Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • rq ihe ọmụmụ 6 p. 12-13
  • Gịnị Bụ Alaeze Chineke?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Gịnị Bụ Alaeze Chineke?
  • Gịnị Ka Chineke Na-achọ n’Aka Anyị?
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Gịnị Bụ Alaeze Chineke?
    Gịnị Ka Baịbụl Na-akụziri Anyị?
  • Gịnị Bụ Alaeze Chineke?
    Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi?
  • Gịnị Bụ Alaeze Chineke?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2011
  • Gịnị Bụ Alaeze Chineke?
    Ozi Ọma Si n’Aka Chineke!
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Gịnị Ka Chineke Na-achọ n’Aka Anyị?
rq ihe ọmụmụ 6 p. 12-13

Ihe Ọmụmụ nke 6

Gịnị Bụ Alaeze Chineke?

Olee ebe Alaeze Chineke dị? (1)

Ònye bụ Eze ya? (2)

Ndị ọzọ hà na-eso Eze ahụ ekere òkè n’ịchịisi? Ya bụrụ otú ahụ, mmadụ ole? (3)

Gịnị na-egosi na anyị na-ebi na mgbe ikpeazụ? (4)

Gịnị ka Alaeze Chineke ga-emere ihe a kpọrọ mmadụ n’ọdịnihu? (5-7)

1. Mgbe ọ nọ n’elu ụwa, Jisọs kụziiri ụmụazụ ya ikpe ekpere maka Alaeze Chineke. Alaeze bụ ọchịchị nke eze bụ onye isi ya. Alaeze Chineke bụ ọchịchị pụrụ iche. E guzobere ya n’eluigwe, ọ ga-achịkwa elu ụwa nke a. Ọ ga-edo aha Chineke nsọ, ma ọ bụ mee ka ọ dị nsọ. Ọ ga-eme ka e mee uche Chineke n’elu ụwa dị ka e si eme ya n’eluigwe.—Matiu 6:9, 10.

2. Chineke kwere nkwa na Jisọs ga-abụ Eze nke Alaeze Ya. (Luk 1:30-33) Mgbe Jisọs nọ n’elu ụwa, o gosipụtara na ya ga-abụ Onye Ọchịchị dị obi ọma, nke ezi omume, ma zuo okè. Mgbe ọ laghachiri n’eluigwe, e guzobeghị ya dị ka Eze nke Alaeze Chineke ozugbo. (Ndị Hibru 10:12, 13) Na 1914, Jehova nyere Jisọs ikike ahụ O kwere ya ná nkwa. Eri mgbe ahụ, Jisọs achịwo n’eluigwe dị ka Eze Jehova họpụtara.—Daniel 7:13, 14.

3. Jehova ahọpụtawokwa ụfọdụ ndị ikom na ndị inyom na-ekwesị ntụkwasị obi site n’ụwa ịga eluigwe. Ha ga-eso Jisọs chịa dị ka ndị eze, ndị ikpe, na ndị nchụàjà n’elu ihe a kpọrọ mmadụ. (Luk 22:28-30; Mkpughe 5:9, 10) Jisọs kpọrọ ndị a ga-eso ya chịa n’Alaeze ya “ìgwè atụrụ nta.” Ha dị 144,000 n’ọnụ ọgụgụ.—Luk 12:32; Mkpughe 14:1-3.

4. Ozugbo Jisọs ghọrọ Eze, ọ chụpụrụ Setan na ndị mmụọ ọjọọ ya n’eluigwe bịa n’ógbè nke ụwa. Ọ bụ n’ihi ya ka ihe jiworo dị oké njọ n’elu ụwa ebe a eri 1914. (Mkpughe 12:9, 12) Agha, ụnwụ nri, ọrịa na-efe efe, ịrị elu nke mmebi iwu—ihe ndị a nile bụ akụkụ nke “ihe ịrịba ama” nke na-egosi na Jisọs na-achị nakwa na usoro ihe nke a nọ na mgbe ikpeazụ ya.—Matiu 24:3, 7, 8, 12; Luk 21:10, 11; 2 Timoti 3:1-5.

5. N’oge na-adịghị anya Jisọs ga-ekpe ndị mmadụ ikpe, na-ekewa ha dị ka onye ọzụzụ atụrụ na-ekewapụta atụrụ n’ụmụ ewu. “Atụrụ” bụ ndị ga-egosiworị onwe ha ndị na-eguzosi ike n’ihe ọ ga-achị. Ha ga-anata ndụ ebighị ebi n’elu ụwa. “Ụmụ ewu” bụ ndị ga-ajụworị Alaeze Chineke. (Matiu 25:31-34, 46) N’ọdịnihu dị nso, Jisọs ga-ebibi ndị nile yiri ewu. (2 Ndị Tesalọnaịka 1:6-9) Ọ bụrụ na ị chọrọ ịbụ otu n’ime “atụrụ” Jisọs, ị ghaghị ige ntị n’ozi Alaeze ahụ ma mee ihe kwekọrọ n’ihe ị mụtara.—Matiu 24:14.

6. Ugbu a e kewara ụwa gaa n’ọtụtụ mba. Nke ọ bụla nwere ọchịchị nke ya. Mba ndị a na-alụsokarị onwe ha ọgụ. Ma Alaeze Chineke ga-anọchi ọchịchị nile nke mmadụ. Ọ ga-achị dị ka otu ọchịchị e nwere nanị ya n’elu ụwa dum. (Daniel 2:44) Mgbe ahụ a gaghị enwekwa agha, mpụ, na ime ihe ike ọzọ. Mmadụ nile ga-ebikọ ọnụ n’udo na ịdị n’otu.—Maịka 4:3, 4.

7. N’oge Ọchịchị Puku Afọ nke Jisọs, ndị mmadụ kwesịrị ntụkwasị obi ga-ezu okè, ụwa dum ga-aghọkwa paradaịs. Ka ọ na-erule ọgwụgwụ nke puku afọ ahụ, Jisọs ga-emeworị ihe nile Chineke sịrị ya mee. Mgbe ahụ ọ ga-enyeghachi Nna ya Alaeze ahụ. (1 Ndị Kọrint 15:24) Gịnị ma ị kọ­ọrọ ndị enyi gị na ndị ị hụrụ n’anya banyere ihe Alaeze Chineke ga-eme?

[Foto dị na peeji nke 13]

N’okpuru ịchịisi Jisọs, a gaghị enwekwa ịkpọasị

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya