Olileanya E Ji n’Aka Maka Ndị Nwụrụ Anwụ
OTU nwanyị gbara 25 afọ dere, sị: “Na 1981 ọrịa cancer gburu nne kuchiri m. Ọnwụ ya nyere mụ na nwanne m nwoke e kuchiri ekuchi nsogbu nke ukwuu. Adị m 17 afọ, nwanne m nwoke dịkwa 11 afọ. Ọnụnọ ọ na-anọghịzi wutere m nke ukwuu. Ebe e ziworo m na ọ nọ n’eluigwe, n’ihi ya, m chọrọ igbu onwe m iji nọnyere ya. Ọ bụ enyi m kasị mma.”
O yiri ihe ikpe na-ezighị ezi dị na ya na ọnwụ ga-enwe ike iwere onye ị hụrụ n’anya. Mgbe o mekwara, echiche nke enweghị ike ọzọ ịgwa onye ị hụrụ n’anya okwu, isoro ya chịa ọchị, ma ọ bụ ijide ya aka pụrụ ịbụ ihe kasị sie ike idi. A dịghị ehichapụ ihe mgbu ahụ site n’ịbụ onye a gwara na onye ị hụrụ n’anya nọ n’eluigwe.
Otú ọ dị, Bible na-enye olileanya dị iche nke ukwuu. Dị ka anyị rịbaworo ama ná mbụ, Akwụkwọ Nsọ na-egosi na o kwere omume gị na onye ị hụrụ n’anya ịbụ ndị e jikọghachiri ọzọ n’ọdịnihu dị nso, ọ bụghị n’eluigwe nke a na-amaghị ama kama kpọmkwem n’elu ala ebe a n’okpuru ọnọdụ udo na ezi omume. N’oge ahụ, ndị mmadụ ga-enwe olileanya nke inwe ahụ ike zuru okè, ha agaghịkwa anwụ ọzọ. ‘Ma n’ezie nke ahụ bụ echiche a na-ejighị n’aka!’ ka ụfọdụ ndị pụrụ ikwu.
Gịnị ka ọ ga-ewe iji mee ka o doo gị anya na nke a bụ olileanya e ji n’aka? Iji kwere ná nkwa, ọ ga-adị gị mkpa ijide n’aka na onye na-ekwe nkwa ahụ dị njikere ma nwee ike imezu ya. Mgbe ahụ, ònye na-ekwe nkwa na ndị nwụrụ anwụ ga-adị ndụ ọzọ?
N’oge opupu ihe ubi nke 31 O.A., Jisọs Kraịst ji obi ike kwee nkwa, sị: “Dị ka Nna m na-eme ndị nwụrụ anwụ ka ha si n’ọnwụ bilie, dị ka Ọ na-emekwa ka ha dị ndụ, otú a ka Ọkpara Ya na-emekwa ka ndị Ọ na-achọ dị ndụ. Ka ihe a ghara iju unu anya: n’ihi na oge hour na-abịa mgbe ndị nile dị n’ili ga-anụ olu Ya [Jisọs], ha ga-apụtakwa.” (Jọn 5:21, 28, 29) Ee, Jisọs Kraịst kwere nkwa na ọtụtụ nde ndị nwụrụ anwụ ugbu a ga-adị ndụ ọzọ n’elu ala ma nwee olileanya nke ịnọgide n’elu ya ruo mgbe ebighị ebi n’okpuru ọnọdụ udo, nke paradaịs. (Luk 23:43; Jọn 3:16; 17:3; tụlee Abụ Ọma 37:29 na Matiu 5:5.) Ebe Jisọs kwere nkwa ahụ, ọ bụ ihe na-adịghị ize ndụ ịnakwere na ọ dị njikere imezu ya. Ma ò nwere ike ime otú ahụ?
Ihe na-erughị afọ abụọ mgbe o kwesịrị nkwa ahụ, Jisọs gosipụtara n’ụzọ dị ike na ọ dị njikere ma nwee ike ịkpọlite ndị mmadụ n’ọnwụ.
“Lazarọs, Pụta n’Èzí”
Ọ bụ ihe omume na-emetụ n’ahụ. Ọrịa na-arịasi Lazarọs ike. Ụmụnne ya ndị nwanyị abụọ, Meri na Mata, zigaara Jisọs ozi, bụ́ onye nọ n’ofe nke ọzọ nke Osimiri Jọdan: “Onyenwe anyị, lee, ahụ nke onye ahụ Ị hụrụ n’anya adịghị ike.” (Jọn 11:3) Ha maara na Jisọs hụrụ Lazarọs n’anya. Ọ̀ bụ na Jisọs agaghị achọ ịhụ enyi ya na-arịa ọrịa? N’ụzọ a na-atụghị anya ya, kama ịga Betani ozugbo ahụ, Jisọs nọdụrụ ebe ọ nọ ruo ụbọchị abụọ na-esonụ.—Jọn 11:5, 6.
Lazarọs nwụrụ mgbe oge ụfọdụ gasịrị ka e zipụsịrị ozi banyere ọrịa ya. Jisọs matara mgbe Lazarọs nwụrụ, o zubekwara ime ihe banyere ya. N’ikpeazụ mgbe Jisọs bịarutere na Betani, ezi enyi ya anwụworị ụbọchị anọ. (Jọn 11:17, 39) Jisọs ọ̀ pụrụ iweghachi ná ndụ onye nwụworo anwụ ruo ogologo oge dị otú ahụ?
Mgbe ọ nụrụ na Jisọs na-abịa, Mata, nwanyị na-adị njikere ime ihe, gbapụrụ ije zute ya. (Tụlee Luk 10:38-42.) N’ịbụ onye iru újú ya metụrụ n’ahụ, Jisọs mesiri ya obi ike, sị: “Nwanne gị nwoke ga-esi n’ọnwụ bilie.” Mgbe o gosipụtara okwukwe ya na mbilite n’ọnwụ ga-adị n’ọdịnihu, Jisọs gwara ya hoo haa, sị: “Mụ onwe m bụ mbilite n’ọnwụ na ndụ: onye na-ekwere na Mụ, ọbụna ma a sị na ọ nwụrụ anwụ, ọ ga-adị ndụ ọzọ.”—Jọn 11:20-25.
Mgbe ọ bịarutere n’ili ahụ, Jisọs nyere iwu ka e wepụ nkume e ji mechie ọnụ ya. Mgbe ahụ, mgbe o kpesịrị ekpere n’olu dara ụda, o nyere iwu, sị: “Lazarọs, pụta n’èzí.”—Jọn 11:38-43.
Anya onye ọ bụla lekwasịrị n’ili ahụ. Mgbe ahụ, site n’ọchịchịrị ahụ, otu onye pụtara. E ji ihe kee ụkwụ na aka ya, jirikwa ákwà kechie ihu ya. “Tọpụnụ ya, gharakwa ya ka ọ laa,” ka Jisọs nyere iwu. Ihe nkechi ikpeazụ ndị ahụ a tọpụrụ atọpụ dara n’ala. Ee, ọ bụ Lazarọs, nwoke ahụ nwụworo anwụ ruo ụbọchị anọ!—Jọn 11:44.
Ò Mere Eme n’Ezie?
Ọ bụ n’ime Oziọma Jọn ka e dekọrọ akụkọ nke mkpọlite a kpọlitere Lazarọs n’ọnwụ dị ka eziokwu nke akụkọ ihe mere eme. Akụkụ ya dị iche iche doro anya nke ukwuu nke na ọ bụghị akụkọ ifo nkịtị. Ịrụ ụka megide eziokwu nke akụkọ ihe mere eme ya bụ ịrụ ụka megide ọrụ ebube nile nke Bible, tinyere mbilite n’ọnwụ nke Jisọs Kraịst n’onwe ya. Ịgọnahụkwa mbilite n’ọnwụ nke Jisọs bụ ịgọnahụ okwukwe nke ndị Kraịst n’ozuzu ya.—1 Ndị Kọrint 15:13-15.
N’ezie, ọ bụrụ na ị nakwere ịdị adị nke Chineke, i kwesịghị inwe ihe isi ike ikwere ná mbilite n’ọnwụ. Iji mee ihe atụ: Mmadụ pụrụ itinye okwu ike ékpé ikpeazụ ya na tepụ vidio, mgbe ọ nwụsịkwara, ndị ikwu na ndị enyi ya pụrụ ịhụ ma nụ ihe ọ na-ekwu, ya bụ, ka ọ na-akọwa ihe a ga-eme banyere ihe owuwu ya. Otu narị afọ gara aga, ụdị ihe dị otú ahụ adịghị abatatụdị n’echiche. Nyekwa ụfọdụ ndị bi n’akụkụ ndị dịpụrụ adịpụ nke ụwa ugbu a, nkà na ụzụ nke ịkpọ ihe na vidio bụ ihe gabigara nghọta nke ukwuu nke na o yiri ọrụ ebube. Ọ bụrụ na ndị mmadụ pụrụ iji ụkpụrụ dị iche iche nke sayensị nke Onye Okike guzobere mee ihe iji mepụtaghachi ihe omume dị otú ahụ a na-ahụ anya na nke a na-anụ ụda ya, Onye Okike ò kwesịghị inwe ike ime ihe karịrị nke ahụ nke ukwuu? Mgbe ahụ, ọ́ bụghị ihe ezi uche dị na ya na Onye ahụ kere ndụ nwere ikike nke ikeghachi ya?
Ọrụ ebube nke mweghachi nke Lazarọs bịa ná ndụ jere ozi ime ka okwukwe e nwere na Jisọs na ná mbilite n’ọnwụ bukwuo ibu. (Jọn 11:41, 42; 12:9-11, 17-19) N’ụzọ na-emetụ n’ahụ, ọ na-ekpughekwa ịdị njikere na ọchịchọ Jehova na Ọkpara ya ime ka ndị mmadụ si n’ọnwụ bilie.
‘Agụụ Ga-agụ Chineke’
Mmeghachi omume Jisọs n’ebe ọnwụ Lazarọs dị na-ekpughe mmetụta dị nro nke Ọkpara Chineke. Mmetụta ya dị omimi n’oge a na-egosi n’ụzọ pụtara ìhè ọchịchọ ya siri ike nke ịkpọlite ndị nwụrụ anwụ n’ọnwụ. Anyị na-agụ, sị: “Meri, mgbe ọ bịara n’ebe Jisọs nọ, mgbe ọ hụrụ Ya, ọ daa n’ala n’ụkwụ Ya, na-asị Ya, Onyenwe anyị, ọ bụrụ na Ị nọrị n’ebe a, nwanne m nwoke agaghị anwụworị. Ya mere mgbe Jisọs hụrụ ya ka ọ na-akwa ákwá, na ndị Juu ndị soro ya bịa ka ha na-akwakwa ákwá, Ọ sụọ ude n’ime mmụọ Ya, meekwa ka obi lọọ Ya mmiri, O wee sị, Olee ebe unu tọgbọworo ya? Ha sị Ya, Onyenwe anyị, Bịa, leekwa. Anya mmiri pụrụ n’anya Jisọs. Ya mere ndị Juu na-asị, Lee otú Ọ hụrụ ya n’anya!”—Jọn 11:32-36.
E ji okwu atọ n’ebe a gosipụta ọmịiko si n’ala ala obi nke Jisọs: “sụọ ude,” ‘mee ka obi lọọ mmiri,’ na “anya mmiri pụrụ n’anya.” Okwu nke asụsụ mbụ ndị e ji mee ihe n’idekọ ihe omume nke a na-emetụ n’ahụ na-egosi na ọnwụ nke ezi enyi ya bụ́ Lazarọs na ọhụhụ ọ hụrụ nwanne nwanyị Lazarọs ka ọ na-akwa ákwá kpaliri Jisọs n’ụzọ dị omimi nke ukwuu nke na anya mmiri jupụtara n’anya Ya.a
Ihe dị ịrịba ama nke ukwuu bụ na tupu mgbe a Jisọs emewo ka mmadụ abụọ ndị ọzọ bịaghachi ná ndụ. O zubekwara n’ụzọ zuru ezu ime otu ihe ahụ n’ebe Lazarọs nọ. (Jọn 11:11, 23, 25) Ma, “anya mmiri pụrụ n’anya” ya. Mgbe ahụ iweghachi ndị mmadụ ná ndụ abụghị usoro ime ihe nkịtị nye Jisọs. Mmetụta ya dị nro na nke dị omimi dị ka e gosipụtara ya n’oge a na-egosi n’ụzọ pụtara ìhè ọchịchọ ya siri ike imezi ihe nile ọnwụ mebiri.
Ebe ọ bụ na Jisọs bụ ‘onyinyo nke ụdị Jehova Chineke,’ n’ụzọ ziri ezi anyị adịghị atụ anya ihe dị ala n’aka Nna anyị nke eluigwe. (Ndị Hibru 1:3) Banyere ịdị njikere nke Jehova n’onwe ya ime ka ndị mmadụ si n’ọnwụ bilite, nwoke ahụ kwesịrị ntụkwasị obi bụ́ Job kwuru, sị: “Ọ bụrụ na mmadụ anwụọ, ọ̀ ga-adị ndụ ọzọ? . . . Ị ga-akpọ òkù, mụ onwe m ga-azakwa Gị: agụụ ọrụ aka Gị ga-agụ Gị.” (Job 14:14, 15) N’ebe a okwu nke asụsụ mbụ nke a sụgharịrị ‘agụụ ga-agụ gị’ na-egosi ezi agụụ na ọchịchọ nke Chineke. (Jenesis 31:30; Abụ Ọma 84:2) N’ụzọ doro anya, Jehova aghaghị ịtụsi anya mbilite n’ọnwụ ike.
Ànyị pụrụ n’ezie ikwere ná nkwa nke mbilite n’ọnwụ? Ee, e nweghị ihe ịrụ ụka na Jehova na Ọkpara ya dị njikere ma nwee ike imezu ya. Gịnị ka nke a pụtara nye gị? I nwere olileanya nke ịbụ onye e jikọghachiri gị na ndị ị hụrụ n’anya nwụrụ anwụ ọzọ kpọmkwem n’elu ala ebe a kama n’okpuru ọnọdụ ndị dị nnọọ iche!
Jehova Chineke, onye maliteere ihe a kpọrọ mmadụ ndụ n’ime ubi mara mma, ekwewo nkwa iweghachi Paradaịs n’elu ala nke a n’okpuru ọchịchị nke Alaeze eluigwe Ya n’aka Jisọs Kraịst ahụ e meworo ka ọ dị ebube ugbu a. (Jenesis 2:7-9; Matiu 6:10; Luk 23:42, 43) N’ime Paradaịs ahụ e weghachiri eweghachi, ezinụlọ mmadụ ga-enwe olileanya nke ịdị ndụ na-adịghị agwụ agwụ, na-enwere onwe ha pụọ n’ahụ adịghị ike na ọrịa nile. (Mkpughe 21:1-4; tụlee Job 33:25; Aịsaịa 35:5-7.) Ihe na-adịghịzikwa ga-abụ ịkpọasị nile, ịkpọasị agbụrụ, ime ihe ike agbụrụ, na mkpagbu akụ na ụba. Ọ ga-abụ n’ime ụwa dị otú ahụ dị ọcha ka Jehova Chineke site n’aka Jisọs Kraịst ga-akpọlite ndị nwụrụ anwụ ịbanye.
Nke ahụ bụ ugbu a olileanya nke nwanyị onye Kraịst ahụ a kpọtụrụ aha ná mmalite nke nkebi nke a. Ọtụtụ afọ mgbe nne ya nwụsịrị, Ndịàmà Jehova nyeere ya aka iji nlezianya mụọ Bible. Ọ na-echeta, sị: “Mgbe m mụtasịrị ihe banyere olileanya nke mbilite n’onwụ, akwara m ákwá. Ọ bụ ihe magburu onwe ya ịmara na m ga-ahụ nne m ọzọ.”
Ọ bụrụ na n’otu aka ahụ obi gị na-enwe agụụ nke ịhụ onye ị hụrụ n’anya ọzọ, obi ga-adị Ndịàmà Jehova ụtọ inyere gị aka ịmụta otú ị pụrụ isi mee ka olileanya nke a e ji n’aka bụrụ kpọmkwem nke gị. Gịnị ma ị kpọtụrụ ha n’otu Ụlọ Nzukọ Alaeze dị gị nso, ma ọ bụ degaa akwụkwọ n’otu adres kasị nso e depụtara na peji nke 32.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Okwu Grik a sụgharịrị “sụọ ude” sitere na ngwaa okwu bụ́ (em·bri·maʹo·mai) nke na-egosipụta ịbụ onye a kpaliri n’ụzọ dị mwute, ma ọ bụ n’ụzọ dị omimi. Otu onye mmụta Bible na-ekwu, sị: “N’ebe a ọ pụrụ nanị ịpụta na mmetụta uche dị omimi dị otú ahụ jichiri Jisọs nke na ịsụ ude ọ na-apụghị ịchịkwa si n’ime obi Ya pụta.” Okwu ahụ a sụgharịrị ‘mee ka obi lọọ mmiri’ na-esite n’okwu Grik bụ́ (ta·rasʹso) nke na-egosi nsogbu. Dị ka ihe otu onye na-ede akwụkwọ ọkọwa okwu kwuru si dị, ọ pụtara “ịkpatara mmadụ ọgba aghara n’ime, . . . ịbụ onye oké ihe mgbu ma ọ bụ iru újú metụtara.” Okwu ahụ bụ́ “anya mmiri pụrụ n’anya” sitere ná ngwaa okwu Grik bụ́ (da·kryʹo) nke pụtara “ibepụta anya mmiri, ịkwa ákwá n’olu dị ala.”
Ajụjụ Ndị A Ga-echere Echiche
Mgbe enyi ya bụ́ Lazarọs nwụrụ, olee otú Jisọs si gosipụta na Ọ dị njikere ma nwee ike ime ka o si n’ọnwụ bilite?
N’ihi gịnị ka anyị pụrụ iji nakwere ihe ndekọ nke Bible banyere mbilite n’ọnwụ Lazarọs dị ka eziokwu nke akụkọ ihe mere eme?
Olee otú ihe ndekọ dị na Jọn isi 11 si na-ekpughe ọchịchọ siri ike nke Jisọs imezi ihe ndị ọnwụ mebiri?
Gịnị na-egosi na Jehova Chineke na-atụsi anya mbilite n’ọnwụ ike?
Igbe dị na peeji nke 28]
Akụkụ Akwụkwọ Nsọ Ndị Na-akasi Obi
Ọtụtụ mgbe, n’ịkọwa otú ha siworo nagide iru újú ha, ndị Kraịst kwesịrị ntụkwasị obi ekwuwo, sị: “Ka m gwa gị akụkụ Bible kasị atọ m ụtọ.” Ọ bụrụ na ị na-eru újú, ma eleghị anya ụfọdụ n’ime akụkụ akwụkwọ nsọ ndị a ga-enyekwara gị aka.
“Onye a gọziri agọzi ka ọ bụ . . . bụ́ Nna nke obi ebere nile na Chineke nke nkasi obi nile; Onye na-akasi anyị obi ná mkpagbu anyị nile.”—2 Ndị Kọrint 1:3, 4.
“Ị na-asaghe aka Gị, ị na-ewerekwa ihe dị ihe ọ bụla dị ndụ ụtọ mee ka afọ ju ya.”—Abụ Ọma 145:16.
‘O [Chineke] debewo otu ụbọchị, nke Ọ ga-ekpe elu ụwa dum mmadụ bi ikpe n’ezi omume n’ime ya site n’aka otu Nwoke Ọ kara aka; O nyekwara mmadụ nile ihe ha ga-eji kwere nke a, ebe O mere ka O si ná ndị nwụrụ anwụ bilie.’—Ọrụ 17:31.
“Mụ onwe m, ọbụna Mụ onwe m, bụ Onye ahụ na-akasi unu obi.”—Aịsaịa 51:12.
“Dị ka onye nke nne ya na-akasi obi, otú a ka Mụ onwe m ga-akasi unu obi.”—Aịsaịa 66:13.
“Nke a bụ nkasi obi m n’ime mweda n’ala m: na okwu ọnụ Gị emewo ka m dị ndụ. Echetawo m ikpe Gị nile site ná mgbe ebighị ebi, Jehova, wee kasie onwe m obi. Biko, kwee ka ebere Gị bụrụ ihe ga-akasi obi m, dị ka okwu ọnụ Gị nke dịịrị ohu Gị si dị.”—Abụ Ọma 119:50, 52, 76.
“Oge hour na-abịa mgbe ndị nile dị n’ili ga-anụ olu Ya, ha ga-apụtakwa; ndị mere ezi ihe ga-aba ná mbilite n’ọnwụ nke ndụ.”—Jọn 5:28, 29.
[Foto dị na peeji nke 26]
Mmetụta dị nro nke Jisọs mgbe ọ na-akpọlite Lazarọs n’ọnwụ gosipụtara ọchịchọ ya siri ike imezi ihe ndị ọnwụ mebiri
[Foto dị na peeji nke 30]
Mbilite n’ọnwụ, na-adabere n’àjà mgbapụta nke Kraịst Jisọs, ga-ewetara mba nile ọṅụ