Isi nke Atọ
“Onye nke M M Họpụtara, Onye Ihe Ya Tọrọ Mkpụrụ Obi M Ụtọ”
1, 2. N’ihi gịnị ka isi 42 nke Aịsaịa ji na-akpali mmasị ndị Kraịst taa?
“UNU onwe unu bụ ndị àmà m, ọ bụ ihe si n’ọnụ Jehova pụta, na ohu m nke M họpụtara.” (Aịsaịa 43:10) Ihe a Jehova kwuru, nke Aịsaịa onye amụma dekọrọ na narị afọ nke asatọ T.O.A., na-egosi na ndị ha na Jehova nọ n’ọgbụgba ndụ n’oge ochie bụ mba nke bụ́ ndị àmà. Ha bụ ohu Chineke ọ họpụtara. Ihe dị ka afọ 2,600 mgbe e mesịrị, na 1931, ndị Kraịst e tere mmanụ kwupụtara n’ihu ọha na okwu ndị a na-ezo aka n’ebe ha nọ. Ha nakweere aha ahụ bụ́ Ndịàmà Jehova ma jiri obi ha dum nakwere ibu ọrụ ndị e jikọtara ha na ịbụ ohu Chineke n’ụwa.
2 Ndịàmà Jehova na-achọsi ike ime ihe na-atọ Chineke ụtọ. N’ihi nke a, isi 42 nke akwụkwọ Aịsaịa na-akpali nnọọ mmasị nke onye nke ọ bụla n’ime ha, n’ihi na ọ bụ nkọwa banyere ohu Jehova nwapụtara nakwa banyere ohu ọzọ ọ jụrụ ajụ. Ịtụle amụma a na mmezu ya na-eme ka a ghọta ihe na-eduje n’inweta nnwapụta Chineke na ihe na-eduje n’enweghị ihu ọma ya.
“Atụkwasịwo M Ya Mmụọ M”
3. Gịnị ka Jehova buru n’amụma site n’ọnụ Aịsaịa banyere “ohu m”?
3 Site n’ọnụ Aịsaịa, Jehova buru amụma banyere ọbịbịa nke otu ohu onye ya onwe ya ga-ahọpụta: “Lee ohu m, onye M na-ejide aka; onye nke m M họpụtara, onye ihe ya tọrọ mkpụrụ obi m ụtọ: atụkwasịwo m ya Mmụọ m; ikpe ka ọ ga-ewepụtara mba nile. Ọ gaghị eti mkpu, ọ gaghị ewelikwa olu ya elu, ọ gaghị emekwa ka a nụ olu ya n’èzí. Ọ gaghị akpaji amị a pịara apịa, ọ gaghị emenyụkwa ogho oriọna na-enwu inyoghi inyoghi: n’eziokwu ka ọ ga-eme ka ikpe pụta. Ọ gaghị enwu inyoghi inyoghi, a gaghị apịakwa ya apịa n’obi, ruo mgbe ọ ga-edoworị ikpe n’ụwa; ọ bụkwa iwu ya ka àgwàetiti nile ga-echere.”—Aịsaịa 42:1-4.
4. Ònye bụ ‘onye ahụ a họpụtara,’ bụ́ onye e buru n’amụma, oleekwa otú anyị si mara nke a?
4 Ònye bụ Ohu ahụ e zoro aka na ya n’ebe a? A hapụghị anyị ịnọ n’obi abụọ. Anyị na-ahụ na e hotara okwu ndị a n’Oziọma Matiu, e jikwa ya mee ihe n’ebe Jisọs Kraịst nọ. (Matiu 12:15-21) Jisọs bụ Ohu ahụ a hụrụ n’anya, ‘onye a họpụtara.’ Olee mgbe Jehova wụkwasịrị Jisọs mmụọ ya? Na 29 O.A., n’oge e mere Jisọs baptism. Ihe ndekọ sitere n’ike mmụọ nsọ kọwara baptism ahụ ma kwuo na mgbe Jisọs si na mmiri rịgopụta, “e meghere eluigwe, Mmụọ Nsọ wee fedakwasị Ya n’oyiyi ahụ, dị ka nduru, olu wee site n’eluigwe, sị, Gị onwe gị bụ Ọkpara m M hụrụ n’anya; ihe Gị dị m ezi mma.” N’ụzọ dị otú a, Jehova n’onwe ya mere ka a mara Ohu ya ọ hụrụ n’anya. Ozi Jisọs jere na ọrụ ebube ndị ọ rụrụ ka oge na-aga gosiri na mmụọ Jehova dị n’ahụ ya n’ezie.—Luk 3:21, 22; 4:14-21; Matiu 3:16, 17.
“Ikpe Ka Ọ Ga-Ewepụtara Mba Nile”
5. N’ihi gịnị ka ime ka ikpe ziri ezi doo anya ji dị mkpa na narị afọ mbụ O.A.?
5 Onye Jehova Họpụtara gaje ‘iwepụta,’ ma ọ bụ ime ka ezi ikpe ziri ezi pụta ìhè. “Ọ ga-akọkwara mba nile akụkọ ikpe.” (Matiu 12:18) Lee ka nke a si dị mkpa na narị afọ mbụ O.A.! Ndị ndú okpukpe ndị Juu kụziri echiche gbagọrọ agbagọ banyere ikpe ziri ezi na ezi omume. Ha chọrọ ịbụ ndị ezi omume site n’ịgbaso ụkpụrụ iwu ndị na-adịghị agbanwe agbanwe—ndị ọ bụ ha mere ọtụtụ n’ime ha. Ebere na ọmịiko kọrọ ụkọ n’ikpe ziri ezi ha nke dabeere n’usoro iwu.
6. N’ụzọ dịgasị aṅaa ka Jisọs si mee ka a mara ezi ikpe ziri ezi?
6 N’ụzọ dị iche, Jisọs kpughere otú Chineke si ele ikpe ziri ezi anya. Site n’ihe ọ kụziri na ụzọ o siri bie ndụ, Jisọs gosiri na ezi ikpe ziri ezi dị ebere ma nwee ọmịiko. Cheedị banyere Ozizi Elu Ugwu ya a ma ama. (Matiu, isi 5-7) Lee nkọwa magburu onwe ya nke otú e kwesịrị isi na-ekpe ikpe ziri ezi ma na-eme ezi omume ọ bụ! Mgbe anyị gụrụ ihe ndekọ ndị dị n’Oziọma ndị ahụ, ọ̀ bụ na ọmịiko Jisọs nwere n’ebe ndị ogbenye na ndị e wedara n’ala nọ adịghị emetụ anyị n’ahụ? (Matiu 20:34; Mak 1:41; 6:34; Luk 7:13) O wegaara ọtụtụ ndị, bụ́ ndị yiri amị a pịara apịa, ndị a kpajiri akpaji na ndị a na-eti ihe, ozi ya nke na-enye nkasi obi. Ha yiri ogho oriọna na-akwụ anwụrụ ọkụ, ọ fọrọ nke nta ka ọkụ ha nyụọ kpam kpam. Jisọs akpajighị “amị a pịara apịa,” o menyụghịkwa “ogho oriọna na-enwu inyoghi inyoghi.” Kama nke ahụ, okwu na omume ịhụnanya na ọmịiko ya nyere ndị dị umeala n’obi agbamume.—Matiu 11:28-30.
7. N’ihi gịnị ka amụma ahụ pụrụ iji kwuo na Jisọs ‘agaghị eti mkpu ma ọ bụ welie olu ya n’èzí’?
7 Otú ọ dị, n’ihi gịnị ka amụma ahụ ji kwuo na Jisọs ‘agaghị eti mkpu ma ọ bụ welie olu ya elu, ọ gaghị emekwa ka a nụ olu ya n’èzí’? N’ihi na o meghị ka a mara ya, dị ka ọtụtụ ndị mere n’oge ya. (Matiu 6:5) Mgbe ọ na-agwọ otu onye ekpenta, ọ gwara nwoke ahụ ọ gwọrọ, sị: “Lezie anya ka ị ghara ịgwa onye ọ bụla okwu ọ bụla.” (Mak 1:40-44) Kama ịchọ ịbụ onye a ma ama na ime ka ndị mmadụ, dabere n’ihe ndị a kọọrọ ha, kpebie onye ọ bụ, Jisọs chọrọ ka ha ghọta n’onwe ha dabere n’ihe àmà gbara ọkpụrụkpụ e nwere, na ya bụ Kraịst ahụ, Ohu Jehova e tere mmanụ.
8. (a) Olee otú Jisọs si ‘wepụtara mba nile ikpe’? (b) Gịnị ka ihe atụ Jisọs banyere onye Sameria bụ́ ezi onye agbata obi na-akụziri anyị banyere ikpe ziri ezi?
8 Ohu ahụ A Họpụtara ‘gaje iwepụtara mba nile ikpe.’ Jisọs mere nke a. E wezụga imesi ọdịdị inwe ọmịiko nke ikpe ziri ezi nke Chineke ike, Jisọs kụziri na o kwesịrị ịgụnye mmadụ nile. N’otu oge, Jisọs chetaara otu nwoke maara Iwu nke ọma na o kwesịrị ịhụ Chineke na onye agbata obi ya n’anya. Nwoke ahụ jụrụ Jisọs, sị: “Ònye bụkwa onye agbata obi m?” Ikekwe ọ tụrụ anya ka Jisọs zaa, sị: “Onye Juu ibe gị.” Ma Jisọs tụrụ ilu banyere onye Sameria bụ́ ezi onye agbata obi. N’ilu ahụ, otu onye Sameria nyeere otu nwoke ndị ohi wakporo aka, ebe onye Livaị na onye nchụàjà jụrụ inyere ya aka. Onye ahụ jụrụ ajụjụ aghaghị ikweta na n’ọnọdụ a, ọ bụ onye Sameria ahụ a kpọrọ asị bụ onye agbata obi ya, ọ bụghị onye Livaị ma ọ bụ onye nchụàjà ahụ. Jisọs mechiri ilu ya site n’inye ndụmọdụ bụ́: “Gị onwe gị meekwa otú ahụ.”—Luk 10:25-37; Levitikọs 19:18.
“Ọ Gaghị Enwu Inyoghi Inyoghi, A Gaghị Apịakwa Ya Apịa n’Obi”
9. Olee otú ịghọta ihe ezi ikpe ziri ezi bụ ga-esi metụta anyị?
9 Ebe Jisọs mere ka ihe ezi ikpe ziri ezi bụ doo anya, ndị na-eso ụzọ ya mụtara igosipụta àgwà a. Anyị aghaghịkwa ime otú ahụ. Nke mbụ, ọ dị anyị mkpa ịnakwere ụkpụrụ Chineke banyere ihe bụ ihe ọma na ihe ọjọọ, ebe ọ bụ na o nwere ikike ikpebi ihe ziri ezi na nke bụ́ ezi omume. Ka anyị na-agbalị ime ihe n’ụzọ nke Jehova, àgwà anyị nke ziri ezi ga-ekpughe n’ụzọ doro anya ihe ezi ikpe ziri ezi bụ.—1 Pita 2:12.
10. N’ihi gịnị ka igosipụta ikpe ziri ezi ji agụnye ikere òkè n’ọrụ ime nkwusa na izi ihe?
10 Anyị na-egosipụtakwa ezi ikpe ziri ezi mgbe anyị ji ịdị uchu na-ekere òkè n’ọrụ ime nkwusa na izi ihe. Jehova enyewo n’ụba ihe ọmụma na-azọpụta ndụ banyere onwe ya, Ọkpara ya, na nzube ya. (Jọn 17:3) Ọ gaghị ekwesị ekwesị ma ọ bụ zie ezie ijichi ihe ọmụma ahụ. “Egbochila ezi ihe ná ndị ọ dịịrị, mgbe ọ dịịrị ike aka gị ime ya,” ka Solomọn na-ekwu. (Ilu 3:27) Ka anyị jiri obi anyị dum soro mmadụ nile kerịta ihe anyị maara banyere Chineke, n’agbanyeghị ebo, agbụrụ, ma ọ bụ mba ha si na ya.—Ọrụ 10:34, 35.
11. N’iṅomi Jisọs, olee otú anyị kwesịrị isi na-emeso ndị ọzọ ihe?
11 Ọzọkwa, ezi onye Kraịst na-emeso ndị ọzọ ihe dị ka Jisọs mere. Ọtụtụ ndị taa na-eche nsogbu ndị na-akpata nkụda obi ihu, ọmịiko na agbamume dịkwa ha mkpa. Ọnọdụ dị iche iche pụrụ imekpọ ọbụna ụfọdụ ndị Kraịst raara onwe ha nye ọnụ nke na ha ga-abịa yie amị a pịara apịa ma ọ bụ ogho oriọna na-akwụ anwụrụ ọkụ. Ọ̀ bụ na enyemaka anyị adịghị ha mkpa? (Luk 22:32; Ọrụ 11:23) Lee ihe na-enye ume ọhụrụ ọ bụ iso ná njikọ nke ezi ndị Kraịst, bụ́ ndị na-agbalị iṅomi Jisọs n’igosipụta ikpe ziri ezi!
12. N’ihi gịnị ka anyị pụrụ iji nwee obi ike na mmadụ nile ga-enweta ikpe ziri ezi n’isi nso?
12 Ọ̀ dị mgbe mmadụ nile ga-enweta ikpe ziri ezi? N’ezie, ọ dị. Onye Jehova Họpụtara ‘agaghị enwu inyoghi inyoghi, a gaghị apịakwa ya apịa n’obi, ruo mgbe ọ ga-edoworị ikpe n’ụwa.’ N’isi nso, Eze ahụ e mere ka ọ nọkwasị n’ocheeze, bụ́ Kraịst Jisọs e mere ka o si n’ọnwụ bilie, ‘ga-abọ ọ́bọ̀ n’ahụ ndị na-amataghị Chineke.’ (2 Ndị Tesalọnaịka 1:6-9; Mkpughe 16:14-16) Alaeze Chineke ga-anọchi ịchịisi ụmụ mmadụ. Ikpe ziri ezi na ezi omume ga-aba ụba. (Ilu 2:21, 22; Aịsaịa 11:3-5; Daniel 2:44; 2 Pita 3:13) N’atụmanya siri ike, ndị ohu Jehova n’ebe nile—ọbụna ndị nọ n’ebe ndị dịpụrụ adịpụ, “àgwàetiti nile”—na-echere ụbọchị ahụ.
‘M Ga-enye Ya Ka Ọ Bụrụ Ìhè nke Mba Nile’
13. Gịnị ka Jehova buru n’amụma banyere Ohu ya ọ Họpụtara?
13 Aịsaịa gara n’ihu ikwu, sị: “Otú a ka Chineke, bụ́ Jehova, sịrị, bụ́ Onye keworo eluigwe, setịakwa ha; Onye meworo ụwa na ihe nile nke si n’ime ya apụta ka ọ saa mbara; Onye na-enye ndị bi n’elu ya ume ha na-eku, Onye na-enyekwa ndị na-ejegharị n’ime ya mmụọ.” (Aịsaịa 42:5) Lee ụzọ magburu onwe ya e si kọwaa Jehova, bụ́ Onye Okike! Ihe ncheta a nke ike Jehova na-emesi okwu ya ike nke ukwuu. Jehova na-ekwu, sị: “Mụ onwe m, bụ́ Jehova, akpọwo gị n’ezi omume, M ga-ejidekwa aka gị, chebe gị, nye gị ka ị bụrụ ọgbụgba ndụ nke ndị m, ka ị bụrụkwa ìhè nke mba nile; imeghe anya nile kpuru ìsì, ime ka onye mkpọrọ si n’ebe e mechibidoro ya pụta, ime ka ndị na-anọdụ n’ọchịchịrị si n’ụlọ mkpọrọ pụta.”—Aịsaịa 42:6, 7.
14. (a) Gịnị ka Jehova ijide aka nke Ohu ya ọ nwapụtara pụtara? (b) Ọrụ dị aṅaa ka Ohu ahụ A Họpụtara na-arụ?
14 Onye Okike Ukwu nke eluigwe na ụwa, bụ́ Onye Na-enye na Onye Na-akwado ndụ, na-ejide aka Ohu ya ọ Họpụtara ma na-ekwe nkwa inye ya nkwado zuru ezu mgbe nile. Lee ka nke ahụ si emesi obi ike! Ọzọkwa, Jehova na-echebe ya iji nye ya ka ọ bụrụ “ọgbụgba ndụ nke ndị” ahụ. Ọgbụgba ndụ bụ nkwekọrịta, nkwa siri ike. Ọ bụ iwu e ji n’aka. Ee, Jehova emewo ka Ohu ya bụrụ “ihe mbé nye ndị ahụ.”—An American Translation.
15, 16. N’ụzọ dị aṅaa ka Jisọs si jee ozi dị ka “ìhè nke mba nile”?
15 Dị ka “ìhè nke mba nile,” Ohu ahụ e kwere ná nkwa ga-emeghe “anya nile kpuru ìsì” ma tọhapụ “ndị na-anọdụ n’ọchịchịrị.” Jisọs mere nke a. Site n’ịgbara eziokwu ahụ àmà, Jisọs wetaara aha Nna ya nke eluigwe otuto. (Jọn 17:4, 6) Ọ gbara ụgha dị iche iche nke okpukpe ọtọ, kwusaa ozi ọma Alaeze ahụ, ma mepeere ndị nọ n’agbụ okpukpe ụzọ maka nnwere onwe ime mmụọ. (Matiu 15:3-9; Luk 4:43; Jọn 18:37) Ọ dọrọ aka ná ntị megide ịrụ ọrụ nke ọchịchịrị ma kpughee Setan dị ka ‘nna nke ụgha’ na “onyeisi ụwa nke a.”—Jọn 3:19-21; 8:44; 16:11.
16 Jisọs kwuru, sị: “Mụ onwe m bụ Ìhè nke ụwa.” (Jọn 8:12) O gosiri na ya bụ ya n’ụzọ pụtara ìhè mgbe o nyere ndụ ya dị ka mmadụ zuru okè ịbụ ihe mgbapụta. O si otú a mepee ụzọ ka ndị nwere okwukwe wee nweta mgbaghara mmehie, mmekọrịta a nwapụtara anwapụta nke ha na Chineke, na olileanya nke ndụ ebighị ebi. (Matiu 20:28; Jọn 3:16) Site n’ịnọgide na-egosipụta nsọpụrụ Chineke n’ụzọ zuru okè ná ndụ ya dum, Jisọs kwadoro ọbụbụeze Jehova ma gosipụta Ekwensu dị ka onye ụgha. Jisọs bụ n’ezie onye na-eme ka ndị ìsì hụ ụzọ na onye na-atọhapụ ndị a tụrụ mkpọrọ n’ọchịchịrị ime mmụọ.
17. N’ụzọ dịgasị aṅaa ka anyị si eje ozi dị ka ndị na-enye ìhè?
17 N’Ozizi Elu Ugwu ahụ, Jisọs gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Unu onwe unu bụ ìhè nke ụwa.” (Matiu 5:14) Ọ̀ bụ na anyị abụghịkwa ndị na-enye ìhè? Site n’ụzọ ndụ anyị na n’ọrụ nkwusa anyị, anyị nwere ihe ùgwù nke iduzi ndị ọzọ gakwuru Jehova, bụ́ Isi Iyi nke ezi ihe ọmụma. N’iṅomi Jisọs, anyị na-eme ka a mara aha Jehova, na-akwado ọbụbụeze Ya, ma na-akpọsa Alaeze Ya dị ka nanị olileanya dịịrị ihe a kpọrọ mmadụ. Ọzọkwa, dị ka ndị na-enye ìhè, anyị na-ekpughe ụgha dị iche iche nke okpukpe, na-adọ aka ná ntị megide ọrụ ndị na-adịghị ọcha nke ọchịchịrị, ma na-ekpughe Setan, bụ́ ajọ onye ahụ.—Ọrụ 1:8; 1 Jọn 5:19.
“Bụkuonụ Jehova Abụ Ọhụrụ”
18. Gịnị ka Jehova na-eme ka ndị ya mara?
18 Jehova cheziri ihu n’ebe ndị ya nọ, na-asị: “Mụ onwe m bụ Jehova; nke ahụ bụ aha m: M gaghị enyekwa onye ọzọ nsọpụrụ m, M gaghị enyekwa arụsị dị iche iche a pịrị apị otuto m. Ihe mbụ, lee, ha abịawo, ọ bụkwa ihe ọhụrụ dị iche iche ka Mụ onwe m na-egosi: tutu ha epuo, ana m eme ka unu nụrụ ha.” (Aịsaịa 42:8, 9) Ọ bụghị otu n’ime chi ndị ahụ na-abaghị uru buru amụma banyere “ohu m,” kama ọ bụ nanị ezi Chineke ahụ dị ndụ buru ya. Ọ ghaghị imezu, o mezukwara. Jehova Chineke bụ n’ezie Onye Na-ewepụta ihe ndị ọhụrụ, ọ na-emekwa ka ndị ya mara banyere ha tupu ha emee. Olee otú anyị kwesịrị isi meghachi omume?
19, 20. (a) Abụ dị aṅaa ka a na-aghaghị ịbụ? (b) Olee ndị taa na-abụku Jehova abụ otuto?
19 Aịsaịa na-ede, sị: “Bụkuonụ Jehova abụ ọhụrụ, kwusaanụ otuto Ya site ná nsọtụ ụwa; unu ndị na-arịda n’oké osimiri, na ùjú ya, àgwàetiti nile, na ndị bi na ha. Ka ọzara na obodo ya nile welie olu ha, obodo nta nile Kida bi: ka ndị bi na Sela tie mkpu ọṅụ, ka ha si n’elu ugwu nile tisie mkpu ike. Ka ha nye Jehova nsọpụrụ, gosikwa otuto Ya n’àgwàetiti nile.”—Aịsaịa 42:10-12.
20 A gbara ndị bi n’obodo dị iche iche, n’obodo nta ndị dị n’ọzara, n’àgwàetiti nile, ọbụna na “Kida,” ma ọ bụ ndị bi n’ịkpa—ndị nọ ebe nile—ume ka ha bụkuo Jehova abụ otuto. Lee ihe na-akpali akpali ọ bụ na n’oge anyị, ọtụtụ nde mmadụ aṅawo ntị n’òkù amụma a! Ha anakwerewo eziokwu nke Okwu Chineke ma mee Jehova Chineke ha. Ndị Jehova na-abụ abụ ọhụrụ a—na-enye Jehova otuto—n’ihe karịrị ala 230. Lee ihe na-akpali akpali ọ bụ isonye n’abụ a a na-abụ n’ọtụtụ ọdịbendị, n’ọtụtụ asụsụ, na n’ọtụtụ agbụrụ!
21. N’ihi gịnị ka ndị iro nke ndị Chineke na-apụghị iji nwee ihe ịga nke ọma n’ịkwụsị abụ otuto a na-abụku Jehova?
21 Ndị mmegide hà pụrụ iguzogide Chineke ma kwụsị abụ otuto a? Ọ gaghị ekwe omume! “Jehova ga-apụta dị ka dike; dị ka onye agha ka Ọ ga-akpọte ekworo: Ọ ga-eti mkpu agha, ee, Ọ ga-eti oké mkpu agha; n’imegide ndị iro Ya ka Ọ na-eme Onwe ya dike.” (Aịsaịa 42:13) Olee ike pụrụ iguzogide Jehova? Ihe dị ka afọ 3,500 gara aga, onye amụma bụ́ Mosis na ụmụ Israel bụrụ abụ, sị: “Jehova bụ onye agha: Jehova bụ aha Ya. Ụgbọala Fero nile na usuu ndị agha ya ka Ọ tụfuworo n’oké osimiri: ndị isi agha ya a họpụtara ahọpụta, ha emikpuwo emikpu n’Oké Osimiri Uhie.” (Ọpụpụ 15:3, 4) Jehova meriri usuu ndị agha kachasị ike e nwere n’oge ahụ. Ọ dịghị onye iro nke ndị Chineke nke pụrụ inwe ihe ịga nke ọma mgbe Jehova pụtara dị ka onye agha dị ike.
“Edebewo M Ọnụ M Duu Site na Mgbe Ebighị Ebi Gara Aga”
22, 23. N’ihi gịnị ka Jehova ji ‘debe ọnụ ya duu site na mgbe ebighị ebi gara aga’?
22 Jehova na-ekpe ikpe ziri ezi, ọ dịghịkwa ele mmadụ anya n’ihu, ọbụna mgbe ọ na-emezu ihe o kpere n’ikpe n’ahụ ndị iro ya. Ọ na-ekwu, sị: “Edebewo m ọnụ m duu site na mgbe ebighị ebi gara aga; ana m agba nkịtị, jisie onwe m ike: dị ka nwanyị ime na-eme, otú a ka M ga-asụ ude, kuo ume ngwa ngwa, kusie ume ike n’otu. M ga-eme ugwu na ugwu nta ka ha kọọ akọ, ihe ọkụkụ ha nile ka M ga-emekwa ka ọ kpọnwụọ; M ga-emekwa osimiri ka ha ghọọ àgwàetiti, meekwa ka ọdọ mmiri nile takọọ.”—Aịsaịa 42:14, 15.
23 Tupu o mee ihe o kpere n’ikpe, Jehova na-ekwe ka oge gafee iji nye ndị na-eme ihe ọjọọ ohere isi n’ụzọ ọjọọ ha chegharịa. (Jeremaịa 18:7-10; 2 Pita 3:9) Tụlee ihe banyere ndị Babilọn, bụ́ ndị, dị ka ike ụwa na-achị achị, bibiri Jerusalem n’afọ 607 T.O.A. Jehova kwere ka nke a mee iji nye ndị Israel ahụhụ n’ihi ekwesịghị ntụkwasị obi ha. Otú ọ dị, ndị Babilọn aghọtaghị ọrụ ha nọ na-arụ. Ha mesoro ndị Chineke ihe n’ụzọ obi ọjọọ karịa otú ikpe Chineke chọrọ. (Aịsaịa 47:6, 7; Zekaraịa 1:15) Lee ka ọ na-aghaghị isiworị wute ezi Chineke ahụ ịhụ ka ndị ya na-ata ahụhụ! Ma o meghị ihe ruo mgbe oge nke ya ruru. Mgbe ahụ, o mere mgbalị—dị ka nwanyị na-amụ nwa—iji tọhapụ ndị ha na ya nọ n’ọgbụgba ndụ ma mụpụta ha dị ka mba kwụụrụ onwe ya. Iji mezuo nke a, na 539 T.O.A., o mere ka Babilọn takọọ ma bibie ya na ihe nchebe ya dị iche iche.
24. Atụmanya dị aṅaa ka Jehova nyere ndị ya, bụ́ Israel?
24 Lee obi ụtọ ndị Chineke na-aghaghị inweworị mgbe e mepeere ha ụzọ ịla, ka ọtụtụ afọ nke ije biri n’ala ọzọ gasịrị! (2 Ihe E Mere 36:22, 23) Obi aghaghị ịdị ha ụtọ ịhụ mmezu nke nkwa Jehova: “M ga-emekwa ka ndị ìsì jee ije n’ụzọ ha na-amaghị: n’okporo ụzọ ha na-amaghị ka M ga-eme ka ha zọọ ije: M ga-eme ka ọchịchịrị bụrụ ìhè n’ihu ha, meekwa ebe gbagọrọ agbagọ ka ha guzozie. Ihe ndị a ka M ga-eme, M gaghị ahapụkwa ha.”—Aịsaịa 42:16.
25. (a) Gịnị ka ndị Jehova taa pụrụ ijide n’aka? (b) Gịnị kwesịrị ịbụ mkpebi anyị siri ike?
25 Olee otú okwu ndị a si emezu taa? Ruo ogologo oge ugbu a—ruo ọtụtụ narị afọ—Jehova ahapụwo mba dị iche iche ka ha na-eme otú masịrị ha. Otú ọ dị, oge ọ kara aka ọ ga-eji dozie okwu dị nso. N’oge a, o mewo ka otu ndị bilie ịgba àmà banyere aha ya. N’itisasị mmegide ọ bụla a na-emegide ha, o doziworo ha ụzọ ife ya ofufe “n’ime mmụọ na eziokwu.” (Jọn 4:24) O kwere nkwa, sị: “M gaghị ahapụkwa ha,” o mezuwokwa nkwa ya. Olee banyere ndị nọgidere na-efe chi ụgha dị iche iche? Jehova na-ekwu, sị: “Ha ga-alaghachi azụ, ihere ga-eme ha nke ukwuu, bụ́ ndị na-atụkwasị arụsị nile a pịrị apị obi, ndị na-asị arụsị a wụrụ awụ, Unu onwe unu bụ chi anyị.” (Aịsaịa 42:17) Lee ka o si dị mkpa na anyị nọgidere na-ekwesị ntụkwasị obi nye Jehova, dị ka Onye ọ Họpụtara si kwesị ntụkwasị obi nye ya!
‘Ohu Ntị Chiri, nke Kpukwara Ìsì’
26, 27. Olee otú Israel si bụrụ ‘ohu ntị chiri, nke kpukwara ìsì,’ oleekwa ihe ndị si na ya pụta?
26 Ohu Chineke Họpụtara, bụ́ Jisọs Kraịst, kwesịgidere ntụkwasị obi ruo ọnwụ. Otú ọ dị, ndị Jehova, bụ́ Israel, bụ ohu na-ekwesịghị ntụkwasị obi, nke ntị chiri, nke kpukwara ìsì n’ụzọ ime mmụọ. N’ịgwa ha okwu, Jehova na-ekwu, sị: “Unu ndị ntị chiri, nụrụnụ; unu ndị ìsì kwa legidenụ anya, ka unu wee hụ ụzọ. Ònye kpuru ìsì, ma ọ́ bụghị ohu m, ma ọ bụ ònye ka ntị chiri, dị ka onye ozi m M na-eziga? ònye kpuru ìsì dị ka onye Mụ na ya dị n’udo, ma ọ bụ ònye kpuru ìsì dị ka ohu Jehova? Ị hụwo ọtụtụ ihe, ma ị dịghị arịba ama; ntị ya abụọ ghere oghe, ma ọ dịghị anụ ihe. Ọ tọrọ Jehova ụtọ, n’ihi ezi omume Ya, ime ka iwu Ya dị ukwuu, na ime ka ọ dị ebube.”—Aịsaịa 42:18-21.
27 Lee ka Israel si bụrụ ndị dara nnọọ ajọ ọdịda! Ndị ya na-adapụ ugboro ugboro gaa n’ife chi ndị mmụọ ọjọọ nke mba dị iche iche ofufe. Jehova nọgidere na-eziga ndị ozi ya ugboro ugboro, ma ndị ya aṅaghị ntị. (2 Ihe E Mere 36:14-16) Aịsaịa buru amụma ihe ndị ga-esi na ya pụta, sị: “Ndị nke a bụ ndị a lụtaworo ihe ha n’agha na ndị a pụnarawooro ha ihe; ha adawo n’igbudu n’olulu, ha nile, ọ bụkwa n’ụlọ mkpọrọ dị iche iche ka e zobeworo ha: ha aghọwo ihe nlụta n’agha, ma ọ dịghị onye nnapụta; ha aghọwo ihe a pụnarawooro mmadụ, ma ọ dịghị onye na-asị, Nyeghachi. Ònye n’etiti unu ga-ege ntị na nke a? ònye ga-aṅa ntị, wee nụ ihe n’ọdịnihu? Ònye weere Jekọb nye ka ọ ghọọ ihe a pụnarawooro mmadụ, were Israel nye ndị na-alụta ihe n’agha? ọ́ bụghị Jehova? bụ́ Onye anyị mehieworo megide, Onye ha na-ekweghịkwa eje ije n’ụzọ Ya nile, ha egeghịkwa ntị iwu Ya. O wee wụkwasị ya ọnụma nke iwe Ya, na ike nke agha; nke ahụ wee sunye ya ọkụ gburugburu, ma ọ maghị; o wee ree ya ọkụ, ma ọ dịghị atụgharị obi na ya.”—Aịsaịa 42:22-25.
28. (a) Gịnị ka anyị pụrụ ịmụta site n’ihe atụ nke ndị bi na Juda? (b) Olee otú anyị pụrụ isi chọọ nnwapụta Jehova?
28 N’ihi ekwesịghị ntụkwasị obi nke ndị bi n’ime ya, Jehova kwere ka a lụta ala Juda n’agha ma pụnara ya na 607 T.O.A. Ndị Babilọn gbara ụlọukwu Jehova ọkụ, bibie Jerusalem, ma dọrọ ndị Juu n’agha. (2 Ihe E Mere 36:17-21) Ka anyị buru ihe atụ ịdọ aka ná ntị a n’uche ma ghara ịdị mgbe anyị ga-akpọchi ntị anyị n’ebe ntụziaka Jehova dị ma ọ bụ leghara Okwu ya e dere ede anya. Kama nke ahụ, ka anyị chọọ nnwapụta Jehova site n’iṅomi Kraịst Jisọs, bụ́ Ohu Jehova ji aka ya nwapụta. Dị ka Jisọs, ka anyị mee ka a mara ihe bụ ezi ikpe ziri ezi site n’ihe anyị na-ekwu ma na-eme. Anyị ga-esi otú a nọgide n’etiti ndị Jehova, na-eje ozi dị ka ndị na-enye ìhè, bụ́ ndị na-eto ezi Chineke ahụ ma na-enye ya otuto.
[Foto ndị dị na peeji nke 33]
Ezi ikpe ziri ezi dị ọmịiko, dịkwa ebere
[Foto dị na peeji nke 34]
N’ilu banyere onye Sameria ahụ bụ́ ezi onye agbata obi, Jisọs gosiri na ezi ikpe ziri ezi na-agụnye mmadụ nile
[Foto ndị dị na peeji nke 36]
Site n’ịbụ ndị na-enye agbamume na ndị nwere obiọma, anyị na-egosipụta ikpe ziri ezi nke Chineke
[Foto ndị dị na peeji nke 39]
Site n’ọrụ nkwusa anyị, anyị na-egosipụta ikpe ziri ezi nke Chineke
[Foto dị na peeji nke 40]
E nyere Ohu ahụ a nwapụtara ‘ka ọ bụrụ ìhè nke mba nile’