Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • fy isi 2 p. 13-26
  • Ịkwadebe Maka Alụmdi na Nwunye Na-aga nke Ọma

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ịkwadebe Maka Alụmdi na Nwunye Na-aga nke Ọma
  • Isi Ihe Na-akpata Obi Ụtọ Ezinụlọ
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ị̀ DỊ NJIKERE MAKA ALỤMDI NA NWUNYE?
  • BURU ỤZỌ MARA ONWE GỊ
  • IHE Ị GA-ELE ANYA YA N’ONYE Ị GA-ALỤ
  • BURU ỤZỌ MEE NCHỌPỤTA
  • MEE KA MBEDO UNU DỊ NSỌPỤRỤ
  • ILE ANYA GABIGA ỤBỌCHỊ AGBAMAKWỤKWỌ AHỤ
  • Alụmdi na Nwunye Bụ Onyinye Chineke Nwere Ịhụnanya Nyere Anyị
    “Nọrọnụ n’Ịhụnanya Chineke”
  • Gịnị Dị Mkpa Iji Nwee Alụmdi na Nwunye Na-aga nke Ọma?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1999
  • Nduzi Chineke Maka Ịhọrọ Onye Òtù Ọlụlụ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2001
  • Ụzọ Isi Mee Ka Alụmdi na Nwunye Gị Sikwuo Ike
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2003
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Isi Ihe Na-akpata Obi Ụtọ Ezinụlọ
fy isi 2 p. 13-26

ISI NKE ABỤỌ

Ịkwadebe Maka Alụmdi na Nwunye Na-aga nke Ọma

Foto dị na peeji nke 13

1, 2. (a) N’ụzọ dị aṅaa ka Jisọs si mesie ike mkpa ọ dị ime atụmatụ? (b) N’ihe omume dị aṅaa ka ime atụmatụ dị oké mkpa?

IWU ụlọ na-achọ nkwadebe e ji nlezianya mee. Tupu a na-atọ ntọala ya, a ghaghị inweta ala ma see ụkpụrụ. Otú ọ dị, ihe ọzọ dị mkpa. Jisọs sịrị: “Ònye n’ime unu, nke na-achọ iwu ụlọ elu, na-ebughị ụzọ nọdụ ala gụọ ego ọ ga-ewe, ma o nwere ego ọ ga-eji rụzuo ya?”—Luk 14:28.

2 Ihe bụ eziokwu banyere iwu ụlọ metụtakwara iwu alụmdi na nwunye na-aga nke ọma. Ọtụtụ na-asị: “Achọrọ m ịlụ nwunye ma ọ bụ di.” Ma mmadụ ole na-akwụsị ma tụlee ihe ọ ga-ewe? Ọ bụ ezie na Bible na-ekwu okwu ọma banyere alụmdi na nwunye, ọ na-adọrọkwa uche gaa n’ihe ịma aka ndị alụmdi na nwunye na-eweta. (Ilu 18:22; 1 Ndị Kọrint 7:28) Ya mere, ọ dị ndị na-eche echiche ịlụ di ma ọ bụ nwunye mkpa inwe echiche ziri ezi banyere ma ngọzi nile nke ịlụ di ma ọ bụ nwunye ma banyere ihe ndị ọ na-ewe.

3. N’ihi gịnị ka Bible ji bụrụ ihe inyeaka bara uru nye ndị na-eme atụmatụ maka alụmdi na nwunye, ajụjụ atọ dịkwa aṅaa ka ọ ga-enyere anyị aka ịza?

3 Bible pụrụ inye aka. Ndụmọdụ ya sitere n’ọnụ Onye Mmalite nke alụmdi na nwunye, Jehova Chineke. (Ndị Efesọs 3:14, 15; 2 Timoti 3:16) N’iji ụkpụrụ ndị a na-achọta n’akwụkwọ nduzi ahụ meworo ochie, bụ́ ndị ka dị nnọọ irè n’oge a mee ihe, ka anyị chọpụta (1) Olee otú mmadụ pụrụ isi mata ma ọ dịwo njikere maka alụmdi na nwunye? (2) Gịnị ka e kwesịrị ile anya ya n’onye a ga-alụ? na (3) Olee otú a pụrụ isi mee mbedo n’ụzọ dị nsọpụrụ?

Ị̀ DỊ NJIKERE MAKA ALỤMDI NA NWUNYE?

4. Olee ihe gbara ọkpụrụkpụ dị n’ịnọgide n’alụmdi na nwunye nke na-aga nke ọma, n’ihi gịnịkwa?

4 Iwu ụlọ pụrụ iwe oké ego, ma ịhụ maka nlekọta ya ruo ogologo oge na-ewekwa oké ego. Ọ dị otú ahụ n’alụmdi na nwunye. Ịlụ di ma ọ bụ nwunye yiri oké ihe ịma aka; ma, a ghaghị ịtụlekwa ịnọgide ná mmekọrịta alụmdi na nwunye site n’afọ ruo n’afọ. Gịnị ka ịnọgide ná mmekọrịta dị otú ahụ na-agụnye? Otu ihe dị mkpa bụ nraranye sitere n’obi dum. Lee otú Bible si kọwaa mmekọrịta alụmdi na nwunye: “Nwoke ga-ahapụ nna ya na nne ya, rapara n’ahụ nwunye ya: ha ewee ghọọ otu anụ ahụ.” (Jenesis 2:24) Jisọs Kraịst nyere ihe ndabere Akwụkwọ Nsọ e nwere nanị ya maka ịgba alụkwaghịm na-enwe ikike nlụgharị—“ịkwa iko,” ya bụ, mmekọahụ na-ezighị ezi n’èzí alụmdi na nwunye. (Matiu 19:9) Ọ bụrụ na ị na-eche echiche ịlụ di ma ọ bụ nwunye, buru ụkpụrụ Akwụkwọ Nsọ ndị a n’uche. Ọ bụrụ na i jikerebeghị maka nraranye nke a siri ike, mgbe ahụ ị dịbeghị njikere maka alụmdi na nwunye.—Deuterọnọmi 23:21; Eklisiastis 5:4, 5.

5. N’agbanyeghị na nraranye ahụ siri ike nke alụmdi na nwunye na-emenye ụfọdụ ụjọ, gịnị mere ndị na-achọ ịlụ di na nwunye ji kwesị nnọọ iji ya kpọrọ ihe?

5 Echiche nke nraranye siri ike na-emenye ọtụtụ ndị ụjọ. “Ịmara na e kekọtawo anyị abụọ ná ndụ mere ka ọ dị m ka a kpachigidere m, gebichie m, kpọchibidokwa m kpam kpam,” ka otu nwa okorobịa kwupụtara. Ma ọ bụrụ na ị hụrụ onye ị na-achọ ịlụ n’anya n’ezie, nraranye agaghị eyi ibu arọ. Kama nke ahụ, a ga-ele ya anya dị ka isi iyi nke ịnọ ná ntụkwasị obi. Echiche nke nraranye a na-ekwu maka ya n’alụmdi na nwunye ga-eme ka di na nwunye chọọ ịnọkọ ọnụ n’oge ndị dị mma na ndị dị njọ na ịkwadorịta onwe ha ihe ọ sọrọ ya mee. Onye Kraịst bụ́ Pọl onyeozi dere na ezi ịhụnanya “na-anagide ihe nile” ma “na-enwe ntachi obi n’ihe nile.” (1 Ndị Kọrint 13:4, 7) “Nraranye nke alụmdi na nwunye na-eme ka m nọrọkwuo ná ntụkwasị obi,” ka otu nwanyị na-ekwu. “Ntụsara ahụ nke na anyị agwawo onwe anyị na ụwa na anyị chọrọ ịrapagide n’ahụ ibe anyị na-atọ m ụtọ.”—Eklisiastis 4:9-12.

6. N’ihi gịnị ka o ji kasị mma ka a ghara iji ọsọ gbaba n’alụmdi na nwunye n’afọ ndụ dị nta?

6 Ibi ndụ n’ụzọ kwekọrọ ná nraranye dị otú ahụ na-achọ ntozu okè. N’ihi ya, Pọl na-adụ ọdụ na ndị Kraịst ga-eme nke ọma karị ịghara ịlụ ruo mgbe ha “gabigaworo ntoju ntorobịa,” oge mgbe mmetụta mmekọahụ na-esi ike, nweekwa ike imegharị mmadụ uche. (1 Ndị Kọrint 7:36, NW) Ndị na-eto eto na-agbanwe ngwa ngwa ka ha na-etolite. Ọtụtụ ndị lụrụ mgbe ha dị nnọọ nta na-achọpụta na mgbe nanị afọ ole na ole gafere mkpa na ọchịchọ ha dị iche iche, nakwa ndị nke onye ha lụrụ, agbanwewo. Ndekọ ọnụ ọgụgụ na-ekpughe na ndị nọ n’afọ iri na ụma bụ́ ndị lụrụ di ma ọ bụ nwunye yikarịrị ka ha agaghị enwe obi ụtọ, chọọkwa ịgba alụkwaghịm karịa ndị chetukwuru ogologo oge karị. Ya mere ejila ọsọ gbaba n’alụmdi na nwunye. Afọ ụfọdụ e biri ndụ dị ka onye metụworo okenye nke nọ nanị ya, nke ka na-eto eto pụrụ inye gị ahụmahụ dị oké ọnụ ahịa nke ga-eme ka i tozukwuo okè ma rukwuo eru ịbụ di ma ọ bụ nwunye dị mma. Icheretụ ntakịrị tupu a lụọ di ma ọ bụ nwunye pụkwara inyere gị aka ịghọta onwe gị nke ọma karị—ihe dị mkpa ma ọ bụrụ na ị ga-azụlite mmekọrịta na-aga nke ọma n’alụmdi na nwunye gị.

BURU ỤZỌ MARA ONWE GỊ

7. N’ihi gịnị ka ndị na-eme atụmatụ ịbanye n’alụmdi na nwunye ji kwesị iburu ụzọ nyochaa onwe ha?

7 Ọ̀ dịịrị gị mfe idepụta àgwà ndị ị chọrọ n’aka onye ị ga-alụ? Ọ na-adịrị ọtụtụ ndị mfe. Otú ọ dị, gịnị banyere àgwà ndị nke gị? Àgwà dị aṅaa ka i nwere bụ́ ndị ga-enyere gị aka ịtụnye ụtụ n’alụmdi na nwunye na-aga nke ọma? Ụdị di ma ọ bụ nwunye dị aṅaa ka ị ga-abụ? Dị ka ihe atụ, ọ̀ na-adịrị gị mfe ịnakwere njehie gị ma nabata ndụmọdụ, ka ị̀ na-agọpụkarịrị onwe gị mgbe a gbaziri gị olu? Ị̀ na-enwekarị ihu ọchị ma na-enwe nchekwube, ka ị̀ na-agbarụkarị ihu, na-eme mkpesa mgbe nile? (Ilu 8:33; 15:15) Cheta, alụmdi na nwunye agaghị agbanwe ụdịdị mmadụ gị. Ọ bụrụ na ị dị nganga, na-enwebiga mmetụta ókè, ma ọ bụ ghara inwe nchekwube nke ukwuu mgbe ị na-alụbeghị di ma ọ bụ nwunye, ị ga-adịkwa otú ahụ mgbe ị lụrụ di ma ọ bụ nwunye. Ebe o siri ike ịhụta onwe anyị n’ụzọ ndị ọzọ si ahụ anyị, gịnị ma ị jụọ onye bụ nne ma ọ bụ nna ma ọ bụ enyi ị tụkwasịrị obi maka okwu na aro ndị si n’ezi obi? Ọ bụrụ na ị mata mgbanwe ndị a pụrụ ime, rụọ ọrụ ná ndị a tupu i were nzọụkwụ nke ịlụ di ma ọ bụ nwunye.

Foto ndị dị na peeji nke 19

Mgbe ị ka nọ nanị gị, zụlite àgwà, omume, na ikike ndị ga-abara gị uru n’alụmdi na nwunye

8-10. Ndụmọdụ dị aṅaa ka Bible na-enye nke ga-enyere mmadụ aka ịkwadebe maka alụmdi na nwunye?

8 Bible na-agba anyị ume ikwe ka mmụọ nsọ Chineke rụọ ọrụ n’ime anyị, na-amịpụta mkpụrụ ndị dị ka “ịhụnanya, ọṅụ, udo, ogologo ntachi obi, obi ọma, ịdị mma, ikwesị ntụkwasị obi, ịdị nwayọọ, imeru ihe n’ókè.” Ọ na-agwakwa anyị ka “e meekwa ka uche [anyị] dị ọhụrụ ná mmụọ nke uche [anyị]” nakwa ‘iyikwasị mmadụ ọhụrụ, nke e kere dị ka Chineke chọrọ n’ime ezi omume na ịdị ọcha nke eziokwu ahụ.’ (Ndị Galetia 5:22, 23; Ndị Efesọs 4:23, 24) Itinye ndụmọdụ nke a n’ọrụ mgbe ị na-alụbeghị di ma ọ bụ nwunye ga-adị ka itinye ego n’ụlọ akụ̀—ihe ga-aba nnọọ uru n’ọdịnihu, mgbe ị lụrụ di ma ọ bụ nwunye.

9 Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na ị bụ nwanyị, mụta ilebakwu anya ná “mmadụ zoro ezo nke mkpụrụ obi” karịa ka ị na-eme banyere ọdịdị elu ahụ gị. (1 Pita 3:3, 4) Ịdị obi umeala na uche zuru okè ga-enyere gị aka inwe amamihe, bụ́ “okpueze mara mma” n’eziokwu. (Ilu 4:9; 31:10, 30; 1 Timoti 2:9, 10) Ọ bụrụ na ị bụ nwoke, mụta imeso ndị inyom n’ụzọ obi ọma na nkwanye ùgwù. (1 Timoti 5:1, 2) Ka ị na-amụta ime mkpebi na iburu ibu ọrụ, mụtakwa ịdị obi umeala. Omume aka ike ga-eduba ná nsogbu n’alụmdi na nwunye.—Ilu 29:23; Maịka 6:8; Ndị Efesọs 5:28, 29.

10 Ọ bụ ezie na ime ka uche dị ọhụrụ n’akụkụ ndị a abụghị ihe dị mfe, ọ bụ ihe ndị Kraịst nile kwesịrị ịrụ ọrụ banyere ya. Ọ ga-enyekwara gị aka ịbụ di ma ọ bụ nwunye nke ka mma.

IHE Ị GA-ELE ANYA YA N’ONYE Ị GA-ALỤ

11, 12. Olee ụzọ mmadụ abụọ pụrụ isi chọpụta ma ha kwekọrọ ma ọ bụ na ha ekwekọghị?

11 Ọ̀ bụ omenala n’akụkụ ebe i bi ka mmadụ jiri aka ya họrọ onye ọ ga-alụ? Ọ bụrụ otú ahụ, olee otú i kwesịrị isi gaa n’ihu mgbe ị hụrụ onye na-abụghị nwoke ma ọ bụ nwanyị ibe gị nke na-adọrọ mmasị gị? Mbụ, jụọ onwe gị, ‘Alụmdi na nwunye ọ̀ bụ nzube m n’ezie?’ Ọ bụ arụrụala iji mmetụta nke onye ọzọ egwu egwu site n’ịkpalite atụmanya ụgha. (Ilu 13:12) Mgbe ahụ, jụọ onwe gị sị, ‘Ànọ m n’ọnọdụ ịlụ di ma ọ bụ nwunye?’ Ọ bụrụ na azịza nye ajụjụ abụọ ndị a bụ ee, nzọụkwụ ọzọ ị ga-ewere ga-adị iche na-adabere n’omenala ógbè ahụ. N’ala ụfọdụ, mgbe i lesịrị onye ahụ anya ruo nwa oge, ị pụrụ ịgakwuru onye ahụ ma kwupụta ọchịchọ ka unu marakwuo onwe unu. Ọ bụrụ na azịza ya bụ ee e, esila ọnwụ ruo n’ókè nke ịbụ onye a na-achọkwaghị. Cheta, onye nke ọzọ ahụ nwekwara ikike ime mkpebi n’okwu ahụ. Otú ọ dị, ọ bụrụ na azịza ya bụ ee, ị pụrụ idokwa iwepụta oge nọkọọ ọnụ n’ihe omume ndị na-ewuli elu. Nke a ga-enye gị ohere ịhụ ma ịlụ onye a ọ ga-abụ ihe amamihe dị na ya.a Gịnị ka ị ga-ele anya maka ya n’oge a?

12 Iji zaa ajụjụ ahụ, chee echiche banyere ihe abụọ e ji eti egwu, ikekwe piano na ụbọ akwara. Ọ bụrụ na a hazie ha nke ọma, nke ọ bụla n’ime ha pụrụ iwepụta egwú mara mma n’onwe ya. Ma, gịnị ga-eme ma ọ bụrụ na e tikọta ngwá egwú ndị a ọnụ? Ugbu a ha abụọ aghaghị ikwekọ n’ibe ha. Ọ bụ otu ihe ahụ n’ebe gị na onye ị na-ele anya ịlụ nọ. Onye ọ bụla n’ime unu pụwororịị ịrụ ọrụ iji “hịzie” àgwà njimara onwe unu dị ka ndị mmadụ n’otu n’otu. Ma ajụjụ dị ugbu a bụ: Olu gị na ya hà na-adakọ? Ikwu ya n’ụzọ ọzọ, ùnu kwekọrọ?

13. Gịnị mere o ji bụrụ ihe amamihe na-adịghị ya isoro onye gị na ya na-enweghị otu okwukwe banye ná mbedo?

13 Ọ dị mkpa ka unu abụọ nwee otu ụdị nkwenkwe na ụkpụrụ. Pọl onyeozi dere, sị: “Unu na ndị na-ekweghị ekwe ekekọtala onwe unu.” (2 Ndị Kọrint 6:14; 1 Ndị Kọrint 7:39) Ịlụ onye na-enweghị okwukwe i nwere na Chineke na-eme ka o yikarịa ka a ga-enwe oké enweghị nkwekọrịta. N’aka nke ọzọ, nsọpụrụ e nwekọrọ ọnụ nye Jehova Chineke bụ ihe ndabere kasị ike maka ịdị n’otu. Jehova chọrọ ka i nwee obi ụtọ na ka ị nụ ụtọ nke nkekọ kasị chie anya a pụrụ inwe nke gị na onye ị na-alụ. Ọ chọrọ ka e kekọta unu na Ya na otu onye n’ebe ibe ya nọ site n’ụdọ atọ nke a tụkọtara n’otu n’ịhụnanya.—Eklisiastis 4:12.

14, 15. Inwe otu okwukwe ọ̀ bụ ya bụ nanị akụkụ nke ịdị n’otu e nwere n’alụmdi na nwunye? Kọwaa.

14 Ọ bụ ezie na ifekọ Chineke ọnụ bụ akụkụ kasị mkpa nke ịdị n’otu, ọ gụnyere ihe karịrị nke ahụ. Iji bụrụ ndị a hịziri ikwekọ n’ibe ha, gị na onye ị na-achọ ịlụ kwesịrị inwe ihe mgbaru ọsọ yiri ibe ha. Gịnị bụ ihe mgbaru ọsọ unu? Dị ka ihe atụ, olee ihe unu abụọ chere banyere ịmụ ụmụ? Ihe ndị dị aṅaa na-ewere ọnọdụ mbụ ná ndụ unu?b (Matiu 6:33) N’alụmdi na nwunye na-aga nke ọma n’ezie, di na nwunye ahụ bụ ezi ndị enyi ma na-anụ ụtọ nke nnọkọrịta ibe ha. (Ilu 17:17) Maka nke a, ọ dị ha mkpa inwe otu ụdị ihe ndị na-amasị ha. Ọ bụ ihe siri ike ijigide ọbụbụenyi chiri anya—ma ya fọdụzie alụmdi na nwunye—mgbe ọ na-adịghị otú ahụ. Ọzọ, ọ bụrụ na otu ihe omume, dị ka ime mkpagharị, na-atọ onye ọ bụ gị na ya ụtọ, ma ọ dịghị atọ gị, nke ahụ ọ̀ na-apụta na unu abụọ ekwesịghị ịlụ? Ọ bụchaghị otú ahụ. Ikekwe unu na-enwekọ ihe mmasị ndị ọzọ ka mkpa. Ọzọkwa, ị pụrụ ime onye ọ bụ gị na ya obi ụtọ site n’ikere òkè n’ihe omume ndị na-ewuli elu n’ihi na ha na-atọ onye nke ọzọ ahụ ụtọ.—Ọrụ 20:35.

15 N’ezie, ruo n’ókè dị ukwuu, a na-ekpebi nkwekọ site n’ụzọ unu abụọ si eme mgbanwe iji kwekọọ karịa otú unu abụọ si yie. Kama ịjụ, “Ànyị na-ekwekọrịta n’ihe nile?” ajụjụ ụfọdụ ka mma pụrụ ịbụ: “Gịnị na-eme mgbe anyị nwere nghọtahie? Ànyị pụrụ ịtụle okwu n’ụzọ dị jụụ, na-ekenye onye ọ bụla nsọpụrụ na nkwanye ùgwù? Ka mkparịta ụka ọ̀ na-aghọkarị ihe na-akpata arụmụka kpụ ọkụ n’ọnụ?” (Ndị Efesọs 4:29, 31) Ọ bụrụ na ị chọrọ ịlụ di ma ọ bụ nwunye, kpachara anya banyere onye ọ bụla dị nganga ma na-achọkarị ka e kwenyere ya, onye na-adịghị achọ ikwenye, ma ọ bụ onye na-esikarị ọnwụ ma na-aghọ aghụghọ iji nweta ihe ọ na-achọ.

BURU ỤZỌ MEE NCHỌPỤTA

16, 17. Gịnị ka nwoke ma ọ bụ nwanyị pụrụ ile anya ha mgbe ọ na-atụle onye ọ chọrọ ịlụ?

16 N’ime ọgbakọ ndị Kraịst, a ‘na-ebu ụzọ nwalee’ ndị a na-enyefe ibu ọrụ n’aka. (1 Timoti 3:10) Gị onwe gị kwa pụrụ itinye ụkpụrụ a n’ọrụ. Dị ka ihe atụ, nwanyị pụrụ ịjụ, “Aha dị aṅaa ka nwoke a nwere? Olee ndị bụ ndị enyi ya? Ọ̀ na-egosipụta njide onwe onye? Olee ụzọ o si emeso ndị agadi? N’ụdị ezinụlọ dị aṅaa ka o siri pụta? Olee ụzọ ya na ha si emekọrịta ihe? Gịnị bụ omume ya n’ebe ego dị? Ọ̀ na-aṅụbiga ihe ọṅụṅụ na-aba n’anya ókè? Ọ̀ na-ewe iwe ọsọ ọsọ, ọbụna na-eme ihe ike? Ibu ọrụ ọgbakọ ndị dị aṅaa ka o nwere, oleekwa ụzọ o si emezu ha? Àpụrụ m ịkwanyere ya ùgwù n’ụzọ dị omimi?”—Levitikọs 19:32; Ilu 22:29; 31:23; Ndị Efesọs 5:3-5, 33; 1 Timoti 5:8; 6:10; Taịtọs 2:6, 7.

17 Nwoke pụrụ ịjụ, “Nwanyị a ọ̀ na-egosipụta ịhụnanya na nkwanye ùgwù maka Chineke? Ò nwere ike ilekọta ebe obibi? Gịnị ka ezinụlọ ya ga-atụ anya ya n’aka anyị? Ọ̀ maara ihe, na-arụsi ọrụ ike, ghara ịdị na-eme oké mmefu? Gịnị ka ọ na-ekwukarị banyere ya? Ò nwere ezi nchegbu banyere ọdịmma nke ndị ọzọ, ka ọ̀ bụ onye na-echebara nanị onwe ya echiche, onye na-etinye ọnụ n’ihe na-agbasaghị ya? À pụrụ ịtụkwasị ya obi? Ọ̀ dị njikere ido onwe ya n’okpuru ịbụisi, ka ọ̀ bụ onye isi ike, ikekwe ọbụna na-enupụ isi?”—Ilu 31:10-31; Luk 6:45; Ndị Efesọs 5:22, 23; 1 Timoti 5:13; 1 Pita 4:15.

18. Ọ bụrụ na a hụta adịghị ike ndị dị nta n’oge mbedo, gịnị ka e kwesịrị iburu n’uche?

18 Echefula na ị na-emeso nwa Adam nke na-ezughị okè ihe, ọ bụghị nwoke ma ọ bụ nwanyị bụ dike a na-ele anya dị ka onye zuru okè nke a na-ahụ n’akwụkwọ ịhụnanya. Onye ọ bụla nwere amaghị eme ya dị iche iche, a ga-elegharakwa ụfọdụ n’ime ndị a anya—ma nke gị ma nke onye ị na-achọ ịlụ. (Ndị Rom 3:23; Jemes 3:2) Ọzọkwa, ihe a hụrụ dị ka adịghị ike pụrụ inye ohere maka uto ime mmụọ. Dị ka ihe atụ, ka e were ya na unu nwere nrụrịta ụka n’oge mbedo unu. Tụlee: Ọbụna ndị hụrụ ibe ha n’anya ma na-akwanyere onwe ha ùgwù na-ese okwu mgbe ụfọdụ. (Tụlee Jenesis 30:2; Ọrụ 15:39.) Ọ̀ pụrụ ịbụ na ọ dị unu abụọ mkpa nanị ‘igbochikwu mmụọ unu’ nke nta ma mụta ụzọ isi dozie nsogbu n’udo? (Ilu 25:28) Onye ị na-achọ ịlụ ọ̀ na-egosi ọchịchọ nke imeziwanye ihe? Ị̀ na-egosi? Ị̀ pụrụ ịmụta ịghara ịdị na-enwe ahụ ntakasị, ịghara ịdị na-ewekarị iwe? (Eklisiastis 7:9) Ịmụta idozi nsogbu pụrụ iguzobe usoro nke nkwurịta okwu n’eziokwu nke dị mkpa ma ọ bụrụ na unu abụọ alụọ di na nwunye.—Ndị Kọlọsi 3:13.

19. Gịnị ka ọ ga-abụ ihe amamihe ime ma ọ bụrụ na nsogbu ndị siri ike ebilite n’oge mbedo?

19 Ma, gịnị ma ọ bụrụ na ị chọpụta ihe ndị na-enye gị oké nsogbu? E kwesịrị iji nlezianya tụlee obi abụọ ndị ahụ. N’agbanyeghị ụdị mmetụta ịhụnanya i nwere ma ọ bụ otú o si na-ahụ̀ gị ahụ̀ ịlụ di ma ọ bụ nwunye, emechila anya gị nye ntụpọ ndị siri oké ike. (Ilu 22:3; Eklisiastis 2:14) Ọ bụrụ na gị na onye i nwere oké ihe ndị na-esichaghị gị ike n’obi naakpakọrịta, ọ bụ ihe amamihe ịkwụsị mmekọrịta ahụ na izere ime nraranye na-adịgide adịgide nye onye ahụ.

MEE KA MBEDO UNU DỊ NSỌPỤRỤ

20. Olee ụzọ ndị nọ ná mbedo ga-esi debe omume ọma ha ka ọ ghara inwe nkọcha?

20 Olee ụzọ unu pụrụ isi mee ka mbedo unu dị nsọpụrụ? Mbụ, jide n’aka na omume ọma gị enweghị nkọcha. N’ebe i bi, à na-ele ijide aka, isusu ọnụ, ma ọ bụ mmakụ anya dị ka akparamàgwà kwesịrị ekwesị maka ndị na-alụbeghị di na nwunye? Ọ bụrụgodị na a dịghị ele ngosipụta nke ịhụnanya dị otú ahụ anya ọjọọ, e kwesịrị ime ha nanị mgbe mmekọrịta ahụ ruworo n’ókè ebe e meworo atụmatụ alụmdi na nwunye. Kpachara anya ka ngosipụta nke ịhụnanya ghara ịgafe ókè banye n’omume na-adịghị ọcha ma ọ bụ ọbụna ịkwa iko. (Ndị Efesọs 4:18, 19; tụlee Abụ nke Abụ 1:2; 2:6; 8:5, 9, 10.) N’ihi na obi dị aghụghọ, unu abụọ ga-abụ ndị maara ihe izere ịbụ ndị nọ nanị ha n’ime ụlọ, n’ebe obibi, n’ụgbọ ala a dọbara otu ebe, ma ọ bụ n’ebe ọ bụla ọzọ nke ga-enye ohere maka omume na-adịghị mma. (Jeremaịa 17:9) Idebe mbedo unu ọcha n’ụzọ omume na-enye ihe àmà doro anya na i nwere njide onwe onye nakwa na ị na-ebute nchegbu achọghị ọdịmma onwe onye nanị maka ọdịmma onye nke ọzọ ụzọ tupu ọchịchọ ndị nke gị. Nke ka mkpa, mbedo dị ọcha ga-atọ Jehova Chineke ụtọ, bụ́ onye nyere ndị ohu ya iwu ka ha gbanarị adịghị ọcha na ịkwa iko.—Ndị Galetia 5:19-21.

21. Nkwurịta okwu dị aṅaa n’obi eziokwu pụrụ ịdị mkpa iji wee nwee mbedo dị nsọpụrụ?

21 Nke abụọ, mbedo dị nsọpụrụ gụnyekwara nkwurịta okwu n’eziokwu. Ka mbedo unu na-aga n’ihu iru agbamakwụkwọ, ọ ga-adị mkpa ka a tụlee ihe ụfọdụ hoo haa. Olee ebe unu ga-ebi? Unu abụọ ùnu ga-arụ ọrụ ego? Ùnu chọrọ ịmụ ụmụ? Ọzọkwa, ọ dị nnọọ mma ikpughe ihe dị iche iche, ikekwe n’oge gara aga nke mmadụ, nke pụrụ imetụta alụmdi na nwunye ahụ. Ndị a pụrụ ịgụnye nnukwu ụgwọ ndị e ji ma ọ bụ ibu ọrụ ma ọ bụ okwu metụtara ahụ ike, dị ka ajọ ọrịa ma ọ bụ ọnọdụ ị pụrụ inwe. Ebe ọtụtụ ndị bu HIV (nje nke na-akpata ọrịa AIDS) adịghị egosipụta ihe mgbaàmà ọ bụla ozugbo, ọ gaghị adị njọ ka mmadụ ma ọ bụ nne na nna na-ahụ n’anya chọọ ka e mee nnwale ọbara n’ihi ọrịa AIDS nke onye tinyere aka ná mmekọahụ aghara aghara ma ọ bụ onye si n’akwara amịnye ọgwụ ọjọọ n’oge gara aga. Ọ bụrụ na nnwale ahụ egosi na o bu ọrịa ahụ, onye ahụ bu ọrịa ekwesịghị ịrụgide onye ahụ ọ na-achọ ịlụ ka ọ nọgide ná mmekọrịta ahụ ọ bụrụ na onye ahụ achọọ ugbu a ịkwụsị ya. N’ezie, onye ọ bụla nke tinyeworo aka n’ụzọ ndụ dị oké ize ndụ ga-eme nke ọma ịhọrọ ije nnwale ọbara n’ihi ọrịa AIDS n’onwe ya tupu ọ na-amalite mbedo.

ILE ANYA GABIGA ỤBỌCHỊ AGBAMAKWỤKWỌ AHỤ

22, 23. (a) Olee ụzọ a pụrụ isi tụfuo ezi uche mgbe a na-akwadebe maka agbamakwụkwọ? (b) Echiche ziri ezi dị aṅaa ka e kwesịrị ijigide mgbe a na-atụle agbamakwụkwọ na alụmdi na nwunye?

22 N’ọnwa ndị ikpeazụ tupu alụmdi na nwunye ahụ, ọ ga-eyikarị ka unu abụọ ọ ga-eji ọrụ n’aka n’ịkwadebe maka agbamakwụkwọ ahụ. Ị pụrụ ibelata nrụgide ahụ site n’imeru ihe n’ókè. Agbamakwụkwọ kporo ọkụ pụrụ ịtọ ndị ikwu na ọha na eze ụtọ, ma ọ pụrụ ime ka ndị ahụ lụrụ di na nwunye ọhụrụ na ezinụlọ ha bụrụ ndị ike gwụrụ n’elu ahụ na ndị ego gwụnahụrụ. Mgbaso nke omenala ụfọdụ bụ ihe ezi uche dị na ya, ma ịgbaso ya dị ka ohu na ma eleghị anya n’ikwekọ n’ụzọ ịsọ mpi pụrụ ikpuchi isi ihe nke ememe ahụ, ọ pụkwara ịnapụ unu ọṅụ nke unu kwesịrị inwe. Ọ bụ ezie na a ghaghị ịtụle mmetụta nke ndị ọzọ, nwoke ahụ na-alụ nwanyị ka ọ dị n’ubu ikpebi ihe ga-eme n’oriri agbamakwụkwọ ahụ.—Jọn 2:9.

23 Cheta na agbamakwụkwọ unu bụ nanị otu ụbọchị, ma alụmdi na nwunye unu ga-adịgide ruo ogologo ndụ. Zere itinyebiga uche ókè n’ihe omume nke ịbanye n’alụmdi na nwunye. Kama nke ahụ, legara Jehova Chineke anya maka nduzi, burukwa ụzọ mee atụmatụ maka ndụ nke ịbụ onye lụrụ di ma ọ bụ nwunye. Mgbe ahụ ị ga-ejikerewo nke ọma maka alụmdi na nwunye na-aga nke ọma.

a  A ga-etinye nke a n’ọrụ n’ala ebe a na-ele iyi oge mkpapụ anya dị ka ihe kwesịrị ekwesị nye ndị Kraịst.

b  Ọbụna n’ime ọgbakọ ndị Kraịst, a pụrụ inwe ụfọdụ na-anọ n’ụsọ, dị ka a pụrụ isi kwuo ya. Kama iji obi dum bụrụ ndị ohu Chineke, omume na àgwà nke ụwa pụrụ inwe mmetụta n’ebe ha nọ.—Jọn 17:16; Jemes 4:4.

OLEE OTÚ ỤKPỤRỤ BIBLE NDỊ A PỤRỤ ISI NYERE . . . MMADỤ AKA ỊKWADEBE MAKA ALỤMDI NA NWUNYE NA-AGA NKE ỌMA?

Di na nwunye aghaghị ime nraranye nye onwe ha.—Jenesis 2:24.

Mmadụ ime dị mkpa karịa ọdịdị elu ahụ.—1 Pita 3:3, 4.

“Unu na ndị na-ekweghị ekwe ekekọtala onwe unu.”—2 Ndị Kọrint 6:14.

Ndị na-adịghị ọcha n’omume bụ ndị ala ọzọ n’ebe Chineke nọ.—Ndị Efesọs 4:18, 19.

OMENALA NA BIBLE

Ụgwọ Isi Nwanyị na Ụgwọ Isi Nwoke: N’ala ụfọdụ a na-ele anya n’aka ezinụlọ nke nwoke inye ndị ezinụlọ nke nwanyị ego (ụgwọ isi nwanyị). Ná ndị ọzọ, ezinụlọ nke nwanyị na-enye ndị nke nwoke ego (ụgwọ isi nwoke). Eleghị anya a gaghị enwe ihe dị njọ n’omenala ndị a ọ bụrụhaala na iwu kwadoro ha. (Ndị Rom 13:1) Otú ọ dị, n’ọnọdụ nke ọ bụla, ezinụlọ nke na-anara anara kwesịrị izere iji anyaukwu na-ana ego ma ọ bụ ihe onwunwe karịa nke ezi uche dị na ya. (Ilu 20:21; 1 Ndị Kọrint 6:10) Ọzọkwa, e kwesịghị ịghọta ịkwụ ụgwọ isi nwanyị ịpụta na nwunye bụ nanị ihe onwunwe a zụtara azụta; di ekwesịghịkwa iche na nanị ibu ọrụ ya n’ebe nwunye ya na ndị ọgọ ya nọ bụ nke ego.

Ịlụ Karịa Otu: Ụfọdụ ọdịbendị na-enye nwoke ohere ịlụ ihe karịrị otu nwunye. N’ọnọdụ dị otú ahụ, nwoke pụrụ ịghọ o kwuchaa ọ gwụ kama ịbụ di na nna. Ọzọkwa, ịlụ ihe karịrị otu nwunye na-akwalitekarị ịsọ mpi n’etiti ndị nwunye. Nye ndị Kraịst, Bible na-enye ohere nanị maka ịnọ n’alụghị di ma ọ bụ nwunye ma ọ bụ ịlụ otu nwunye.—1 Ndị Kọrint 7:2.

Alụmdi na Nwunye Nnwale: Ọtụtụ di na nwunye na-azọrọ na ibikọ ọnụ tupu alụmdi na nwunye ga-enyere ha aka ịnwale nkwekọ ha. Ma, alụmdi na nwunye nnwale adịghị anwale otu n’ime ihe ndị kasị mkpa pụtara ìhè nke alụmdi na nwunye—nraranye. Ọ dịghị ndokwa ọzọ ma e wezụga alụmdi na nwunye nke na-enye otu ọ̀tụ̀tụ̀ ahụ nke nchebe na ịnọ ná ntụkwasị obi nye ndị nile o metụtara—tinyere ụmụ ọ bụla nke pụrụ isi ná njikọ ahụ pụta. N’anya Jehova Chineke, ibikọ ọnụ n’enweghị abamuru nke alụmdi na nwunye bụ ịkwa iko.—1 Ndị Kọrint 6:18; Ndị Hibru 13:4.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya