Isi nke Iri na Otu
Ahụhụ Ga-adịrị Ndị Nnupụisi!
1. Olee mmehie dị oké njọ nke Jeroboam mere?
MGBE e kewara ndị ha na Jehova nọ n’ọgbụgba ndụ ịghọ alaeze abụọ, Jeroboam malitere ịchị alaeze ebo iri nke dị n’ebe ugwu. Eze ọhụrụ ahụ bụ onye ọchịchị dị ike, nke nwere ume. Ma o nweghị okwukwe n’ezie n’ebe Jehova nọ. N’ihi nke a o mere mmehie dị oké njọ nke nyere akụkọ ihe mere eme nile nke alaeze ebe ugwu ahụ ntụpọ ọjọọ. Mgbe ha nọ n’okpuru Iwu Mosis, e nyere ndị Israel iwu ịga ugboro atọ n’afọ n’ụlọukwu ahụ dị na Jerusalem, bụ́ nke dị ugbu a n’alaeze ebe ndịda nke Juda. (Deuterọnọmi 16:16) N’ịtụ egwu na njem dị otú ahụ a na-eme oge nile ga-eme ka ndị ọ na-achị chewe echiche ka e jikọtaghachi ha na ụmụnna ha nọ n’ebe ndịda, Jeroboam ‘mere ụmụ ehi abụọ nke ọlaedo; ọ sị ha, Unu arịgozuwo Jerusalem; lee chi gị, Israel, ndị mere ka i si n’ala Ijipt rịgopụta. Ọ dọba otu n’ime Betel, tinye nke ọzọ n’ime Dan.’—1 Ndị Eze 12:28, 29.
2, 3. Mmetụta dịgasị aṅaa ka mmehie Jeroboam nwere n’Israel?
2 Ruo nwa oge, atụmatụ Jeroboam yiri ka o nwere ihe ịga nke ọma. Ndị ahụ ji nke nta nke nta kwụsị ịga Jerusalem ma malite ife ụmụ ehi abụọ ahụ ofufe. (1 Ndị Eze 12:30) Otú ọ dị, omume okpukpe a nke bụ́ ndapụ n’ezi ofufe metọrọ alaeze ebo iri ahụ. N’afọ ndị dị n’ihu, ọbụna Jihu, bụ́ onye gosiri oké ịnụ ọkụ n’obi nke kwesịrị ịja mma n’ikpochapụ ofufe Beal n’Israel, nọgidere na-akpọ isiala nye ụmụ ehi ọlaedo ahụ. (2 Ndị Eze 10:28, 29) Gịnị ọzọ si n’ajọ mkpebi Jeroboam mere pụta? Ọgba aghara ọchịchị na ndị ahụ ịta ahụhụ.
3 N’ihi na Jeroboam esila n’ezi ofufe dapụ, Jehova kwuru na mkpụrụ ya agaghị achị ala ahụ, n’ikpeazụkwa, alaeze ebe ugwu ahụ ga-enweta oké ọdachi. (1 Ndị Eze 14:14, 15) Ihe Jehova kwuru mezuru. Mmadụ asaa n’ime ndị eze nke Israel chịrị afọ abụọ ma ọ bụ ihe na-erughị ya—ụfọdụ chịrị nanị ụbọchị ole na ole. Otu eze gburu onwe ya, ndị ikom nwere oké ọchịchọ gburu isii ma nọchie n’ocheeze. E nwere ọgba aghara, ime ihe ike, na igbu mmadụ n’Israel, karịsịa mgbe ọchịchị Jeroboam nke Abụọ gasịrị, bụ́ nke bịara ná njedebe n’ihe dị ka na 804 T.O.A. n’oge Ụzaịa nọ na-achị Juda. Ọ bụ n’ọnọdụ a ka Jehova zigaara alaeze ebe ugwu ịdọ aka ná ntị, ma ọ bụ “okwu” kpọmkwem site n’ọnụ Aịsaịa. “Onyenwe anyị zigara okwu baa n’ime Jekọb, o wee daba n’Israel.”—Aịsaịa 9:8.a
Mpako na Mkparị Akpata Iwe Chineke
4. Olee “okwu” Jehova zigara megide Israel, n’ihi gịnịkwa?
4 A gaghị eleghara “okwu” Jehova anya. “Ndị ahụ ga-amakwa, ha nile, bụ́ Efraim na onye bi na Sameria, ndị na-ekwu okwu n’ime mpako na n’oké obi.” (Aịsaịa 9:9) “Jekọb,” “Israel,” “Efraim,” na “Sameria,” ha nile na-ezocha aka n’alaeze ebe ugwu nke Israel, nke Efraim bụ ebo kasịnụ na ya, nke Sameria bụkwa isi obodo ya. Ihe Jehova kwuru megide alaeze ahụ bụ okwu ikpe siri ike n’ihi na Efraim dapụrụ n’ezi ofufe emewo ka obi ya kpọọ nkụ, ọ na-akparịkwa Jehova n’asọghị anya. Chineke agaghị echebe ndị ahụ pụọ n’ihe ndị ga-esi n’ụzọ ọjọọ ha pụta. A ga-amanye ha ịnụ, ma ọ bụ ịṅa ntị n’okwu Chineke.—Ndị Galetia 6:7.
5. Olee otú ndị Israel si gosi na ikpe Jehova adịghị emetụ ha n’ahụ?
5 Ka ọnọdụ na-akawanye njọ, nnukwu ihe na-efunahụ ndị ahụ, gụnyere ebe obibi ha—bụ́ ndị a na-ejikarị brik na osisi na-esighị ike ewu. Nke ahụ ò mere ka obi ha dị nro? Hà ga-aṅa ndị amụma Jehova ntị ma laghachikwuru ezi Chineke ahụ?b Aịsaịa dekọrọ mmeghachi omume mkparị nke ndị ahụ, sị: “Brik adazuwo, ma nkume a wara awa ka anyị ga-eji wuo: e gbutuzuwo osisi sycomore, ma osisi cedar ka anyị ga-etinye n’ọnọdụ ha.” (Aịsaịa 9:10) Ndị Israel mara Jehova aka ma ledaa ndị amụma ya anya, bụ́ ndị na-agwa ha ihe mere ha ji na-enwe ihe isi ike ndị ahụ. Ya bụ, ihe ndị ahụ na-ekwu bụ: ‘Ụlọ ndị anyị ji brik nke na-emebi emebi na osisi na-esighị ike wuo pụrụ ịdakasị, ma anyị ga-enweta ihe karịrị ihe ndị a na-ala n’iyi site n’iji ihe ndị ka mma wughachi ha—nkume a wara awa na osisi cedar!’ (Tụlee Job 4:19.) Nanị ihe Jehova ga-eme bụ inyekwu ha ntaramahụhụ.—Tụlee Aịsaịa 48:22.
6. Olee otú Jehova si bibie atụmatụ ndị Siria na Israel megide Juda?
6 Aịsaịa gara n’ihu ikwu, sị: “Jehova na-eme ka ndị na-akpagbu Rezin nọrọ n’elu imegide ya.” (Aịsaịa 9:11a) Eze Peka nke Israel na Eze Rezin nke Siria jikọrọ aka. Ha na-eme atụmatụ imeri alaeze ebo abụọ nke Juda na itinye eze ha ga na-achịkwa n’ocheeze Jehova dị na Jerusalem—“nwa Tabeel.” (Aịsaịa 7:6) Ma izu mmegide ahụ ga-akụ afọ n’ala. Rezin nwere ndị iro dị ike, Jehova ga-emekwa ka ndị iro a “nọrọ n’elu imegide ya,” Israel. Okwu bụ́ ‘mee ka ọ nọrọ n’elu’ pụtara ikwe ka ha buo agha mmeri nke ga-akpata mbibi nke ndị ahụ jikọrọ aka na nzube ha.
7, 8. Nye Israel, gịnị si ná mmeri Asiria meriri Siria pụta?
7 Ntisa nke ndị a jikọrọ aka malitere mgbe Asiria wakporo Siria. “Eze Asiria wee rịgoruo Damaskọs [isi obodo Siria], were ya, mee ka ndị ya jee biri na Kia, o mekwara ka Rezin nwụọ.” (2 Ndị Eze 16:9) Ebe onye òtù ya dị ike na-anọkwaghị ya, Peka chọpụtara na atụmatụ ya megide Juda akụọla afọ n’ala. N’ezie, ntakịrị oge mgbe Rezin nwụsịrị, Hoshea n’onwe ya, bụ́ onye weghaara ocheeze Sameria, gburu Peka.—2 Ndị Eze 15:23-25, 30.
8 Siria, bụ́ ndị ha na Israel jikọburu aka, nọzi n’okpuru Asiria, bụ́ mba kasị ike n’ógbè ahụ. Aịsaịa buru amụma banyere otú Jehova ga-esi jiri njikọ aka ọhụrụ a nke ọchịchị mee ihe: “Ọ [Jehova] na-akwalikwa ndị iro ya [Israel]; Siria site n’Ihu anyanwụ, na ndị Filistia site n’Ọdịda anyanwụ; ha na-ewerekwa ọnụ nile richapụ Israel. N’ihe a nile iwe Ya alaghachighị azụ, kama ruo ugbu a ka aka Ya na-esetị esetị.” (Aịsaịa 9:11b, 12) Ee, Siria bụzi onye iro Israel, Israel aghaghịkwa ijikere maka mwakpo nke ndị Asiria na Siria. Mwakpo ahụ gara nke ọma. Asiria mere onye ahụ weghaara ọchịchị, bụ́ Hoshea, ohu ya, na-ana ya ụtụ buru oké ibu. (Iri afọ ole na ole tupu mgbe ahụ, Asiria nwetara ego buru ibu site n’aka Eze Menahem nke Israel.) Lee ka ihe Hosea onye amụma kwuru si bụrụ eziokwu: “Ndị ala ọzọ eripịawo ike ya [Efraim]”!—Hosea 7:9; 2 Ndị Eze 15:19, 20; 17:1-3.
9. N’ihi gịnị ka anyị pụrụ iji kwuo na ndị Filistia si “n’Ọdịda anyanwụ” mee mwakpo?
9 Ọ̀ bụ na Aịsaịa ekwughịkwa na ndị Filistia ga-eme mwakpo “site n’Ọdịda anyanwụ”? Ee. Tupu e mepụta compass ndị ji ike ndọrọ arụ ọrụ, ndị Hibru na-akọwa akụkụ ihe dị na-adabere n’otú onye chere ihu n’ọwụwa anyanwụ si ahụ ya. N’ihi ya, ‘ihu anyanwụ’ bụ n’ihu, ebe ‘ọdịda anyanwụ,’ bụ́ ebe obodo ndị Filistia nke dị n’ụsọ oké osimiri dị, bụ azụ. “Israel” ahụ e hotara n’Aịsaịa 9:12 pụrụ ịgụnye Juda n’ebe a n’ihi na ndị Filistia wakporo Juda n’oge ọchịchị nke onye ya na Peka dịkọrọ ndụ, bụ́ Ehaz, merie ma weghara ọtụtụ obodo na ebe ndị e wusiri ike nke Juda. Dị ka Efraim nke dị n’ebe ugwu, ntaramahụhụ a sitere n’aka Jehova kwesịrị Juda n’ihi na ndapụ n’ezi ofufe jupụtakwara n’ime ya.—2 Ihe E Mere 28:1-4, 18, 19.
Malite ‘n’Isi Ruo n’Ọdụdụ’ —Mba nke Ndị Nnupụisi
10, 11. Ntaramahụhụ dị aṅaa ka Jehova ga-enye Israel n’ihi nnupụisi ha nọgidere na-enupụ?
10 N’agbanyeghị ahụhụ nile ọ na-ata—n’agbanyeghịkwa nkwupụta okwu ndị siri ike nke ndị amụma Jehova—alaeze ebe ugwu ahụ nọgidere na-enupụrụ Jehova isi. “Ndị nke a alaghachikwuteghị Onye na-etigbu ha, ọ bụghịkwa Jehova nke usuu nile nke ndị agha ka ha chọworo.” (Aịsaịa 9:13) N’ihi ya, onye amụma ahụ kwuru, sị: “Jehova wee na-ebipụ n’Israel isi na ọdụdụ, igu nkwụ na amị, n’otu ụbọchị. Okenye nke a na-ahụkwa ihu ọma, onye ahụ bụ isi; onye amụma kwa nke na-ezi okwu ụgha, onye ahụ bụ ọdụdụ. Ndị nduzi nke ndị nke a wee ghọọ ndị na-eme ka ha wagharịa; ọzọ, ndị ha a na-eduzi eduzi bụ ndị a na-eloda eloda.”—Aịsaịa 9:14-16.
11 “Isi” na “igu nkwụ” na-anọchite anya “okenye nke a na-ahụkwa ihu ọma”—ndị ndú nke mba ahụ. “Ọdụdụ” na “amị” na-ezo aka ná ndị amụma ụgha bụ́ ndị na-ekwu okwu na-atọ ndị ndú ha ụtọ. Otu ọkà mmụta Bible dere, sị: “A na-akpọ Ndị Amụma ụgha ọdụdụ, n’ihi na ọ bụ ha bụ ndị omume ha kasị njọ, nakwa n’ihi na ha bụ ndị odibo na-araparasi ike n’ahụ ndị ọchịchị ọjọọ ma na-akwado ha.” Prọfesọ Edward J. Young na-ekwu banyere ndị amụma ụgha a, sị: “Ha abụghị ndị ndú kama, ha na-eje ebe ndị ndú duuru ha jee, ha na-enye nnọọ otuto ọnụ efu ma na-achọ ihu ọma, ha dị ka nkịta nke na-egbu ọdụ.”—Tụlee 2 Timoti 4:3.
Ọbụna ‘Ndị Inyom Di Ha Nwụrụ na Ụmụ Mgbei’ Bụ Ndị Nnupụisi
12. Ruo ókè ha aṅaa ka omume rụrụ arụ ruworo n’etiti ndị Israel?
12 Jehova bụ Onye Na-agbachitere ndị inyom di ha nwụrụ na ụmụ mgbei. (Ọpụpụ 22:22, 23) N’agbanyeghị nke ahụ, gee ntị n’ihe Aịsaịa na-ekwu ugbu a: “Onyenwe anyị agaghị aṅụrị ọṅụ n’ahụ ụmụ okorobịa ha, Ọ gaghị enwekwa obi ebere n’ahụ ụmụ mgbei ha na ndị inyom ha di ha nwụrụ: n’ihi na onye ọ bụla n’ime ha bụ onye e merụrụ emerụ na onye na-eme ihe ọjọọ, ọnụ ọ bụla na-ekwukwa ihe nzuzu. N’ihe a nile iwe Ya alaghachighị azụ, kama ruo ugbu a ka aka Ya na-esetị esetị.” (Aịsaịa 9:17) Ndapụ n’ezi ofufe emerụwo akụkụ nile nke ọha mmadụ, gụnyere ndị inyom di ha nwụrụ na ụmụ mgbei! Jehova ji ndidi na-ezipụ ndị amụma ya, na-enwe olileanya na ndị ahụ ga-agbanwe ụzọ ha. Dị ka ihe atụ, Hosea na-arịọ, sị: “Israel, laghachikwute Jehova, bụ́ Chineke gị; n’ihi na ị sụwo ngọngọ site n’ajọ omume gị.” (Hosea 14:1) Lee ka ọ na-aghaghị isiworị wute Onye Na-agbachitere ndị inyom di ha nwụrụ na ụmụ mgbei imezu ihe e kpere n’ikpe ọbụna n’ahụ ha!
13. Gịnị ka anyị pụrụ ịmụta site n’ọnọdụ dịnụ n’oge Aịsaịa?
13 Dị ka Aịsaịa, anyị na-ebi n’oge ndị dị oké egwu tupu ụbọchị ikpe Jehova megide ndị ajọ omume. (2 Timoti 3:1-5) Mgbe ahụ, lee ka o si dị mkpa na ezi ndị Kraịst, n’agbanyeghị ọnọdụ ha ná ndụ, ga-anọgide na-adị ọcha n’ime mmụọ, n’omume, na n’uche iji nọgide na-enwe ihu ọma Chineke. Ka onye ọ bụla chebesie mmekọrịta ya na Jehova ike. Ka onye ọ bụla nke siworo na “Babilọn Ukwu” ahụ pụọ ghara mgbe ọ bụla “iso ya nwekọọ mmehie ya nile.”—Mkpughe 18:2, 4.
Ofufe Ụgha Akpata Ime Ihe Ike
14, 15. (a) Gịnị si n’ife ndị mmụọ ọjọọ ofufe pụta? (b) Aịsaịa buru amụma na Israel ga-ata ahụhụ dị aṅaa nke na-aga n’ihu mgbe ahụ?
14 Ofufe ụgha bụ n’ezie, ife ndị mmụọ ọjọọ. (1 Ndị Kọrint 10:20) Dị ka e mere ka ọ pụta ìhè tupu Iju Mmiri ahụ, mmetụta nke ndị mmụọ ọjọọ na-eduga n’ime ihe ike. (Jenesis 6:11, 12) Mgbe ahụ, ọ bụghị ihe ijuanya na mgbe Israel si n’ezi ofufe dapụ wee malite ife ndị mmụọ ọjọọ, ime ihe ike na mmebi iwu jupụtara n’ala ahụ.—Deuterọnọmi 32:17; Abụ Ọma 106:35-38.
15 N’ezoghị ọnụ, Aịsaịa kọwara mgbasa nke mmebi iwu na ime ihe ike n’Israel: “Mmebi iwu erewo dị ka ọkụ; ogwu na uké ka ọ na-erichapụ: ọ na-enwukwa ọkụ n’alụghụlụ nile nke oké ọhịa, ha wee kwụlie elu ná nkwụli elu nke anwụrụ ọkụ. N’ime nrubiga ókè iwe nke Jehova nke usuu nile nke ndị agha ka e rechapụworo ala: ndị nke a wee dị ka nri ọkụ; onye ọ bụla adịghị enwe ọmịiko n’ahụ nwanne ya. O wee gbutuo n’aka nri, ma agụụ na-agụ ya: o wee rie ihe n’aka ekpe, ma afọ ejughị ha: ha ga-eri, onye ọ bụla anụ ahụ nke ogwe aka ya: Manase ga-emegide Efraim, Efraim ga-emegidekwa Manase: ndị ahụ abụọ ga-emegide Juda. N’ihe a nile iwe Ya alaghachighị azụ, kama ruo ugbu a ka aka Ya na-esetị esetị.”—Aịsaịa 9:18-21.
16. Olee otú e si mezuo ihe ndị e kwuru n’Aịsaịa 9:18-21?
16 Dị ka ọkụ nke na-agbasa site n’otu ọhịa gaa n’ọzọ, ime ihe ike ekweghị nchịkwa, n’egbughịkwa oge, ọ gbasaruru “n’alụghụlụ nile nke oké ọhịa,” na-akpata nnukwute ọkụ na-agba n’oké ọhịa nke bụ́ ime ihe ike. Ndị na-akọwa Bible, bụ́ Keil na Delitzsch, na-akọwa ókè ime ihe ike ahụ ruru dị ka “mbibi onwe onye kasị njọ n’oge agha obodo nke na-enweghị nchịkwa. N’ịbụ ndị na-enweghị obi ebere ọ bụla, ha gburịtara ibe ha ma ha enweghị afọ ojuju.” Ma eleghị anya a kpọrọ ebo Efraim na Manase aha iche n’ebe a n’ihi na ọ bụ ha bụ ndị bụ́ isi na-anọchite anya alaeze ebe ugwu, dịkwa ka ndị sitere n’eriri ụmụ ndị ikom abụọ nke Josef, ọ bụ ha kasị bụrụ ndị ikwu nke ebo iri ahụ. Otú ọ dị, n’agbanyeghị nke a, ha kwụsịrị igbu ụmụnne ha nanị mgbe ha busoro Juda nke dị n’ebe ndịda agha.—2 Ihe E Mere 28:1-8.
Ndị Ikpe Rụrụ Arụ Ezute Onyeikpe Ha
17, 18. Mmerụ dị aṅaa dị n’usoro iwu na ọchịchị nke Israel?
17 Jehova lekwasịziri anya ikpe ya n’ahụ ndị ikpe na ndị isi ndị ọzọ rụrụ arụ nke Israel. Ndị a ji ike ha eme ihe n’ụzọ na-ezighị ezi site n’ịpụnara ndị e wedara n’ala na ndị ụwa na-ara ahụ ihe ha, bụ́ ndị na-abịakwute ha maka ikpe ziri ezi. Aịsaịa na-ekwu, sị: “Ahụhụ ga-adịrị ndị na-atọ ụkpụrụ dị iche iche nke ajọ ihe, na ndị odeakwụkwọ nke deworo mmegbu n’akwụkwọ: iwezụga ndị na-enweghị ike n’ezi ikpe, na ịnapụ ikpe ziri ezi nke ndị e wedara n’ala nke ndị m, ka ndị inyom di ha nwụrụ wee bụrụ ihe ha kwatara n’agha, ka ha wee lụtakwa ihe ụmụ mgbei n’agha!”—Aịsaịa 10:1, 2.
18 Iwu Jehova machibidoro ụdị nile nke ikpe na-ezighị ezi: “Unu emela ajọ omume n’ikpe: ahụla onye na-enweghị ike ihu ọma, asọpụrụkwala ihu nke onye ukwu.” (Levitikọs 19:15) N’ileghara iwu ahụ anya, ndị isi a na-emepụta “ụkpụrụ dị iche iche [nke ha] nke ajọ ihe” iji mee ka ihe bụ́ kpọmkwem izu ohi kasị njọ—iweghara ntakịrị ihe onwunwe ndị inyom di ha nwụrụ na ụmụ mgbei nwere—bụrụ ihe iwu kwadoro. Chi ụgha dị iche iche nke Israel n’ezie adịghị ahụ ikpe na-ezighị ezi a, ma Jehova na-ahụ ya. Site n’ọnụ Aịsaịa, Jehova chere ihu ugbu a n’ebe ajọ ndị ikpe a nọ.
19, 20. Olee otú a ga-esi gbanwee ọnọdụ nke ndị ikpe rụrụ arụ nke Israel, gịnịkwa ga-eme “nsọpụrụ” ha?
19 “Gịnị ka unu ga-eme n’ụbọchị nleta, na n’ịla n’iyi nke ga-esi n’ebe dị anya bịa? Ònye ka unu ga-agbakwuru ka o wee nyere unu aka? ọ̀ bụkwa olee ebe [ka] unu ga-ahapụ nsọpụrụ unu? Ọ bụ nanị na ọ makpuworo n’ọnọdụ onye mkpọrọ, ọ bụkwa n’ọnọdụ ndị e gburu egbu ka ha ga-ada.” (Aịsaịa 10:3, 4a) Ndị inyom di ha nwụrụ na ụmụ mgbei enweghị ndị ikpe na-akwụwa aka ọtọ ha ga-agakwuru. Mgbe ahụ lee ka o si kwesị ekwesị na Jehova jụziri ndị ikpe ahụ rụrụ arụ nke Israel onye ha ga-echigharịkwuru ugbu a ha ga-aza ajụjụ n’ihu Jehova. Ee, ha na-aga ịmụta na “ọ bụ ihe dị egwu ịdaba n’aka Chineke dị ndụ.”—Ndị Hibru 10:31.
20 “Nsọpụrụ” nke ajọ ndị ikpe a—ùgwù, nsọpụrụ, na ike nke akụ̀ na ụba na ọkwá ha na-ewetara ha n’ụwa a—agaghị adịte anya. Ụfọdụ ga-aghọ ndị a nwụdere n’agha, ‘na-amakpu’ n’ala, ma ọ bụ na-akpọ isiala, ha na ndị ọzọ e ji eji, ebe a ga-egbu ndị ọzọ egbu, ozu nke ndị nwụrụ n’agha ga-ekpuchi ozu ha. “Nsọpụrụ” ha na-agụnyekwa akụ̀ na ụba ha nwetara n’ụzọ na-akwụghị ọtọ, bụ́ nke ndị iro ga-akwakọrọ.
21. Iwe Jehova megide Israel ọ̀ kwụsịwo n’ihi ntaramahụhụ ndị o nwetaworo?
21 Aịsaịa ji ịdọ aka ná ntị siri ike mechie nkebi ikpeazụ a nke ihe odide e dere n’ụdị uri: “N’ihe a nile [ahụhụ nile mba ahụ taworo rute mgbe ahụ] iwe Ya alaghachighị azụ, kama ruo ugbu a ka aka Ya na-esetị esetị.” (Aịsaịa 10:4b) Ee, Jehova ka nwere ihe ọ ga-agwa Israel. Ogwe aka Jehova nke setịrị esetị agaghị alaghachi azụ ruo mgbe o tiri alaeze ebe ugwu ahụ na-enupụ isi ihe otiti ikpeazụ, nke ga-akpata oké mbibi.
Adabala Mgbe Ọ Bụla n’Okwu Ụgha na Ịchọ Ọdịmma Onwe Onye
22. Gịnị ka anyị pụrụ ịmụta site n’ihe mere Israel?
22 Ihe Jehova kwuru site n’ọnụ Aịsaịa mezuru n’ụzọ dị ike n’ahụ Israel, ‘ọ laghachikwuteghịkwa ya n’efu.’ (Aịsaịa 55:10, 11) Akụkọ ihe mere eme dekọrọ otú alaeze ebe ugwu nke Israel si bịa ná njedebe n’ike, anyị pụkwara nanị iche n’echiche ahụhụ ndị bi n’ime ya na-aghaghị ịtaworị. N’otu aka ahụkwa, ihe ndị Chineke kwuru ga-emezu n’ahụ usoro ihe dị ugbu a, karịsịa n’ahụ Krisendọm si n’ezi ofufe dapụ. Mgbe ahụ, lee ka o si dị mkpa na ndị Kraịst agaghị ege ntị ná mkpọsa ụgha, nke na-emegide Chineke! Site n’enyemaka nke Okwu Chineke, e kpughewo atụmatụ aghụghọ nile nke Setan eri oge, ka ha wee ghara inweta anyị dị ka ha nwetara ndị Israel oge ochie. (2 Ndị Kọrint 2:11) Ka anyị nile ghara ịkwụsị mgbe ọ bụla ife Jehova ofufe “n’ime mmụọ na eziokwu.” (Jọn 4:24) Ọ bụrụ na anyị mee otú ahụ, ogwe aka ya setịrị esetị agaghị eti ndị na-efe ya ofufe ihe dị ka o tiri Efraim na-enupụ isi; ọ ga-amakụ ha n’ịhụnanya, ọ ga-enyekwara ha aka ije ije n’ụzọ ahụ nke na-eduga ná ndụ ebighị ebi n’ime ụwa paradaịs.—Jemes 4:8.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Ihe mejupụtara Aịsaịa 9:8–10:4 bụ nkebi anọ nke ihe odide e dere n’ụdị uri, nke ọ bụla ji okwu na-agba àmà ihe ọjọọ wee mechie: “N’ihe a nile iwe Ya alaghachighị azụ, kama ruo ugbu a ka aka Ya na-esetị esetị.” (Aịsaịa 9:12, 17, 21; 10:4) Ụzọ ide ihe a jikọtara Aịsaịa 9:8–10:4 ịghọ otu “okwu” nke nwere ọtụtụ akụkụ. (Aịsaịa 9:8) Rịbakwa ama na “ruo ugbu a ka aka [Jehova] na-esetị esetị,” ọ bụghị ka ya na ha kpezie, kama iji kpee ikpe.—Aịsaịa 9:13.
b Ndị amụma Jehova nọ n’alaeze ebe ugwu nke Israel gụnyere Jihu (ọ bụghị nke bụ́ eze), Elaịja, Maịkaịa, Elaịsha, Jona, Oded, Hosea, Emọs, na Maịka.
[Foto dị na peeji nke 139]
Mmebi iwu na ime ihe ike gbasara n’Israel dị ka ọkụ na-agba n’oké ọhịa
[Foto dị na peeji nke 141]
Ndị na-erigbu ndị ọzọ ga-aza ajụjụ n’ihu Jehova