikpeazụ nke Bible si na-akọ: “Agha wee pụta n’eluigwe: Maịkael [Kraịst n’ike nke eluigwe] na ndị mmụọ ozi ya buru agha megide dragọn ahụ [Setan]; dragọn ahụ na ndị mmọọ ozi ya [ndị mmụọ ọjọọ] wee buo agha; ha enweghịkwa ike, ahụghịkwa ọnọdụ ha ọzọ n’eluigwe. E wee chụda dragọn ukwu ahụ, bụ́ agwọ ochie ahụ, onye a na-akpọ Ekwensu na Setan, onye na-eduhie ụwa nile mmadụ bi; a chụdara ya n’ụwa, chụdakwa ndị mmụọ ozi ya, ha na ya.”—Mkpughe 12:7-9.
10, 11. Olee otú o si metụta ihe a kpọrọ mmadụ mgbe a chụturu Setan na ndị mmụọ ọjọọ ya n’ụwa?
10 Olee ihe ndị si na nke ahụ pụta nye ezinụlọ nke mmadụ? Amụma ahụ gara n’ihu, na-asị: “Ahụhụ ga-adịrị ụwa na oké osimiri: n’ihi na Ekwensu arịdakwuruwo unu, na-enwe oké ọnụma, ebe ọ matara na o nwere nanị nwa oge.” Ee, Setan maara na usoro ihe ya na-abịaru nso ọgwụgwụ ya, ya mere ọ na-eme ihe nile ọ pụrụ iji chigharịa ụmụ mmadụ megide Chineke tupu e wezụga ya na ụwa ya. (Mkpughe 12:12; 20:1-3) Lee ka mmụọ ndị ahụ e kere eke si bụrụ ndị e wedara ala n’ihi iji inwe onwe ime mkpebi ha mee ihe n’ụzọ na-ezighị ezi! Lee ka ọnọdụ dị n’ụwa si bụrụ ihe na-atụ oké egwu n’okpuru mmetụta ha, karịsịa kemgbe 1914!
11 Ka a sịkwa ihe mere Jisọs ji buo amụma banyere oge anyị, sị: “N’elu ụwa ka mkpagbu nke mba dị iche iche ga-adịkwa . . . Mmadụ na-atụbọ site n’egwu, sitekwa n’ile anya ihe na-abịakwasị n’elu ụwa dum mmadụ bi.”—Luk 21:25, 26.
Ọgwụgwụ nke Ọchịchị Mmadụ na nke Ndị Mmụọ Ọjọọ Dị Nso
12. Olee otu n’ime amụma ikpeazụ ndị ga-emezu tupu usoro ihe nke a abịa n’ọgwụgwụ ya?
12 Amụma Bible òle ka fọdụrụ imezu tupu Chineke ebibie usoro ihe dị ugbu a? Ọ bụ ole na ole! Otu n’ime nke ikpeazụ dị ná 1 Ndị Tesalọnaịka 5:3, nke na-asị: “Ka ha na-ekwu okwu banyere udo na ntụkwasị obi, na mberede ọdachi ga-adakwasị ha.” (The New English Bible) Nke a na-egosi na ọgwụgwụ nke usoro ihe nke a ga-amalite “ka ha na-ekwu okwu.” N’amaghị ama nye ụwa, mbibi ga-abịa mgbe a na-atụghị anya ya, mgbe ụmụ mmadụ chere ihu n’udo na ntụkwasị obi nke ha tụrụ anya ya.
13, 14. Oge dị aṅaa nke nsogbu ka Jisọs buru n’amụma, oleekwa otú ọ ga-esi bịa ná ngwụsị?
13 Oge na-agwụnahụ ụwa nke a nọ n’okpuru mmetụta Setan. N’oge na-adịghị anya, o ga-abịaru n’ọgwụgwụ ya n’oge nsogbu nke Jisọs kwuru banyere ya, sị: “N’ihi na mgbe ahụ ka mkpagbu ukwu ga-adị, nke ihe dị ka ya a ka-adịghị site ná mmalite ụwa ruo mgbe a, ee e, ọ gaghị adịkwa ma ọlị.”—Matiu 24:21.
14 Ngwụsị nke “mkpagbu ukwu” ahụ ga-abụ agha Chineke nke Amagedọn. Nke ahụ bụ oge Daniel onye amụma kwuru banyere ya mgbe Chineke “ga-etipịa alaeze ndị a nile mee ka ha gwụsịa.” Nke a ga-apụta ọgwụgwụ nke ọchịchị mmadụ dị ugbu a nke na-adabereghị na Chineke. Ọchịchị Alaeze ya nke si n’eluigwe ga-eweghara nduzi nke ihe omume nile nke mmadụ kpam kpam. Ọ dịghị mgbe ọ bụla ọzọ, ka Daniel na-ebu n’amụma, a ga-ahapụ ike ọchịchị n’aka “ndị ọzọ.”—Daniel 2:44; Mkpughe 16:14-16.
15. Gịnị ga-eme mmetụta nke Setan na ndị mmụọ ọjọọ ya?
15 N’oge ahụ mmetụta nile nke Setan na ndị mmụọ ọjọọ ga-akwụsịkwa. A ga-ewepụ ndị mmụọ ahụ e kere eke na-enupụ isi ka ha wee ghara inwe ike “iduhie mba nile ọzọ.” (Mkpughe 12:9; 20:1-3) A mawo ha ikpe ọnwụ, ha na-echerekwa mbibi ha. Lee ihe ntụsara ahụ ọ ga-abụrụ ihe a kpọrọ mmadụ inwere onwe ha pụọ ná mmetụta ha nke na-emerụ emerụ!
Olee Ndị Ga-alanarị? Olee Ndị Na-agaghị Alanarị?
16-18. Olee ndị ga-alanarị ọgwụgwụ nke usoro ihe nke a, olee ndị na-agaghị alanarị?
16 Mgbe e mere ihe Chineke kpere n’ikpe megide ụwa nke a, olee ndị ga-alanarị? Olee ndị na-agaghị alanarị? Bible na-egosi na ndị chọrọ ọchịchị Chineke ga-abụ ndị e chebere, ha ga-alanarịkwa. A gaghị echebe ndị na-achọghị ọchịchị Chineke, kama a ga-ebibikọ ha na ụwa Setan.
17 Ilu 2:21, 22 na-asị: “Ndị ziri ezi [ndị na-edo onwe ha n’okpuru ọchịchị Chineke] ga-ebi n’ụwa, ndị zuru okè ga-afọdụkwa n’ime ya. Ma ndị na-emebi iwu [ndị na-adịghị edo onwe ha n’okpuru ọchịchị Chineke] ka a ga-ebipụ n’ụwa, ọ bụkwa ndị na-aghọ aghụghọ ka a ga-efopụ na ya.”
18 Abụ Ọma 37:10, 11 na-asịkwa: “Ma ọ fọdụrụ nwa mgbe, onye na-emebi iwu agaghị adịkwa . . . Ma ndị dị umeala n’obi ga-enweta ala; ịba ụba nke udo ga-atọkwa ha ụtọ.”Abụ Ọma 37 Amaokwu nke 29 na-asịkwa: “Ndị ezi omume ga-enweta ala, birikwa n’elu ya ruo mgbe ebighị ebi.”
19. Olee ndụmọdụ anyị kwesịrị iburu n’obi?
19 Anyị ga-eburu n’obi ndụmọdụ nke Abụ Ọma 37:34, nke na-asị: “Na-ele anya Jehova, debekwa ụzọ ya, ọ ga-ebulikwa gị inweta ala: mgbe a na-ebipụ ndị na-emebi iwu, ị ga-ahụ.”Abụ Ọma 37 Amaokwu nke 37 na 38 na-asị: “Rịba onye zuru okè ama, leekwa onye ziri ezi: n’ihi na ọdịnihu dịịrị onye udo. Ma ndị njehie, a na-ekpochapụ ha n’otu: a ga-ebipụ ọdịnihu nke ndị na-emebi iwu.”
20. N’ihi gịnị ka anyị pụrụ iji kwuo na ndị a bụ oge na-akpali akpali ibi na ha?
20 Lee ihe na-akasi obi, ee, lee ihe na-enye ume ọ bụ ịmara na Chineke na-eche banyere anyị n’ezie nakwa na ọ ga-eweta mmebi iwu na ahụhụ nile ná ngwụsị n’oge na-adịghị anya! Lee ihe na-akpali akpali ọ bụ ịmata na mmezu nke amụma ndị ahụ dị ebube dị nso!
[Foto dị na peeji nke 20]
Bible buru amụma banyere ihe omume ndị ga-emejupụta “ihe ịrịba ama” mgbe ikpeazụ
[Foto dị na peeji nke 22]
N’oge n’adịghị anya, n’Amagedọn, a ga-ebipụ ndị na-adịghị edo onwe ha n’okpuru ọchịchị Chineke. Ndị na-edo onwe ha n’okpuru ya ga-alanarị ịbanye n’ụwa ọhụrụ nke ezi omume