Nkebi nke 5
Ndụ Nwere Nzube Dị Ebube
1, 2. Olee otú anyị pụrụ isi mata ma Chineke ọ̀ na-eche banyere anyị, oleekwa ebe anyị ga-echigharịkwuru maka azịza nye ajụjụ dị iche iche banyere ndụ?
1 Ụzọ e si mee ụwa na ihe ndị dị ndụ dị na ya na-egosi na Onye Okike ha bụ Chineke ịhụnanya, onye na-eche banyere ha n’ezie. Okwu ya kwa, bụ́ Bible, na-egosi na ọ na-emetụ ya n’obi; ọ na-enye anyị azịza ndị kasị mma banyere ajụjụ ndị ahụ bụ́: Gịnị mere anyị ji nọrọ n’ebe a n’ụwa? na, Ebee ka anyị na-aga?
2 Ọ dị anyị mkpa inyocha Bible maka azịza ndị ahụ. Okwu Chineke na-asị: “Ọ bụrụkwa na unu achọọ ya, ọ ga-eme ka unu chọta ya; ma ọ bụrụ na unu ahapụ ya, ọ ga-ahapụ unu.” (2 Ihe Emere 15:2) Ya mere, gịnị ka nnyocha nke Okwu Chineke na-ekpughe banyere nzube ya maka anyị?
Ihe Mere Chineke Ji Kee Ụmụ Mmadụ
3. N’ihi gịnị ka Chineke ji kee ụwa?
3 Bible na-egosi na Chineke kwadebere ụwa na-ebu ụmụ mmadụ n’uche n’ụzọ bụ isi. Aịsaịa 45:18 na-asị banyere ụwa na Chineke ‘ekeghị ya ka ọ bụrụ ihe tọgbọrọ n’efu, kama ọ kpụrụ ya ka e wee biri n’ime ya.’ O tinyekwara n’ụwa ihe ọ bụla ndị mmadụ ga-achọ, ọ bụghị nanị iji dị adị, kamakwa iji nụ ụtọ ndụ ruo n’ozuzu ya.—Jenesis, isi nke 1 na 2.
4. N’ihi gịnị ka Chineke ji kee ụmụ mmadụ mbụ?
4 N’Okwu ya, Chineke na-akọ banyere okike nke ndị mmadụ mbụ, Adam na Iv, wee na-ekpughe ihe o bu n’uche maka ezinụlọ mmadụ. Ọ sịrị: “Ka anyị kpụọ mmadụ n’onyinyo anyị, dị ka oyiyi anyị si dị: ka ha nweekwa ike n’ahụ azụ nke oké osimiri, na n’ahụ anụ ufe nke eluigwe, na n’ahụ anụ ụlọ, na n’ahụ ụwa nile, na n’ahụ ihe nile ọ bụla na-akpụ akpụ nke na-akpụ akpụ n’elu ụwa.” (Jenesis 1:26) Ụmụ mmadụ gaje ilekọta “ụwa nile” na ụmụ anụ e kenyere n’elu ya.
5. Ebee ka e tinyere ụmụ mmadụ mbụ?
5 Chineke mere otu nnukwute ubi yiri ogige ntụrụndụ n’ókèala a na-akpọ Iden, nke dị n’Ebe Etiti Ọwụwa Anyanwụ Ụwa. O wee “were mmadụ ahụ mee ka ọ nọdụ n’ubi Iden a gbara ogige ịrụ ọrụ ya na idebe ya.” Ọ bụ paradaịs nke nwere ihe nile ga-adị ụmụ mmadụ mbụ ahụ mkpa iri. Ọ gụnyekwara ‘osisi nile ọ bụla a na-achọsi ike n’ile anya, dịkwa mma oriri,’ nakwa ihe ubi ndị ọzọ na ọtụtụ ụdị anụmanụ ndị na-akpali mmasị.—Jenesis 2:7-9, 15.
6. Àgwà ndị dị aṅaa nke uche na nke anụ ahụ ka e kenyere ụmụ mmadụ?
6 E kere anụ ahụ nke ụmụ mmadụ mbụ ahụ n’izu okè, ka ha wee ghara ịda ọrịa, kaa nká, ma ọ bụ nwụọ. E nyekwara ha àgwà ndị ọzọ, dị ka nke nnwere onwe ime nhọrọ. A kọwara ụzọ e si mee ha na Jenesis 1:27: “Chineke wee kee mmadụ n’onyinyo ya, n’onyinyo Chineke ka o kere ya: nwoke na nwanyị ka o kere ha.” Ebe ọ bụ na e kere anyị n’onyinyo Chineke, e nyere anyị ọ bụghị nanị àgwà dị iche iche ndị nke a na-ahụ anya na ndị nke uche, kamakwa akụkụ ndị metụtara omume na ihe ime mmụọ, a ghaghịkwa imeju ndị a ma ọ bụrụ na anyị ga-enwe obi ụtọ n’ezie. Chineke gaje inye ihe ndị a ga-eji mejuo mkpa ndị ahụ nakwa mkpa maka nri, mmiri, na ikuku. Dị ka Jisọs Kraịst kwuru, “ọ bụghị nanị achịcha ka mmadụ ga-eji dị ndụ, kama ọ bụ okwu nile ọ bụla nke na-esi n’ọnụ Chineke pụta.”—Matiu 4:4.
7. Iwu dị aṅaa ka e nyere mmadụ abụọ mbụ ahụ?
7 Ọzọkwa, Chineke nyere mmadụ abụọ mbụ ahụ iwu dị ebube mgbe ha nọ n’Iden: “Mụọnụ ọmụmụ, baanụ ụba, jupụta ụwa.” (Jenesis 1:28) Ya mere ha ga-enwe ike ịmụpụta ụmụ ndị zuru okè. Ka ọnụ ọgụgụ ụmụ mmadụ na-arịkwa elu, ha ga-enwe ọrụ ahụ na-enye obi ụtọ nke ịgbasawanye ókèala nile nke ógbè paradaịs nke Iden mbụ ahụ yiri ogige ntụrụndụ. N’ikpeazụ, a ga-ewulite ụwa dum ịghọ paradaịs, nke ndị obi ụtọ, ndị zuru okè bi n’ime ya, bụ́ ndị pụrụ ịdị ndụ ruo ebighị ebi. Bible na-eme ka anyị mara na mgbe a malitesịrị ihe ndị a nile, “Chineke wee hụ ihe nile ọ bụla o mere, ma, lee, ọ dị mma nke ukwuu.”—Jenesis 1:31; leekwa Abụ Ọma 118:17.
8. Olee otú ụmụ mmadụ ga-esi lekọta ụwa?
8 Ihe àmà na-egosi na ụmụ mmadụ gaje iji ụwa nke e budara n’okpuru ha mee ihe maka abamuru ha. Ma a gaje ime nke a n’ụzọ ndị isi zuru okè. Ụmụ mmadụ gaje ịbụ ndị ji nkwanye ùgwù na-elekọta ụwa, ọ bụghị ndị na-ebibi ya. Mbibi nke ụwa nke anyị na-ahụ taa megidere uche Chineke, ndị na-ekerekwa òkè na ya na-emegidekwa nzube nke ndụ n’elu ụwa. Ha gaje ịkwụ ụgwọ maka nke ahụ, ebe Bible na-asị na Chineke gaje “imebi ndị ahụ na-emebi ụwa.”—Mkpughe 11:18.
Ọ Ka Bụkwa Nzube Chineke
9. Gịnị mere anyị ji jide n’aka na a ga-emezu nzube Chineke?
9 Otú a, site na mmalite ọ bụ nzube Chineke ka ezinụlọ mmadụ zuru okè biri n’ụwa ruo mgbe ebighị ebi n’ime paradaịs. Ọ ka bụkwa nzube ya! N’adaghị ada, a ga-emezu nzube ahụ. Bible na-asị: “Jehova nke usuu nile nke ndị agha aṅụwo iyi, sị, N’ezie dị ka m cheworo, otú a ka ọ ga-adị; na dị ka m zubeworo, nke ahụ ga-eguzosi ike.” “Ekwuwo m, m ga-emekwa ka o mee; ezubewo m, m ga-emekwa ya.”—Aịsaịa 14:24; 46:11.
10, 11. Olee otú Jisọs, Pita, na ọbụ abụ bụ́ Devid si kwuo banyere Paradaịs?
10 Jisọs Kraịst kwuru banyere nzube Chineke iweghachi paradaịs n’elu ụwa mgbe ọ gwara otu nwoke chọrọ olileanya maka ọdịnihu, sị: “Mụ na gị ga-anọ na Paradaịs.” (Luk 23:43) Pita onyeozi kwa kwuru banyere ọbịbịa nke ụwa ọhụrụ mgbe o buru amụma, sị: “Dị ka nkwa [Chineke] si dị, anyị na-ele anya eluigwe ọhụrụ [ndokwa gọọmenti ọhụrụ na-achị site n’eluigwe] na ụwa ọhụrụ [ọha mmadụ ọhụrụ nke ụwa], nke ezi omume bi n’ime ha.”—2 Pita 3:13.
11 Onye ọbụ abụ ahụ bụ́ Devid dekwara banyere ụwa ọhụrụ ahụ na-abịanụ na ogologo oge hà aṅaa ọ ga-anọ. O buru amụma, sị: “Ndị ezi omume ga-enweta ala, birikwa n’elu ya ruo mgbe ebighị ebi.” (Abụ Ọma 37:29) Ọ bụ ya mere Jisọs ji kwee nkwa, sị: “Ngọzi na-adịrị ndị dị nwayọọ n’obi: n’ihi na ndị ahụ ga-eketa ụwa.”—Matiu 5:5.
12, 13. Nye nchịkọta nke nzube dị ebube nke Chineke maka ihe a kpọrọ mmadụ.
12 Lee olileanya dị ebube nke ahụ bụ, ibi ndụ ebighị ebi n’ime ụwa paradaịs nke ihe ọjọọ, mpụ, ọrịa, iru újú, na ihe mgbu nile na-adịghị na ya! N’akwụkwọ ikpeazụ nke Bible, Okwu amụma Chineke na-achịkọta nzube a dị ebube site n’ikwupụta, sị: “[Chineke] ga-ehichapụkwa anya mmiri nile ọ bụla n’anya ha; ọnwụ agaghị adịkwa ọzọ; iru újú ma ọ bụ ịkwa ákwá ma ọ bụ ahụ ụfụ agaghị adịkwa ọzọ: ihe mbụ nile agabigawo.” O kwukwara, sị: “Onye ahụ nke na-anọkwasị n’ocheeze ahụ wee sị, Lee, ana m eme ihe nile ka ha dị ọhụrụ. O wee sị, Dee akwụkwọ: n’ihi na okwu ndị a kwesịrị ntụkwasị obi, bụrụkwa eziokwu.”—Mkpughe 21:4, 5.
13 Ee, Chineke bu nzube dị ebube n’uche. Ọ ga-abụ ụwa ọhụrụ nke ezi omume, paradaịs na-adịru ebighị ebi, nke Onye ike na nke ga-eme ihe o kwere ná nkwa buru amụma ya, n’ihi na “okwu [ya] kwesịrị ntụkwasị obi, bụrụkwa eziokwu.”
[Foto ndị dị na peeji nke 20, 21]
Chineke zubere ka ụmụ mmadụ dịa ndụ ebighị ebi n’elu ụwa paradaịs. Nke ahụ ka bụkwa nzube ya
[Foto dị na peeji nke 22]
Onye nwe ya pụrụ inye ndị o nyefere ụlọ ya, bụ́ ndị mebiri ya, ntaramahụhụ n’ihi ya