Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • ip-2 isi 5 p. 61-75
  • Ezi Chineke Ebuo Amụma Banyere Mgbapụta

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ezi Chineke Ebuo Amụma Banyere Mgbapụta
  • Amụma Aịsaịa—Ìhè nke Dịịrị Ihe Nile A Kpọrọ Mmadụ II
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Olileanya Maka Ndị Bụ́ Ndị nke Jehova
  • Ịma Aka Nye Chi Dị Iche Iche
  • Abaghị n’Ihe nke Ife Ihe Oyiyi Ofufe
  • Jehova Eruo n’Obi
  • Njedebe nke Ule nke Ịbụ Chineke
  • Aịsaịa, Saịrọs, na Ndị Kraịst Taa
  • Jehova—“Chineke nke Na-eme Ezi Omume na Onye Nzọpụta”
    Amụma Aịsaịa—Ìhè nke Dịịrị Ihe Nile A Kpọrọ Mmadụ II
  • Okwu Amụma Nkasi Obi Ndị Metụtara Gị
    Amụma Aịsaịa—Ìhè nke Dịịrị Ihe Nile A Kpọrọ Mmadụ II
  • Ime Ka A Mata Ụdị Onye Ozi Bụ nke Ọma Ya
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
  • “Unu Onwe Unu Bụ Ndị Àmà M”!
    Amụma Aịsaịa—Ìhè nke Dịịrị Ihe Nile A Kpọrọ Mmadụ II
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Amụma Aịsaịa—Ìhè nke Dịịrị Ihe Nile A Kpọrọ Mmadụ II
ip-2 isi 5 p. 61-75

Isi nke Ise

Ezi Chineke Ebuo Amụma Banyere Mgbapụta

Aịsaịa 44:1-28

1, 2. (a) Ajụjụ dịgasị aṅaa ka Jehova welitere? (b) Olee otú Jehova ga-esi gosi na ọ bụ nanị ya bụ ezi Chineke ahụ?

‘ÒNYE bụ ezi Chineke ahụ?’ A nọwo na-ajụ ajụjụ a kemgbe ọtụtụ narị afọ. Lezie ka o si bụrụ ihe ijuanya na n’akwụkwọ Aịsaịa, Jehova n’onwe ya jụrụ ajụjụ ahụ! Ọ na-akpọ ụmụ mmadụ òkù ịtụle: ‘Ọ̀ bụ Jehova bụ nanị ezi Chineke ahụ? Ka è nwere onye ọzọ nke pụrụ ịma ọkwá ya aka?’ Mgbe ọ malitesịrị mkparịta ụka ahụ, Jehova nyere ụkpụrụ ezi uche dị na ya iji kpebie okwu banyere ịbụ Chineke. Arụmụka dị n’ime ya na-eduga ndị nwere obi eziokwu n’otu nkwubi okwu a na-apụghị izere ezere.

2 N’oge Aịsaịa, a na-efe ihe oyiyi ofufe n’ọtụtụ ebe. Ná mkparịta ụka ahụ a na-ezoghị ọnụ na ya, nke dokwara anya e dekọrọ n’isi 44 nke akwụkwọ amụma Aịsaịa, lee ihe efu e gosiri ọ bụ ife ihe oyiyi ofufe! Ma, ndị nke Chineke adabawo n’ọnyà nke ikpere arụsị. N’ihi ya, dị ka anyị hụrụ n’isiakwụkwọ ndị bu ụzọ nke Aịsaịa, ndị Israel gaje inweta ịdọ aka ná ntị siri ike. Otú ọ dị, Jehova ji ịhụnanya na-emesi mba ahụ obi ike na ọ bụ ezie na ya ga-ekwe ka ndị Babilọn dọrọ ndị ya n’agha, na ya ga-agbapụta ha n’oge nke ya. Mmezu nke amụma banyere mgbapụta site ná ndọrọ n’agha na nke mweghachi nke ofufe dị ọcha ga-egosi n’ụzọ ihe ịrụ ụka na-adịghị ya na ọ bụ nanị Jehova bụ ezi Chineke ahụ, n’ụzọ ga-emenye ndị nile na-efe chi ndị na-adịghị ndụ nke mba dị iche iche, ihere.

3. Olee otú okwu amụma Aịsaịa kwuru si enyere ndị Kraịst aka taa?

3 Amụma ndị dị n’akụkụ a nke akwụkwọ Aịsaịa nakwa mmezu ha n’oge ochie na-ewusi okwukwe nke ndị Kraịst ike taa. Ọzọkwa, okwu amụma ndị Aịsaịa kwuru nwere mmezu n’oge anyị nakwa ọbụna n’ọdịnihu. Ihe omume ndị ahụ na-emetụtakwa onye mgbapụta na mgbapụta nke karịrị ọbụna nke ahụ e buru n’amụma maka ndị Chineke n’oge ochie.

Olileanya Maka Ndị Bụ́ Ndị nke Jehova

4. Olee otú Jehova si gbaa Israel ume?

4 Isi 44 malitere n’ụzọ dị mma site n’ihe ncheta bụ na ọ bụ Chineke họpụtara Israel, debe ya iche pụọ ná mba ndị gbara ya gburugburu ka o wee bụrụ ohu ya. Amụma ahụ na-ekwu, sị: “Ugbu a, nụrụ, Jekọb, bụ́ ohu m; nụrụkwa, Israel, nke M họpụtara: otú a ka Jehova sịrị, bụ́ Onye keworo gị, Onye kpụwokwara gị site n’afọ nne gị, Nke na-enyere gị aka; Atụla egwu, gị ohu m, bụ́ Jekọb; na gị, Jeshurun, nke M họpụtara.” (Aịsaịa 44:1, 2) Jehova anọwo na-elekọta Israel malite n’afọ nne ya, dị ka a pụrụ isi kwuo ya, kemgbe Israel ghọrọ mba ka o sichara n’Ijipt pụta. Ọ na-akpọkọta ndị ya nile “Jeshurun,” nke pụtara “Onye Ziri Ezi,” bụ́ utu aha na-egosi mmetụta ịhụnanya na ịdị nro. Aha ahụ bụkwa ihe ncheta na ndị Israel aghaghị ịnọgide na-abụ ndị ziri ezi, bụ́ nke ha na-emeghị ọtụtụ mgbe.

5, 6. Ndokwa dịgasị aṅaa na-enye ume ọhụrụ ka Jehova meere Israel, gịnịkwa si na ha pụta?

5 Lee ka ihe Jehova kwuziri si enye obi ụtọ ma na-enye ume ọhụrụ! Ọ sịrị: “M ga-awụkwasị mmiri n’ahụ onye akpịrị na-akpọ nkụ, na ọtụtụ mmiri iyi n’ala akọrọ: M ga-awụkwasị Mmụọ m n’ahụ mkpụrụ gị, na ngọzi m n’ahụ ụmụ ị mụrụ: ha ewee puo n’etiti ahịhịa, dị ka osisi willow n’akụkụ iyi jupụtara ná mmiri.” (Aịsaịa 44:3, 4) Ọbụna ná mba kpọrọ nkụ, nke na-ekpo ọkụ, ìgwè osisi pụrụ ime nke ọma n’akụkụ mmiri iyi. Mgbe Jehova nyere mmiri ya nke eziokwu nke na-enye ndụ ma wụpụ mmụọ nsọ ya, Israel ga-eme nnọọ nke ọma, dị ka osisi ndị dị n’akụkụ ọwa mmiri ndị a na-awa iji dee ubi mmiri. (Abụ Ọma 1:3; Jeremaịa 17:7, 8) Jehova ga-enye ndị ya ume iji rụọ ọrụ ha dị ka ndị àmà nke ịbụ Chineke ya.

6 Otu ihe ga-esi ná mwụpụ a ọ ga-awụpụ mmụọ nsọ pụta ga-abụ ụfọdụ ndị inweghachi ekele maka mmekọrịta nke Jehova na Israel nwere. Ya mere, anyị na-agụ, sị: “Otu onye ga-asị, Onye Jehova nwere ka m bụ; onye ọzọ ga-akpọ onwe ya n’aha Jekọb; onye ọzọ ga-edekwasị n’aka ya, Onye Jehova nwere, ọ ga-ejikwa aha Israel tuo onwe ya aha.” (Aịsaịa 44:5) Ee, nsọpụrụ ga-adị n’ịza aha Jehova, n’ihi na a ga-ahụ ya dị ka nanị ezi Chineke ahụ.

Ịma Aka Nye Chi Dị Iche Iche

7, 8. Olee otú Jehova si ama chi nke mba dị iche iche aka?

7 N’okpuru Iwu Mosis, onye mgbapụta—nke na-abụkarị nwoke nke bụ́ onye ikwu kasị dịrị mmadụ nso—pụrụ ịgbapụta mmadụ n’ịbụ ohu. (Levitikọs 25:47-54; Rut 2:20) Jehova kọwaziri onwe ya ugbu a dị ka Onye Mgbapụta Israel—onye ga-agbapụta mba ahụ, ka ọ bụrụ ihe mmechu ihu nye Babilọn na chi ya nile. (Jeremaịa 50:34) Ọ mara chi ụgha dị iche iche na ndị na-efe ha aka, na-asị: “Otú a ka Jehova, Nke bụ́ eze Israel na onye mgbapụta ya, bụ́ Jehova nke usuu nile nke ndị agha, sịrị: Mụ onwe m bụ onye mbụ, Mụ onwe m bụkwa onye ikpeazụ; ọ dịghịkwa Chineke ọ bụla dị ma e wezụga nanị Mụ onwe m. Ọ̀ bụkwa ònye, dị ka Mụ onwe m, na-akpọ, na-egosi ya, na-edoro m ya n’usoro, site na mgbe M doro ndị nke mgbe ebighị ebi gara aga? ihe nile nke ga-adị n’ihu, na nke ga-abịa, ka ha gosi ha. Unu atụla oké egwu, unu amakwala jijiji: ọ́ bụghị site na mgbe gara aga ka M meworo ka ị nụrụ, gosikwa gị ya? unu onwe unu bụkwa ndị àmà m. Ọ̀ dị Chineke ọzọ dị ma e wezụga nanị Mụ onwe m? ee e, ọ dịghị Oké Nkume ọ bụla dị; ọ dịghị otu efu M maara.”—Aịsaịa 44:6-8.

8 Jehova na-ama chi dị iche iche aka ka ha gosi ihe akaebe ha. Hà pụrụ ịkpọ ihe ndị na-adịghị adị dị ka a ga-asị na ha dị, buo amụma ihe ndị ga-eme n’ọdịnihu n’ụzọ ziri nnọọ ezi nke na ọ ga-eyi ka ha emewelarị? Ọ bụ nanị ‘onye mbụ na onye ikpeazụ,’ bụ́ onye dị adị tupu e cheta chi ụgha dị iche iche n’echiche, onye ka ga-anọkwa ya ogologo oge mgbe e chezọsịworo ha, pụrụ ime ihe dị otú ahụ. Ọ dịghị mkpa ka ndị ya tụọ ụjọ ịgbara eziokwu a àmà, ebe Jehova na-akwado ha, bụ́ onye na-eguzosi ike ma kwụrụ chịm dị ka oké nkume!—Deuterọnọmi 32:4; 2 Samuel 22:31, 32.

Abaghị n’Ihe nke Ife Ihe Oyiyi Ofufe

9. Ọ̀ dị njọ bụ́ ụmụ Israel ime ụdị ihe oyiyi ọ bụla nke ihe dị ndụ? Kọwaa.

9 Aka Jehova mara chi ụgha dị iche iche na-echetara anyị iwu nke abụọ n’ime Iwu Iri ahụ. Iwu ahụ kwuru n’ụzọ doro anya, sị: “Gị emerela onwe gị arụsị a pịrị apị, ma ọ bụ oyiyi nke ụdị ọ bụla nke dị n’eluigwe n’elu, ma ọ bụ nke dị n’ụwa n’okpuru ya, ma ọ bụ nke dị na mmiri n’okpuru ụwa: gị akpọla isiala nye ha, efekwala ha ofufe.” (Ọpụpụ 20:4, 5) N’ezie, mmachibido iwu a apụtaghị na ndị Israel agaghị eme ihe oyiyi ndị e ji achọ ụlọ mma. Jehova n’onwe ya kwuru ka e debe ihe oyiyi nke ihe ọkụkụ, anụmanụ, na cherub n’ụlọikwuu ahụ. (Ọpụpụ 25:18; 26:31) Otú ọ dị, a gaghị asọpụrụ, ma ọ bụ fee ihe ndị a ofufe. Ọ dịghị onye ga-ekpegara ihe oyiyi ndị ahụ ekpere ma ọ bụ chụọrọ ha àjà. Iwu ahụ nke sitere n’ike mmụọ nsọ Chineke machibidoro ime ụdị ihe oyiyi ọ bụla a ga na-efe ofufe. Ife ihe oyiyi ofufe ma ọ bụ ịkpọ isiala nye ha iji nye ha nsọpụrụ bụ ikpere arụsị.—1 Jọn 5:21.

10, 11. N’ihi gịnị ka Jehova ji were ihe oyiyi dị ka ihe na-eweta ihere?

10 Aịsaịa kọwaziri abaghị n’ihe nke ihe oyiyi ndị na-adịghị ndụ na ihere ga-eme ndị na-eme ha: “Ndị na-akpụ arụsị a pịrị apị, ha nile bụ ihe tọgbọrọ n’efu; ihe nile a na-achọsi ike nke ha agaghị aba uru: ndị àmà ha kwa, ha onwe ha adịghị ahụ ụzọ, ha adịghị amakwa; ka ihere wee mee ha. Ònye kpụworo chi, ma ọ bụ wụọ arụsị a pịrị apị nke na-abaghị uru ma ọlị? Lee, ihere ga-eme ndị e jikọtara ya na ha; ndị ọkà kwa, ha onwe ha bụ ihe zara mmadụ: ka ha chịkọta onwe ha, ha nile, ka ha guzo ọtọ; ha ga-atụ oké egwu, ihere ga-eme ha n’otu.”—Aịsaịa 44:9-11.

11 N’ihi gịnị ka Chineke ji were ihe oyiyi ndị a dị ka ndị na-eweta oké ihe ihere? Nke mbụ, a pụghị iji ihe ndị a na-ahụ anya mee ihe oyiyi nke Onye Pụrụ Ime Ihe Nile n’ụzọ ziri ezi. (Ọrụ 17:29) Ọzọkwa, ife ihe e kere eke ofufe kama ife Onye Okike bụ mkparị nye ọbụbụ Jehova bụ Chineke. Ọ́ bụghịkwa iweda ùgwù mmadụ ala n’ezie, bụ́ onye e kere “n’onyinyo Chineke”?—Jenesis 1:27; Ndị Rom 1:23, 25.

12, 13. N’ihi gịnị ka mmadụ na-apụghị iji mepụta ihe oyiyi ọ bụla kwesịrị ife ofufe?

12 Ọ̀ dị otú ihe a pụrụ ịhụ anya pụrụ isi ghọọ ihe dị nsọ n’ihi na a kpụwo ya ka ọ ghọọ ihe a na-efe ofufe? Aịsaịa na-echetara anyị na ịkpụ ihe oyiyi bụ nanị ọrụ aka mmadụ. Ngwá ọrụ na nkà nke onye na-akpụ ihe oyiyi ji eme ihe na nke onye ọrụ aka ọ bụla ji eme ihe bụ otu ihe ahụ: “Ụzụ na-akpụ ihe ọrụ, o were icheku arụ, werekwa òtùtù ya nile akpụ ya, werekwa ogwe aka ya dị ike arụ ya: ọzọ, agụụ na-agụ ya, ike wee ghara ịdị; ọ ṅụghị mmiri, o wee daa mbà. Onye ọkà n’osisi na-esetị eriri; ọ na-ewere pensịl kaa ya; o were mkpụ ya nile na-akpụcha ya, werekwa compass ya kaa ya, o wee mee ya ka ọ dị ka ihe atụ nwoke, dị ka ịma mma nke mmadụ, ibi n’ụlọ.”—Aịsaịa 44:12, 13.

13 Ọ bụ ezi Chineke ahụ kere ihe nile dị ndụ nọ n’ụwa a, gụnyere mmadụ. Ihe ndị dị ndụ, bụ́ ndị na-enwe mmetụta, bụ oké ihe àmà nke ọbụbụ Jehova bụ Chineke, ma n’ezie, ihe nile Jehova kere dị ala n’ebe ọ nọ. Ọ̀ ga-ekwe omume na mmadụ ga-eme ihe karịrị nke ahụ? Ọ̀ pụrụ imepụta ihe ka ya—ihe ka ya nke na o kwesịrị ka ọ na-efe ya? Mgbe mmadụ mere ihe oyiyi, ike na-agwụ ya, agụụ na-agụ ya, akpịrị na-akpọkwa ya nkụ. Ihe ndị a bụ adịghị ike ụmụ mmadụ, ma ha na-egosi, ma ọ dịghị ihe ọzọ, na mmadụ ahụ dị ndụ. Ihe oyiyi o mere pụrụ ịdị ka mmadụ. Ọ pụrụ ọbụna ịma mma. Ma ọ dịghị ndụ. Ọ dịghị otú ihe oyiyi si bụrụ Chineke. Ọzọkwa, ọ dịghị ihe oyiyi a kpụrụ akpụ nke ‘sitụworo n’eluigwe daa,’ dị ka a ga-asị na o siteghị n’aka mmadụ na-anwụ anwụ.—Ọrụ 19:35.

14. N’ụzọ dị aṅaa ka ndị na-eme ihe oyiyi si adabere kpam kpam n’ebe Jehova nọ?

14 Aịsạia gara n’ihu igosi na ndị na-eme ihe oyiyi na-adabere kpam kpam n’usoro ndị sitere n’okike na n’ihe ndị Jehova kere: “Ọ na-egbuturu onwe ya osisi cedar dị iche iche, werekwa osisi holm na osisi oak, ọ na-emekwara onwe ya otu osisi n’etiti osisi nile nke oké ọhịa ka o nwee ume: ọ kụwo osisi fir, mmiri ozuzo na-emekwa ka o buo ibu. Ọ ga-abụkwara mmadụ ihe isure ọkụ; o wee were ụfọdụ n’ime ha, nyaa ọkụ; ee, ọ fụnwuo ya, wee sie achịcha: ee, ọ na-apị chi, wee kpọọ isiala nye ya; o mewo ya arụsị a pịrị apị, wee daa kpuo ihu n’ala n’ihu ya. Nkera ya ka o sureworo n’ọkụ; o ji nkera ya eri anụ; ọ na-ahụ anụ ọhụhụ, wee rijuo afọ: ee, ọ na-anya ọkụ, wee sị, Ehee, ahụ ekpowo m ọkụ, ahụwo m ọkụ: ma nke fọdụrụ n’ime ya ka o meworo ka ọ ghọọ chi, ọbụna arụsị ya a pịrị apị: ọ na-ada kpuo ihu n’ala n’ihu ya, na-akpọkwa isiala, na-ekpere ya, sị, Napụta m; n’ihi na chi m ka ị bụ.”—Aịsaịa 44:14-17.

15. Enwetụghị nghọta dị aṅaa ka onye na-eme ihe oyiyi na-egosipụta?

15 Mkpirisi nkụ a na-esureghị n’ọkụ, ọ̀ pụrụ ịnapụta onye ọ bụla? Ọ dịghị ma ọlị. Ọ bụ nanị ezi Chineke pụrụ ịnapụta mmadụ. Olee otú ndị mmadụ pụrụ isi jiri ihe ndị na-adịghị ndụ mere chi? Aịsaịa na-egosi na ebe nsogbu ahụ dị n’ezie bụ n’obi mmadụ: “Ha amaghị, ha adịghị aghọtakwa: n’ihi na O techiwo anya ha, ha we ghara ịhụ ụzọ; O techiwo obi ha, ha wee ghara inwe uche. Ọ dịghịkwa onye na-echetara obi ya, ọ dịghịkwa ihe ọmụma ma ọ bụ nghọta dị ịsị, Nkera ya ka m sureworo n’ọkụ; ọzọkwa, esiwo m achịcha n’elu icheku ọkụ ya na-ere ere; ana m ahụ anụ rie: m̀ ga-emekwa nke fọdụrụ n’ime ya ka ọ ghọọ ihe arụ? Ọ̀ bụ n’ihu ogwe osisi ka m ga-ada kpuo ihu n’ala? Ọ bụ onye ji ntụ azụ onwe ya: obi a kwara emo ewezụgawo ya, o wee ghara ịnapụta mkpụrụ obi ya, ma ọ bụ ịsị, Ọ́ bụghị okwu ụgha, bụ́ ihe dị n’aka nri m?” (Aịsaịa 44:18-20) Ee, iche na ikpere arụsị pụrụ ịrụpụta ihe ọma ọ bụla n’ụzọ ime mmụọ yiri ịdị na-ara ntụ kama iri ihe oriri na-edozi ahụ.

16. Olee otú ikpere arụsị si malite, gịnịkwa na-eme ka o kwe omume?

16 Ikpere arụsị malitere n’ezie n’eluigwe mgbe mmụọ e kere eke dị ike, onye ghọrọ Setan, nwere ọchịchọ ọjọọ maka ofufe ruuru nanị Jehova. Ọchịchọ Setan siri ike nke na o kewapụrụ ya n’ebe Chineke nọ. Nke ahụ bụ n’ezie mmalite nke ikpere arụsị, ebe Pọl onyeozi kwuru na ọchịchọ ọjọọ na ikpere arụsị bụ otu ihe ahụ. (Aịsaịa 14:12-14; Ezikiel 28:13-15, 17; Ndị Kọlọsi 3:5, NW) Setan kpaliri mmadụ abụọ mbụ ahụ inwe echiche ịchọ ọdịmma onwe onye nanị. Iv nwere ọchịchọ ọjọọ maka ihe Setan kwuru na ọ ga-enweta: “A ga-emeghe anya unu, unu ewee dị ka Chineke, na-ama ezi ihe na ihe ọjọọ.” Jisọs kwuru na ọchịchọ ọjọọ na-esite n’obi. (Jenesis 3:5; Mak 7:20-23) Ikpere arụsị na-ekwe omume mgbe e metọrọ obi. Lezie ka o si dị mkpa na anyị nile ‘chebere obi anyị,’ n’ekweghị mgbe ọ bụla ka onye ọ bụla ma ọ bụ ihe ọ bụla weghara ọnọdụ kwesịịrị Jehova n’ebe ahụ.—Ilu 4:23; Jemes 1:14.

Jehova Eruo n’Obi

17. Gịnị ka Israel kwesịrị iburu n’obi?

17 Jehova rịọziri ụmụ Israel ka ha cheta na ha nwere ọnọdụ ihe ùgwù, nke dị mkpa. Ha bụ ndị àmà ya! Ọ na-ekwu, sị: “Cheta ihe ndị a, Jekọb; gị Israel kwa, n’ihi na ohu m ka ị bụ: akpụwo m gị; ohu M nwere ka ị bụ: Israel, M gaghị echezọ gị. Ehichapụwo m njehie gị nile, dị ka oké igwe ojii, hichapụkwa mmehie gị nile, dị ka igwe ojii: laghachikwute m; n’ihi na agbapụtawo m gị. Tienụ mkpu ọṅụ, unu eluigwe, n’ihi na Jehova emewo ya; tienụ mkpu, unu ebe nile dị ala nke ụwa; unu ugwu, tiwenụ mkpu ọṅụ, gị oké ọhịa, na osisi ọ bụla dị n’ime ya: n’ihi na Jehova agbapụtawo Jekọb, ọ bụkwa n’Israel ka Ọ ga-eme Onwe ya ka Ọ maa mma.”—Aịsaịa 44:21-23.

18. (a) N’ihi gịnị ka Israel ji nwee ihe mere ọ ga-eji ṅụrịa ọṅụ? (b) Olee otú ndị ohu Jehova pụrụ isi ṅomie ihe nlereanya nke obi ebere ya taa?

18 Ọ bụghị Israel kpụrụ Jehova. Ọ bụghị chi mmadụ mere. Kama nke ahụ, Jehova mere ka Israel bụrụ ohu ya ọ họpụtara. Ọ ga-egosipụtakwa ọzọ, ọbụbụ ọ bụ Chineke, mgbe ọ ga-anapụta mba ahụ. Ọ na-agwa ndị ya okwu n’ụzọ dị nro, na-emesi ha obi ike na ọ bụrụ na ha echegharịa, ọ ga-ekpuchicha mmehie ha, na-ezochi mmejọ ha dị ka a ga-asị na ha dị n’azụ igwe ojii nke a na-apụghị isi na ya gafere. Lee ezi ihe mere Israel ga-eji ṅụrịa ọṅụ! Ihe nlereanya nke Jehova na-akpali ndị ohu ya nke oge a iṅomi obi ebere ya. Ha pụrụ ime otú ahụ site n’ịchọ inyere ndị mere mmehie aka—ịgbalị ime ka ha kwụsie ike ọzọ n’ụzọ ime mmụọ ma ọ bụrụ na o kwe mee.—Ndị Galetia 6:1, 2.

Njedebe nke Ule nke Ịbụ Chineke

19, 20. (a) N’ụzọ dị aṅaa ka Jehova si eweta okwu ikpe ya ná njedebe? (b) Ihe dịgasị aṅaa na-enye obi ụtọ ka Jehova na-ebu n’amụma banyere ndị ya, ònyekwa ka ọ ga-eji mezuo ihe ndị a?

19 Ugbu a Jehova na-eweta arụmụka ya metụtara iwu ná njedebe dị ịrịba ama. Ọ na-aga inye azịza nke ya n’ule ahụ kasị ike nke ịbụ Chineke—ikike ikwu ihe ga-eme n’ọdịnihu n’ụzọ ziri ezi. Otu ọkà mmụta Bible kpọrọ amaokwu ise na-esonụ nke Aịsaịa isi 44 “uri banyere ịbụ onye kasị elu nke Chineke nke Israel,” onye nanị ya bụ Onye Okike, nanị Onye Na-ekpughe ọdịnihu nakwa olileanya Israel maka mgbapụta. Amaokwu ahụ ruru n’ọ̀tụ̀tụ̀ ya kasị elu site n’ịma ọkwa aha nwoke ga-eme ka mba ahụ nwere onwe ha pụọ na Babilọn.

20 “Otú a ka Jehova sịrị, bụ́ Onye mgbapụta gị na Onye kpụworo gị site n’afọ nne gị: Mụ onwe m bụ Jehova, Onye na-eme ihe nile; Onye nanị m na-esetị eluigwe; Onye na-agbasa ụwa; ọ̀ bụ ònye ka Mụ na ya nọ? abụ m Onye na-emebi ihe ịrịba ama nile nke ndị ekwukwu, M na-emekwa ka ndị na-ajụ ase wịa ara; abụ m Onye na-eme ka ndị maara ihe laghachi azụ, M na-emekwa ka ihe ọmụma ha ghọọ ihe nzuzu: abụ m Onye na-eme ka okwu ohu Ya guzosie ike, Nke na-emezukwa ndụmọdụ [ndị ozi] Ya; Onye ahụ Nke na-ekwu okwu banyere Jerusalem, sị, A ga-ebi ya; Nke na-ekwukwa okwu banyere obodo nile nke Juda, sị, A ga-ewu ha; mkpọmkpọ ebe ya nile ka M ga-ewulikwa: Onye ahụ Nke na-asị ogbu mmiri, Takọọ; osimiri gị nile ka M ga-emekwa ka ha tachasịa: Onye ahụ Nke na-ekwu okwu banyere Saịrọs, sị, Ọ bụ onye ọzụzụ atụrụ m, ihe nile nke na-atọ m ụtọ ka ọ ga-emezukwa: ọbụna n’ikwu okwu banyere Jerusalem, sị, A ga-ewu ya; na n’ịsị ụlọukwu Chineke, A ga-atọ ntọala gị.”—Aịsaịa 44:24-28.

21. Mmesi obi ike dị aṅaa ka okwu Jehova na-enye?

21 Ee, ọ bụghị nanị na Jehova pụrụ ikwu ihe ndị ga-eme n’ọdịnihu kamakwa o nwere ike iji mezuo nzube ya nile o mere ka a mata. Ihe a o kwuru ga-enye Israel olileanya. Ọ bụ ihe mmesi obi ike na ọ bụ ezie na ndị agha Babilọn ga-ebibi ala ahụ, Jerusalem na obodo ndị gbara ya gburgburu ga-ebiliteghachi, a ga-eguzobeghachi ezi ofufe n’ebe ahụ. Ma ọ̀ bụ n’ụzọ dị aṅaa?

22. Kọwaa otú Osimiri Yufretis si atakọ atakọ.

22 Ndị na-ajụ ndị mmụọ ase, bụ́ ndị na-enweghị ike mmụọ nsọ, adịkebeghị anwa ịkapị nnọọ okwu ọnụ n’amụma ha ka oge wee ghara ime ha ndị ụgha. N’ụzọ dị iche na nke ahụ, site n’ọnụ Aịsaịa, Jehova kpughere kpọmkwem aha nwoke ọ ga-eji tọhapụ ndị ya ná ndọrọ n’agha ka ha wee nwee ike ịla ma wughachi Jerusalem na ụlọukwu ya. Aha ya bụ Saịrọs, a makwaara ya dị ka Saịrọs Onye Ukwu nke Peasia. Jehova kọwakwara n’ụzọ sara mbara ihe Saịrọs ga-eme iji gafere oké usoro ihe nchebe nke Babilọn, nke gụnyekwara ọtụtụ ihe. Mgbidi ndị dị elu na ọwa mmiri ndị gafere n’etiti nakwa na gburugburu Babilọn ga-echebe ya. Saịrọs ga-eji akụkụ bụ́ isi nke usoro ahụ—Osimiri Yufretis—mee ihe maka abamuru nke ya. Dị ka ndị ọkọ akụkọ ihe mere eme n’oge ochie bụ́ Herodotus na Xenophon si kwuo, ná mgbago mgbago mmiri ahụ site na Babilọn, Saịrọs chere mmiri osimiri Yufretis ihu n’ebe ọzọ ruo mgbe mmiri ahụ talatara ruo n’otú ndị agha ya ga-enwe ike iji ụkwụ si na ya gafere. A bịa n’inwe ike ichebe Babilọn, osimiri Yufretis ahụ dị ike na-atakọ atakọ.

23. Olee ihe ndekọ e nwere banyere mmezu nke amụma bụ́ na Saịrọs ga-atọhapụ Israel?

23 Gịnị banyere nkwa ahụ bụ́ na Saịrọs ga-atọhapụ ndị Chineke nakwa na ọ ga-ahụ na a ga-ewughachi Jerusalem na ụlọukwu ya? Saịrọs n’onwe ya, n’ịma ọkwa sitere n’aka ya bụ́ nke e dekọrọ na Bible, kwuru, sị: “Otú a ka Saịrọs, bụ́ eze Peasia, sịrị, Alaeze nile nke ụwa ka Jehova, bụ́ Chineke eluigwe, nyeworo m; Ya onwe ya mekwara m ka m bụrụ onye nlekọta n’iwuru Ya ụlọ n’ime Jerusalem, nke dị na Juda. Ònye nọ n’etiti unu site ná ndị Ya nile? ka Chineke ya nọnyere ya, ya rịgoruokwa Jerusalem, wuo ụlọ Jehova, bụ́ Chineke Israel, (Ya onwe ya bụ Chineke,) nke dị na Jerusalem.” (Ezra 1:2, 3) Ihe Jehova kwuru site n’ọnụ Aịsaịa mezuru kpam kpam!

Aịsaịa, Saịrọs, na Ndị Kraịst Taa

24. Njikọ dị aṅaa dị n’agbata mpụta nke iwu Ataksakses bụ́ “iwughachi na iwuzi Jerusalem” na ọbịbịa nke Mesaịa?

24 Isi 44 nke Aịsaịa na-ebuli Jehova elu dị ka otu ezi Chineke ahụ na Onye Mgbapụta nke ndị ya n’oge ochie. Ọzọkwa, amụma ahụ nwere ihe miri emi ọ pụtara nye anyị nile taa. Iwu Saịrọs bụ́ ka e wughachi ụlọukwu Jerusalem, bụ́ nke o nyere na 538/537 T.O.A., kpasuru ihe omume ndị bịara ná njedebe ná mmezu nke amụma ọzọ dị ịrịba ama. Iwu nke onye ọchịchị ọzọ, nke chịrị ka e mesịrị, bụ́ Ataksakses, onye nyere iwu ka e wughachi obodo Jerusalem, sochiri iwu Saịrọs. Akwụkwọ Daniel gosiri na a ga-enwe “izu” 69 nke nke ọ bụla n’ime ha ga-adị afọ 7 “site ná mpụta okwu ahụ iwughachi na iwuzi Jerusalem [na 455 T.O.A.] ruo mgbe onye e tere mmanụ [Mesaịa], bụ́ onye ndú.” (Daniel 9:24, 25) Amụma a mezukwara. Kpọmkwem n’oge ya n’afọ 29 O.A., afọ 483 mgbe iwu Ataksakses malitesịrị ịdị irè n’Ala Nkwa ahụ, e mere Jisọs baptism, ọ malitekwara ozi elu ala ya.a

25. Gịnị ka ọdịda nke Babilọn dara site n’aka Saịrọs na-ezo aka na ya n’oge a?

25 Ntọhapụ nke ndị Juu na-eguzosi ike n’ihe site n’ịbụ ndị bi n’ala ọzọ, bụ́ nke ọdịda nke Babilọn mere ka o kwe mee, sere onyinyo ntọhapụ nke ndị Kraịst e tere mmanụ na 1919 site n’ịbụ ndị bi n’ala ọzọ n’ụzọ ime mmụọ. Ntọhapụ ahụ bụ ihe àmà na-egosi na Babilọn ọzọ, nke a kọwara dị ka nwanyị na-akwa iko, bụ́ Babilọn Ukwu ahụ—ihe atụ nke okpukpe ụgha nile nke ụwa ma e jikọta ha—adawo. Dị ka e dekọrọ n’akwụkwọ Mkpughe, Jọn onyeozi hụrụ ọdịda ya tupu ya adaa. (Mkpughe 14:8) Ọ hụkwara mbibi mberede ya tupu o mee. Otú Jọn si kọwaa mbibi nke alaeze ụwa ahụ jupụtara n’arụsị yiri n’ụzọ ụfọdụ otú Aịsaịa si kọwaa mmeri gara nke ọma nke Saịrọs meriri obodo oge ochie bụ́ Babilọn. Dị nnọọ ka ọwa mmiri bụ́ ihe nchebe nke Babilọn na-echebelighị ya pụọ n’aka Saịrọs, otú a ka “mmiri” nke ihe a kpọrọ mmadụ nke na-akwado ma na-echebe Babilọn Ukwu ahụ ga-esi “takọọ” tupu e bibie ya dị ka o kwesịrị.—Mkpughe 16:12.b

26. Olee otú amụma Aịsaịa na mmezu ya si ewusi okwukwe anyị ike?

26 N’ileghachi anya azụ, ihe karịrị narị afọ iri abụọ na ọkara mgbe Aịsaịa busịrị amụma ya, anyị pụrụ ịhụ na Chineke ‘na-emezu ndụmọdụ [nke ndị ozi] ya’ n’ezie. (Aịsaịa 44:26) N’ihi ya mmezu nke amụma Aịsaịa bụ ihe atụ kwesịrị ịrịba ama nke otú amụma nile dị n’Akwụkwọ Nsọ si bụrụ ndị a pụrụ ịdabere na ha.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

a Lee isi 11 nke akwụkwọ bụ́ Ṅaa Ntị n’Amụma Daniel!, nke Watchtower Bible and Tract Society of New York, Inc., bipụtara.

b Lee isi nke 35 na 36 nke akwụkwọ bụ́ Mkpughe—Mmezu Ya Dị Ebube Dị Nso!, nke Watchtower Bible and Tract Society of New York, Inc., bipụtara.

[Foto dị na peeji nke 63]

Mkpirisi nkụ a na-esureghị n’ọkụ, ọ̀ pụrụ ịnapụta onye ọ bụla?

[Foto dị na peeji nke 73]

Isi e ji marble kpụọ nke otu eze Iran, ikekwe nke Saịrọs

[Foto dị na peeji nke 75]

Saịrọs mezuru ihe e buru n’amụma site n’iche mmiri Yufretis ihu n’ebe ọzọ

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya