Akwụkwọ A Kasị Ekesa n’Ụwa
“Bible bụ akwụkwọ a kasị agụ n’akụkọ ihe mere eme. . . . E kesawo ọnụ ọgụgụ ka ukwuu nke Bible karịa akwụkwọ ọ bụla ọzọ. A sụgharịwokwa Bible ọtụtụ ugbo, gaakwa n’ọtụtụ asụsụ karịa akwụkwọ ọ bụla ọzọ.”—“The World Book Encyclopedia.”1
N’AKỤKỤ ụfọdụ, ọtụtụ akwụkwọ dị ka ụmụ mmadụ. Ha na-apụta, nwee ike wuo ewu, wee—e wezụga ole na ole ndị bụ ọkpọka—mee ochie ma nwụọ. Ọ́bá akwụkwọ na-eje ozi dị ka ebe ili ozu nye ọtụtụ akwụkwọ meworo ochie, ndị a na-adịghị agụ agụ, ya bụ, ndị nwụrụ anwụ.
Otú ọ dị, Bible pụrụ iche ọbụna n’etiti akwụkwọ ndị bụ ọkpọka. Ọ bụ ezie na mmalite odide ya bụ laa azụ n’afọ 3,500 gara aga, ọ ka dị nnọọ ndụ. N’ụzọ dị ukwuu ọ bụ akwụkwọ a kasị ekesa n’ụzọ sara mbara n’ụwa.a Kwa afọ, a na-ekesa ihe dị ka nde 60 nke Bible dum ma ọ bụ akụkụ ya ụfọdụ. Mbipụta mbụ e biri site ná mkpụrụ akwụkwọ ndị a na-edogharị edogharị bụ n’ígwè obibi akwụkwọ onye nchepụta bụ́ onye Germany bụ́ Johannes Gutenberg n’ihe dị ka na 1455. Eri mgbe ahụ e biwo ihe dị ka ijeri Bible anọ (n’ozuzu ya ma ọ bụ akụkụ ya ụfọdụ). Ọ dịghị akwụkwọ ọzọ, ma nke okpukpe ma ụdị ndị ọzọ, bịarutetụrụ nso.
Bible bụkwa akwụkwọ a kasị sụgharịa n’akụkọ ihe mere eme. A sụgharịwo Bible dum ma ọ bụ akụkụ ya ụfọdụ gaa n’ihe karịrị asụsụ na olu 2,100.b Ihe karịrị 90 pasent nke ezinụlọ mmadụ pụrụ inweta ma ọ dịghị ihe ọzọ akụkụ ụfọdụ nke Bible n’asụsụ nke ha.2 N’ihi ya akwụkwọ a agafewo ókèala mba dị iche iche, meriekwa ihe mgbochi nile nke agbụrụ na ebo.
Ndekọ ọnụ ọgụgụ nanị nwere ike ha agaghị enye ihe dị ike mere ị ga-eji nyochaa Bible. Ka o sina dị, ọnụ ọgụgụ nkesa na nsụgharị ya na-ebu isi, na-agba akaebe maka ndọrọ zuru ụwa ọnụ nke Bible nwere. N’ezie akwụkwọ kasị aga ahịa na nke a kasị asụgharị n’akụkọ ihe mere eme nile nke mmadụ ruru eru ka ị tụlee ya.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a E chere na mbipụta ọzọ na-esote n’ịbụ nke a kasị kesaa bụ akwụkwọ nta mkpo ya na-acha ọbara ọbara bụ́ Quotations From the Works of Mao Tse-tung, nke e reworo ma ọ bụ kesaa ihe dị ka nde 800 n’ime ya.
b Ndekọ ọnụ ọgụgụ banyere ọnụ ọgụgụ asụsụ dabeere n’ọnụ ọgụgụ ndị United Bible Societies bipụtara.
[Foto dị na peeji nke 6]
Bible Gutenberg, na Latin, akwụkwọ mbụ zuru ezu site ná mkpụrụ akwụkwọ ndị a na-edogharị edogharị