Nkebi nke 1
È Nwere Nzube Dị ná Ndụ?
1. Gịnị ka a na-ajụkarị banyere nzube nke ndụ, oleekwa otú otu onye si kwuo okwu banyere ya?
Ka oge na-aga, ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ mmadụ nile na-ajụ maka ihe bụ nzube nke ndụ. Ọ̀ bụ ịrụsi ọrụ ike iji meziwanye ọnọdụ ibi ndụ anyị, inye ezinụlọ anyị ihe na-akpa ha, ịnwụ ma eleghị anya mgbe 70 ma ọ bụ 80 afọ gasịrị, wee ghara ịdịzị adị ruo mgbe ebighị ebi? Otu onye na-eto eto nke chere otú a kwuru na e nweghị nzube ọzọ dị ná ndụ e wezụga “ibi ndụ, inwe ụmụ, inwe obi ụtọ wee nwụzie.” Ma nke ahụ ọ̀ bụ eziokwu? Ọnwụ ọ̀ na-ewetakwa ihe nile ná ngwụsị?
2, 3. N’ihi gịnị ka inweta ụba nke ihe onwunwe ji ghara ịbụ nzube zuru ezu ná ndụ?
2 Ọtụtụ ndị si ma n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ ma n’Ebe Ọdịda Anyanwụ Ụwa na-eche na nzube bụ isi dị n’ịdị ndụ bụ inweta ụba ihe onwunwe. Ha kwenyere na nke a pụrụ iduga ná ndụ obi ụtọ, nke nwere isi. Ma gịnị banyere ndị nweworo ụba ihe onwunwe? Onye Canada na-ede akwụkwọ bụ́ Harry Bruce kwuru, sị: “Ọnụ ọgụgụ na-eju anya nke ndị bara ọgaranya nọgidesiri ike na-ekwu na ha enweghị obi ụtọ.” O kwukwasịrị: “Ajụjụ ọnụ ndị a jụrụ na-eme ka a ghọta na ajọ enweghị olileanya emetụtawo Ebe Ugwu America . . . Ọ̀ dị onye ọ bụla nọ ebe ahụ nwere obi ụtọ? Ọ bụrụ otú ahụ, gịnị bụ isi ihe dị na ya?”
3 Jimmy Carter bụbu onye isi ala mba U.S. kwuru, sị: “Anyị achọpụtawo na inwe ihe na iripịa ihe adịghị egbo ọchịchọ anyị siri ike maka isi ihe. . . . Ịkwakọba ihe onwunwe ndị a na-ahụ anya apụghị imeju ịtọgbọ chakoo nke ndụ ndị na-enweghị nchekwube ma ọ bụ nzube ọ bụla.” Onye ndú ọzọ nke ndọrọ ndọrọ ọchịchị kwukwara, sị: “Anọwo m ruo ọtụtụ afọ ugbu a na-achọsi eziokwu nile banyere onwe m na ndụ m ike; ọtụtụ ndị ọzọ m maara na-eme otu ihe ahụ. Ọtụtụ ndị karịa mgbe ọ bụla ọzọ na-ajụ sị, ‘Olee ndị ka anyị bụ? Gịnị bụ nzube anyị?’”
Ọnọdụ Ndị Siwanyere Ike
4. N’ihi gịnị ka ụfọdụ ji arụ ụka ma ndụ ò nwere nzube ọ bụla?
4 Ọtụtụ na-arụ ụka ma ndụ ò nwere nzube mgbe ha hụrụ na ọnọdụ ibi ndụ esiwanyewo ike. N’akụkụ ụwa nile, ihe karịrị otu ijeri mmadụ nọ n’oké ọrịa ma ọ bụ ghara ịdị na-eri nri na-edozi ahụ, na-akpata ọnwụ nke ihe dị ka iri nde ụmụaka kwa afọ nanị n’Africa. Ọnụ ọgụgụ mmadụ bi n’ụwa, nke na-eru ijeri 6, anọgidewo jiri 90 nde mmadụ na-arị elu kwa afọ, nke ihe karịrị 90 pasent n’uto ahụ bụ ná mba ndị na-emepe emepe. Ụba mmadụ nke a nọgidere na-agbasawanye na-eme ka mkpa maka nri, ụlọ, na ụlọ ọrụ mmepụta ihe na-arị elu, bụ́ nke na-ewetakwuru ala, mmiri, na ikuku mbibi site n’ihe mmetọ ndị na-esite n’ụlọ ọrụ mmepụta ihe na ihe ndị ọzọ na-emetọ mbara.
5. Gịnị na-eme ahịhịa ndị dị n’ụwa?
5 Akwụkwọ ahụ bụ́ World Military and Social Expenditures 1991 na-akọ, sị: “Kwa afọ a na-ebibi ókèala ọhịa hà ka mbara ala nile nke [Great Britain]. N’ọ̀tụ̀tụ̀ dị ugbu a (nke e si egbusisị osisi), mgbe ọ na-erule afọ 2000, anyị ga-ewepụworị 65 pasent nke ọhịa ndị dị n’ebe okpomọkụ mmiri na-ezo.” N’ebe ndị ahụ, dị ka ndị ọrụ UN si kwuo, a na-egbutu osisi 10 maka 1 ọ bụla a kụrụ; n’Africa ọ̀tụ̀tụ̀ ya bụ 20 maka 1 a kụrụ. Ya mere ebe ndị bụ ọzara na-aba ụba, kwa afọ kwa ókèala hà ka Belgium na-efu maka iji ya akọ ugbo.
6, 7. Gịnị bụ nsogbu ụfọdụ nke ndị ndú bụ mmadụ na-enweghị ike ịgwọta, ya mere olee ajụjụ ndị ọ dị mkpa ka a zaa?
6 Ọzọ, narị afọ nke 20 nke a enwewo okpukpu anọ nke ọnwụ site n’agha karịa narị afọ anọ gara aga ma e jikọta ha ọnụ. N’ebe ọ bụla, e nwere ịrị elu ná mpụ, karịsịa ná mpụ ime ihe ike. Ndakpọ nke ezinụlọ, iji ọgwụ ọjọọ eme ihe, AIDS, ọrịa ndị a na-ekesa site ná mmekọahụ, na ihe ndị ọzọ na-adịghị mma na-emekwa ka ndụ siwanye ike. Ndị ndú ụwa enwebeghịkwa ike inye ihe ngwọta maka ọtụtụ nsogbu na-eti ezinụlọ ụmụ mmadụ ihe otiti. Otú a, o kwere nghọta ihe mere ndị mmadụ ji ajụ, Gịnị bụ nzube nke ndụ?
7 Olee otú ndị mmụta akwụkwọ na ndị ndú okpukpe dị iche iche siworo lebara ajụjụ ahụ anya? Ka oge ọtụtụ narị afọ ndị a gafesịworo, hà enyewo azịza na-eju afọ?
Ihe Ha Na-ekwu
8, 9. (a) Gịnị ka otu onye mmụta bụ onye China kwuru banyere nzube nke ndụ? (b) Gịnị ka onye lanarịrị ogige ọnwụ ndị Nazi kwuru?
8 Onye mmụta okpukpe Confucius bụ́ Tu Wei-Ming kwuru, sị: “A na-achọta isi ihe kasị elu nke ndụ n’ọdịdị anyị nkịtị, nke ịdị adị mmadụ.” Dị ka echiche a na-egosi, a ga-anọgide na-amụpụta ụmụ mmadụ, ha ga-adọlịsi ike ịdị adị, wee nwụọ. E nwere olileanya dị nta n’ụzọ ile ihe anya dị otú ahụ. Ọ̀ bụkwanụ eziokwu?
9 Elie Wiesel, onye lanarịrị ogige ọnwụ dị iche iche nke Nazi n’Agha Ụwa nke Abụọ, chọpụtara na: “‘N’ihi gịnị ka anyị ji nọrọ n’ebe a?’ bụ ajụjụ kasị mkpa mmadụ ga-eche ihu. . . . Ekwenyere m na ndụ nwere nzube n’agbanyeghị ọnwụ na-enweghị isi nke m hụworo.” Ma ọ pụghị ikwu ihe bụ isi nke ndụ.
10, 11. (a) Olee otú otu onye editọ si gosi na mmadụ enweghị azịza ha? (b) N’ihi gịnị ka echiche otu ọkà mmụta sayensị evolushọn na-ejighị bụrụ nke na-eju afọ?
10 Onye editọ bụ́ Vermont Royster kwuru, sị: “N’echiche nke mmadụ n’onwe ya, . . . nke ebe ọ nọ n’usoro eluigwe na ala nke a, anyị agatụwo n’ihu gabiga ebe anyị malitere. Anyị ka nwekwara ajụjụ ndị ahụ metụtara onye anyị bụ na ebe anyị nọ na ebe anyị na-aga.”
11 Ọkà mmụta sayensị nke evolushọn bụ́ Stephen Jay Gould kwuru, sị: “Anyị pụrụ inwe oké ọchịchọ maka azịza ‘ka elu’—ma ọ dịghị nke dị.” Nye ndị evolushọn dị otú ahụ, ndụ bụ nke ike keta o rie, ọnwụ abụrụ ọgwụgwụ ihe nile. E nweghị olileanya n’echiche ahụ kwa. Ọzọ, ọ̀ bụkwanụ eziokwu?
12, 13. Gịnị bụ echiche ndị ndú okpukpe, hà bụkwanụ ndị na-eju afọ karịa nke ndị nkịtị na-ekiri ihe na-emenụ?
12 Ọtụtụ ndị ndú okpukpe na-asị na nzube nke ndụ bụ ibi ndụ dị mma ka ọ ga-abụ na mgbe a nwụrụ, mkpụrụ obi mmadụ ga-enwe ike ịga eluigwe ma nọrọ ebe ahụ ruo mgbe ebighị ebi. Nhọrọ ọzọ e nyere maka ndị ọjọọ bụ ntaramahụhụ ebighị ebi n’ọkụ mmụọ. Ma, dị ka nkwenkwe a na-egosi, n’elu ụwa, a ga-anọgide na-enwe ịrị elu nke otu ịdị adị ahụ na-adịghị enye afọ ojuju nke dịworo n’akụkọ ihe mere eme nile. Ma ọ bụrụ na nzube Chineke bụ ka ndị mmadụ biri n’eluigwe dị ka ndị mmụọ ozi, gịnị mere na o keghị ha nnọọ n’ebe ahụ ná mmalite, dị ka o kere ndị mmụọ ozi?
13 Ọbụna ndị ụkọchukwu nwere ihe isi ike n’echiche ndị dị otú ahụ. Dr. W. R. Inge, onye bụbu onye nlekọta ngalaba chọọchị St. Paul’s Cathedral na London, nwere mgbe o kwuru, sị: “Ná ndụ m nile agbalịsiwo m ike ịchọta nzube nke ịdị ndụ. Anwawo m ịgwọta nsogbu atọ ndị yiworo mgbe nile dị ka ndị bụ isi: nsogbu nke mgbe ebighị ebi; nsogbu nke ọdịdị mmadụ; na nsogbu nke ihe ọjọọ. Adawo m. Agwọtabeghị m nke ọ bụla n’ime ha.”
Mmetụta Ya
14, 15. Mmetụta dị aṅaa ka echiche ndị ahụ na-emegide onwe ha na-enwe n’ahụ ọtụtụ ndị?
14 Gịnị bụ mmetụta nke ọtụtụ echiche dị iche iche otú a nke ndị mmụta na ndị ndú okpukpe n’ajụjụ nke nzube nke ndụ? Ọtụtụ na-aza dị ka otu nwoke meworo okenye, bụ́ onye sịrị: “Anọwo m na-ajụ ihe mere m ji nọrọ n’ebe a n’akụkụ ka ukwuu nke ndụ m. Ọ bụrụ na e nwere nzube, achọkwaghị m ịma.”
15 Ọtụtụ ndị hụworo ụba nke echiche na-adịghị agwụ agwụ n’etiti okpukpe nile nke ụwa na-ekwubi na ọ dịghị nnọọ ihe ihe mmadụ kwenyere mere. Ha na-eche na okpukpe bụ nanị ihe ntụrụndụ nke uche, ihe nke na-enye ntakịrị udo nke uche na ntụsara ahụ ka mmadụ wee nwee ike ịnagide nsogbu nile nke ndụ. Ndị ọzọ na-eche na okpukpe abụghị ihe ọzọ e wezụga nkwenkwe na-enweghị isi. Ha na-eche na ọtụtụ narị afọ nke nchepụta okpukpe azabeghị ajụjụ banyere nzube nke ndụ, o mebeghịkwa ka ndụ ndị nkịtị ka mma. N’ezie, akụkọ ihe mere eme na-egosi na ọtụtụ mgbe okpukpe nile nke ụwa a ejighachiwo ihe a kpọrọ mmadụ azụ pụọ n’ọganihu, ọ bụwokwa ihe kpatara mkpọrọmasị na agha.
16. Olee otú ịchọta nzube dị ná ndụ si dị mkpa?
16 Ma, ọ̀ dịdị mkpa ịchọta eziokwu banyere nzube nke ndụ? Ọkachamara n’ihe banyere ahụ ike nke uche bụ́ Viktor Frankl zara, sị: “Itinye mgbalị iji chọta isi ihe dị ná ndụ mmadụ bụ ikike mkpali bụ isi dị ná mmadụ. . . . Ọ dịghị ihe dị n’ụwa, ka m kara anya na-ekwu, nke ga-enyere mmadụ aka n’ụzọ dị irè ịlanarị ọbụna ọnọdụ ndị kasị njọ dị ka ihe ọmụma nke na e nwere isi ihe dị ná ndụ mmadụ.”
17. Ajụjụ ndị dị aṅaa ka ọ dị anyị mkpa ịjụ ugbu a?
17 Ebe nkà ihe ọmụma na okpukpe ndị mmadụ akọwabeghị n’ụzọ na-eju afọ ihe nzube nke ndụ bụ, olee ebe anyị pụrụ ịga iji chọta ihe ọ bụ? È nwere isi iyi nke amamihe ka elu nke pụrụ ịgwa anyị eziokwu banyere okwu a?
[Foto dị na peeji nke 4]
“Kwa afọ a na-ebibi ókèala ọhịa hà ka mbara ala nile nke [Great Britain]”
[Foto dị na peeji nke 5]
“Anọwo m na-ajụ ihe mere m ji nọrọ n’ebe a n’akụkụ ka ukwuu nke ndụ m”