Isi Mbụ
Gị na Akwụkwọ Daniel
1, 2. (a) Gịnị bụgasị ụfọdụ ọnọdụ pụrụ iche e kwuru maka ha n’akwụkwọ Bible bụ́ Daniel? (b) N’oge anyị, ajụjụ ndị dị aṅaa na-ebilite banyere akwụkwọ Daniel?
OTU eze dị ike achọọ igbu ndị amamihe ya n’ihi na ha enweghị ike ikpughe na ịkọwa nrọ ya dị mgbagwoju anya. A tụba ụmụ okorobịa atọ jụrụ ife onyinyo dị oké elu n’ọkụ na-enwu ajọ onwunwu, ma ha alanarị. N’etiti otu oké ememe, ọtụtụ narị mmadụ ahụ otu aka nke na-ede okwu ndị dị omimi n’ahụ ájá nke obí eze. Ndị na-akpa nkata ọjọọ emee ka a tụba otu agadi nwoke n’ime olulu ọdụm, ma o si n’ebe ahụ pụta n’enweghị ọkọ kọrọ ya. Onye amụma Chineke ahụ anụ ọhịa anọ n’otu ọhụụ, ihe ndị ha pụtara dịrukwara ọtụtụ narị afọ iri n’ihu.
2 Ndị a bụ nanị ụfọdụ n’ime akụkọ ndị dị n’akwụkwọ Bible bụ́ Daniel. Hà kwesịrị ka e chebara ha ezi echiche? Olee abamuru akwụkwọ a meworo ochie pụrụ inwe maka oge anyị? N’ihi gịnị ka ihe ndị merenụ n’ihe dị ka afọ 2,600 gara aga kwesịrị iji gbasa anyị?
DANIEL—AKWỤKWỌ OCHIE MAKA OGE A
3, 4. N’ihi gịnị ka ọtụtụ ndị mmadụ ji bụrụ ndị ziri ezi n’inwe nchegbu banyere ọdịnihu nke ihe a kpọrọ mmadụ?
3 Akụkụ dị ukwuu nke akwụkwọ Daniel na-elekwasị anya n’isiokwu nke ịchịisi ụwa, okwu kasị mkpa taa. Ọ fọrọ nke nta ka ọ bụrụ mmadụ nile ga-ekweta na anyị na-ebi n’oge siri ike. Kwa ụbọchị, akụkọ ụwa na-echetara anyị n’ụzọ dị ilu na ọha mmadụ na-emikpu ná nsogbu ndị siri oké ike—nke a dịkwa otú ahụ n’agbanyeghị ihe ndị dị ịrịba ama a rụzuworo na sayensị na nkà na ụzụ.
4 Tụlee nke a: Mmadụ ejewo ije n’ọnwa, ma n’ọtụtụ ebe ọ pụghị ịkpagharị n’okporo ámá nke mbara ụwa ya n’atụghị ụjọ. Ọ pụrụ iji ụdị ihe ọgbara ọhụrụ nile na-enyere ndụ aka kwajuo ụlọ ya, ma ọ pụghị ịkwụsị ịrị elu nke ezinụlọ ndị na-etisa etisa. Ọ pụkwara ichepụta ọgbọ ihe ọmụma, ma ọ pụghị ịkụziri ndị mmadụ otú e si ebikọ ọnụ n’udo. Hugh Thomas, bụ́ prọfesọ nke akụkọ ihe mere eme, dere n’otu mgbe, sị: “Mgbasa nke ihe ọmụma na agụmakwụkwọ akụziworo ihe a kpọrọ mmadụ ihe dị nta banyere inwe njide onwe onye na ihe ka nta banyere nkà nke isoro ndị ọzọ biri n’udo.”
5. N’akụkụ ka ukwuu, gịnị siworo n’ịchịisi mmadụ pụta?
5 Ná mgbalị iguzobe ọ̀tụ̀tụ̀ ụfọdụ nke ịdị n’usoro n’ọha mmadụ, ndị mmadụ ahaziwo onwe ha n’okpuru ọtụtụ ụdị gọọmentị. Otú ọ dị, ọ dịghị otu n’ime ha nke ịbụ eziokwu nke nchọpụta Eze Solomọn na-emetụtaghị: “Mgbe dị mgbe otu mmadụ nwere ike n’ahụ mmadụ ibe ya imejọ ya.” (Eklisiastis 4:1; 8:9) Otú ọ dị, ụfọdụ ndị ọchịchị enwewo ezi ebumnobi. Ka o sina dị, ọ dịghị eze, president, ma ọ bụ onye ọchịchị aka ike pụrụ iwepụ ọrịa na ọnwụ. Ọ dịghị mmadụ ọ bụla pụrụ ime ka ụwa anyị ghọghachi Paradaịs ahụ Chineke zubere ka ọ bụrụ.
6. N’ihi gịnị ka nkwado nke ịchịisi mmadụ na-ejighị dị Jehova mkpa iji mezuo uche ya?
6 Ma, Onye Okike dị njikere ma nwee ike ime ihe ndị dị otú ahụ. Ọ dịghị ya mkpa ịnata gọọmentị mmadụ ikike iji mezuo nzube ya, n’ihi na nye ya “a gụwo mba nile n’otu ntụ mmiri na-atụpụ n’ite mmiri, na n’uzuzu nke ihe ọ̀tụ̀tụ̀.” (Aịsaịa 40:15) Ee, Jehova bụ Eze Na-achị Isi n’eluigwe na ala. N’ihi ya, o nwere ikike karịrị nke gọọmentị mmadụ nke ukwuu. Ọ bụ Alaeze Chineke ga-anọchi ịchịisi nile nke mmadụ, na-ewetara ihe a kpọrọ mmadụ ngọzi ebighị ebi. Ikekwe ọ dịghị ebe ọ bụla e mere ka nke a doo anya karịa n’akwụkwọ Bible bụ́ Daniel.
DANIEL—ONYE CHINEKE HỤRỤ N’ANYA NKE UKWUU
7. Ònye bụ Daniel, oleekwa otú Jehova si were ya?
7 Jehova Chineke nwere ịhụnanya dị ukwuu n’ebe Daniel nọ, bụ́ onye jere ozi dị ka onye amụma ya ruo ọtụtụ afọ. N’ezie, mmụọ ozi Chineke kọwara Daniel dị ka “ihe a na-achọsi ike nke ukwuu.” (Daniel 9:23) Okwu Hibru mbụ a sụgharịrị ịbụ “ihe a na-achọsi ike nke ukwuu” pụrụ ịpụta “onye a hụrụ n’anya nke ukwuu,” “onye e ji kpọrọ ihe nke ukwuu,” ọbụna “onye a kasị nwee mmasị na ya.” Daniel kasị dị oké ọnụ ahịa n’anya Chineke.
8. Olee otú Daniel si bịa nọrọ na Babilọn?
8 Ka anyị tụlee ná mkpirikpi ọnọdụ pụrụ iche nke onye amụma a a hụrụ n’anya. Na 618 T.O.A., Eze Nebukadneza nke Babilọn nọchibidoro Jerusalem. (Daniel 1:1) Nwa oge ka nke ahụ gasịrị, e mere ka ụfọdụ ndị ntorobịa bụ́ ndị Juu gụrụ akwụkwọ gaa Babilọn n’ike. Daniel so n’ime ha. N’oge ahụ, ikekwe ọ nọ n’afọ iri na ụma ya.
9. Olee ọzụzụ e nyere Daniel na ndị enyi ya bụ́ ndị Hibru?
9 Daniel na ndị enyi ya bụ́ Hananaịa, Mishael, na Azaraịa so n’ime ndị Hibru a họọrọ ịnata ọzụzụ afọ atọ ‘n’akwụkwọ na asụsụ nke ndị Kaldea.’ (Daniel 1:3, 4) Ụfọdụ ndị ọkà mmụta na-ekwu na nke a yiri ka ọ bụghị nanị ịmụ asụsụ. Dị ka ihe atụ, Prọfesọ C. F. Keil na-asị: “A ga-ezi Daniel na ndị enyi ya amamihe nke ndị nchụàjà na ndị gụrụ akwụkwọ nke Kaldea, bụ́ nke a kụziri n’ụlọ akwụkwọ Babilọn.” Ya mere a na-enye Daniel na ndị enyi ya ọzụzụ pụrụ iche maka ọrụ gọọmenti.
10, 11. Olee ihe ịma aka ndị Daniel na ndị enyi ya chere ihu, oleekwa enyemaka Jehova nyere ha?
10 Lee oké mgbanwe ọnọdụ nke a bụụrụ Daniel na ndị òtù ya! Na Juda, ha ebiwo n’etiti ndị na-efe Jehova. Ugbu a, ndị na-efe chi dị iche iche ndị dị n’akụkọ ọdịbendị na-emeghị eme gbara ha gburugburu. Ka o sina dị, e menyeghị Daniel, Hananaịa, Mishael, na Azaraịa ka na-eto eto ụjọ. Ha kpebisiri ike—n’agbanyeghị ọnọdụ a na-ama okwukwe aka—ijigidesi ezi ofufe ike.
11 Nke a agaghị adị mfe. Eze Nebukadneza bụ onye na-efesi Marduk ike, bụ́ chi kasị ukwuu nke Babilọn. Mgbe ụfọdụ, ihe ndị eze na-achọ ka e mee bụ nke ndị na-efe Jehova ofufe na-adịghị anabata ma ọlị. (Dị ka ihe atụ, lee Daniel 3:1-7.) Ma, Daniel na ndị enyi ya nwere nduzi Jehova na-adịghị ada ada. N’ime afọ atọ nke ọzụzụ ha, Chineke ji “ọmụma ihe na uche n’akwụkwọ na amamihe nile” gọzie ha. Tụkwasị na nke ahụ, e nyere Daniel ikike ịghọta ihe ọhụụ na nrọ pụtara. Ka oge na-aga mgbe eze nyochara ụmụ okorobịa anọ ndị a, ọ hụrụ na ha ka “ndị odeakwụkwọ dị nsọ nile na ndị dibia nile ndị nọ n’alaeze ya nile mma ugbo iri.”—Daniel 1:17, 20.
ỊKPỌSA OZI CHINEKE
12. Olee ọrụ pụrụ iche Daniel nwere?
12 N’ime ọtụtụ afọ nile ọ nọrọ na Babilọn, Daniel jere ozi dị ka onye ozi Chineke nye ndị ikom dị ka Eze Nebukadneza na Eze Belshaza. Ọrụ Daniel dị oké mkpa. Jehova ekwewo ka Nebukadneza bibie Jerusalem, jiri ya mee ihe dị ka ngwá ọrụ Ya. Ka oge na-aga, a ga-ebibikwa Babilọn. N’ezie, akwụkwọ Daniel na-ebuli Jehova Chineke elu dị ka Onye Kachasị Ihe Nile Elu nakwa dị ka Onye Na-achị Achị “n’alaeze nke mmadụ.”—Daniel 4:17.
13, 14. Gịnị mere Daniel mgbe Babilọn dasịrị?
13 Daniel nọgidere n’ozi obí eze ruo ihe dị ka afọ iri asaa, ruo mgbe Babilọn dara. Ọ dị ndụ hụ ka ọtụtụ ndị Juu na-alaghachi n’ala ha na 537 T.O.A., ọ bụ ezie na Bible ekwughị na o so ha. Ọ rụsiri nnọọ ọrụ ike ma ọ dịghị ihe ọzọ ruo n’afọ nke atọ nke ọchịchị Eze Saịrọs, bụ́ onye guzobere Alaeze Ukwu Peasia. Ka ọ na-erule oge ahụ, ọ ghaghị ịbụ na Daniel na-aga nso 100 afọ!
14 Mgbe Babilọn dasịrị, Daniel deturu ihe omume ndị kasị mkpa ná ndụ ya. Ihe o dere bụ ugbu a akụkụ dị ịrịba ama nke Bible Nsọ, a makwaara ya dị ka akwụkwọ Daniel. Ma n’ihi gịnị ka anyị kwesịrị iji ṅaa akwụkwọ ochie a ntị?
AKỤKỤ ABỤỌ, OTU OZI
15. (a) Olee akụkụ abụọ dị n’akwụkwọ Bible bụ́ Daniel? (b) Olee otú akụkụ Daniel nke bụ́ akụkọ pụrụ isi baara anyị uru?
15 Akwụkwọ Daniel bụ́ nke pụrụ iche nwere akụkụ abụọ dịrịtara nnọọ iche—otu bụ akụkọ, nke ọzọ bụ amụma. Akụkụ abụọ ahụ nke akwụkwọ Daniel pụrụ iwulite okwukwe anyị. N’ụzọ dị aṅaa? Akụkụ bụ akụkọ—nke so n’ime ndị kasị doo anya na Bible—na-egosi anyị na Jehova Chineke ga-agọzi ma lekọta ndị nọgidere na-eguzosi ike n’ezi ihe nye ya. Daniel na ndị enyi ya atọ nọgidesiri ike n’agbanyeghị ọnwụnwa ndị na-eyi ndụ egwu. Taa, ịtụle ihe nlereanya ha nke ọma ga-ewusi ndị nile chọrọ ịnọgide na-eguzosi ike n’ihe nye Jehova ike.
16. Olee ihe anyị na-amụta site n’akụkụ Daniel nke bụ́ amụma?
16 Akụkụ amụma nke Daniel na-ewulite okwukwe site n’igosi na Jehova maara ihe ga-emenụ ọtụtụ narị afọ—ọbụna ọtụtụ puku afọ—tupu ha emee. Dị ka ihe atụ, Daniel nyere nkọwa sara mbara banyere mbilite na ọdịda nke ike ọchịchị ụwa dị iche iche malite n’oge nke Babilọn oge ochie ruo kpọmkwem na “mgbe ọgwụgwụ.” (Daniel 12:4) Daniel na-adọrọ uche anyị gaa n’Alaeze Chineke nke dị n’aka Eze Ọ họpụtara ahọpụta na “ndị nsọ” na-eso ya, na-ezo aka n’ebe ọ dị dị ka ọchịchị nke ga-adịru mgbe ebighị ebi. Ọchịchị a ga-emezu nzube Jehova maka ụwa anyị n’ụzọ zuru ezu, ọ ga-arụpụtakwa ngọzi nye ndị nile chọrọ ijere Chineke ozi.—Daniel 2:44; 7:13, 14, 22.
17, 18. (a) Olee otú inyocha akwụkwọ Daniel nke ọma ga-esi wusie okwukwe anyị ike? (b) Olee okwu ọ dị mkpa ka e lebara anya tupu anyị abanye n’ịmụ akwụkwọ amụma a nke Bible?
17 Ọ bụ ihe obi ụtọ na Jehova adịghị ezochi ihe ọmụma banyere ihe ndị ga-eme n’ọdịnihu. Kama nke ahụ, ọ bụ onye “na-ekpughe ihe nzuzo nile.” (Daniel 2:28) Ka anyị na-atụle mmezu nke amụma ndị e dekọrọ n’akwụkwọ Daniel, a ga-ewusi okwukwe anyị ná nkwa Chineke ike. Anyị ga-ejidekwu nnọọ n’aka na Chineke ga-emezu nzube ya kpọmkwem n’oge ya nakwa n’ụzọ ọ họọrọ iji mee ya.
18 Ndị nile ji obi na-anabata ihe na-amụ akwụkwọ Bible bụ́ Daniel ga-eto n’okwukwe. Otú ọ dị, tupu anyị abanye n’inyocha akwụkwọ a n’ụzọ miri emi, ọ dị anyị mkpa ịtụle ihe àmà e nwere iji hụ ma akwụkwọ a ọ̀ bụ eziokwu n’ezie. Ụfọdụ ndị nkatọ akatọwo akwụkwọ Daniel, na-asị na e dere amụma ya n’ezie mgbe ha mezusịrị. Nzọrọ ndị a nke ndị nkatọ hà ziri ezi? Isiakwụkwọ nke na-esonụ ga-elebara okwu a anya.
GỊNỊ KA Ị GHỌTARA?
• N’ihi gịnị ka Daniel ji bụrụ akwụkwọ dịịrị oge a?
• Olee otú Daniel na ndị enyi ya si banye n’ọrụ gọọmenti Babilọn?
• Gịnị bụ ọrụ pụrụ iche Daniel nwere na Babilọn?
• N’ihi gịnị ka anyị kwesịrị iji ṅaa ntị n’amụma Daniel?
[Foto dị na peeji nke nke 4]
[Foto dị na peeji nke nke 11]