Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • ip-2 isi 15 p. 215-231
  • Nwanyị Aga Aṅụrịa Ọṅụ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Nwanyị Aga Aṅụrịa Ọṅụ
  • Amụma Aịsaịa—Ìhè nke Dịịrị Ihe Nile A Kpọrọ Mmadụ II
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • A Mata Onye “Nwanyị” ahụ Bụ
  • Ọtụtụ Ụmụ nke Nwanyị Aga Ahụ
  • Nne nke Na-elekọta Nwa Ya
  • Ịdọ Aka ná Ntị Na-adịru Otu Ntabi Anya, Ngọzi Ebighị Ebi
  • Ịnọ ná Nchebe Ime Mmụọ nke Ndị Chineke
  • “Ihe Ngosi Bụ́ Ihe Atụ” nke Baara Anyị Uru
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2006
  • Ezi Ofufe Agbasaa n’Ụwa Nile
    Amụma Aịsaịa—Ìhè nke Dịịrị Ihe Nile A Kpọrọ Mmadụ II
  • Jehova—Chineke nke Na-akụzi Ihe
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1995
  • Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2024
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Amụma Aịsaịa—Ìhè nke Dịịrị Ihe Nile A Kpọrọ Mmadụ II
ip-2 isi 15 p. 215-231

Isi nke Iri na Ise

Nwanyị Aga Aṅụrịa Ọṅụ

Aịsaịa 54:1-17

1. N’ihi gịnị ka o ji gụsie Sera agụụ ike ịmụta ụmụ, oleekwa ahụmahụ o nwere na nke a?

Ọ GỤSIRI Sera agụụ ike ịmụta ụmụ. N’ụzọ dị mwute, ọ bụ nwanyị aga, nke ahụ wutekwara ya nke ukwuu. N’oge ya, a na-ele amụghị nwa anya dị ka nkọcha, ma o nwere ihe na-ewute Sera karịa nke ahụ. Ọ gụsiri ya agụụ ike ịhụ mmezu nke nkwa Chineke kwere di ya. Abraham gaje ịmụpụta mkpụrụ nke ga-abụrụ ezinụlọ nile nke ụwa ngọzi. (Jenesis 12:1-3) Otú ọ dị, ọtụtụ iri afọ kemgbe Chineke kwesịrị nkwa ahụ, ha ka gba aka nwa. Sera mere agadi n’amụghịkwa nwa. Mgbe ụfọdụ, ọ pụrụ icheworị ma olileanya ya ọ kụwo afọ n’ala. Otú ọ dị, otu ụbọchị, enweghị olileanya ya ghọrọ ọṅụ!

2. N’ihi gịnị ka amụma ahụ e dekọrọ n’Aịsaịa isi 54 kwesịrị iji dọrọ mmasị anyị?

2 Ọnọdụ ọjọọ nke Sera nọ na ya na-enyere anyị aka ịghọta amụma ahụ e dekọrọ n’Aịsaịa isi 54. N’ebe ahụ a gwara Jerusalem okwu dị ka ọ bụ nwanyị aga, onye mesịrị nwee oké ọṅụ nke ịmụ ọtụtụ ụmụ. Site n’ịkọwakọta ndị ya nke oge ochie n’otu dị ka nwunye ya, Jehova na-egosi mmetụta ịhụnanya o nwere n’ebe ha nọ. Ọzọkwa, isiakwụkwọ a nke Aịsaịa na-enyere anyị aka ịghọta akụkụ dị mkpa nke ihe Bible kpọrọ ‘ihe nzuzo dị nsọ.’ (Ndị Rom 16:25, 26, NW) Onye “nwanyị” a bụ nakwa ahụmahụ ya ndị e kwuru maka ha n’amụma a na-enye ihe ọmụma dị mkpa banyere ofufe dị ọcha taa.

A Mata Onye “Nwanyị” ahụ Bụ

3. N’ihi gịnị ka “nwanyị” aga ahụ ga-eji ṅụrịa ọṅụ?

3 Isi 54 ji okwu na-enye obi ụtọ malite: “Tie mkpu ọṅụ, gị nwanyị aga, bụ́ nwanyị na-amụghị nwa; tiwaa mkpu ọṅụ, tisiekwa mkpu ike, gị onye ime nwa na-emeghị: n’ihi na ụmụ nke nwanyị a hapụrụ nanị ya dị ọtụtụ karịa ụmụ nke nwanyị a lụrụ na nwunye, ka Jehova sịrị.” (Aịsaịa 54:1) Lee otú Aịsaịa na-aghaghị isiworị nwee obi ụtọ ikwu okwu ndị a! Leekwa nkasi obi mmezu ha ga-ewetara ndị Juu e mere ka ha jee biri na Babilọn! N’oge ahụ, Jerusalem ka ga-atọgbọ n’efu. Dị ka mmadụ si ele ihe anya, ọ ga-eyi ka e nweghị olileanya na a ga-ebikwa n’ime ya ọzọ, dị nnọọ ka nwanyị aga na-apụghị ịnọkata nnọọ tụwa anya ịmụ ụmụ n’agadi ya. Ma “nwanyị” a nwere ngọzi dị ukwuu n’ọdịnihu ya—ọ ga-amụ ụmụ. Jerusalem ga-aṅụrị ọṅụ nke ukwuu. “Ụmụ,” ma ọ bụ ndị obibi, ga-ejupụtaghachi n’ime ya.

4. (a) Olee otú Pọl onyeozi si nyere anyị aka ịhụ na Aịsaịa isi 54 aghaghị inwe mmezu karịrị nke ahụ o nwere na 537 T.O.A.? (b) Gịnị bụ “Jerusalem nke dị n’elu”?

4 O nwere ike Aịsaịa amaghị otú ahụ, ma amụma ya ga-enwe ihe karịrị otu mmezu. Pọl onyeozi hotara ihe e kwuru n’Aịsaịa isi 54 ma kọwaa na “nwanyị” ahụ na-ese onyinyo ihe dị mkpa karịa nnọọ obodo Jerusalem dị n’elu ala. Ọ na-ede, sị: “Jerusalem nke dị n’elu nweere onwe ya, ya onwe ya bụkwa nne anyị.” (Ndị Galetia 4:26) Gịnị bụ ‘Jerusalem a nke dị n’elu’? O doro anya na ọ bụghị obodo Jerusalem nke dị n’Ala Nkwa ahụ. Obodo ahụ dị n’elu ala, ọ bụghị “n’elu” n’ógbè eluigwe. “Jerusalem nke dị n’elu” bụ “nwanyị” Chineke nke nọ n’eluigwe, bụ́ nzukọ ya nke ndị mmụọ dị ike e kere eke mejupụtara.

5. N’ihe ngosi ahụ bụ́ ihe atụ nke a kọwara ná Ndị Galetia 4:22-31, ònye ka (a) Abraham, (b) Sera, (ch) Aịsak, (d) Hega, (e) Ishmael, sere onyinyo ya?

5 Otú ọ dị, olee otú Jehova pụrụ isi nwee ụmụ nwanyị abụọ bụ́ ihe atụ—otu n’eluigwe, nke ọzọ n’ụwa? È nwere ihe ụfọdụ na-ekwekọghị ekwekọ n’ebe a? Ọ dịghị ma ọlị. Pọl onyeozi na-egosi na azịza ya dabeere n’ihe atụ amụma nke ezinụlọ Abraham nọchiri anya ya. (Ndị Galetia 4:22-31; lee “Ezinụlọ Abraham—Ihe Atụ Amụma,” nke dị na peeji nke 218.) Sera, nke bụ́ ‘nwanyị ahụ nweere onwe ya’ nakwa nwunye Abraham, na-ese onyinyo nzukọ eluigwe nke Jehova nke ndị mmụọ e kere eke mejupụtara, bụ́ nke yiri nwunye. Hega, nke bụ́ ohu nwanyị na nwanyị nke abụọ nke Abraham, ma ọ bụ iko ya nwanyị, na-ese onyinyo Jerusalem nke dị n’ụwa.

6. N’echiche dị aṅaa ka nzukọ eluigwe nke Chineke nọrọ ogologo oge n’amụghị nwa?

6 N’iburu ọnọdụ a n’uche, anyị na-amalite ịhụ ihe miri emi Aịsaịa 54:1 pụtara. Mgbe ọtụtụ iri afọ nke amụghị nwa gasịrị, Sera mụrụ Aịsak mgbe ọ dị afọ 90. N’otu aka ahụ, nzukọ eluigwe nke Jehova nọrọ ogologo oge n’amụghị nwa. Laa azụ n’ogige Iden, Jehova kwere nkwa na “nwanyị” ya ga-amụpụta “mkpụrụ” ahụ. (Jenesis 3:15) Ihe karịrị afọ 2,000 ka e mesịrị, Jehova na Abraham gbara ọgbụgba ndụ banyere Mkpụrụ ahụ e kwere ná nkwa. Ma “nwanyị” eluigwe nke Chineke aghaghị icherekwu ruo ọtụtụ narị afọ tupu ọ mụpụta Mkpụrụ ahụ. N’agbanyeghị nke ahụ, oge ruru mgbe ụmụ nke nwanyị a bụbu “nwanyị aga” bịara dị ọtụtụ karịa nke Israel anụ ahụ. Ihe atụ nke nwanyị aga ahụ na-enyere anyị aka ịhụ ihe mere ndị mmụọ ozi ji nwee oké mmasị ịhụ ọbịbịa nke Mkpụrụ ahụ e buru amụma ya. (1 Pita 1:12) Olee mgbe nke ahụ mesịrị mee?

7. Olee mgbe “Jerusalem nke dị n’elu” nwere ihe mere ọ ga-eji ṅụrịa ọṅụ dị ka e buru n’amụma n’Aịsaịa 54:1, n’ihi gịnịkwa ka i ji zaa otú ahụ?

7 Ọmụmụ nke Jisọs dị ka nwa ọhụrụ bụ́ mmadụ bụ n’ezie ihe ịṅụrị ọṅụ nye ndị mmụọ ozi. (Luk 2:9-14) Ma ọ bụghị ya bụ ihe omume ahụ e buru amụma ya n’Aịsaịa 54:1. Ọ bụ nanị mgbe e ji mmụọ nsọ mụọ Jisọs na 29 O.A. ka ọ ghọrọ nwa ime mmụọ nke “Jerusalem nke dị n’elu,” bụrụ onye Chineke n’onwe ya nabatara n’ihu ọha dị ka ‘Ọkpara ya ọ hụrụ n’anya.’ (Mak 1:10, 11; Ndị Hibru 1:5; 5:4, 5) Ọ bụ mgbe ahụ ka “nwanyị” eluigwe nke Chineke nwere ihe mere ọ ga-eji ṅụrịa ọṅụ ná mmezu nke Aịsaịa 54:1. N’ikpeazụ, ọ mụpụtawo Mkpụrụ ahụ e kwere ná nkwa, bụ́ Mesaịa! Ọtụtụ narị afọ nke amụghị nwa ya agabigawo. Otú ọ dị, nke ahụ abụghị ebe ịṅụrị ọṅụ ya kwụsịrị.

Ọtụtụ Ụmụ nke Nwanyị Aga Ahụ

8. N’ihi gịnị ka “nwanyị” eluigwe nke Chineke ji nwee ihe mere ọ ga-eji ṅụrịa ọṅụ mgbe ọ mụpụtasịrị Mkpụrụ ahụ e kwere ná nkwa?

8 Mgbe Jisọs nwụsịrị ma si n’ọnwụ bilie, “nwanyị” eluigwe nke Chineke ṅụrịrị ọṅụ ịnabataghachi Ọkpara ya a ọ hụrụ n’anya dị ka “onye e buru ụzọ mụọ site ná ndị nwụrụ anwụ.” (Ndị Kọlọsi 1:18) Mgbe ahụ, ọ malitere ịmụpụtakwu ụmụ ime mmụọ. Na Pentikọst 33 O.A., e ji mmụọ nsọ tee ihe dị ka mmadụ 120 n’ime ụmụazụ Jisọs mmanụ, si otú ahụ na-edo ha dị ka ndị ha na Kraịst ga-eketakọ ihe. Ka oge na-aga n’ụbọchị ahụ, a tụkwasịkwuru mmadụ 3,000. (Jọn 1:12; Ọrụ 1:13-15; 2:1-4, 41; Ndị Rom 8:14-16) Ìgwè ndị a bụ́ ụmụ nọgidere na-amụba. Na narị afọ ndị mbụ mgbe Krisendọm si n’ezi ofufe dapụ, mmụba ahụ belatara nke ukwuu. Otú ọ dị, nke ahụ gbanwere na narị afọ nke 20.

9, 10. Gịnị ka ntụziaka bụ́ ka e ‘mee ka ebe ụlọikwuu saa mbara’ ga-apụta nye nwanyị bi n’ụlọikwuu n’oge ochie, n’ihi gịnịkwa ka oge a ji bụrụ oge ọṅụ nye nwanyị dị otú ahụ?

9 Aịsaịa gara n’ihu ibu amụma banyere oge nke uto dị ịrịba ama, na-asị: “Mee ka ebe ụlọikwuu gị saa mbara, ka ha setịakwa ákwà nkwụba nile nke ebe obibi gị nile; egbochila: mee ka ụdọ gị nile dị ogologo, meekwa ka ntú gị nile dị ike. N’ihi na n’aka nri na n’aka ekpe ka ị ga-agbasa; mkpụrụ gị ga-enwetakwa mba dị iche iche, ọ bụkwa obodo dị iche iche nke tọgbọrọ n’efu ka ha ga-eme ka mmadụ biri n’ime ha. Atụla egwu; n’ihi na ihere agaghị eme gị: ka a ghara itinyekwa gị n’ọnọdụ ihere; n’ihi na a gaghị eme gị ka i nwee ihu ihere: n’ihi na ị ga-echezọ ihere nke mgbe ị nọ na nwata, ọzọ, ịta ụta nke ọnọdụ nwanyị di ya nwụrụ ị nọ, ị gaghị echeta ya ọzọ.”—Aịsaịa 54:2-4.

10 N’ebe a, a na-agwa Jerusalem okwu dị ka ọ̀ bụ nwunye na nne nke bi n’ụlọikwuu, dị nnọọ ka Sera. Mgbe a gọziri ya site n’inye ya ezinụlọ na-ebuwanye ibu, ọ bụ oge ka nne dị otú ahụ hụ na e wusawanyere ụlọ ya. Ọ dị mkpa ka ọ rụọ ákwà nkwụba na ụdọ ndị dị ogologo karị ma kụnyesie ntú ụlọikwuu ahụ ike n’ebe ọhụrụ ọ kpọnyere ha. Nke a bụụrụ ya ọrụ na-enye obi ụtọ, n’oge dị otú ahụkwa ọ ga-eji ọrụ n’aka, ọ pụrụ ichezọ ngwa ngwa afọ ndị ahụ ọ nọ na-echegbu onwe ya ma ya ga-anọkatakwa mụta ụmụ ga-eme ka usoro ezinụlọ ya dịgide.

11. (a) Olee otú e si gọzie “nwanyị” eluigwe nke Chineke na 1914? (Lee ihe odide ala ala peeji.) (b) Malite na 1919 gaa n’ihu, ngọzi dị aṅaa ka ndị e tere mmanụ nọ n’ụwa nwetaworo?

11 E ji oge mwughachi dị otú ahụ gọzie Jerusalem nke dị n’elu ala mgbe ndọrọ n’agha gaa na Babilọn gasịrị. A gọziwo “Jerusalem nke dị n’elu” ọbụna karị.a Karịsịa kemgbe 1919, “ụmụ” ya e tere mmanụ anọwo na-eme nke ọma n’ọnọdụ ime mmụọ ha e weghachiri ọhụrụ. (Aịsaịa 61:4; 66:8) Ha ‘nwetakwara mba dị iche iche’ n’ihi na ha gbasara banye n’ọtụtụ ala iji chọta ndị nile ga-esonyere ezinụlọ ime mmụọ ha. N’ihi ya, e nwere oké mmụba ná nchịkọbata nke ụmụ ahụ e tere mmanụ. O yiri ka e nwetazuru ọnụ ọgụgụ ha nke bụ́ 144,000 n’ihe dị ka n’etiti afọ ndị 1930. (Mkpughe 14:3) N’oge ahụ, ebe ọrụ nkwusa ahụ lekwasịrị anya abụkwaghị ná nchịkọta nke ndị e tere mmanụ. Ma, mmụba akwụsịghị ná ndị e tere mmanụ.

12. Tụkwasị ná ndị e tere mmanụ, olee ndị a chịkọbataworo n’ọgbakọ ndị Kraịst kemgbe afọ ndị 1930?

12 Jisọs n’onwe ya buru amụma na e wezụga “ìgwè atụrụ nta” nke ụmụnna ya e tere mmanụ, ọ ga-enwe “atụrụ ọzọ” ndị a na-aghaghị ịkpọbata n’ogige atụrụ nke ezi ndị Kraịst. (Luk 12:32; Jọn 10:16) Ọ bụ ezie na ha esoghị n’ụmụ e tere mmanụ nke “Jerusalem nke dị n’elu,” ndị a na-ekwesị ntụkwasị obi, bụ́ ndị ibe nke ndị e tere mmanụ, na-arụ ọrụ dị mkpa e buru n’amụma eri ogologo oge gara aga. (Zekaraịa 8:23) Malite n’afọ ndị 1930 ruo taa, a chịkọtawo “oké ìgwè mmadụ” n’ime ha, na-arụpụta mmụba a na-enwetụbeghị ụdị ya n’ọgbakọ ndị Kraịst. (Mkpughe 7:9, 10) Taa, ọnụ ọgụgụ oké ìgwè mmadụ ahụ eruwo ọtụtụ nde. Mmụba a nile emewo ka e nwee mkpa dị ukwuu maka Ụlọ Nzukọ Alaeze, Ụlọ Mgbakọ, na ihe owuwu alaka. Ihe Aịsaịa kwuru yiri ka ọ dabara nnọọ adaba ugbu a karịa mgbe ọ bụla ọzọ. Lee ihe ùgwù ọ bụ iso ná mmụba ahụ e buru amụma ya!

Nne nke Na-elekọta Nwa Ya

13, 14. (a) Ihe isi ike dị aṅaa pụtara ìhè ka a na-ahụ n’ihe metụtara ụfọdụ n’ime okwu ndị ahụ a gwara “nwanyị” eluigwe nke Chineke? (b) Olee ihe ndị anyị pụrụ ịghọta site n’ojiji Chineke ji mmekọrịta ezinụlọ mee ihe n’ụzọ ihe atụ?

13 Anyị ahụwo na ná mmezu ya ka ukwuu, “nwanyị” ahụ e kwuru maka ya n’amụma ahụ na-anọchite anya nzukọ eluigwe nke Jehova. Ma ọ bụrụ na anyị agụọ Aịsaịa 54:4, anyị pụrụ ịdị na-eche otú e sitụworo menye nzukọ ahụ nke ndị mmụọ e kere eke ihere ma ọ bụ wetara ya ịta ụta. Amaokwu ndị na-esonụ na-ekwu na a ga-ajụ “nwanyị” nke Chineke, weda ya ala, ma wakpo ya. Ọ ga-akpasu ọbụna Chineke iwe. Olee otú ihe ndị dị otú ahụ ga-esi mezuo n’ebe nzukọ nke ndị mmụọ e kere eke zuru okè nọ, bụ́ ndị na-emetụbeghị mmehie? Azịza ya dabeere n’ọdịdị ezinụlọ ahụ.

14 Jehova na-eji mmekọrịta ezinụlọ eme ihe—di na nwunye, nne na ụmụ—iji kọwaa eziokwu ime mmụọ ndị gbara ọkpụrụkpụ n’ihi na ihe atụ ndị dị otú ahụ bụ nke ụmụ mmadụ pụrụ ịghọta. N’agbanyeghị otú ahụmahụ anyị nwere banyere ezinụlọ hà ma ọ bụ ọdịdị ha, anyị maara ma eleghị anya otú alụmdi na nwunye dị mma ma ọ bụ mmekọrịta dị mma nke dị n’etiti ndị mụrụ ụmụ na ụmụ ha kwesịrị ịdị. Mgbe ahụ lee otú Jehova si na-akụziri anyị n’ụzọ doro anya na ya na ọnụ ọgụgụ bara ụba nke ndị ohu ya bụ́ mmụọ na-enwe mmekọrịta dị mma, nke chiri anya, na nke ntụkwasịrịta obi! Leekwa ka o si na-akụziri anyị n’ụzọ magburu onwe ya na nzukọ eluigwe ya na-elekọta ụmụ ya e ji mmụọ nsọ tee mmanụ nọ n’ụwa! Mgbe ndị ohu ahụ bụ́ ụmụ mmadụ na-ata ahụhụ, ndị ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi nọ n’eluigwe, bụ́ “Jerusalem nke dị n’elu,” na-ata ahụhụ. N’otu aka ahụ, Jisọs kwuru, sị: “Ka ọ hà, bụ́ otú unu si mee ya nye otu onye n’ime ụmụnna m ndị a [e ji mmụọ nso tee mmanụ], bụ́ ndị dịkarịsịrị nta, Mụ ka unu mere ya nye.”—Matiu 25:40.

15, 16. Gịnị bụ mmezu mbụ nke Aịsaịa 54:5, 6, gịnịkwa bụ mmezu ya ka ukwuu?

15 Mgbe ahụ, n’abụghị ihe ijuanya, ihe dị ukwuu n’ihe a gwara “nwanyị” eluigwe nke Jehova na-ekpughe ahụmahụ nke ụmụ ya ndị nọ n’ụwa nwere. Tụlee okwu ndị a: “Di gị bụ Onye meworo gị; Jehova nke usuu nile nke ndị agha bụ aha Ya: ọzọ, onye mgbapụta gị bụ Onye Nsọ nke Israel; Chineke nke ụwa nile ka a na-akpọ Ya. N’ihi na Jehova akpọwo gị dị ka nwanyị a hapụrụ ahapụ nke ọ na-ewutekwa ya n’ime mmụọ ya, bụ́ nwunye a lụtara na nwata, mgbe a jụrụ ya, ka Chineke gị sịrị.”—Aịsaịa 54:5, 6.

16 Ònye bụ nwunye a na-agwa okwu n’ebe a? Ná mmezu mbụ ya, ọ bụ Jerusalem, nke na-anọchite anya ndị Chineke. N’oge ha ga-eje biri na Babilọn ruo afọ 70, ọ ga-adị ha ka Jehova ọ jụwo ha ma hapụ ha kpam kpam. Ná mmezu ya ka ukwuu, okwu ndị ahụ na-ezo aka na “Jerusalem nke dị n’elu” nakwa n’ahụmahụ ya nke imesịa mụpụta “mkpụrụ” ahụ ná mmezu nke Jenesis 3:15.

Ịdọ Aka ná Ntị Na-adịru Otu Ntabi Anya, Ngọzi Ebighị Ebi

17. (a) Olee otú Jerusalem nke dị n’elu ala ga-esi nweta “nrubiga ókè” nke iwe Chineke? (b) “Nrubiga ókè” dị aṅaa ka ụmụ “Jerusalem nke dị n’elu” nwetara?

17 Amụma ahụ gara n’ihu, sị: “N’otu ntabi anya dị nta ka M hapụworo gị ahapụ; ma obi ebere nile dị ukwuu ka M ga-eji chịkọta gị. Ná nrubiga ókè nke iwe ka M zonahụrụ gị ihu m otu ntabi anya; ma ebere ebighị ebi ka M ga-eji nwee obi ebere n’ahụ gị, ka Jehova, bụ́ Onye mgbapụta gị, sịrị.” (Aịsaịa 54:7, 8) “Nrubiga ókè” nke iwe Chineke kpuchiri Jerusalem nke dị n’elu ala mgbe ndị agha Babilọn wakporo ya na 607 T.O.A. Afọ 70 ọ ga-anọ n’ala ọzọ pụrụ iyi ogologo oge. Ma, ule ndị dị otú ahụ ga-adịru “otu ntabi anya” ma e jiri ha tụnyere ngọzi ebighị ebi na-echere ndị nakweere ịdọ aka ná ntị ahụ. N’otu aka ahụ, ọ dị ụmụ e tere mmanụ nke “Jerusalem nke dị n’elu” ka “nrubiga ókè” nke iwe Chineke o rikpuwo ha mgbe Jehova kwere ka ndị ndọrọ ndọrọ ọchịchị wakpo ha site ná mkpali nke Babilọn Ukwu ahụ. Ma lee ka ịdọ aka ná ntị ahụ si mesịa yie ihe dịruru nwa oge, n’iji ya tụnyere oge ngọzi ime mmụọ nke sochiworo kemgbe 1919!

18. Ụkpụrụ dị aṅaa dị mkpa ka anyị pụrụ ịhụ n’ihe banyere iwe Jehova n’ebe ndị ya nọ, oleekwa otú nke a pụrụ isi metụta anyị onwe anyị?

18 Amaokwu ndị a na-ekwupụta eziokwu ọzọ gbara ọkpụrụkpụ—iwe Chineke adịghị anọte aka ma ebere ya na-adịru ebighị ebi. Iwe ya na-adị ọkụ megide ajọ omume, ma ọ na-achịkwa ya achịkwa mgbe nile, ọ na-enwe nzube mgbe nile. Ọ bụrụkwa na anyị anakwere ịdọ aka ná ntị Jehova, iwe ya na-adịru “otu ntabi anya,” wee dajụọ. A na-eji “obi ebere [ya] nile dị ukwuu”—mgbaghara ya na ebere ịhụnanya ya, edochi ya. Ndị a na-adịru mgbe “ebighị ebi.” Ya bụrụ otú ahụ, mgbe anyị mere mmehie, anyị ekwesịtụghị igbu oge ichegharị na ịchọ isoro Chineke dozie okwu. Ọ bụrụ na mmehie ahụ dị oké njọ, anyị kwesịrị ịgakwuru ndị okenye ọgbakọ ozugbo. (Jemes 5:14) N’eziokwu, ịdọ aka ná ntị pụrụ ịdị mkpa, ọ pụkwara isi ike nnara. (Ndị Hibru 12:11) Ma ọ ga-adịru nwa oge ma e jiri ya tụnyere ngọzi ebighị ebi ndị ga-abịa site n’ịnweta mgbaghara nke Jehova Chineke!

19, 20. (a) Gịnị bụ ọgbụgba ndụ eke na ogwurugwu, oleekwa otú o si gbasa ndị ahụ e mere ka ha jee biri na Babilọn? (b) “Ọgbụgba ndụ nke udo” na-enye ndị Kraịst e tere mmanụ taa mmesi obi ike dị aṅaa?

19 Ugbu a, Jehova na-enye ndị ya mmesi obi ike na-enye nkasi obi: “Otú mmiri nke Noa [dị] ka nke a dịịrị m: n’ihi na dị ka M ṅụrụ iyi, sị na mmiri nke Noa agaghị erubigakwa ụwa ọzọ, otú a ka M ṅụworo iyi, sị na M gaghị ewesa gị iwe, na M gaghị abasiri gị mba ike. N’ihi na ugwu nile ga-apụ n’ọnọdụ ha, a ga-ewezụgakwa ugwu nta nile n’ọnọdụ ha; ma ebere m agaghị esi n’ebe ị nọ pụọ, a gaghị ewezụgakwa ọgbụgba ndụ nke udo nke m n’ọnọdụ ya, ka Onye nwere obi ebere n’ahụ gị sịrị, bụ́ Jehova.” (Aịsaịa 54:9, 10) Mgbe Iju Mmiri ahụ gasịrị, Chineke na Noa nakwa mkpụrụ obi ọ bụla ọzọ dị ndụ gbara ndụ—nke a na-akpọ ọgbụgba ndụ eke na ogwurugwu mgbe ụfọdụ. Jehova kwere nkwa na ya agaghị eji iju mmiri zuru ụwa ọnụ mebie ụwa ọzọ. (Jenesis 9:8-17) Gịnị ka nke ahụ pụtara nye Aịsaịa na ndị ya?

20 Ọ bụ ihe na-akasi obi ịmara na ntaramahụhụ ahụ ha na-aghaghị inweta—ije biri na Babilọn ruo afọ 70—ga-ewere ọnọdụ nanị otu ugboro. Mgbe ọ gasịrị, ọ gaghị emekwa ọzọ. Mgbe nke ahụ gasịrị, “ọgbụgba ndụ nke udo” nke Chineke ga-amalite ịdị irè. Echiche dị n’okwu Hibru maka “udo” abụghị nanị enweghị agha, kamakwa ụdị nile nke ihe ịdị mma. N’akụkụ nke Chineke, ọgbụgba ndụ a na-adịgide adịgide. Ugwu dị iche iche ga-apụ n’anya kama ebere ịhụnanya ya n’ebe ndị ya na-ekwesị ntụkwasị obi nọ ịkwụsị. N’ụzọ dị mwute, mba ya dị n’elu ala ga-emesịa ghara imezu akụkụ nke ha n’ọgbụgba ndụ ahụ, ha ga-emebikwa udo nke ha site n’ịjụ Mesaịa ahụ. Otú ọ dị, ụmụ nke “Jerusalem nke dị n’elu” mere nke ọma karị. Ozugbo oge ahụ siere ha ike nke ịdọ aka ná ntị gasịrị, e mesiri ha obi ike banyere nchebe Chineke.

Ịnọ ná Nchebe Ime Mmụọ nke Ndị Chineke

21, 22. (a) N’ihi gịnị ka e ji sị na “Jerusalem nke dị n’elu” bụ nke e wedara n’ala na nke oké ifufe na-efegharị? (b) Gịnị ka ọnọdụ a gọziri agọzi nke “nwanyị” eluigwe nke Chineke na-egosi banyere “ụmụ” ya ndị nọ n’ụwa?

21 Jehova gara n’ihu ibu amụma banyere ịnọ ná nchebe maka ndị ya kwesịrị ntụkwasị obi, sị: “Gị nwanyị e wedara n’ala, nke oké ifufe na-efegharị, nke a na-akasighị obi, lee, Mụ onwe m ga-edo nkume gị nile n’ihe ịchọ mma, were nkume sapphire tọọ ntọala gị. M ga-emekwa ka elu akụkụ ụlọ gị nile ghọọ nkume ruby, meekwa ka ọnụ ụzọ ámá gị nile ghọọ nkume carbuncle, meekwa ka ókèala gị nile ghọọ nkume dị iche iche a na-achọsi ike. Ọzọ, ụmụ gị nile ga-abụ ndị [Jehova ziri ihe, NW]; udo nke ụmụ gị ga-abakwa ụba. N’ezi omume ka a ga-eme ka i guzosie ike: gị nọpụ mmegbu n’ebe dị anya, n’ihi na ị gaghị atụ egwu; nọpụkwa ihe ụjọ n’ebe dị anya, n’ihi na ọ gaghị abịaru gị nso. Lee, ọ bụrụ na onye ọ bụla akpalie iseokwu megide gị, o siteghị na Mụ: onye ọ bụla nke kpaliworo iseokwu n’ebe ị nọ ga-ada ada n’ihi gị.”—Aịsaịa 54:11-15.

22 N’eziokwu, ọ dịbeghị mgbe e wedara “nwanyị” Jehova nke dị n’ógbè ndị mmụọ ala ma ọ bụ bụrụ nke oké ifufe fegharịrị kpọmkwem. Ma ọ tara ahụhụ mgbe “ụmụ” ya e tere mmanụ nọ n’ụwa tara ahụhụ, karịsịa mgbe a dọọrọ ha n’agha n’ụzọ ime mmụọ na 1918-1919. N’aka nke ọzọ, mgbe e buliri “nwanyị” ahụ nọ n’eluigwe elu, nke a na-egosipụtakwa ọnọdụ yiri ya nke ụmụ ya nọ na ya. Mgbe ahụ, tụlee ụzọ magburu onwe ya e si kọwaa “Jerusalem nke dị n’elu.” Nkume dị oké ọnụ ahịa ndị dị n’ọnụ ụzọ ámá ya, ‘ihe ịchọ mma’ gburu ego e ji doo nkume ya, ntọala ya, na ọbụna ókèala ya na-egosi, dị ka otu akwụkwọ e ji eme nchọpụta si kwuo, “ịma mma, ịdị ebube, ịdị ọcha, ike, na nkwụsi ike.” Gịnị ga-eduje ndị Kraịst e tere mmanụ n’ọnọdụ dị otú ahụ dị nchebe, nke a gọzikwara agọzi?

23. (a) Ịbụ “ndị Jehova ziri ihe” enwewo mmetụta dị aṅaa n’ahụ ndị Kraịst e tere mmanụ na mgbe ikpeazụ a? (b) N’echiche dị aṅaa ka e jiworo ‘ókèala nke nkume dị iche iche a na-achọsi ike’ gọzie ndị Chineke?

23 Amaokwu nke 13 nke Aịsaịa isi 54 na-enye azịza ya—ha nile ga-abụ “ndị Jehova ziri ihe.” Jisọs n’onwe ya ji ihe ndị e kwuru n’amaokwu a mee ihe n’ebe ụmụazụ ya e tere mmanụ nọ. (Jọn 6:45) Daniel onye amụma buru amụma na na “mgbe ọgwụgwụ” a, a ga-eji ezi ihe ọmụma na nghọta ime mmụọ bara ụba gọzie ndị e tere mmanụ. (Daniel 12:3, 4) Nghọta dị otú ahụ enyeworo ha aka ibute ụzọ n’ọrụ izi ihe kasịnụ a rụtụworo n’akụkọ ihe mere eme, na-agbasa izi ihe Chineke n’ụwa nile. (Matiu 24:14) N’otu oge ahụ, nghọta dị otú ahụ enyeworo ha aka ịhụ ihe dị iche n’ezi okpukpe na nke ụgha. Aịsaịa 54:12 hotara ‘ókèala nke nkume dị iche iche a na-achọsi ike.’ Kemgbe 1919, Jehova emewo ka ndị ahụ e tere mmanụ nwee nghọta doro anya karị banyere ókèala ndị ahụ—ókèala ime mmụọ—na-edo ha iche pụọ n’okpukpe ụgha nakwa ná ndị na-adịghị asọpụrụ Chineke n’ụwa. (Ezikiel 44:23; Jọn 17:14; Jemes 1:27) E si otú a doo ha iche dị ka ndị nke Chineke.—1 Pita 2:9.

24. Olee otú anyị pụrụ isi jide n’aka na Jehova na-ezi anyị ihe?

24 N’ihi ya, onye ọ bụla n’ime anyị ga-eme nke ọma ịjụ onwe ya sị, ‘Àbụ m onye Jehova na-ezi ihe?’ Anyị adịghị enweta ụdị izi ihe a n’emeghị mgbalị. Anyị aghaghị itinye mgbalị. Ọ bụrụ na anyị agụchie Okwu Chineke anya ma na-atụgharị uche na ya, ọ bụrụkwa na anyị na-anara ntụziaka site n’ịgụ akwụkwọ ndị dabeere na Bible bụ́ ndị “ohu ahụ kwesịrị ka a tụkwasị ya obi, nke nwekwara uche” na-ebipụta nakwa site n’ịkwadebe na ịga nzukọ ndị Kraịst, anyị ga-abụ n’ezie ndị Jehova ziri ihe. (Matiu 24:45-47) Ọ bụrụ na anyị na-agbalịsi ike itinye ihe ndị anyị na-amụta n’ọrụ ma nọgide na-amụrụ anya, na-anọkwa na nche n’ụzọ ime mmụọ, izi ihe Chineke ga-eme ka anyị dị iche n’ebe ndị nọ n’ime ụwa nke a na-adịghị asọpụrụ Chineke nọ. (1 Pita 5:8, 9) Ọbụna nke ka mma, ọ ga-enyere anyị aka ‘ịbịaru Chineke nso.’—Jemes 1:22-25; 4:8.

25. Gịnị ka nkwa udo Chineke kwere pụtaara ndị ya n’oge a?

25 Amụma Aịsaịa na-egosikwa na e ji udo bara ụba gọzie ndị e tere mmanụ. Nke a ọ̀ pụtara na ọ dịghị mgbe ọ bụla a na-awakpo ha? Ee e, ma Chineke na-enye mmesi obi ike na ya agaghị enye iwu ka e mee mwakpo ndị dị otú ahụ ma ọ bụ kwe ka ọ gaa nke ọma. Anyị na-agụ, sị: “Lee, Mụ onwe m ekewo ụzụ́ nke na-afụ ọkụ icheku, na-akpụ ihe ọrụ iji rụọ ọrụ nke aka ya; Mụ onwe m ekewokwa onye mbibi imebi emebi. Ọ dịghị ihe agha ọ bụla a kpụworo imegide gị ga-aga nke ọma: ọzọ, ire ọ bụla nke ga-ebili imegide gị n’ikpe ka ị ga-ama ikpe. Nke a bụ ihe nketa nke ndị ohu Jehova, ezi omume ha na-esite na m: ọ bụ ihe sị n’ọnụ Jehova pụta.”—Aịsaịa 54:16, 17.

26. N’ihi gịnị ka o ji bụrụ ihe na-emesi obi ike ịmara na Jehova bụ Onye Okike nke ihe nile a kpọrọ mmadụ?

26 Na nke ugboro abụọ ya n’isiakwụkwọ a nke Aịsaịa, Jehova na-echetara ndị ohu ya na ọ bụ ya bụ Onye Okike. Tupu ugbu a, ọ gwara “nwunye” ihe atụ ya na ọ bụ ya bụ “Onye meworo” ya. Ugbu a, ọ na-ekwu na ọ bụ ya bụ Onye Okike nke ihe nile a kpọrọ mmadụ. Amaokwu nke 16 na-akọwa onye ụzụ́ nke na-afụ ọkụ icheku ekò ya ka ọ nọ na-akpụpụta ihe agha ya e ji ebibi ihe nakwa dike, bụ́ “onye mbibi imebi emebi.” Ndị ikom dị otú ahụ pụrụ ịbụrụ ụmụ mmadụ ibe ha ihe iyi egwu, ma olee nnọọ otú ha ga-esi tụọ anya imeri Onye Okike ha? N’otu aka ahụ taa, ọbụna mgbe ndị agha kasị ike nke ụwa a wakporo ndị Jehova, ha agaghị enwe olileanya inwe ihe ịga nke ọma n’ikpeazụ. N’ihi gịnị?

27, 28. Olee ihe anyị pụrụ ijide n’aka n’oge ndị a siri ike, n’ihi gịnịkwa ka anyị ji mara na mwakpo Setan na-awakpo anyị agaghị enwe isi?

27 Oge ịwakpo ndị Chineke na ofufe ha na-efe n’ime mmụọ na eziokwu n’ụzọ ga-ebibi ihe agafewo. (Jọn 4:23, 24) Jehova nyere Babilọn Ukwu ohere ịwakpo ha otu mwakpo nke nwere ihe ịga nke ọma ruo nwa oge. Ruo otu ntabi anya, “Jerusalem nke dị n’elu” hụrụ ka ọ fọrọ nke nta ka e mechie ụmụ ya ọnụ n’ihi na ọrụ nkwusa ahụ a na-arụ n’ụwa fọrọ nke nta ka ọ kwụsị. Ọ gaghị eme ọzọ! Ugbu a, ọ na-aṅụrị ọṅụ n’ihi ụmụ ya n’ihi na ha bụ ndị a na-apụghị imeri emeri, n’ụzọ ime mmụọ. (Jọn 16:33; 1 Jọn 5:4) E nwewo ihe agha mwakpo ndị a kpụworo megide ha, a ka ga-enwekwa ndị ọzọ. (Mkpughe 12:17) Ma ndị a enwebeghị ihe ịga nke ọma, ha agaghịkwa enwe. Setan enweghị ihe agha ọ bụla pụrụ imebi okwukwe na oké ịnụ ọkụ n’obi nke ndị e tere mmanụ na ndị ibe ha. Udo ime mmụọ a bụ “ihe nketa nke ndị ohu Jehova,” ya mere, ọ dịghị onye pụrụ ịnapụ ha ya n’ike.—Abụ Ọma 118:6; Ndị Rom 8:38, 39.

28 Ee e, ọ dịghị ihe ụwa Setan pụrụ ime nke ga-akwụsịli ọrụ na ofufe dị ọcha na-adịgide adịgide nke ndị ohu Chineke raara onwe ha nye ya, ma ọli. Ụmụ e tere mmanụ nke “Jerusalem nke dị n’elu” enwetawo nkasi obi dị ukwuu site ná mmesi obi ike ahụ. Ndị so n’oké ìgwè mmadụ ahụ na-enwetakwa. Ka anyị na-amatakwu banyere nzukọ eluigwe nke Jehova na otú ya na ndị na-efe ya ofufe nọ n’elu ụwa si emekọrịta ihe, otú ahụ ka okwukwe anyị ga na-esiwanye ike. Ọ bụrụhaala na okwukwe anyị siri ike, ihe agha dị iche iche nke Setan ga-abụ ihe efu n’agha ọ na-ebuso anyị!

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

a Dị ka Mkpughe 12:1-17 si kwuo, a gọziri “nwanyị” nke Chineke n’ụzọ dị ukwuu site n’ọmụmụ ọ mụrụ “nwa” kasị mkpa—ọ bụghị otu nwa bụ́ mmụọ, kama Alaeze Mesaịa nke dị n’eluigwe. Ọmụmụ nwa a weere ọnọdụ na 1914. (Lee Mkpughe—Mmezu Ya Dị Ebube Dị Nso!, peeji nke 177-186.) Amụma Aịsaịa lekwasịrị anya n’ọṅụ o nwere n’ihi ngọzi Chineke gọziri ụmụ ya e tere mmanụ nọ n’ụwa.

Igbe dị na peeji nke 218, 219]

Ezinụlọ Abraham—Ihe Atụ Amụma

Pọl onyeozi kọwara na ezinụlọ Abraham bụ ihe ngosi bụ́ ihe atụ, ihe atụ amụma nke mmekọrịta dị n’etiti Jehova na nzukọ eluigwe ya nakwa ya na mba Israel dị n’elu ala n’okpuru ọgbụgba ndụ Iwu Mosis.—Ndị Galetia 4:22-31.

Abraham, dị ka onyeisi ezinụlọ, na-anọchite anya Jehova Chineke. Njikere Abraham dị ịchụ nwa ya nwoke ọ hụrụ n’anya bụ́ Aịsak n’àjà na-ese onyinyo njikere Jehova dị ịchụ Ọkpara ya ọ hụrụ n’anya n’àjà maka mmehie nke ihe a kpọrọ mmadụ.—Jenesis 22:1-13; Jọn 3:16.

Sera na-ese onyinyo “nwunye” eluigwe nke Chineke, bụ́ nzukọ ya nke ndị mmụọ e kere eke mejupụtara. A kọwara nzukọ ahụ dị n’eluigwe n’ụzọ dabara adaba dị ka nwunye Jehova, n’ihi na ya na Jehova na-enwe mmekọrịta chiri anya, ọ nọ n’okpuru ịbụisi ya, ma na-erube isi n’ụzọ zuru ezu n’imezu nzube ya dị iche iche. A kpọkwara ya “Jerusalem nke dị n’elu.” (Ndị Galetia 4:26) E hotakwara otu “nwanyị” a na Jenesis 3:15, a kọwakwara ya n’ọhụụ ná Mkpughe 12:1-6, 13-17.

Aịsak na-ese onyinyo Mkpụrụ ime mmụọ nke nwanyị Chineke. N’ụzọ bụ́ isi, nke a bụ Jisọs Kraịst. Otú ọ dị, mkpụrụ ahụ mesịkwara gụnye ụmụnna Kraịst e tere mmanụ, bụ́ ndị e doro dị ka ụmụ ime mmụọ, ha aghọọkwa ndị ha na Kraịst ga-eketakọ ihe.—Ndị Rom 8:15-17; Ndị Galetia 3:16, 29.

Hega, bụ́ nwunye nke abụọ nke Abraham, ma ọ bụ iko ya nwanyị, bụ ohu. Ọ na-ese onyinyo Jerusalem elu ala n’ụzọ dabara adaba, bụ́ ebe ụkpụrụ Iwu Mosis dị irè, na-ekpughe ndị nile na-agbaso ya dị ka ndị bụ́ ndị ohu nye mmehie na ọnwụ. Pọl kwuru na ‘Hega pụtara Saịnaị, bụ́ ugwu dị n’Arebia,’ n’ihi na e guzobere ọgbụgba ndụ Iwu ahụ n’ebe ahụ.—Ndị Galetia 3:10, 13; 4:25, NW.

Ishmael, bụ́ nwa Hega, na-ese onyinyo ndị Juu nke narị afọ mbụ, bụ́ ụmụ nke Jerusalem, ndị ka bụ ohu nye Iwu Mosis. Dị ka Ishmael si kpagbuo Aịsak, otú ahụ ka ndị Juu ahụ si kpagbuo ndị Kraịst, bụ́ ụmụ e tere mmanụ nke Sera ihe atụ ahụ, bụ́ “Jerusalem nke dị n’elu.” Dịkwa nnọọ ka Abraham si zilaga Hega na Ishmael, Jehova mesịrị jụ Jerusalem na ụmụ ya na-enupụ isi.—Matiu 23:37, 38.

[Foto dị na peeji nke 220]

Mgbe e mesịrị ya baptism, e ji mmụọ nsọ tee Jisọs mmanụ, Aịsaịa 54:1 malitekwara inwe mmezu ya kasị mkpa

[Foto dị na peeji nke 225]

Jehova zopụrụ ihu ya n’ebe Jerusalem nọ ruo “otu ntabi anya”

[Foto ndị dị na peeji nke 231]

Dike na onye ụzụ́ hà pụrụ imeri Onye Okike ha?

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya