Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • fy isi 7 p. 76-89
  • È Nwere Onye Nnupụisi n’Ụlọ?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • È Nwere Onye Nnupụisi n’Ụlọ?
  • Isi Ihe Na-akpata Obi Ụtọ Ezinụlọ
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • GỊNỊ BỤ ONYE NNUPỤISI?
  • IHE NDỊ NA-AKPATA NNUPỤISI
  • ILAỊ NA-ANABATA IHE Ọ BỤLA NA REHOBOAM NA-EGBOCHI EGBOCHI
  • IGBO MKPA NDỊ BỤ ISI PỤRỤ IGBOCHI NNUPỤISI
  • MGBE ỤMỤAKA DABARA N’IHE ISI IKE
  • ỊHỤ MAKA ONYE NNUPỤISI KPỌRỌ EKWO NKỤ
  • Nyere Nwa Gị Nọ n’Afọ Iri na Ụma Aka Inwe Ọganihu
    Isi Ihe Na-akpata Obi Ụtọ Ezinụlọ
  • Zụlite Nwa Gị Site na Nwa Ọhụrụ
    Isi Ihe Na-akpata Obi Ụtọ Ezinụlọ
  • Ndị Nne na Nna—Jirinụ Ịhụnanya Na-azụ Ụmụ Unu
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2007
  • Kụziere Ụmụ Gị Ịhụ Jehova n’Anya
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2007
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Isi Ihe Na-akpata Obi Ụtọ Ezinụlọ
fy isi 7 p. 76-89

ISI NKE ASAA

È Nwere Onye Nnupụisi n’Ụlọ?

Foto dị na peeji nke 76

1, 2. (a) Olee ihe atụ Jisọs nyere iji mee ka ekwesịghị ntụkwasị obi nke ndị ndú okpukpe Juu pụta ìhè? (b) Isi ihe dị aṅaa banyere ndị nọ n’oge uto ka anyị pụrụ ịmụta site n’ihe atụ Jisọs?

ỤBỌCHỊ ole na ole tupu ọnwụ ya, Jisọs jụrụ otu ìgwè nke ndị ndú okpukpe ndị Juu otu ajụjụ na-akpali echiche. Ọ sịrị: “Gịnị bụ uche unu? Otu nwoke nwere ụmụ abụọ; o wee bịakwute nke mbụ, sị, Nwa, jee rụọ ọrụ taa n’ubi vine nke m. Ma ọ zara, sị, Achọghị m ije: ma e mesịa ọ kwaa ụta, wee jee. O wee bịakwute nke abụọ, kwuo otú ahụ. O wee zaa, sị, Mụ onwe m ga-eje, Onyenwe anyị: ma o jeghị. Ònye n’ime ha abụọ mere ihe nna ya chọrọ?” Ndị ndú ndị Juu zara, sị: “Onye mbụ.”—Matiu 21:28-31.

2 N’ebe a Jisọs na-eme ka ekwesịghị ntụkwasị obi nke ndị ndú ndị Juu pụta ìhè. Ha dị ka nwa nke abụọ ahụ, na-ekwe nkwa ime uche Chineke ma hapụ idebe nkwa ha. Ma ọtụtụ nne na nna ga-amata na ihe atụ Jisọs dabeere n’ezi nghọta nke ndụ ezinụlọ. Dị ka o gosiri nke ọma, ọ na-esikarị ike ịmata ihe ndị na-eto eto na-eche ma ọ bụ ibu ụzọ kwuo ihe ha ga-eme. Onye na-eto eto pụrụ ịkpata ọtụtụ nsogbu mgbe ọ nọ n’oge uto ma tolite ịbụ okenye nwere ezi uche, nke a na-akwanyere ùgwù nke ukwuu. Nke a bụ ihe a ga-eburu n’uche mgbe anyị na-atụle nsogbu nke nnupụisi ndị nọ n’afọ iri na ụma.

GỊNỊ BỤ ONYE NNUPỤISI?

3. N’ihi gịnị ka ndị nne na nna na-ekwesịghị iji dị ngwa ịkpọ nwa ha onye nnupụisi?

3 Site n’oge ruo n’oge, ị pụrụ ịnụ banyere ndị nọ n’afọ iri na ụma ndị na-enupụ nnọọ isi megide ndị mụrụ ha. Ị pụrụ ọbụna ịma n’onwe gị ezinụlọ ebe onye nọ n’afọ iri na ụma yiri ka a pụghị ịchịkwali ya. Otú ọ dị, ọ naghị adị mfe mgbe nile ịmata ma nwata ọ̀ bụ n’ezie onye nnupụisi. Ọzọ, ọ pụrụ isi ike ịghọta ihe mere ụmụaka ụfọdụ ji enupụ isi ma ndị ọzọ—ọbụna site n’otu ezinụlọ—adịghị. Ọ bụrụ na nne na nna echee na otu n’ime ụmụ ha pụrụ ịdị na-aghọ ajọ onye nnupụisi, gịnị ka ha kwesịrị ime? Iji zaa nke a, anyị aghaghị ibu ụzọ kwuo banyere ihe onye nnupụisi bụ.

4-6. (a) Gịnị bụ onye nnupụisi? (b) Gịnị ka ndị nne na nna kwesịrị iburu n’uche ma ọ bụrụ na nwa ha nọ n’afọ iri na ụma na-enupụ isi site n’oge ruo n’oge?

4 Ikwu ya n’ụzọ dị mfe, onye nnupụisi bụ onye na-akpachara anya ma na-anọgide na-enupụ isi ma ọ bụ na-eguzogide, na-elelịkwa ikike ka elu. N’ezie, ‘uche gbagọrọ agbagọ dị n’obi nwata.’ (Ilu 22:15) Ya mere ụmụaka nile na-eguzogide ikike nne na nna na ikike ndị ọzọ n’otu oge ma ọ bụ n’ọzọ. Nke a na-abụkarị eziokwu n’oge ntolite anụ ahụ na mmetụta uche nke a maara dị ka oge uto. Mgbanwe ná ndụ onye ọ bụla ga-akpata nrụgide, oge uto bụkwa oge ọtụtụ mgbanwe. Nwa gị nwoke ma ọ bụ nwanyị nọ n’afọ iri na ụma si n’ịbụ nwata na-apụ ma na-abanye n’ụzọ ịbụ onye toro eto. N’ihi nke a, n’afọ ndị ahụ nke oge uto, ụfọdụ nne na nna na ụmụaka na-enwe ihe isi ike ikwekọrịta. Ọtụtụ mgbe ndị nne na nna n’amaghị ama na-agbalị ịkwụsịlata mgbanwe ahụ, ebe ndị nọ n’afọ iri na ụma na-achọ ime ka ọ gakwuo ngwa ngwa.

5 Onye nọ n’afọ iri na ụma nke bụ onye nnupụisi na-agbakụta ụkpụrụ nne na nna azụ. Ma, cheta na omume ole na ole nke nnupụisi adịghị eme mmadụ onye nnupụisi. Mgbe a bịakwara n’okwu ime mmụọ, ụmụaka ụfọdụ pụrụ na mbụ igosi mmasị dị nta ma ọ bụ ghara igosi ma ọlị n’eziokwu Bible, ma ọ pụrụ ịbụ na ha abụghị ndị nnupụisi. Dị ka nne ma ọ bụ nna, adịla ngwa ịkpọ nwa gị onye nnupụisi.

6 È ji nnupụisi megide ikike nne na nna mara afọ nile nke oge uto nke ndị nile toro eto? Ee e, ọ dịghị ma ọlị. N’ezie, ihe àmà e nwere yiri ka ọ ga-egosi na nanị ọnụ ọgụgụ ka nta nke ndị nọ n’afọ iri na ụma na-egosipụta ajọ nnupụisi nke ndị nọ n’oge uto. Ma, gịnị banyere nwatakịrị nke gbara isi akwara ma nọgide na-enupụ isi? Gịnị pụrụ ịkpalite nnupụisi dị otú ahụ?

IHE NDỊ NA-AKPATA NNUPỤISI

7. Olee otú gburugburu ebe obibi nke Setan pụrụ isi mee nwatakịrị ka o nupụ isi?

7 Otu ọkpụrụkpụ ihe na-akpata nnupụisi bụ gburugburu ebe obibi ụwa nke Setan. “Ụwa dum na-atọgbọkwa n’aka ajọ onye ahụ.” (1 Jọn 5:19) Ụwa nke dị n’aka Setan ewulitewo ọdịbendị na-emerụ ahụ nke ndị Kraịst na-aghaghị ịgbaso mgba. (Jọn 17:15) Ihe dị ukwuu n’ọdịbendị ahụ rere ure, dị ize ndụ, ma jupụta ná mmetụta ọjọọ ka ukwuu taa karịa ka ọ dị n’oge gara aga. (2 Timoti 3:1-5, 13) Ọ bụrụ na nne na nna ezighị ụmụ ha ihe, dọọ ha aka ná ntị, ma chebe ha, ọ pụrụ ịdị mfe “mmụọ ahụ nke na-arụsi ọrụ ike n’ime ụmụ nke ekwenyeghị ekwenye ugbu a” irikpu ndị na-eto eto. (Ndị Efesọs 2:2) Ihe e jikọrọ ya na nke a bụ nrụgide ndị ọgbọ. Bible na-asị: “Enyi ndị nzuzu ka a ga-emejọ.” (Ilu 13:20) N’otu aka ahụ, onye na-eso ndị ji mmụọ nke ụwa a mejupụta obi ha na-akpakọrịta eleghị anya ga-abụ onye mmụọ ahụ metụtara. Enyemaka a nọgidere na-enye dị ndị na-eto eto mkpa ma ọ bụrụ na ha ga-aghọta na nrubeisi nye ụkpụrụ ndị nke Chineke bụ ntọala nke ụzọ ndụ nke kachasị mma.—Aịsaịa 48:17, 18.

8. Olee ihe ndị pụrụ iduba ná nnupụisi n’akụkụ nke nwatakịrị?

8 Ihe ọzọ na-akpata nnupụisi pụrụ ịbụ ọnọdụ dị n’ụlọ. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na nne ma ọ bụ nna bụ onye aṅụrụma, na-aṅụ ọgwụ ọjọọ, ma ọ bụ na-emeso nke ọzọ ihe ike, echiche onye nọ n’afọ iri na ụma pụrụ ịgbagọ agbagọ. Ọbụna n’ezinụlọ ndị nwetụrụ udo, nnupụisi pụrụ itiwapụ mgbe o yiri nwatakịrị ka ọ bụ na ndị mụrụ ya enweghị mmasị n’ebe ọ nọ. Otú ọ dị, ọ bụghị ihe ndị si n’èzí na-akpata nnupụisi ndị nọ n’afọ iri na ụma mgbe nile. Ụmụaka ụfọdụ na-agbakụta ụkpụrụ ndị nne na nna azụ n’agbanyeghị inwe nne na nna na-etinye ụkpụrụ Chineke n’ọrụ na ndị na-echebe ha, ruo n’ọ̀tụ̀tụ̀ dị ukwuu, pụọ n’ụwa dị ha gburugburu. N’ihi gịnị? Ma eleghị anya n’ihi mkpọrọgwụ ọzọ nke nsogbu anyị nile—ezughị okè mmadụ. Pọl sịrị: “Mmehie si n’aka otu mmadụ [Adam] baa n’ụwa, dị ka ọnwụ si n’aka mmehie baakwa; ọnwụ wee si otú a gabiga ruo mmadụ nile, n’ihi na mmadụ nile mehiere.” (Ndị Rom 5:12) Adam bụ onye nnupụisi na-achọ ọdịmma onwe ya nanị, ọ hapụkwaara ụmụ ya nile ihe nketa ọjọọ. Ụfọdụ ndị ntorobịa na-ahọrọ nnọọ inupụ isi, dị ka nna nna ha mere.

ILAỊ NA-ANABATA IHE Ọ BỤLA NA REHOBOAM NA-EGBOCHI EGBOCHI

9. Akụkụ dịgasị aṅaa gabigara ókè n’ịzụlite ụmụaka pụrụ ịkpali nwatakịrị inupụ isi?

9 Ihe ọzọ dubaworo ná nnupụisi ndị nọ n’afọ iri na ụma bụ echiche na-ezighị ezi nke nzụlite ụmụaka n’akụkụ nke ndị nne na nna. (Ndị Kọlọsi 3:21) Nne na nna ụfọdụ tinyere obi ha n’ọrụ na-egbochi ma na-enye ụmụ ha ahụhụ karị. Ndị ọzọ na-anabata ihe ọ bụla, ghara ịdị na-enye nduzi nke ga-echebe ụmụ ha na-enweghị ahụmahụ bụ́ ndị nọ n’oge uto. Ọ naghị adị mfe mgbe nile inwe ezi nguzo n’etiti akụkụ abụọ a gabigara ókè. Ụmụaka dịgasị iche nwekwara mkpa dịgasị iche. Otu pụrụ inwe mkpa maka nlekọta karịa ọzọ. Ọzọkwa, ihe atụ abụọ nke Bible ga-enye aka igosi ihe ize ndụ nke ime ihe gabiga ókè ma n’igbochi egbochi ma n’ịnabata ihe ọ bụla.

10. N’ihi gịnị ka Ilaị, ọ bụ ezie na ọ pụrụ ịbụwo onye isi nchụàjà kwesịrị ntụkwasị obi, ji bụrụ ajọ nna?

10 Onye isi nchụàjà nke Israel oge ochie bụ́ Ilaị bụ nna. O jere ozi 40 afọ, ihe ịrụ ụka adịghịkwa ya na ọ maara Iwu Chineke nke ọma. O yiri ka Ilaị ọ̀ rụrụ ọrụ ndị ọ na-arụkarị dị ka onye nchụàjà n’ikwesị ntụkwasị obi nnọọ, nweekwa ike ọbụna zie ụmụ ya, Họfnaị na Finehas, Iwu Chineke nke ọma. Otú ọ dị, Ilaị na-ekwenyere ụmụ ya gabiga ókè. Họfnaị na Finehas jere ozi dị ka ndị ọrụ nchụàjà, ma ha bụ “ndị jọgburu onwe ha,” nwee mmasị nanị n’imeju agụụ na ọchịchọ omume rụrụ arụ ndị nke ha. Ma, mgbe ha mere ihe arụ n’ala nsọ, Ilaị enweghị obi ike ịchụpụ ha n’ọrụ. Ọ baara ha nanị mba na-erijughị afọ. Site na ya ịnabata ihe ọ bụla, Ilaị sọpụụrụ ụmụ ya karịa Chineke. N’ihi ya, ụmụ ya nupụụrụ ofufe dị ọcha nke Jehova isi, ezinụlọ dum nke Ilaị nwetara ọdachi.—1 Samuel 2:12-17, 22-25, 29; 3:13, 14; 4:11-22.

11. Gịnị ka ndị nne na nna pụrụ ịmụta site n’ajọ ihe nlereanya nke Ilaị?

11 Ụmụ Ilaị abụrụworị ndị toro eto mgbe ihe ndị a mere, ma akụkọ ihe mere eme a na-emesi ike ihe ize ndụ nke enyeghị ịdọ aka ná ntị. (Tụlee Ilu 29:21.) Nne na nna ụfọdụ pụrụ ịghọtahie ịhụnanya na ịnabata ihe ọ bụla, na-ada ada n’isetịpụ na ịhụ na e debere ụkpụrụ ndị doro anya, ndị na-adịghị agbanwe agbanwe, ma bụrụ ndị nke ezi uche. Ha na-ahapụ ịdọ aka ná ntị n’ịhụnanya, ọbụna mgbe e mebiri ụkpụrụ Chineke. N’ihi nnabata ihe ọ bụla dị otú ahụ, ụmụ ha pụrụ imesị hapụ ịdị na-aṅa ntị n’ikike nne na nna ma ọ bụ n’ụdị ikike ọ bụla ọzọ.—Tụlee Eklisiastis 8:11.

12. Olee ụzọ Rehoboam hiere n’iji ikike mee ihe?

12 Rehoboam na-eme ihe atụ nke akụkụ nke ọzọ gabigara ókè n’iji ikike eme ihe. Ọ bụ eze ikpeazụ nke alaeze dịkọrọ ọnụ nke Israel, ma ọ bụghị ezi eze. Rehoboam eketawo ala nke ndị ya na-enweghị afọ ojuju n’ihi ibu arọ nna ya, bụ́ Solomọn, tụkwasịrị ha. Rehoboam ò gosiri nghọta? Ee e. Mgbe òtù ndị e dunyere ozi rịọrọ ya ka o wepụ ụfọdụ n’ihe mmegbu ndị ahụ, ọ jụrụ ịṅa ntị n’okwu ndụmọdụ rijuru afọ site n’ọnụ ndị ndụmọdụ ya ka okenye ma nye iwu ka e mee ka yoke ndị ahụ dịkwuo ike. Nganga ya kpalitere nnupụisi site n’ebo iri ndị dị n’ebe ugwu, e kewakwara alaeze ahụ abụọ.—1 Ndị Eze 12:1-21; 2 Ihe Emere 10:18.

13. Olee otú ndị nne na nna pụrụ isi zere ihie ụzọ Rehoboam?

13 Ndị nne na nna pụrụ ịmụta ihe ndị dị mkpa site n’akụkọ Bible nke Rehoboam. Ọ dị ha mkpa ‘ịchọ Jehova’ n’ekpere na inyocha ụzọ ndị ha si azụlite ụmụ ha n’ìhè nke ụkpụrụ dị iche iche nke Bible. (Abụ Ọma 105:4) “Mmegbu na-eme ka onye maara ihe ghọọ onye nzuzu,” ka Eklisiastis 7:7 na-ekwu. Ókè ndị e chepụtara nke ọma na-enye ndị nọ n’oge uto ohere itolite ma na-echebe ha pụọ ná mmerụ ahụ. Ma ụmụaka ekwesịghị ibi n’ọnọdụ nke dị mkpagide ma na-ejikpa ahụ karị nke na e gbochiri ha ịzụlite ọ̀tụ̀tụ̀ ezi uche dị ya nke ịdabere n’onwe onye na obi ike onwe onye. Mgbe ndị nne na nna na-agbalịsi ike inwe ezi nguzo n’agbata ịdị nro dị mma na ebe njedebe ndị siri ike bụ́ ndị a kara akara doro anya, ihe ka ná ndị nọ n’afọ iri na ụma ga-enwe ọchịchọ dị nta karị inupụ isi.

IGBO MKPA NDỊ BỤ ISI PỤRỤ IGBOCHI NNUPỤISI

Foto dị na peeji nke 83

Eleghị anya, ụmụaka ga-etolite ịbụ ndị kwụsiri ike karị ma ọ bụrụ na ndị mụrụ ha enyere ha aka ịnagide nsogbu ha ndị nke afọ iri na ụma

14, 15. Olee otú ndị nne na nna kwesịrị isi lee ntolite nke nwa ha anya?

14 Ọ bụ ezie na nne na nna na-aṅụrị ọṅụ ịhụ ka nwa ha na-eto eto na-etolite n’anụ ahụ site na nwata gaa n’ịbụ okenye, ha pụrụ inwe nchegbu mgbe nwa ha nọ n’oge uto malitere isi n’ịdabere na ha gaa n’ịkwụrụ onwe ya otú kwesịrị ekwesị. N’oge mgbanwe nke a, ya atụla gị n’anya ma ọ bụrụ na nwa gị nọ n’afọ iri na ụma akpọchie ntị ma ọ bụ jụ ikwenye ekwenye site n’oge ruo n’oge. Buru n’uche na ihe mgbaru ọsọ nke nne na nna bụ́ ndị Kraịst kwesịrị ịbụ ịzụlite onye Kraịst tozuru etozu, nke kwụsiri ike, ma nwee ezi uche.—Tụlee 1 Ndị Kọrint 13:11; Ndị Efesọs 4:13, 14.

15 N’agbanyeghị otú o siruru n’ike, ọ dị nne na nna mkpa ịkwụsị àgwà nke ịza mba n’arịrịọ ọ bụla nke nwa ha nọ n’oge uto maka inwerekwu onwe ya. N’ụzọ na-ewuli elu, ọ dị nwatakịrị mkpa itolite dị ka onye. N’ezie, n’afọ ndụ dị nnọọ nta, ụfọdụ ndị nọ n’afọ iri na ụma na-amalite inweta ọdịdị nke onye toro nnọọ eto. Dị ka ihe atụ, Bible na-ekwu banyere Eze Josaịa bụ nwata, sị: “Mgbe ya onwe ya nọ na nwata [nke dị ihe dị ka afọ 15], ọ malitere ịchọ Chineke nke Devid.” Onye a pụrụ iche nke nọ n’afọ iri na ụma bụ n’ụzọ doro anya onye nwere ezi uche.—2 Ihe Emere 34:1-3.

16. Ka a na-enye ụmụaka ibu ọrụ ka ukwuu, gịnị ka ha kwesịrị iche ihu?

16 Otú ọ dị, nnwere onwe na-eweta ịza ajụjụ. Ya mere, kwe ka nwa gị na-aghọ okenye nwee ahụmahụ nke ihe ndị na-esite ná mkpebi na omume ya ụfọdụ. Ụkpụrụ bụ́ “mkpụrụ ọ bụla mmadụ na-agha, nke ahụ ka ọ ga-ewetakwa n’ubi” dịịrị ndị nọ n’afọ iri na ụma dị ka ọ dịịrị ndị okenye. (Ndị Galetia 6:7) A pụghị ichebe ụmụaka ruo ebighị ebi. Ma, gịnị ma ọ bụrụ na nwa gị achọọ ime ihe a na-apụghị ịnakwere ma ọlị? Dị ka nne ma ọ bụ nna nwere ezi uche, ị ghaghị ịsị, “Ee e.” Ọzọ, ọ bụ ezie na ị pụrụ ịkọwa ihe ndị kpatara ya, ọ dịghị ihe kwesịrị ịgbanwe ee e ahụ ka ọ bụrụ ee. (Tụlee Matiu 5:37.) Ka o sina dị, gbalịa ịsị “Ee e” n’ụzọ dị jụụ ma gosi ezi uche, ebe ọ bụ na “ọzịza okwu dị nro na-eme ka ọnụma laghachi azụ.”—Ilu 15:1.

17. Olee mkpa ụfọdụ nke onye nọ n’afọ iri na ụma bụ́ ndị nne ma ọ bụ nna kwesịrị igbo?

17 Ndị na-eto eto nwere mkpa nchebe nke ịdọ aka ná ntị a nọgidesiri ike na-enye ọ bụrụgodị na ha ekwenyeghị n’ihe mgbochi na ụkpụrụ ndị ahụ ozugbo mgbe nile. Ọ na-agbawa obi ma ọ bụrụ na a na-agbanwe ụkpụrụ mgbe mgbe, na-adabere n’otú obi dị nne ma ọ bụ nna n’oge ahụ. Ọzọkwa, ọ bụrụ na ndị nọ n’afọ iri na ụma anata agbamume na enyemaka, dị ka mkpa si dị, n’ịnagide enweghị obi ike ma ọ bụ ihere, o yikarịrị ka ha ga-etolite ịbụ ndị kwụsiri ike karị. Ndị nọ n’afọ iri na ụma na-enwekwa ekele mgbe ha nwetara ntụkwasị obi nke ha rụtaworo.—Tụlee Aịsaịa 35:3, 4; Luk 16:10; 19:17.

18. Olee eziokwu ụfọdụ na-agba ume banyere ndị nọ n’afọ iri na ụma?

18 Ọ pụrụ ịbụrụ nne na nna ihe nkasi obi ịmara na mgbe udo, nkwụrụsi ike, na ịhụnanya dị n’ime ezinụlọ, ụmụaka na-emekarị nke ọma. (Ndị Efesọs 4:31, 32; Jemes 3:17, 18) Ee, ọtụtụ ndị na-eto eto emeriwo ọbụna gburugburu ebe obibi dị njọ, na-esite n’ezinụlọ e ji aṅụrụma, ime ihe ike, ma ọ bụ mmetụta ọjọọ ọzọ mara, ha etolitewokwa ịbụ ndị okenye ọma. N’ihi ya, ọ bụrụ na i mee ka e nwee ụlọ ebe ụmụ gị nọ n’afọ iri na ụma nọ ná nchebe, na-amatakwa na ha ga-enweta ịhụnanya, mmetụta, na nlebara anya—ọbụna ma ọ bụrụ na ihe mgbochi na ịdọ aka ná ntị ezi uche dị na ha, bụ́ ndị kwekọrọ n’ụkpụrụ Akwụkwọ Nsọ, na-eso nkwado ahụ—o yikarịrị ka ha ga-etolite ịbụ ndị okenye ị ga-eji na-eme ọnụ.—Tụlee Ilu 27:11.

MGBE ỤMỤAKA DABARA N’IHE ISI IKE

19. Ọ bụ ezie na nne na nna kwesịrị ịzụlite nwa dị ka ụzọ ya si dị, ibu ọrụ dị aṅaa dịịrị nwa ahụ?

19 Ịbụ ezi nne ma ọ bụ nna na-eme ka e nwee ọdịiche n’ezie. Ilu 22:6 na-asị: “Zụlite nwata dị ka ụzọ ya si dị, ọbụna mgbe o mere okenye ọ gaghị esi n’ime ya wezụga onwe ya.” Ma, gịnị banyere ụmụaka nwere oké nsogbu n’agbanyeghị inwe ezigbo nne na nna? Nke a ọ̀ pụrụ ime eme? Ee. A ghaghị ịtụle amaokwu ndị ọzọ na-emesi ike ibu ọrụ nwata ‘ịnụ ntị’ ma rube isi n’olu nne na nna iji ghọta okwu ndị dị n’ilu ahụ. (Ilu 1:8) Ma nne ma ọ bụ nna ma nwata aghaghị ijikọ aka n’itinye ụkpụrụ Akwụkwọ Nsọ n’ọrụ ma ọ bụrụ na a ga-enwe nkwekọrịta ezinụlọ. Ọ bụrụ na nne na nna na ụmụaka adịghị arụkọ ọrụ ọnụ, a ga-enwe ihe isi ike.

20. Mgbe ụmụaka hiere ụzọ n’ihi echeghị echiche, olee ụzọ amamihe ndị nne na nna ga-esi lebara okwu ahụ anya?

20 Olee otú nne na nna kwesịrị isi meghachi omume mgbe onye nọ n’afọ iri na ụma hiere ụzọ ma daba ná nsogbu? Mgbe ahụ, karịsịa, ka onye ahụ na-eto eto nwere mkpa enyemaka. Ọ bụrụ na nne na nna echeta na ha na-emeso onye ntorobịa na-enweghị ahụmahụ ihe, ọ ga-akara ha mfe iguzogide àgwà nke imeghachi omume gabiga ókè. Pọl dụrụ ndị toro eto nọ n’ọgbakọ ọdụ, sị: “A sị na ọ bụ ezie na a nwụde mmadụ mgbe ọ nọ ná ndahie ọ bụla, unu onwe unu, bụ́ ndị Mmụọ Nsọ na-achị, meenụ ka mmadụ dị otú a guzozie n’ime mmụọ nke ịdị nwayọọ.” (Ndị Galetia 6:1) Ndị nne na nna pụrụ ịgbaso otu usoro a mgbe ha na-emeso onye na-eto eto nke hiere ụzọ n’ihi echezighị echiche ihe. Ka ha na-akọwa n’ụzọ doro anya ihe mere àgwà ya ji dị njọ na ụzọ ọ pụrụ isi gbochie ihie ụzọ ahụ ọzọ, nne na nna ahụ kwesịrị ime ka o doo anya na ọ bụ àgwà ahụ, ọ bụghị onye ntorobịa ahụ, dị njọ.—Tụlee Jud 22, 23.

21. N’ịgbaso ihe nlereanya nke ọgbakọ ndị Kraịst, olee otú nne na nna kwesịrị isi meghachi omume ma ọ bụrụ na nwa ha emee mmehie dị oké njọ?

21 Gịnị ma ọ bụrụ na nnupụisi onye ahụ na-eto eto dị oké njọ? Mgbe ahụ enyemaka pụrụ iche na nduzi nkà dị na ya dị nwata ahụ mkpa. Mgbe onye òtù ọgbakọ mere mmehie dị oké njọ, a na-agba ya ume ichegharị ma jekwuru ndị okenye ọgbakọ maka enyemaka. (Jemes 5:14-16) Ozugbo o chegharịrị, ndị okenye na-esoro ya rụkọọ ọrụ iji weghachi ya n’ụzọ ime mmụọ. N’ime ezinụlọ ibu ọrụ nke inyere onye nọ n’afọ iri na ụma nke hiere ụzọ aka dịịrị nne na nna, ọ bụ ezie na ọ pụrụ ịdị ha mkpa isoro ndị okenye tụlee okwu ahụ. Ha ekwesịghị ma ọlị ịgbalị izochiri òtù ndị okenye mmehie ọ bụla dị oké njọ nke otu n’ime ụmụ ha mere.

22. N’iṅomi Jehova, olee àgwà ndị nne na nna ga-agbalị ijigide ma ọ bụrụ na nwa ha ehie ụzọ dị oké njọ?

22 Nsogbu siri ike metụtara nwa mmadụ bụ oké ihe ọnwụnwa. N’ịbụ ndị o tijasịrị ná mmetụta uche, ọ pụrụ ịdị nne na nna ka ọ bụ ha jiri iwe yie nwa ahụ na-agahie agahie egwu; ma nanị ihe nke a pụrụ ime bụ ime ya obi ilu. Buru n’uche na ọdịnihu onye a na-eto eto pụrụ ịdabere n’otú e si mesoo ya n’oge a dị oké mkpa. Chetakwa na Jehova dị njikere ịgbaghara mgbe ndị ya gahiere ụzọ pụọ n’ezi ihe—ọ bụrụ nnọọ na ha ga-echegharị. Gee ntị n’okwu ịhụnanya ya: “Biko bịanụ, ka anyị rụrịta ụka, bụ ihe Jehova na-asị: ọ bụrụ na mmehie unu adị ka uwe uhie, ọ bụ dị ka snow ka ha ga-adị ọcha; ọ bụrụ na ha achaa uhie uhie dị ka ogho uhie, ọ bụ dị ka ajị ọcha ka ha ga-adị.” (Aịsaịa 1:18) Lee aha ihe nlereanya ọma ọ bụụrụ ndị nne na nna!

23. Mgbe otu n’ime ụmụ ha mere mmehie dị oké njọ, olee otú ndị nne na nna kwesịrị isi mee omume, gịnịkwa ka ha kwesịrị izere?

23 Ya mere, gbalịa ịgba onye ahụ na-agahie agahie ume ịgbanwe ụzọ ya. Chọọ okwu ndụmọdụ dị mma site n’ọnụ ndị nne na nna nweworo ahụmahụ na ndị okenye ọgbakọ. (Ilu 11:14) Gbalịa ịhapụ ime ihe ná mkpali ma kwuo ma ọ bụ mee ihe ndị ga-eme ka o siere nwa gị ike ịlaghachikwute gị. Gbochie ọnụma a na-achịkwaghị achịkwa na ihe ilu. (Ndị Kọlọsi 3:8) Adịla ngwa ịchịli aka. (1 Ndị Kọrint 13:4, 7) Ka ị na-akpọ ajọ ihe asị, zere ịkpọ obi nkụ na inwe obi ilu n’ebe nwa gị nọ. Nke ka mkpa, ndị nne na nna kwesịrị ịgbalị isetịpụ ihe nlereanya ọma na ịhụ na okwukwe ha na Chineke siri ike.

ỊHỤ MAKA ONYE NNUPỤISI KPỌRỌ EKWO NKỤ

24. Ọnọdụ dị aṅaa dị mwute na-ebilite mgbe ụfọdụ n’ezinụlọ ndị Kraịst, oleekwa otú nne ma ọ bụ nna kwesịrị isi meghachi omume?

24 N’ọnọdụ ụfọdụ ọ na-edo anya na onye ntorobịa emewo mkpebi doro anya inupụ isi na ịjụ ụkpụrụ ndị Kraịst kpam kpam. Mgbe ahụ nzube kwesịrị ịgbanwe gaa na nke ilekọta ma ọ bụ iwulighachi ndụ ezinụlọ nke ndị fọrọnụ. Kpachara anya ịhụ na i tinyeghị ume gị nile n’ebe onye nnupụisi ahụ nọ, na-eleghara ụmụaka ndị nke ọzọ anya. Kama ịdị na-agbalị izochiri ndị ọzọ n’ezinụlọ ahụ nsogbu ahụ, soro ha tụlee okwu ahụ ruo n’ọ̀tụ̀tụ̀ kwesịrị ekwesị na n’ụzọ na-emesighachi obi ike.—Tụlee Ilu 20:18.

25. (a) N’ịgbaso ụkpụrụ nke ọgbakọ ndị Kraịst, olee otú ndị nne na nna na-aghaghị isi mee ihe ma ọ bụrụ na nwatakịrị abụrụ onye nnupụisi kpọrọ ekwo nkụ? (b) Gịnị ka ndị nne na nna kwesịrị iburu n’uche ma otu n’ime ụmụ ha nupụ isi?

25 Jọn onyeozi kwuru banyere otu onye nnupụisi a na-apụghị ịgbazilikwa olu nke nọ n’ọgbakọ, sị: “Unu akpọbatala ya n’ụlọ, unu asịkwala ya biri nke ọma.” (2 Jọn 10) Nne na nna pụrụ ịhụ ya dị ka ihe dị mkpa iwere nguzo yiri nke ahụ n’ihe banyere nwa nke ha ma ọ bụrụ na o ruwo afọ ndụ ibiri onwe ya ma na-enupụ nnọọ isi. (Tụlee Deuterọnọmi 21:18-21.) N’agbanyeghị na ihe omume dị otú ahụ pụrụ isi ike ma na-agbawa obi, ọ dị mkpa mgbe ụfọdụ iji chebe ndị ọzọ nọ n’ezinụlọ. Nchebe na nlekọta ị nọgidere na-enye dị ezinụlọ gị mkpa. N’ihi ya, jigide ụkpụrụ akparamàgwà ndị doro anya, ma kwekọọ n’ezi uche. Soro ụmụaka ndị nke ọzọ na-ekwurịta okwu. Nwee mmasị n’otú ha na-eme n’ụlọ akwụkwọ na n’ọgbakọ. Ọzọ, mee ka ha mara na ọ bụ ezie na ị kwadoghị omume nwa ahụ na-enupụ isi, ị kpọghị ya asị. Katọọ omume ọjọọ ahụ, kama ịkatọ nwa ahụ. Mgbe ụmụ abụọ nke Jekọb wetaara ezinụlọ ahụ mmekpa ahụ n’ihi omume obi ọjọọ ha, Jekọb bụrụ iwe ime ihe ike ha ọnụ, ọ bụghị ụmụ ahụ n’onwe ha.—Jenesis 34:1-31; 49:5-7.

26. Site na gịnị ka nne na nna tinyere uche ha n’ọrụ pụrụ isi nweta nkasi obi ma ọ bụrụ na otu n’ime ụmụ ha enupụ isi?

26 Ọ pụrụ ịdị gị ka ọ bụ gị kpatara ihe meworo n’ezinụlọ gị. Ma ọ bụrụ na i jiwo ekpere mee ihe nile ị pụrụ ime, na-agbaso ndụmọdụ Jehova nke ọma ruo otú i nwere ike, ọ dịghị mkpa ịkatọ onwe gị n’ụzọ ezi uche na-adịghị ya. Nwee nkasi obi n’eziokwu bụ na ọ dịghị onye pụrụ ịbụ nne ma ọ bụ nna zuru okè, ma i ji obi gị nile gbalịa ịbụ nke ezigbo. (Tụlee Ọrụ 20:26.) Inwe ajọ onye nnupụisi n’ezinụlọ bụ ihe obi mgbawa, ma ọ bụrụ na ọ dabara gị, ka obi sie gị ike na Chineke na-aghọta nakwa na ọ dịghị mgbe ọ ga-agbahapụ ndị ohu ya raara onwe ha nye. (Abụ Ọma 27:10) Ya mere kpebisie ike ịhụ na ụlọ gị bụ nke nchebe, ebe ọzụzụ ime mmụọ nye ụmụ gị ndị ọzọ.

27. Icheta ilu nke nwa mmefu ahụ, gịnị ka nne na nna nke nwa na-enupụ isi pụrụ ịdị na-ele anya ya mgbe nile?

27 Ọzọkwa, i kwesịghị ịda mbà ma ọlị n’olileanya gị. Mgbalị ndị mbụ i mere n’ọzụzụ dị mma pụrụ imesị metụta obi nwa ahụ na-efu ụzọ ma weghachi ezi uche ya. (Eklisiastis 11:6) Ọtụtụ ezinụlọ ndị Kraịst enwewo otu ụdị ahụmahụ ahụ dị ka nke gị, ụfọdụ ahụwokwa ka ụmụ ha na-agahie agahie laghachitere, dị nnọọ ka nna ahụ mere n’ilu Jisọs nke nwa mmefu. (Luk 15:11-32) Otu ihe ahụ pụrụ ime gị.

OLEE OTÚ ỤKPỤRỤ BIBLE NDỊ A PỤRỤ ISI NYERE . . . NNE MA Ọ BỤ NNA AKA IGBOCHI AJỌ NNUPỤISI N’EZINỤLỌ?

N’enweghị enyemaka, mmụọ ụwa pụrụ imerụ nwatakịrị.—Ilu 13:20; Ndị Efesọs 2:2.

Ọ dị ndị nne na nna mkpa inwe ezi nguzo n’etiti itinye ihe mgbochi na ịnabata ihe.—Eklisiastis 7:7; 8:11.

A ghaghị ịgbaso àgwà ọjọọ mgba, kama na mmụọ nke ịdị nwayọọ.—Ndị Galetia 6:1.

A pụrụ ‘ime ka ahụ dị’ ndị mere mmehie dị oké njọ ma ha chegharịa ma nakwere enyemaka.—Jemes 5:14-16.

KWUPỤTA YA

Ndị nọ n’oge uto ga-enwe obi abụọ na nchegbu ndị metụtara nnwere onwe ka ukwuu. Ahụ pụrụ ịmatụ ha jijiji banyere ikike ha nwere ilekọta onwe ha n’ụwa. Ọ bụ dị ka a ga-asị na ha na-anwa ịga ije n’ụzọ na-amị amị. Unu ndị na-eto eto, kọọrọ ndị mụrụ unu ihe ndị na-atụ unu egwu na ahụ erughị ala unu na-enwe. (Ilu 23:22) Ma ọ bụ ọ bụrụ na ị na-eche na ndị mụrụ gị na-ejikpa gị ahụ karị, soro ha kwurịta banyere mkpa ọ dị gị ka e nyekwuo gị nnwere onwe. Mee atụmatụ iso ha kwurịta okwu n’oge mgbe i nwere ntụsara ahụ na mgbe ha na-ejighị ọrụ n’aka. (Ilu 15:23) Wepụta nnọọ oge igerịta onwe unu ntị.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya