Olee Otú M Pụrụ Isi Nagide Iru Újú M?
“M NWERE mmetụta nke oké ihe nrụgide n’ahụ m ikpuchi mmetụta m,” ka Mike na-akọwa n’icheta ọnwụ nna ya. Nye Mike, ikpuchi iru újú ya bụ ime ka nwoke. Ma n’ikpeazụ ọ ghọtara na ya ezighị ezi. Ya mere mgbe nna ochie nke enyi Mike nwụnahụrụ ya, Mike matara ihe ọ ga-eme. Ọ na-ekwu, sị: “Afọ ole na ole gara aga, m gaara akụtụ ya aka n’ubu ma sị, ‘Mee ka nwoke.’ Ugbu a m metụrụ ya aka n’ogwe aka ma sị, ‘Nwee mmetụta otú ọ bụla i kwesịrị inwe. Ọ ga-enyere gị aka ịnagide ya. Ọ bụrụ na ị chọrọ ka m lawa, m ga-ala. Ọ bụrụ na ị chọrọ ka m nọrọ, m ga-anọ. Ma egwu atụla gị inwe mmetụta.’”
MaryAnne nwekwara ihe nrụgide nke ịbịada mmetụta ya dị iche iche mgbe di ya nwụrụ. “Ịbụ ezi ihe nlereanya nye ndị ọzọ nyere m nsogbu nke ukwuu,” ka ọ na-echeta, “nke na enyeghị m onwe m ohere nke inwe mmetụta dị ka o kwesịrị ịdị. Ma n’ikpeazụ m mụtara na ịnwa ịbụ ide nke ike maka ndị ọzọ anaghị enyere m aka. M malitere inyocha ọnọdụ m ma na-ekwu, ‘Kwaa ákwá ma ọ bụrụ na ọ dị gị mkpa ịkwa. Anwala isi oké ike. Wepụ ya n’ime onwe gị.’”
Ya mere ma Mike ma MaryAnne na-atụ aro, sị: Ruo újú gị! Ha zikwara ezi. N’ihi gịnị? N’ihi na iru újú bụ ihe na-enye ntọhapụ dị mkpa nke mmetụta uche. Ibelata mmetụta uche gị dị iche iche pụrụ ibelata ihe nrụgide ị nọ n’ime ya. Ngosipụta ebumpụta ụwa nke mmetụta uche, ma ọ bụrụ na i jikọta ya na nghọta na ihe ọmụma ziri ezi na-ekwe ka i tinye mmetụta gị dị iche iche n’ọnọdụ kwesịrị ekwesị.
Otú ọ dị, ọ bụghị mmadụ nile na-egosipụta iru újú n’otu ụzọ ahụ. Ihe ndị ahụ dịkwa ka ma onye ahụ a hụrụ n’anya ọ̀ nwụrụ ná mberede ma ọ bụ ma ọnwụ ọ̀ bịara mgbe a rịaworo ọrịa ogologo oge pụrụ inwe mmetụta ná mmeghachi omume nke ndị dị ndụ. Ma otu ihe yiri ka o doro anya: Ịbịada mmetụta gị dị iche iche pụrụ ịbụ ihe na-emerụ ahụ ma n’ụzọ anụ ahụ ma n’ụzọ mmetụta uche. Ọ bụ ihe na-enye ahụ ike karị ibelata iru újú gị. N’ụzọ dị aṅaa? Akwụkwọ Nsọ nwere ụfọdụ ndụmọdụ ndị bara uru.
Ibelata Iru Újú—N’ụzọ Dị Aṅaa?
Ikwu okwu pụrụ ịbụ ihe mbelata bara uru. Mgbe ọnwụ ụmụ iri ya nile gasịrị, tinyekwara ụfọdụ ihe ọdachi onwe onye ndị ọzọ, nna ochie ahụ bụ́ Job kwuru, sị: “Ike ndụ m agwụwo mkpụrụ obi m; ka m hapụrụ [Hibru, “tọhapụ”] onwe m ntamu m; ka m kwuo okwu n’ịdị ilu nke mkpụrụ obi m.” (Job 1:2, 18, 19; 10:1) Job apụghịkwa igbochi nchegbu ya ọzọ. Ọ dị ya mkpa ibelata ya, ọ ghaghị ‘ikwu okwu.’ N’otu aka ahụ, onye England ahụ na-ede ihe nkiri bụ́ Shakespeare dere n’akwụkwọ bụ́ Macbeth, sị: “Kwupụta iru újú; iru újú a na-ekwupụtaghị ekwupụta na-eme ka ike gwụ obi ma gbawaa ya.”
Ya mere ikwu ihe banyere mmetụta gị dị iche iche gwa “enyi” gị bụ́ onye ga-eji ndidi na ọmịiko gee ntị pụrụ inye ọ̀tụ̀tụ̀ ahụ efe ụfọdụ. (Ilu 17:17) Ikwupụta ahụmahụ na mmetụta dị iche iche na-emekarị ka ọ dị mfe ịghọta ha na ịnagide ha. Ọ bụrụkwa na onye ahụ na-ege ntị bụ onye ọzọ mmadụ nwụnahụworo, bụ́ onye nagideworo ihe funahụrụ ya n’ụzọ dị irè, ị pụrụ inwetatụ aro ụfọdụ ndị bara uru otú ị pụrụ isi nagide ya. Mgbe nwa ya nwụrụ, otu onye bụ nne kọwara ihe mere o ji enye aka ịgwa nwanyị ọzọ okwu, bụ́ onye cheworo mfu yiri nke ahụ ihu: “Ịmara na onye ọzọ ezutewo otu ihe ahụ, sikwa n’ime ya pụta na-enwe mmetụta uche dị mma, nakwa na ọ ka dị ndụ ma na-achọtaghachi ụdị ụfọdụ nke ịdị n’usoro ọzọ n’ime ndụ ya bụ ihe na-agba ume nye m.”
Gịnị ma ọ bụrụ na ahụ adịghị eru gị ala ikwu okwu banyere mmetụta gị dị iche iche? Mgbe ọnwụ Sọl na Jonatan gasịrị, Devid dere otu abụ iru újú na-emetụ n’ahụ nke ukwuu nke ọ nọ na ya gosipụta iru újú ya n’ụzọ zuru ezu. Ihe odide nke a nke iru újú ghọrọ akụkụ nke ihe ndekọ e dere ede nke akwụkwọ Bible bụ́ Samuel nke Abụọ. (2 Samuel 1:17-27; 2 Ihe Emere 35:25) N’otu aka ahụ, ọ na-adịrị ụfọdụ ndị mfe karị igosipụta ihe ha bu n’uche n’ihe odide. Otu nwanyị di ya nwụrụ kọrọ na ọ na-edetu mmetụta ya dị iche iche ma gụọ ihe o dere mgbe ụbọchị ụfọdụ gasịrị. Ọ hụrụ nke a dị ka ihe ntọhapụ na-enye aka.
Ma ọ̀ bụ site n’ikwu okwu ma ọ̀ bụ site n’ide ihe, ịgwa onye ọzọ ihe ndị bụ mmetụta gị pụrụ inye aka ibelata iru újú gị. Ọ pụkwara ime ka nghọtahie ụfọdụ doo anya. Otu nne nwa ya nwụrụ na-akọwa, sị: “Mụ na di m nụrụ banyere di na nwunye ndị gbara alụkwaghịm mgbe nwa ha nwụsịrị, anyị achọghịkwa ka nke ahụ mee anyị. Ya mere mgbe ọ bụla iwe were anyị, na-achọ ịta ibe anyị ụta, anyị ga-akparịta ya. M chere na site n’ime nke ahụ anyị bịara onwe anyị nso n’ezie karị.” Otú a, ime ka a mara mmetụta gị dị iche iche pụrụ inyere gị aka ịghọta na ọ bụ ezie na otu ụdị ọnwụ ahụ ka unu na-eru újú ya, ndị ọzọ pụrụ iru újú n’ụzọ dị iche—n’ọ̀tụ̀tụ̀ nke ha na n’ụzọ nke ha.
Ihe ọzọkwa pụrụ ime ka mbelata nke iru újú dị ngwa bụ ịkwa ákwá. E nwere “mgbe ịkwa ákwá,” ka Bible na-ekwu. (Eklisiastis 3:1, 4) N’ezie ọnwụ nke onye anyị hụrụ n’anya na-eweta oge dị otú ahụ. Ịkwa ákwá iru újú yiri ka ọ bụ akụkụ dị mkpa nke usoro ngwọta ya.
Otu nwa agbọghọ na-akọwa otú otu enyi dị ya nso si nyere ya aka ịnagide ya mgbe nne ya nwụrụ. Ọ na-echeta, sị: “Enyi m na-anọ ebe ahụ mgbe nile maka m. O soro m kwaa ákwá. O soro m kwurịta okwu. M pụrụ ikwupụta nnọọ ihe bụ mmetụta uche m n’ụzọ pụtara ìhè, nke ahụ dịkwa m mkpa. Ọ dịghị m mkpa inwe mmechuihu banyere ịkwa ákwá.” (Lee Ndị Rom 12:15.) I kwesịghịkwa ime ihere n’ihi anya mmiri gị. Dị ka anyị hụworo, ihe atụ dị iche iche nke ndị ikom na ndị inyom nwere okwukwe jupụtara na Bible—tinyere Jisọs Kraịst—bụ́ ndị bepụtara anya mmiri nke iru újú n’ụzọ pụtara ìhè n’enweghị mmechuihu ọ bụla e nwere ihe àmà ya.—Jenesis 50:3; 2 Samuel 1:11, 12; Jọn 11:33, 35.
Ị pụrụ ịchọpụta na ruo nwa oge ị pụghị ịma ihe ga-abụ mmetụta uche gị. Anya mmiri pụrụ ịsọ ka mmiri n’ebughị ụzọ nye ihe ịdọ aka ná ntị. Otu nwanyị di ya nwụrụ chọpụtara na ịzụ ahịa n’ụlọ ahịa (ihe ya na di ya soworo mee ọtụtụ ugbo) pụrụ ime ka ọ kwaa ákwá, karịsịa mgbe ọ gbatịpụrụ aka, dị ka ihe maworo mmadụ ahụ, iweta ihe oriri ndị di ya kasị nwee mmasị na ha. Nwee ndidi n’ebe onwe gị nọ. Echekwala na ị ghaghị igbochi onwe gị ịkwa ákwá. Cheta, ha bụ akụkụ ebumpụta ụwa na nke dị mkpa maka iru újú.
Ime Ihe Banyere Ikpe Ọmụma
Dị ka e kwuru n’oge gara aga, ụfọdụ ndị na-enwe mmetụta nke ikpe ọmụma mgbe onye ha hụrụ n’anya nwụnahụsịrị ha. Nke a pụrụ inye aka ịkọwa oké iru újú nke nwoke ahụ kwesịrị ntụkwasị obi bụ́ Jekọb nwere mgbe e dubara ya n’ikwere na “ajọ anụ” egbuwo nwa ya nwoke bụ́ Josef. Jekọb n’onwe ya ezipụwo Josef ije lee otú ụmụnne ya dị. O yiri ka mmetụta ikpe ọmụma ò nyere Jekọb nsogbu, dị ka, ‘Gịnị mere m ji zipụ Josef nanị ya? N’ihi gịnị ka m ji zipụ ya banye n’ógbè ebe anụ ọhịa jupụtara?’—Jenesis 37:33-35.
Ma eleghị anya ị na-eche na nleghara anya ụfọdụ n’akụkụ nke gị so kpata ọnwụ nke onye ị hụrụ n’anya. Ịghọta na ikpe ọmụma—nke mere eme ma ọ bụ nke e chere n’echiche—bụ mmeghachi omume iru újú kwesịrị ekwesị pụrụ ịbụ ihe inye aka n’onwe ya. Ọzọkwa, echela na ị ghaghị idebere onwe gị ụdị mmetụta dị otú ahụ. Ikwu okwu banyere otú i si na-enwe mmetụta pụrụ iweta nnwere onwe dị mkpa nke ukwuu.
Otú ọ dị, ghọta na n’agbanyeghị otú anyị hụruru onye ọzọ n’anya, anyị apụghị ịchịkwa ndụ ya, anyị apụghịkwa igbochi “mgbe na ihe ndapụta” ịdabara ndị anyị hụrụ n’anya. (Eklisiastis 9:11) E wezụga nke ahụ, ihe ịrụ ụka adịghị ya na ebumnuche gị adịghị njọ. Dị ka ihe atụ, n’akpọtụrụghị onye dọkịta ọsọ ọsọ, ì zubere ka onye ị hụrụ n’anya rịa ọrịa ma nwụọ? Ee enụ! Mgbe ahụ ikpe ọ̀ mara gị n’ezie ịkpata ọnwụ onye ahụ? Ee e.
Otu nne mụtara ịnagide ikpe ọmụma ahụ mgbe nwa ya nwanyị nwụsịrị n’ihe mberede ụgbọ ala. Ọ na-akọwa, sị: “M nwere ikpe ọmụma na m zipụrụ ya. Ma m bịara ghọta na ọ bụ ihe na-atọ ọchị inwe mmetụta dị otú ahụ. Ọ dịghị ihe dị njọ n’iziga ya na nna ya ije ozi. Ọ bụ nanị ajọ ihe mberede.”
‘Ma e nwere ọtụtụ ihe ọ ga-amasị m ma á sị na m kwuru ma ọ bụ mee,’ ka ị pụrụ ikwu. Eziokwu, ma olee onye n’ime anyị pụrụ ikwu na anyị abụwo nna, nne, ma ọ bụ nwa zuru okè? Bible na-echetara anyị, sị: “Anyị nile na-asụ ngọngọ n’ọtụtụ ihe. Ọ bụrụ na onye ọ bụla asụghị ngọngọ n’okwu, onye ahụ bụ nwoke tozuru okè.” (Jemes 3:2; Ndị Rom 5:12) Ya mere nakwere eziokwu ahụ bụ́ na i zughị okè. Ịnọgide na-eche banyere ụdị nile nke “a sị nnọọ” agaghị agbanwe ihe ọ bụla, kama ọ ga-adọla mgbake gị azụ.
Ọ bụrụ na i nwere ezi ihe mere i ji kwere na ikpe ọmụma gị ziri ezi, ọ bụghị nke e chere eche, mgbe ahụ tụlee ihe kasị mkpa n’ihe nile n’ime ka ikpe ọmụma ghara isi ike—mgbaghara Chineke. Bible na-emesi anyị obi ike, sị: “Ọ bụrụ na Ị rịba ajọ omume nile ama, Ja, Onyenwe anyị, ònye ga-eguzo? Ma n’aka Gị ka mgbaghara dị.” (Abụ Ọma 130:3, 4) Ị pụghị ịlaghachi n’oge gara aga ma gbanwee ihe ọ bụla. Otú ọ dị, ị pụrụ ịrịọ mgbaghara Chineke maka mmehie ihe ndị e mere n’oge gara aga. Mgbe ahụ gịnị ọzọ? Ọ dị mma, ọ bụrụ na Chineke ekwee nkwa ịgbaghara ihe ndị i mere n’oge gara aga, ọ̀ bụ na i kwesịghịkwa ịgbaghara onwe gị?—Ilu 28:13; 1 Jọn 1:9.
Ime Ihe Banyere Iwe
Ị̀ na-ewesara ma eleghị anya ndị dọkịta, ndị nọọsụ, ndị enyi, ma ọ bụ ọbụna onye ahụ nwụrụ anwụ iwe? Ghọta na nke a kwa bụ mmeghachi omume a na-enwekarị mgbe ihe funahụrụ mmadụ. Ma eleghị anya iwe gị bụ ihe ebumpụta ụwa na-eso mmetụta mmerụ ahụ ị na-enwe. Otu onye na-ede akwụkwọ kwuru, sị: “Ọ bụ nanị site n’ịghọta iwe ahụ—ọ bụghị ime ihe n’ihi ya kama ịmara na i nwere ya—ka ị pụrụ inwere onwe gị pụọ ná mmetụta ya na-ebibi ihe.”
Ọ pụkwara inye aka igosipụta ma ọ bụ iso onye ọzọ kwurịta iwe ahụ. N’ụzọ dị aṅaa? N’ezie ọ bụghị site ná ntiwapụ a na-achịkwaghị achịkwa. Bible na-adọ aka ná ntị na iwe e mere ka ọ dịtee anya dị ize ndụ. (Ilu 14:29, 30) Ma ị pụrụ inweta nkasi obi n’isoro enyi na-aghọta ihe kwurịta ya. Ụfọdụ na-achọpụtakwa na inwe mmega ahụ siri ike mgbe iwe ji ha bụ ihe mbelata na-enye aka.—Leekwa Ndị Efesọs 4:25, 26.
Ọ bụ ezie na ọ dị mkpa ikwupụta na ikwu eziokwu banyere mmetụta gị, okwu ịdọ aka ná ntị kwesịrị ekwesị. E nwere ọdịiche dị ukwu n’etiti igosipụta mmetụta gị na ibokwasị ha ndị ọzọ. Ọ dịghị mkpa ịta ndị ọzọ ụta maka iwe gị na obi nkoropụ gị. Ya mere buru n’uche ikwupụta ihe bụ mmetụta gị, ma ọ bụghị n’ụzọ ịkpọasị. (Ilu 18:21) E nwere otu ihe enyemaka dị oké mkpa n’ịnagide iru újú, anyị ga-atụlekwa ya ugbu a.
Enyemaka Sitere n’Aka Chineke
Bible na-emesi anyị obi ike, sị: “Jehova nọ nso ndị obi ha tiwara etiwa, Ọ na-azọpụtakwa ndị a zọpịaworo n’ime mmụọ ha.” (Abụ Ọma 34:18) Ee, karịa ihe ọ bụla ọzọ, mmekọrịta e soro Chineke nwee pụrụ inyere gị aka ịnagide ọnwụ onye ị hụrụ n’anya. N’ụzọ dị aṅaa? Aro nile a tụworo ruo ugbu a bụ ndị e meworo ka ha dabere ma ọ bụ kwekọọ n’Okwu Chineke, bụ́ Bible. Itinye ha n’ọrụ pụrụ inyere gị aka ịnagide.
Ọzọkwa, eledala abamuru nke ekpere anya. Bible na-agba anyị ume, sị: “Tụkwasị Jehova ihe O nyeworo gị dị ka ibu, Ya onwe ya ga-anagidekwa gị.” (Abụ Ọma 55:22) Ọ bụrụ na ikwupụta mmetụta gị gwa enyi gị nwere ọmịiko pụrụ inye aka, lee ka ịgwa “Chineke nke nkasi obi nile” ihe nile dị gị n’obi ga-esi nyere gị aka!—2 Ndị Kọrint 1:3.
Ọ bụghị na ikpe ekpere na-eme nnọọ ka anyị nwee mmetụta ka mma. “Onye na-anụ ekpere” na-ekwe nkwa inye ndị ohu ya mmụọ nsọ, bụ́ ndị ji obi eziokwu na-arịọ maka ya. (Abụ Ọma 65:2; Luk 11:13) Mmụọ nsọ Chineke kwa, ma ọ bụ ike ọrụ, pụrụ ime ka i nwee “ọkịka nke ike” iji si n’otu ụbọchị gafee na nke na-esonụ. (2 Ndị Kọrint 4:7) Cheta: Chineke pụrụ inyere ndị ohu ya kwesịrị ntụkwasị obi aka ịtachi obi ná nsogbu nile ha pụrụ iche ihu.
Otu nwanyị nwa ya nwụrụ na-echeta otú ike nke ekpere si nyere ya na di ya aka idi ọnwụ ahụ. “Ọ bụrụ na anyị nọ n’ụlọ n’abalị, iru újú ahụ wee ghọọ ihe a na-apụghị imeri emeri, anyị ga-ekpekọ ekpere ọnụ n’olu dara ụda,” ka ọ na-akọwa. “N’oge mbụ anyị na ya na-esoghị mekọọ ihe—nzukọ ọgbakọ mbụ anyị jere, mgbakọ mbụ anyị jere—anyị ga-ekpe ekpere maka ike. Mgbe anyị tetara n’ụtụtụ, ịbụ eziokwu nke ihe ahụ nile wee yie ihe a na-apụghị idi edi, anyị ga-ekpeku Jehova ekpere inyere anyị aka. N’ihi ihe ụfọdụ, ọ bụụrụ m n’ezie ihe na-akpasasị uche nanị m ịbanye n’ime ụlọ. N’ihi ya mgbe ọ bụla nanị m lọtara n’ụlọ, m ga-ekpe nnọọ ekpere nye Jehova inyere m aka ịnọgide na-adị jụụ.” Nwanyị ahụ kwesịrị ntụkwasị obi kwenyesiri ike n’ụzọ ziri ezi na ekpere ndị ahụ dị mkpa. Gị onwe gị kwa pụrụ ịchọpụta na ná nzaghachi nke ekpere ndị ị nọgidesiri ike na-ekpe, ‘udo nke Chineke, nke karịrị uche nile, ga-echekwa obi gị na echiche uche gị.’—Ndị Filipaị 4:6, 7; Ndị Rom 12:12.
Enyemaka nke Chineke na-enye dị mkpa. Onye Kraịst bụ Pọl onyeozi kwuru na Chineke “na-akasi anyị obi ná mkpagbu anyị nile, ka anyị wee pụọ isite ná nkasi obi nke Chineke ji kasie anyị onwe anyị obi kasie ndị ahụ obi ndị nọ ná mkpagbu ọ bụla.” N’eziokwu, enyemaka Chineke adịghị ewepụ ihe mgbu, ma ọ pụrụ ime ka ọ dị mfe odidi. Nke ahụ apụtaghị na ị gaghị akwa ákwá ọzọ ma ọ bụ chefuo onye ị hụrụ n’anya. Ma ahụ pụrụ ịdịghachi gị mma. Ka ị na-emekwa otú a, ihe i nwere ahụmahụ ya pụrụ ime ka ị na-aghọta ihe ma na-enwe ọmịiko karịa n’inyere ndị ọzọ aka ịnagide ọnwụ yiri nke ahụ.—2 Ndị Kọrint 1:4.
Ajụjụ Ndị A Ga-echere Echiche
N’ihi gịnị ka o ji dị mkpa gị ikwe ka i ruo újú?
Olee otú ị pụrụ isi belata iru újú gị?
Olee otú Akwụkwọ Nsọ pụrụ isi nyere gị aka ịnagide mmetụta dị iche iche nke ikpe ọmụma na iwe?
N’ụzọ dị aṅaa ka mmekọrịta gị na Chineke pụrụ isi nyere gị aka ịnagide ọnwụ nke onye ị hụrụ n’anya?
Olee ụfọdụ aro ndị bara uru maka ịnagide iru újú?
Igbe dị na peeji nke 18]
Aro Ụfọdụ Ndị Bara Uru
Dabere ná ndị enyi: Ajụla ikwe ka ndị ọzọ nye aka ma ọ bụrụ na ha achọọ ime otú ahụ, i nwekwara ike n’ezie iji enyemaka ụfọdụ mee ihe. Ghọta na ọ pụrụ ịbụ ụzọ ha nwere isi gosi gị ihe bụ mmetụta ha; ma eleghị anya ha apụghị ịchọta okwu ndị kwesịrị ekwesị.—Ilu 18:24.
Lezie ahụ ike gị anya: Iru újú pụrụ ime ka ike gwụ gị, karịsịa ná mmalite. Ahụ gị chọrọ ezumike zuru ezu, mmega ahụ na-enye ahụ ike, na ihe na-azụ ahụ karịa mgbe ọ bụla ọzọ. Ijekwuru dọkịta ezinụlọ unu site ná mgbe ruo ná mgbe maka ile ahụ pụrụ ịbụ ihe dị mma ime.
Yigharịa mkpebi ndị bụ isi: Ọ bụrụ na o kwe mee, chere ma ọ dịkarịa nta ruo oge ụfọdụ ruo mgbe ị na-eche echiche nke ọma karị tupu i kpebie ihe ndị dị ka ma ị ga-ere ụlọ gị ma ọ bụ ịgbanwe ọrụ gị. (Ilu 21:5) Otu nwanyị di ya nwụrụ chetara na ọtụtụ ụbọchị mgbe di ya nwụsịrị, o nyere ndị ọzọ ọtụtụ n’ime ihe onwunwe di ya. Mgbe e mesịrị, ọ ghọtara na o nyewo ndị ọzọ ihe ncheta ndị ọ gụrụ n’ihe ndị dị oké ọnụ ahịa.
Nweere onwe gị ndidi: Iru újú na-adịte anya karịa ka ndị mmadụ n’ozuzu na-aghọta. Ihe ndị na-eme kwa afọ na-eme ka e cheta onye ahụ nwụrụ anwụ a hụrụ n’anya pụrụ ime ka ihe mgbu dị iche iche dịghachi ọhụrụ. Foto ndị pụrụ iche, abụ dị iche iche, ma ọ bụ ọbụna ísìsì pụrụ ịkpali anya mmiri. Otu ihe ọmụmụ sayensi e mere banyere ịbụ onye mmadụ nwụnahụrụ kọwara usoro iru újú n’ụzọ na-esonụ: “Onye mmadụ nwụnahụrụ pụrụ isi n’otu ọnọdụ mmetụta mafere n’ọzọ n’ụzọ dị ịtụnanya na n’ụzọ dị ngwa, ruokwa oge ụfọdụ onye ahụ pụrụ izere ihe ndị na-eme ka e cheta onye ahụ nwụrụ anwụ ma kpachapụ anya mgbe ọzọ na-ewulite ncheta ndị ahụ.” Buru nkwa ndị dị oké ọnụ ahịa nke Jehova n’obi.—Ndị Filipaị 4:8, 9.
