Isi nke Iri na Ise
Ndị Eze ahụ Na-amarịta Aka Abata na Narị Afọ nke 20
1. Olee ndị otu onye ọkọ akụkọ ihe mere eme kwuru na ha bụ ndị ndú Europe na narị afọ nke 19?
“E NWERE ọganihu na Europe nke narị afọ iri na itoolu nke karịrị nnọọ ihe ọ bụla a mabuuru,” ka ọkọ akụkọ ihe mere eme bụ́ Norman Davies na-ede. Ọ na-agbakwụnye: “Europe nwere ike ọ na-enwetụbeghị: ikike nkà na ụzụ, ikike akụ̀ na ụba, ikike ọdịbendị, ikike gafere kọntinent ahụ.” Ndị ndú nke “‘narị afọ nke ike’ nwere mmeri nke Europe,” ka Davies na-ekwu, “bu ụzọ bụrụ Great Britain . . . e mesịakwa Germany n’iri afọ ndị sochirinụ.”
‘OBI DỊ N’IME IHE ỌJỌỌ’
2. Ka narị afọ nke 19 gwụsịrị, olee ike ọchịchị ndị weere ọkwá “eze Ugwu” na “eze Ndịda”?
2 Ka narị afọ nke 19 na-eru nso ọgwụgwụ ya, Alaeze Ukwu Germany bụ “eze Ugwu,” Britain nọkwa n’ọkwá nke “eze Ndịda.” (Daniel 11:14, 15) “Eze abụọ ndị a,” ka mmụọ ozi Jehova kwuru, “obi ha ga-adị n’ime ihe ọjọọ, ọ bụkwa n’otu tebụl ka ha ga-ekwu okwu ụgha.” Ọ gara n’ihu, sị: “Ma ọ gaghị aga nke ọma; n’ihi na ọgwụgwụ fọdụrụ ịdị na mgbe a kara aka.”—Daniel 11:27.
3, 4. (a) Ònye ghọrọ eze ukwu mbụ nke Alaeze Ukwu Germany, njikọ dị aṅaa ka e guzobekwara? (b) Olee ụkpụrụ Kaiser Wilhelm ji mee ihe?
3 Na January 18, 1871, Wilhelm nke Mbụ ghọrọ eze ukwu mbụ nke Alaeze Ukwu Germany. Ọ họpụtara Otto von Bismarck ịbụ onyeisi ala. Ebe o lekwasịrị anya n’iwulite alaeze ukwu ọhụrụ ahụ, Bismarck zeere ịlụso mba ndị ọzọ ọgụ ma soro Austria-Hungary na Itali jikọọ aka, nke a maara dị ka Njikọ Mba Atọ. Ma n’oge na-adịghị anya ọchịchọ nke eze ugwu ọhụrụ a na ndị nke eze ndịda adabakọghị.
4 Mgbe Wilhelm nke Mbụ na onye nọchiri ya, bụ́ Frederick nke Atọ, nwụrụ na 1888, Wilhelm nke Abụọ dị afọ 29 nọkwasịrị n’ocheeze. Wilhelm nke Abụọ, ma ọ bụ Kaiser Wilhelm, manyere Bismarck ịhapụ ọkwá ya, ọ chụsokwara ụkpụrụ nke ịgbasawanye ike Germany na-akpa n’ụwa nile. “N’okpuru Wilhelm nke Abụọ,” ka otu onye ọkọ akụkọ ihe mere eme na-ekwu, “[Germany] malitere ịkpa àgwà mpako na nke obi ọjọọ.”
5. Olee otú ndị eze abụọ ahụ si nọdụ ‘n’otu tebụl,’ gịnịkwa ka ha kwuru n’ebe ahụ?
5 Mgbe Czar Nicholas nke Abụọ nke Russia kpọrọ nzukọ udo na Hague, Netherlands, n’August 24, 1898, ọnọdụ dị ná nzukọ ahụ bụ esemokwu nke mba dị iche iche. Nzukọ a na nke sochiri ya na 1907 guzobere Ụlọikpe Na-adịgide Adịgide Maka Idozi Okwu na Hague. Site n’ịghọ ndị òtù nke ụlọikpe a, Alaeze Ukwu Germany nakwa Great Britain nyere echiche na ha chọrọ udo. Ha nọdụrụ “n’otu tebụl,” yie ka ha bụ ndị enyi, ma ‘obi ha dị n’ime ihe ọjọọ.’ Atụmatụ akọ nke ‘ikwu okwu ụgha n’otu tebụl’ apụghị ịkwalite ezi udo. Banyere ọchịchọ ndọrọ ndọrọ ọchịchị, azụmahịa, na ọrụ agha ha, ‘ọ pụghị ịga nke ọma’ n’ihi na ọgwụgwụ nke eze abụọ ahụ “fọdụrụ ịdị na mgbe [Jehova Chineke] kara aka.”
“IMEGIDE ỌGBỤGBA NDỤ NSỌ”
6, 7. (a) N’ụzọ dị aṅaa ka eze ugwu si ‘laghachi n’ala ya’? (b) Olee otú eze ndịda si meghachi omume n’ike na-ebuwanye ibu nke eze ugwu?
6 N’ịga n’ihu, mmụọ ozi Chineke kwuru, sị: “Ọ [eze ugwu] ga-alaghachikwa n’ala ya n’akụ̀ ukwu; obi ya ga-abụkwa imegide ọgbụgba ndụ nsọ; ọ ga-emekwa ihe, laghachi n’ala ya.”—Daniel 11:28.
7 Kaiser Wilhelm laghachiri “n’ala,” ma ọ bụ ọnọdụ elu ala, nke eze ugwu oge ochie ahụ. N’ụzọ dị aṅaa? Site n’iwulite ọchịchị ndị eze ukwu nke e zubere iji gbasaa Alaeze Ukwu Germany, gbasaakwa ike o nwere. Wilhelm nke Abụọ chụsoro ihe mgbaru ọsọ ha ịbụ ndị na-achị achị n’Africa na n’ebe ndị ọzọ. N’ịchọ ịma ika ike nke Britain n’agha mmiri aka, ọ gara n’ihu iwulite ndị agha mmiri dị ike. “Ndị agha mmiri nke Germany sitere n’ịbụ nke dị nnọọ nta gaa n’ịbụ nke nanị nke Britain karịrị n’ihe gafetụrụ afọ iri,” ka The New Encyclopædia Britannica na-ekwu. Iji nọgide na-aka ike, Britain aghaghị ịgbasawanye ihe omume agha mmiri ya n’ezie. Britain sokwaara France mee nkwekọrịta entente cordiale (nkwekọrịta enyi na enyi), o sokwaara Russia mee nkwekọrịta yiri nke ahụ, na-eguzobe Nkwekọrịta Mba Atọ. Ugbu a e kewara Europe gaa n’òtù ndị agha abụọ—Nkwekọrịta Mba Atọ n’otu akụkụ na Nkekọ Atọ n’aka nke ọzọ.
8. Olee otú Alaeze Ukwu Germany si bịa nwee “akụ̀ ukwu”?
8 Alaeze Ukwu Germany nwere ụkpụrụ ịchụso ihe n’ike, na-akpatara Germany “akụ̀ ukwu” n’ihi na ọ bụ akụkụ bụ́ isi nke Njikọ Mba Atọ ahụ. Austria-Hungary na Itali bụcha ndị Roman Katọlik. Ya mere, Njikọ Mba Atọ ahụ nwetakwara ihu ọma popu, ebe eze ndịda, ya na Nkwekọrịta Mba Atọ ya nke ihe ka ukwuu n’ime ha na-abụghị ndị Katọlik, enwetaghị ya.
9. Olee otú eze ugwu si ‘megide ọgbụgba ndụ nsọ ahụ’ n’ime obi ya?
9 Gịnị banyere ndị Jehova? O tewo aka ha kwupụtara na “oge nke mba ọzọ” ga-agwụsị na 1914.a (Luk 21:24) N’afọ ahụ, e guzobere Alaeze Chineke nke dị n’aka Onye Nketa Eze Devid, bụ́ Jisọs Kraịst, n’eluigwe. (2 Samuel 7:12-16; Luk 22:28, 29) Laarị azụ na March 1880, magazin Ụlọ Nche jikọtara ọchịchị Alaeze Chineke na ọgwụgwụ nke “mgbe a kara aka nke ndị mba ọzọ,” ma ọ bụ “oge ndị Jentaịl.” (King James Version) Ma obi nke eze Germany bụ́ eze ugwu ‘megidere ọgbụgba ndụ Alaeze ahụ dị nsọ.’ Kama ịnabata ọchịchị Alaeze, Kaiser Wilhelm ‘mere ihe’ site n’ịkwalite atụmatụ ya maka ịchị ụwa. Otú ọ dị, n’ime nke ahụ, ọ kụrụ mkpụrụ maka Agha Ụwa Mbụ.
‘OBI EMEBIE’ EZE AHỤ N’AGHA
10, 11. Olee otú Agha Ụwa Mbụ si malite, oleekwa otú nke a si bụrụ “na mgbe a kara aka”?
10 “Na mgbe a kara aka ka ọ [eze ugwu] ga-abịaghachi,” ka mmụọ ozi ahụ buru n’amụma, “baa na Ndịda; ma ọ gaghị adị na mgbe ikpeazụ otú ọ dịrị na mbụ.” (Daniel 11:29) “Mgbe a kara aka” nke Chineke iji kwụsị ọchịchị ndị Jentaịl na-achị ụwa bịara na 1914 mgbe o guzobere Alaeze eluigwe ahụ. Na June 28 nke afọ ahụ, onye omekome Serbia gburu Archduke Francis Ferdinand nke Austria na nwunye ya n’obodo Sarajevo, Bosnia. Nke ahụ kpaliri Agha Ụwa Mbụ.
11 Kaiser Wilhelm gbara ndị Austria-Hungary ume ka ha megwara Serbia. N’ịbụ ndị e kwere nkwa nkwado Germany, Austria-Hungary malitere ịlụso Serbia agha na July 28, 1914. Ma Russia bịara nyere Serbia aka. Mgbe Germany malitere ịlụso Russia agha, France (nke so ná Nkwekọrịta Mba Atọ ahụ) kwadoro Russia. Mgbe ahụ Germany malitere ịlụso France agha. Iji mee ka e nwee ike ịbanye na Paris n’ụzọ ka mfe, Germany wakporo Belgium, bụ́ nke Britain kwere nkwa ichebe nnọpụiche ya. N’ihi ya Britain malitere ịlụso Germany agha. Mba ndị ọzọ tinyere aka, Itali nọ na-agbanwe ndị ọ na-adụnyere úkwù. Mgbe a na-alụ agha ahụ, Britain mere Ijipt ala ọ na-echebe iji gbochie eze ugwu ịsụchi Ọwa Mmiri Suez na ịwakpo Ijipt, ala oge ochie nke eze ndịda.
12. N’oge Agha Ụwa Mbụ, n’ụzọ dị aṅaa ka ihe si ghara ‘ịdị otú ọ dịrị na mbụ’?
12 “N’agbanyeghị ịdị ukwuu na ịdị ike nke Njikọ Britain na Ndị Òtù Ya,” ka The World Book Encyclopedia na-ekwu, “o yiri ka ọ fọrọ nke nta ka Germany merie n’agha ahụ.” N’ọgụ ndị bu ụzọ n’etiti ndị eze abụọ ahụ, Alaeze Ukwu Rom, dị ka eze ugwu, anọwo na-emeri mgbe nile. Ma na nke ugbu a, ‘ihe adịghị otú ọ dịrị na mbụ.’ E meriri eze ugwu n’agha ahụ. N’ikwu ihe kpatara nke a, mmụọ ozi ahụ kwuru, sị: “Ụgbọ Kitim ga-abịa imegide ya; obi ya ewee mebie emebie.” (Daniel 11:30a) Gịnị bụ “ụgbọ Kitim” ahụ?
13, 14. (a) N’ụzọ bụ́ isi, gịnị bụ “ụgbọ Kitim” ndị bịara imegide eze ugwu? (b) Olee otú ụgbọ Kitim ndị ọzọ si bịa ka Agha Ụwa Mbụ na-aga n’ihu?
13 N’oge Daniel Kitim bụ Saịprọs. Ná mmalite nke agha ụwa mbụ ahụ, Saịprọs batara n’okpuru Britain. Ọzọkwa, dị ka The Zondervan Pictorial Encyclopedia of the Bible si kwuo, aha ahụ bụ́ Kitim “gbasapụrụ ịgụnye Ebe Ọ[dịda Anyanwụ] n’ozuzu ya, ma karịsịa Ebe Ọ[dịda Anyanwụ] bụ́ ndị ọrụ ụgbọ mmiri.” New International Version sụgharịrị okwu ahụ bụ́ “ụgbọ Kitim” ịbụ “ụgbọ mmiri ndị dị n’ụsọ osimiri nke ebe ọdịda anyanwụ.” N’oge agha ụwa mbụ, ụgbọ mmiri Kitim mesịrị bụrụ n’ụzọ bụ́ isi ụgbọ mmiri Britain, na-adọsa n’ụsọ osimiri ebe ọdịda anyanwụ nke Europe.
14 Ka a nọgidere na-alụ agha ahụ, ụgbọ mmiri ndị ọzọ nke Kitim wusiri Ndị Agha Mmiri Britain ike. Na May 7, 1915, ụgbọ agha okpuru mmiri nke Germany bụ́ U-20 kpuru ụgbọ mmiri ndị nkịtị bụ́ Lusitania ná mpụga ụsọ oké osimiri nke ebe ndịda Ireland. Ndị America 128 so ná ndị nwụrụnụ. Ka oge na-aga, Germany gbasapụrụ agha okpuru mmiri ya banye n’Atlantic. Mgbe nke ahụ gasịrị, n’April 6, 1917, President Woodrow Wilson nke United States malitere ịlụso Germany agha. N’ịbụ nke ụgbọ mmiri agha na usuu ndị agha United States nyeere aka, eze ndịda—ugbu a Ike Ọchịchị Ụwa Anglo-America—nọ na-alụso eze na-ama ya aka, agha kpụ ọkụ n’ọnụ.
15. Olee mgbe ‘obi mebiri’ eze ugwu?
15 N’ịbụ nke Ike Ọchịchị Ụwa Anglo-America na-alụso agha, ‘obi mebiri’ eze ugwu, o wee chịlie aka elu na November 1918. Wilhelm nke Abụọ gbagara Netherlands, Germany ghọkwara ripọblik. Ma eze ugwu ahụ adabeghị.
EZE AHỤ ‘EMEE IHE’
16. Dị ka amụma ahụ si kwuo, olee otú eze ugwu ga-esi meghachi omume ná mmeri e meriri ya?
16 “O [eze ugwu] wee laghachi, wesa ọgbụgba ndụ nsọ ahụ oké iwe, mee ihe, laghachi, tụgharịa uche ná ndị na-ahapụ ọgbụgba ndụ nsọ ahụ.” (Daniel 11:30b) Nke ahụ ka mmụọ ozi ahụ buru n’amụma, otú ahụ kwa ka o mere.
17. Gịnị dujere ná mbilite nke Adolf Hitler?
17 Mgbe agha ahụ biri na 1918, Njikọ Britain na Ndị Òtù Ya nwere mmeri manyere Germany ịba ná nkwekọrịta udo iji nye ya ntaramahụhụ. Ndị Germany weere ihe ndị e kwuru ná nkwekọrịta ahụ dị ka ihe dị ha njọ n’ahụ, ripọblik ọhụrụ ahụ ghọkwara nke na-adịghị ike site ná mmalite. Germany nwere oké nsogbu ruo ụfọdụ afọ ma nwee Oké Ndakpọ Akụ̀ na Ụba nke mere n’ikpeazụ ka nde mmadụ isii ghara inwe ọrụ. Ka ọ na-erule mmalite afọ ndị 1930, ọnọdụ achaala maka mbilite nke Adolf Hitler. Ọ ghọrọ onyeisi ala na January 1933, n’afọ na-esokwanụ ọ malitere ịbụ president nke ihe ndị Nazi kpọrọ Alaeze nke Atọ.b
18. Olee otú Hitler si “mee ihe”?
18 Ozugbo ọ malitere ịchị, Hitler mere mwakpo obi ịta mmiri megide “ọgbụgba ndụ nsọ ahụ,” bụ́ nke ụmụnna Jisọs Kraịst e tere mmanụ nọchiri anya ya. (Matiu 25:40) N’ime nke a o ‘mere ihe’ megide ndị Kraịst a na-eguzosi ike n’ihe, na-akpagbu ọtụtụ n’ime ha n’ụzọ obi ọjọọ. Hitler nwere ihe ịga nke ọma n’ụzọ akụ̀ na ụba na ná mmekọrịta ya na mba ndị ọzọ, ‘na-eme ihe’ n’akụkụ ndị ahụkwa. N’ime afọ ole na ole, o mere ka Germany bụrụ ike ọchịchị a maara amara n’ụwa.
19. N’ịchọ nkwado, ole ndị ka Hitler metara enyi?
19 Hitler ‘tụgharịrị uche ná ndị na-ahapụ ọgbụgba ndụ nsọ ahụ.’ Olee ndị bụ ndị a? Ihe àmà na-egosi na ọ bụ ndị ndú Krisendọm, bụ́ ndị zọọrọ na ha na Chineke nwere mmekọrịta ọgbụgba ndụ ma bụrụ ndị kwụsịworo ịbụ ndị na-eso ụzọ Jisọs Kraịst. Hitler kpọkuru “ndị na-ahapụ ọgbụgba ndụ nsọ ahụ” maka nkwado ha n’ụzọ gara nke ọma. Dị ka ihe atụ, o sooro popu mee nkwekọrịta na Rom. Na 1935, Hitler kepụtara Ụlọ Ọrụ Na-ahụ Maka Ihe Ndị Metụtara Chọọchị. Otu n’ime nzube ya bụ iweta chọọchị Evangelical n’okpuru nchịkwa nke ọchịchị.
“OGWE AKA ỤFỌDỤ” ESITE N’EZE AHỤ PỤTA
20. Olee “ogwe aka ụfọdụ” ndị eze ugwu jiri mee ihe, ọ bụkwa megide ònye?
20 N’oge na-adịghị anya, Hitler malitere ịlụ agha dị ka mmụọ ozi ahụ buworo n’amụma n’ụzọ ziri ezi: “Ogwe aka ụfọdụ ga-esitekwa n’akụkụ ya guzo, mee ka ebe nsọ ahụ ghara ịdị nsọ, bụ́ ebe ahụ siri ike, ha ga-ewezụgakwa àjà nsure ọkụ ahụ a na-esure mgbe dum.” (Daniel 11:31a) “Ogwe aka ụfọdụ” ahụ bụ usuu ndị agha nke eze ugwu jiri mee ihe iji lụso eze ndịda agha n’Agha Ụwa nke Abụọ. Na September 1, 1939, “ogwe aka ụfọdụ” nke Nazi wakporo Poland. Ụbọchị abụọ mgbe nke ahụ gasịrị, Britain na France malitere ịlụso Germany agha iji nyere Poland aka. Otú a ka Agha Ụwa nke Abụọ si malite. E meriri Poland ngwa ngwa, oge na-adịghị anya mgbe nke ahụ gasịkwara, usuu ndị agha Germany weghaara Denmark, Norway, Netherlands, Belgium, Luxembourg, na France. “Ná ngwụsị nke 1941,” ka The World Book Encyclopedia na-ekwu, “Nazi Germany na-achị kọntinent ahụ.”
21. Olee otú ihe si gbanwee megide eze ugwu n’oge Agha Ụwa nke Abụọ, na-arụpụta gịnị?
21 Ọ bụ ezie na Germany na Soviet Union abịanyewo aka ná Nkwekọrịta Ịbụ Enyi, Imekọ Ihe Ọnụ, na Ịkpa Ókèala, Hitler gara n’ihu ịwakpo ógbè Soviet na June 22, 1941. Ihe a mere ka Soviet Union dụnyere Britain úkwù. Usuu ndị agha Soviet gbanyesiri ụkwụ n’ala ike n’agbanyeghị mwakpo ndị mbụ kpụ ọkụ nke usuu ndị agha Germany mere. Na December 6, 1941, e meriri ndị agha Germany n’ezie na Moscow. Echi ya, ndị ha na Germany jikọrọ aka, bụ́ Japan, tụrụ bọmbụ na Pearl Harbor, Hawaii. Mgbe ọ nụrụ nke a, Hitler gwara ndị osote ya, sị: “Ugbu a a gaghị emerili anyị n’agha a.” Na December 11 o ji ọkụ ọkụ malite ịlụso United States agha. Ma o ledara ma ike Soviet Union ma nke United States anya. Ka ndị agha Soviet si n’ebe ọwụwa anyanwụ na-abịa, usuu ndị agha Britain na America esitekwa n’ebe ọdịda anyanwụ, n’egbughị oge ihe gbanwere megide Hitler. A malitere ịnapụ usuu ndị agha Germany ókèala ndị ha nwetaburu. Mgbe Hitler gbusịrị onwe ya, Germany chịliiri Njikọ Britain na Ndị Òtù Ya aka elu, na May 7, 1945.
22. Olee otú eze ugwu si ‘mee ka ebe nsọ ahụ gharakwa ịdị nsọ ma wezụga àjà nsure ọkụ ahụ a na-esure mgbe dum’?
22 ‘[Ogwe aka Nazi] ga-eme ka ebe nsọ ahụ ghara ịdị nsọ, bụ́ ebe ahụ siri ike, ha ga-ewezụgakwa àjà nsure ọkụ ahụ a na-esure mgbe dum,’ ka mmụọ ozi ahụ kwuru. Na Juda oge ochie, ebe nsọ ahụ bụ akụkụ nke ụlọ nsọ ahụ dị na Jerusalem. Otú ọ dị, mgbe ndị Juu jụrụ Jisọs, Jehova jụrụ ha na ụlọ nsọ ha. (Matiu 23:37–24:2) Kemgbe narị afọ mbụ O.A., ụlọ nsọ Jehova abụrụwo n’ezie nke ime mmụọ, na-enwe ebe nsọ ya kasị ebe nsọ nile n’eluigwe, na-enwekwa ogige ime mmụọ ya n’elu ala, bụ́ ebe ụmụnna Jisọs e tere mmanụ, bụ́ Onyeisi Nchụàjà, na-eje ozi. Malite n’afọ 1930 gaa n’ihu, “oké ìgwè mmadụ” ahụ esorowo ndị fọdụrụnụ e tere mmanụ fee ofufe, n’ihi ya kwa bụrụ ndị e kwuru na ha na-eje ozi ‘n’ụlọ nsọ Chineke.’ (Mkpughe 7:9, 15; 11:1, 2; Ndị Hibru 9:11, 12, 24) N’ala ndị ọ na-achị, eze ugwu mere ka ogige elu ụwa nke ụlọ nsọ ahụ ghara ịdị nsọ site n’ịnọgide na-akpagbu ihe fọdụrụ ahụ e tere mmanụ na ndị enyi ha. Mkpagbu ahụ dị oké njọ nke na e wepụrụ “àjà nsure ọkụ ahụ a na-esure mgbe dum”—àjà ihu ọha bụ́ otuto nye aha Jehova. (Ndị Hibru 13:15) Otú ọ dị, n’agbanyeghị ịta ahụhụ dị egwu, ndị Kraịst e tere mmanụ kwesịrị ntụkwasị obi, ha na “atụrụ ọzọ” ahụ nọgidere na-eme nkwusa n’oge Agha Ụwa nke Abụọ.—Jọn 10:16.
‘E DOO IHE ARỤ AHỤ’
23. Gịnị bụ “ihe arụ” ahụ na narị afọ mbụ?
23 Mgbe agha ụwa nke abụọ na-achọ ibi, ihe ọzọ mere, dị nnọọ ka mmụọ ozi Chineke buworo n’amụma. “Ha ga-edokwa ihe arụ nke na-akpata ịtọgbọrọ n’efu.” (Daniel 11:31b) Jisọs ekwuwokwa banyere “ihe arụ.” Na narị afọ mbụ, ọ bụ ndị agha Rom bịara na Jerusalem na 66 O.A. iji bịanyụọ nnupụisi ndị Juu.c—Matiu 24:15; Daniel 9:27.
24, 25. (a) Gịnị bụ “ihe arụ” ahụ n’oge a? (b) Ole mgbe, ọ bụkwa n’ụzọ dị aṅaa ka e si ‘doo ihe arụ ahụ’?
24 Olee “ihe arụ” nke ‘e doro’ n’oge a? N’ụzọ doro anya, ọ bụ Alaeze Chineke adịgboroja nke ‘rụrụ arụ.’ Nke a bụ Njikọ Mba Nile, bụ́ anụ ọhịa ahụ na-acha uhie uhie nke banyere n’abyss, ma ọ bụ kwụsị ịdị adị dị ka òtù maka udo ụwa mgbe Agha Ụwa nke Abụọ dara. (Mkpughe 17:8) Otú ọ dị, ‘anụ ọhịa ahụ gaje isi n’abyss ahụ rịgopụta.’ O mere nke a mgbe e guzobere Mba Ndị Dị n’Otu n’October 24, 1945, na-enwe mba 50 bụ ndị òtù ya gụnyere ebe bụbu Soviet Union. N’ụzọ dị otú a e doro “ihe arụ” ahụ nke mmụọ ozi ahụ buru n’amụma—Mba Ndị Dị n’Otu.
25 Germany abụwo onye iro bụ́ isi nke eze ndịda n’oge agha ụwa abụọ ahụ, ọ nọwokwa n’ọkwá nke eze ugwu. Ònye ga-abụ onye ọzọ ga-anọ n’ọkwá ahụ?
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Lee Isi nke 6 nke akwụkwọ a.
b Alaeze Ukwu Rom Dị Nsọ bụ alaeze nke mbụ, Alaeze Ukwu Germany abụrụkwa nke abụọ.
c Lee Isi nke 11 nke akwụkwọ a.
GỊNỊ KA Ị GHỌTARA?
• Ná ngwụsị nke narị afọ nke 19, olee ike ọchịchị ndị weere ọkwá eze ugwu na eze ndịda?
• N’oge Agha Ụwa Mbụ, olee otú ihe si n’ọgụ ahụ pụta si gosi na ihe ‘adịghị otú ọ dị na mbụ’ nye eze ugwu?
• Mgbe Agha Ụwa Mbụ gasịrị, olee otú Hitler si mee ka Germany ghọọ ike ọchịchị a maara amara n’ụwa?
• Gịnị si n’ịmarịta aka dị n’etiti eze ugwu na eze ndịda n’oge Agha Ụwa nke Abụọ pụta?
[Chaatị/Foto ndị dị na peeji nke 268]
Ndị Eze Dị na Daniel 11:27-31
Eze Ugwu Eze Ndịda
Daniel 11:30b, 31 Alaeze nke Atọ Hitler Ike Ọchịchị Ụwa
(Agha Ụwa nke Abụọ) Anglo-America
[Ndise]
A kpagburu ọtụtụ ndị Kraịst n’ogige ịta ahụhụ
[Ndise]
Ndị ndú na Krisendọm kwadoro Hitler
[Ndise]
President Woodrow Wilson ya na Eze George nke Ise
[Ndise]
Ụgbọala e gburu Archduke Ferdinand n’ime ya
[Ndise]
Ndị agha Germany, Agha Ụwa Mbụ
[Foto dị na peeji nke 257]
Na Yalta na 1945, Praịm Minista Britain bụ́ Winston Churchill, President Franklin D. Roosevelt nke United States, na Onyeisi Ala Joseph Stalin nke Soviet kwekọrịtara n’atụmatụ iweghara Germany, ihiwe gọọmenti ọhụrụ na Poland, na inwe nzukọ iji guzobe òtù Mba Ndị Dị n’Otu
[Foto ndị dị na peeji nke 258]
1. Archduke Ferdinand 2. Ụgbọ agha mmiri Germany 3. Ụgbọ agha mmiri Britain 4. Lusitania 5. Akwụkwọ mkpọsa agha nke United States
[Foto dị na peeji nke 263]
Adolf Hitler nwere obi ike na ya ga-emeri mgbe Japan ya na ya jikọrọ aka n’oge agha tụrụ bọmbụ na Pearl Harbor