“Ọ Pụghị Ịbụ Eziokwu!”
OTU nwoke si New York (U.S.A.) na-akọ, sị: “Nwa m nwoke bụ́ Jonathan nọ na-eleta ndị enyi ya bi maịlụ ole na ole pụọ n’ebe anyị bi. Nwunye m, bụ́ Valentina enweghị mmasị ya ije n’ebe ahụ. Mgbe nile ọ na-atụ egwu banyere njem ụgbọ ala. Ma nwa anyị nwoke nwere mmasị ná ngwá ụlọ ndị ji ike ọkụ eletrik arụ ọrụ, ndị enyi ya kwa nwere ụlọ ọrụ ebe ọ pụrụ inweta ahụmahụ nke otú e si arụ ya. M nọ n’ụlọ n’ọdịda anyanwụ Manhattan, New York. Nwunye m pụrụ ije leta ndị ikwu ya na Puerto Rico. ‘Jonathan ga-alọghachi n’oge na-adịghị anya,’ ka m chere. Mgbe ahụ mgbịrịgba ọnụ ụzọ kụrụ. ‘N’ezie nke ahụ ga-abụ ya.’ Ọ bụghị ya. Ọ bụ ndị uwe ojii na ndị ọkà ọrụ ahụ ike na-ahụ maka ihe mberede. ‘Ị̀ matara akwụkwọ ikike ịnya ụgbọ ala nke a?’ ka onye ọrụ uwe ojii ahụ jụrụ. ‘Ee, nke ahụ bụ nke nwa m, nke Jonathan.’ ‘Anyị wetaara gị ozi ọjọọ. E nwewo ihe mberede, ma . . . nwa gị nwoke, . . . nwa gị nwoke anwụwo.’ Mmeghachi omume mbụ m bụ, ‘Ọ pụghị ịbụ eziokwu!’ Ihe omume ahụ na-ama ahụ jijiji mepere ọnyá n’ime obi anyị nke ka na-akpọ akpọ, ọbụna mgbe ọtụtụ afọ gasịrị.”
Otu nna na Barcelona (Spain) na-ede, sị: “Laa azụ na Spain n’afọ ndị 1960, ezinụlọ anyị bụ nke obi ụtọ. E nwere María, nwunye m, na ụmụ anyị atọ, David, Paquito, na Isabel, afọ ndụ ha bụ 13, 11, na 9 n’otu n’otu.
“Otu ụbọchị na March 1963, Paquito si ụlọ akwụkwọ lọta na-ekpesa na isi na-awasi ya ike. O juru anyị anya ihe pụrụ ịkpata ya—ma n’oge na-adịghị anya anyị matara. Ọ nwụrụ hour atọ mgbe nke a gasịrị. Ọbara ọgbụgba n’ime ụbụrụ ewerewo ndụ ya ná mberede.
“Ọnwụ Paquito weere ọnọdụ ihe karịrị 30 afọ gara aga. Ọ bụ ezie na ọ dị otú a, anyị ka na-enwe ihe mgbu miri emi nke ọnwụ ahụ ruo taa. Ọ dịghị ụzọ ọ bụla nwatakịrị pụrụ isi nwụnahụ ndị mụrụ ụmụ ha ghara inwe mmetụta na ihe efunahụwo ha—n’agbanyeghị ogologo oge gaferenụ ma ọ bụ ụmụntakịrị ole ha pụrụ inwe.”
Ahụmahụ abụọ ndị a, ebe ụmụntakịrị nwụnahụrụ ndị mụrụ ụmụ, na-enye ihe atụ nke otú ọnyá ahụ si emi emi ma na-adịte anya mgbe nwatakịrị nwụrụ. Lee otú okwu otu dọkịta kwuru si bụrụ eziokwu, bụ́ onye dere, sị: “Ọnwụ nwa na-abụkarị ihe ọdachi na ihe na-akpata oké nchegbu karịa ọnwụ onye meworo okenye n’ihi na nwa bụ onye ikpeazụ n’ezinụlọ a tụrụ anya ịnwụ. . . . Ọnwụ nke nwatakịrị ọ bụla na-apụta ntụfu nke nchekwube ndị a na-enwe maka ọdịnihu, mmekọrịta dị iche iche [nwa nwoke, nwunye nwa, nwa nwa], ahụmahụ dị iche iche . . . ndị a na-amabeghị ụtọ ha.” Otu echiche a kwa nke mfu miri emi pụkwara ịdị otú ahụ nye nwanyị ọ bụla nwa ya nwụnahụrụ site n’ime ịpụ ya.
Otu nwunye di ya nwụrụ na-akọwa: “Di m, bụ́ Russell, jere ozi dị ka osote onye nduzi ndị ọrụ ahụ ike n’ọgbọ agha nke osimiri Pacific n’oge Agha Ụwa nke Abụọ. Ọ hụwo ma lanarị ụfọdụ agha ndị dị oké njọ. Ọ lọghachitere na United States ma malite ibi ndụ dị jụụ karị. N’ikpeazụ o jere ozi dị ka onye ozi nke Okwu Chineke. Mgbe ọ nọ n’agbata afọ ndụ nke 60 na 65, ọ malitere inwe mgbaàmà nke nsogbu obi. Ọ nwara ibi ndụ mmega ahụ. Mgbe ahụ, otu ụbọchị na July 1988, ọrịa obi nkụchi siri oké ike rịara ya o wee nwụọ. Ọnwụ ya bibiri ihe. Enweghị m ohere ọbụna ịsị ya gaa nke ọma. Ọ bụghị di m nanị. Ọ bụ enyi m kasị mma. Mụ na ya ebikọwo ndụ ọnụ ruo 40 afọ. Ugbu a o yiri ka m ga-eche owu ọmụma pụrụ iche ihu.”
Ndị a bụ nanị ole na ole n’ime ọtụtụ puku ihe ọdachi ndị na-adakwasị ezinụlọ dị iche iche gburugburu ụwa kwa ụbọchị. Dị ka ihe ka n’ọnụ ọgụgụ ndị na-eru újú ga-agwa gị, mgbe ọnwụ gburu nwa gị, di gị, nwunye gị, onye mụrụ gị, enyi gị, ọ bụ n’ezie ihe onye Kraịst ahụ na-ede akwụkwọ bụ́ Pọl kpọrọ ya, “onye iro ikpeazụ.” Ọtụtụ mgbe mmeghachi omume ebumpụta ụwa mbụ mgbe a nụrụ akụkọ ahụ na-atụ egwu pụrụ ịbụ ịjụ ikweta, “Ọ pụghị ịbụ eziokwu! Ekwetaghị m.” Mmeghachi omume ndị ọzọ na-esochikarị, dị ka anyị ga-ahụ.—1 Ndị Kọrint 15:25, 26.
Otú ọ dị, tupu anyị atụlee mmetụta dị iche iche nke iru újú, ka anyị zaa ajụjụ ụfọdụ ndị dị mkpa. Ọnwụ ọ̀ pụtara ọgwụgwụ nke onye ahụ? È nwere olileanya ọ bụla dịnụ nke ịhụ ndị anyị hụrụ n’anya ọzọ?
E Nwere Ezi Olileanya
Onye so dee Bible bụ́ Pọl nyere olileanya nke nnwere onwe pụọ n’aka “onye iro ikpeazụ” ahụ, bụ́ ọnwụ. O dere, sị: “A gaje ime ka ọnwụ ghara ịdị irè.” “Onye iro ikpeazụ a ga-ekpochapụ bụ ọnwụ.” (1 Ndị Kọrint 15:26, The New English Bible) N’ihi gịnị ka Pọl pụrụ iji jide nke ahụ n’aka otú a? N’ihi na onye e meworo ka o si n’ọnwụ bilite, bụ́ Jisọs Kraịst, eziwo ya ihe. (Ọrụ 9:3-19) Ọ bụkwa n’ihi nke ahụ ka Pọl pụrụ ide, sị: “Ebe ọnwụ sitere n’aka mmadụ [Adam], mbilite n’ọnwụ nke ndị nwụrụ anwụ sitekwara n’aka mmadụ [Jisọs Kraịst]. N’ihi na dị ka ọnwụ dịịrị mmadụ nile n’ime Adam, ọ bụkwa otú a ka a ga-eme ka mmadụ nile dị ndụ n’ime Kraịst ahụ.”—1 Ndị Kọrint 15:21, 22.
Jisọs ruru újú n’ụzọ miri emi mgbe o zutere otu nwanyị di ya nwụrụ bụ́ onye Nain ma hụ nwa ya nwoke nwụrụ anwụ. Ihe ndekọ nke Bible na-agwa anyị, sị: “Mgbe [Jisọs] bịaruru nso ọnụ ụzọ ámá obodo ahụ [Nain], lee, a na-ebupụ otu onye nwụrụ anwụ, bụ́ nwa nwoke nke nne ya mụrụ nanị ya, nwanyị ahụ bụkwa onye di ya nwụrụ: oké ìgwè nke ndị obodo ahụ sorokwa ya. Mgbe Onyenwe anyị hụrụ ya, O wee nwee ọmịiko n’ahụ ya, sị ya, Akwala ákwá. O wee bịaruo nso, metụ igbe ozu ahụ aka: ndị na-ebu ya wee guzoo. O wee sị, Nwa okorobịa, gị ka M na-asị, Bilie. Onye ahụ nke nwụrụ anwụ wee nọlie, malite ikwu okwu. O wee were ya nye nne ya. Mmadụ nile wee tụọ egwu: ha wee nye Chineke otuto, sị, Onye amụma ukwu ebiliwo n’etiti anyị: ha sịkwa, Chineke eletawo ndị Ya.” Lee ka ọmịiko si kpalie Jisọs nke na ọ kpọlitere nwa nwoke nke nwanyị ahụ di ya nwụrụ! Cheedị echiche ihe nke ahụ na-egosi banyere ọdịnihu!—Luk 7:12-16.
N’ebe ahụ, n’ihu ndị ji anya ha hụ, Jisọs rụrụ ọrụ mbilite n’ọnwụ a na-apụghị ichefu echefu. Ọ bụ ngosipụta nke ihe mere a ga-eji kwere ná mbilite n’ọnwụ ahụ o kwewororị nkwa ya n’otu oge tupu ihe omume nke a, mweghachite gaa ná ndụ n’elu ala n’okpuru “eluigwe ọhụrụ.” N’oge ahụ Jisọs ekwuwo, sị: “Ka ihe a ghara iju unu anya: n’ihi na oge hour na-abịa mgbe ndị nile dị n’ili ga-anụ olu Ya, ha ga-apụtakwa.”—Mkpughe 21:1, 3, 4; Jọn 5:28, 29; 2 Pita 3:13.
Ndị ọzọ ji anya ha hụ otu mbilite n’ọnwụ gụnyere Pita, tinyekwara ụfọdụ ndị ọzọ n’ime mmadụ 12 ahụ sonyeere Jisọs ná njem ya nile. N’ezie ha nụrụ ka Jisọs ahụ e mere ka o si n’ọnwụ bilie kwuru okwu n’akụkụ Osimiri Galili. Ihe ndekọ ahụ na-agwa anyị, sị: “Jisọs sị ha, Bịanụ, rie nri ụtụtụ. Ma ọ dịghị onye ọ bụla n’ime ndị na-eso ụzọ Ya nwere anya ike ịjụ Ya, sị, Gị onwe gị bụ ònye? n’ihi na ha matara na ọ bụ Onyenwe anyị. Jisọs bịa, were achịcha ahụ, nye ha, azụ ahụkwa otú ahụ. Nke a mere ya ugbo atọ e mere ka Jisọs pụta ìhè nye ndị na-eso ụzọ Ya, mgbe e mesịrị ka O si ná ndị nwụrụ anwụ bilie.”—Jọn 21:12-14.
N’ihi ya, Pita pụrụ iji ezigbo ihe ido anya dee, sị: “Onye a gọziri agọzi ka Ọ bụ, bụ́ Chineke na Nna nke Onyenwe anyị Jisọs Kraịst, Onye mụrụ anyị ọzọ, dị ka oké ebere Ya si dị, ka anyị wee nwee olileanya dị ndụ, site ná mbilite ahụ nke Jisọs Kraịst si ná ndị nwụrụ anwụ bilite.”—1 Pita 1:3.
Pọl onyeozi gosipụtara olileanya ya siri ike mgbe o kwuru, sị: “M kwere ihe nile nke dị ka iwu anyị si dị, nke e dewokwara n’akwụkwọ ndị amụma: n’ihi na enwere m olileanya n’ebe Chineke nọ, ndị a onwe ha na-echekwa, na mbilite n’ọnwụ nke ndị ezi omume na nke ndị ajọ omume kwa gaje ịdị.”—Ọrụ 24:14, 15.
N’ihi ya ọtụtụ nde mmadụ pụrụ inwe olileanya siri ike nke ịhụ ndị ha hụrụ n’anya ka ha dị ndụ ọzọ n’elu ala kama n’okpuru ọnọdụ ndị dị nnọọ iche. Gịnị ka ọnọdụ ndị ahụ ga-abụ? A ga-atụle ihe ndị ọzọ metụtara olileanya ahụ dabeere na Bible banyere ndị anyị hụrụ n’anya nwụrụ anwụ n’akụkụ ikpeazụ nke broshuọ nke a, nke a kpọrọ “Olileanya E Ji n’Aka Maka Ndị Nwụrụ Anwụ.”
Ma nke mbụ ka anyị tụlee ajụjụ dị iche iche ị pụrụ inwe ma ọ bụrụ na ị na-eru újú n’ihi ọnwụ nke onye a hụrụ n’anya: Ò kwesịrị ekwesị iru újú otú a? Olee otú m pụrụ isi nagide iru újú m? Olee ihe ndị ọzọ pụrụ ime iji nyere m aka ịnagide? Olee otú m pụrụ isi nyere ndị ọzọ na-eru újú aka? N’ụzọ bụkwa isi, Gịnị ka Bible na-ekwu banyere olileanya e ji n’aka maka ndị nwụrụ anwụ? Ọ̀ dị mgbe m ga-ahụ ndị m hụrụ n’anya ọzọ? N’olee ebe kwa?
Ajụjụ Ndị A Ga-echere Echiche
Gịnị bụ mmeghachi omume ebumpụta ụwa mgbe onye a hụrụ n’anya nwụrụ?
Gịnị ka Jisọs meere otu nwanyị di ya nwụrụ na Nain?
Nkwa dị aṅaa banyere ndị nwụrụ anwụ ka Jisọs kwere?
N’ihi gịnị ka Pita na Pọl pụrụ iji jide n’aka na a ga-enwe mbilite n’ọnwụ?
Ajụjụ ndị dị aṅaa kwesịrị inwe azịza?
[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 4]
‘Anyị wetaara gị ozi ọjọọ. E nwewo ihe mberede, ma . . . nwa gị nwoke, . . . nwa gị nwoke anwụwo.’