Na-enye ohere maka ndị ọzọ: Gbalịa inwe ndidi maka ndị ọzọ. Ghọta na o siiri ha ike. N’amaghị ihe a ga-ekwu, ha pụrụ ikwu ihe na-ezighị ezi n’adịghị akọ.—Ndị Kọlọsi 3:12, 13.
Kpachara anya iji ọgwụ ma ọ bụ ihe ọṅụṅụ na-aba n’anya na-eme ihe iji nagide iru újú gị: Ọ kachasịa mma, ngwọta ọ bụla nke ọgwụ ma ọ bụ ihe ọṅụṅụ na-aba n’anya nyere na-adị nwa oge. E kwesịrị ịṅụ ọgwụ nanị ná nduzi nke onye dọkịta. Ma kpachara anya; ọtụtụ ọgwụ na-eri ahụ. Ọzọkwa, ihe ndị a pụrụ ime ka usoro iru újú dịtee anya. Onye ọkà n’ịkọwa ihe banyere ọrịa na-adọ aka ná ntị, sị: “A ghaghị ịtachi obi n’ihe ọdachi ahụ, taa ahụhụ ya ma n’ikpeazụ ghọta ya, igbochilata nke a gabiga ókè site n’iji ọgwụ mee ka [onye] ahụ ghara ịma ihe na-aganụ pụrụ ịgbatị ma ọ bụ mee ka usoro ahụ hie ụzọ.” Mgbake na-adịte anya ga-abịa site n’ịtụgharị uche ná nzube ukwu dị iche iche nke Jehova.—Abụ Ọma 1:2; 119:97.
Banyeghachi n’usoro ime ihe oge nile: Ọ pụrụ ịdị mkpa ka ị manye onwe gị ná mbụ ije ọrụ, ije ịzụta ihe, ma ọ bụ ilekọta ibu ọrụ ndị ọzọ. Ma ị pụrụ ịchọpụta na ọdịdị nke usoro ime ihe gị ga-abara gị uru nke ukwuu. Bụrụ onye na-arụ ọrụ ndị Kraịst mgbe nile.—Tụlee 1 Ndị Kọrint 15:58.
Egwu atụla gị ịkwụsị oké iru újú gị: Dị ka ọ pụrụ iyi ihe na-eju anya, ụfọdụ ndị mmadụ nwụnahụrụ na-atụ egwu ịkwụsị iru oké újú, na-ekweta na ọ pụrụ igosi na ịhụnanya ha maka onye ahụ nwụrụ anwụ na-ebelata ebelata. Nke ahụ abụghị kpọmkwem otú ọ dị. Ịkwụsị ihe mgbu ahụ na-eme ka ohere dịrị maka ncheta ndị ahụ dị oké ọnụ ahịa bụ́ nke ihe ịrụ ụka na-adịghị ya na ọ ga na-adịgide n’ime gị mgbe nile.—Eklisiastis 3:1, 4.
Echegbubigala onwe gị ókè: Ị pụrụ ịchọpụta na ị na-enye onwe gị nsogbu, ‘Olee ihe ga-abụ ọnọdụ m ugbu a?’ Bible na-adụ ọdụ ka a na-eche echiche banyere otu ụbọchị n’otu mgbe. “Ịdị ndụ na-eche ụbọchị nke ọ bụla ihu na-enyere m aka n’ezie,” ka otu nwanyị di ya nwụrụ na-akọwa. Jisọs gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Unu echegbula onwe unu nye echi: n’ihi na echi ga-echegburu onwe ya.”—Matiu 6:25-34.
[Foto dị na peeji nke 15]
Ihe atụ dị iche iche nke Bible na-egosi na idetu mmetụta gị nile pụrụ inyere gị aka igosipụta iru újú gị
[Foto dị na peeji nke 16]
N’ọdịnala nile, ndị na-eru újú na-enwe ekele maka ịnata nkasi obi