Isi nke Iri na Itoolu
E Kpughee Omume Ihu Abụọ!
1. Olee otú Jisọs na Jehova si ele omume ihu abụọ anya, oleekwa ụzọ e si gosipụta ya n’oge Aịsaịa?
“UNU onwe unu na-egosikwa onwe unu nye mmadụ n’ìhè dị ka ndị ezi omume,” ka Jisọs gwara ndị ndú okpukpe nke oge ya, “ma n’ime unu jupụtara n’ihu abụọ na ihe na-emebi iwu.” (Matiu 23:28) Nkatọ Jisọs katọrọ omume ihe abụọ na-egosipụta echiche nke Nna ya nke eluigwe. Isi 58 nke amụma Aịsaịa lekwasịrị anya kpọmkwem n’omume ihu abụọ nke jupụtara na Juda. Esemokwu, mmegbu, na ime ihe ike juru ebe nile, idebe Ụbọchị Izu Ike aghọwokwa ememe na-enweghị isi. Ndị mmadụ na-ejere Jehova ozi nanị iji mejuo iwu, na-emekwa ka a sị na ha ji okpukpe kpọrọ ihe site n’ibu ọnụ nke na-esighị n’obi. Ka a sịkwa ihe mere Jehova ji gbaa ha ọtọ!
‘Gosi Ndị ahụ Mmehie Ha’
2. Mmụọ dị aṅaa ka Aịsaịa gosipụtara ka ọ na-akpọsa ozi Jehova, oleekwa ndị yiri ya taa?
2 Ọ bụ ezie na Jehova kpọrọ omume Juda asị, ihe ndị O kwuru na-agụnye arịrịọ sitere n’obi ka mba ahụ chegharịa. N’agbanyeghị nke ahụ, Jehova achọghị ka ịba mba ya ghara ido anya. N’ihi ya, o nyere Aịsaịa iwu, sị: “Were akpịrị kpọọ mkpu, egbochila, welie olu gị dị ka opi ike, wee gosi ndị m njehie ha, gosikwa ụlọ Jekọb mmehie ha.” (Aịsaịa 58:1) Iji anyaike na-akpọsa ihe Jehova kwuru pụrụ ime ka ndị ahụ wesoo Aịsaịa iwe, ma ọ laghị azụ n’ihi ụjọ. Ọ ka nwere otu mmụọ ahụ nke ịrara onwe ya nye bụ́ nke o gosipụtara mgbe ọ sịrị: “Lee m; ziga m.” (Aịsaịa 6:8) Lee ihe nlereanya magburu onwe ya nke ntachi obi Aịsaịa bụ nye Ndịàmà Jehova nke oge a, bụ́ ndi e nyekwara ọrụ ikwusa Okwu Chineke na ikpughe omume ihu abụọ nke okpukpe.—Abụ Ọma 118:6; 2 Timoti 4:1-5.
3, 4. (a) Olee omume ihu abụọ ndị nọ n’oge Aịsaịa na-eme? (b) Olee ọnọdụ dị n’ezie na Juda?
3 N’elu ọnụ, ndị nọ n’oge Aịsaịa na-achọ Jehova ma na-ekwupụta na ikpe ezi omume ya nile na-atọ ha ụtọ. Anyị na-agụ ihe Jehova kwuru, sị: “Mụ ka ha na-achọ kwa ụbọchị, ịmara ụzọ m nile na-atọkwa ha ụtọ: dị ka mba nke mere ezi omume, nke na-ahapụghịkwa ikpe nke Chineke ha, ha na-arịọ m ikpe nile nke ezi omume, ịbịaru Chineke nso na-atọ ha ụtọ.” (Aịsaịa 58:2) Ụtọ a ha sị na ụzọ Jehova na-atọ ha ò si ha n’obi? Ee e. Ha yiri “mba nke mere ezi omume,” ma oyiyi ahụ ha yiri ya abamighị ime. N’eziokwu, mba a ‘ahapụwo ikpe nke Chineke ha.’
4 Ọnọdụ ahụ yiri nnọọ nke e mesịrị kpugheere Ezikiel onye amụma. Jehova gwara Ezikiel na ndị Juu na-agwa ibe ha, sị: “Biko, bịanụ, nụrụ ihe bụ́ okwu a nke na-esi n’ọnụ Jehova pụta.” Ma Chineke dọrọ Ezikiel aka ná ntị banyere enweghị obi eziokwu ha: “Ha wee na-abịakwute gị . . . , ha na-anụkwa okwu gị nile, ma okwu gị ndị a ka ha na-emeghị: n’ihi na ịhụnanya hiri nne ka ndị ahụ ji ọnụ ha egosi, ma uru ha nke na-ezighị ezi ka obi ha na-ejeso. Ma, lee, ị dịịrị ha ka abụ nke ịhụnanya hiri nne, dị ka onye nwere olu mara mma, nke na-akpọkwa ụbọ nke ọma: n’ihi na ha anụwo okwu gị nile, ma ha adịghị eme ha.” (Ezikiel 33:30-32) Ndị ha na Aịsaịa dịkọrọ ndụ na-ekwukwa na ha na-achọ Jehova mgbe nile, ma ha adịghị erube isi n’okwu ya.
Ibu Ọnụ Ihu Abụọ
5. Olee otú ndị Juu si agbalị inweta ihu ọma Chineke, gịnịkwa bụ mmeghachi omume Jehova?
5 Ná mgbalị iji nweta ihu ọma Chineke, ndị Juu na-ebu ọnụ iji mejuo iwu, ma omume ha nke ime ka ha ji okpukpe kpọrọ ihe bụ nanị nkewapụ ka ọ na-ekewapụ ha n’ebe Jehova nọ. Ha na-ajụ n’ụzọ yiri ka ọ bụ n’ijuanya, sị: “N’ihi gịnị ka anyị buworo ọnụ, ma Ị hụghị? n’ihi gịnị ka anyị wedaworo mkpụrụ obi anyị n’ala, ma Ị dịghị ama?” Jehova na-aza n’ezoghị ọnụ, sị: “N’ụbọchị obubu ọnụ unu unu na-achọpụta ihe na-atọ unu ụtọ, ọ bụkwa ihe nile nke pụtara ná ndọgbu ndị ọrụ unu na-adọgbu onwe ha n’ọrụ ka unu na-anara n’ihe ike. Lee, ọ bụ n’ihi iseokwu na ịlụ ọgụ ka unu na-ebu ọnụ, ya na iwere ọkpọ nke mmebi iwu tigbuo: unu adịghị ebu ọnụ dị ka taa ime ka a nụrụ olu unu n’elu. Ọ̀ bụ dị ka nke a ka obubu ọnụ nke M na-ahọpụta bụ? bụ́ ụbọchị mmadụ ga-eweda mkpụrụ obi ya n’ala? Ọ̀ bụ ihuda isi ya n’ala dị ka amị, na ịgbasa ákwà mkpe na ntụ n’okpuru ya? ọ̀ bụ nke a ka ị ga-akpọ obubu ọnụ na ụbọchị na-atọ Jehova ụtọ?”—Aịsaịa 58:3-5.
6. Ihe dịgasị aṅaa ndị Juu na-eme na-egosi na ibu ọnụ ha bụ omume ihu abụọ?
6 Ka ha nọ na-ebu ọnụ, na-eme ka ha bụ ndị ezi omume, ọbụnakwa na-arịọ maka ikpe ezi omume Jehova, ndị ahụ na-achụso ihe ụtọ onwe ha nanị na atụmatụ achụmnta ego ha. Ha na-etinye aka n’esemokwu, mmegbu, na ime ihe ike. Ná mgbalị ikpuchi àgwà ha, ha na-eme oké ngosi nke iru újú—na-ehuda isi ha n’ala dị ka amị, yirikwa ákwà mkpe ma nọrọ ná ntụ—n’ihe yiri ka ọ bụ nchegharị n’ihi mmehie ha. Olee uru ihe a nile bara ma ha nọgide na-enupụ isi? Ha adịtụghị egosi mwute na nchegharị n’ụzọ nke Chineke bụ́ ndị e kwesịrị ijikọta ha na ibu ọnụ sitere n’obi eziokwu. A dịghị anụ iti mkpu ha—ọ bụ ezie na ọ na-adasi ụda ike—n’eluigwe.
7. Olee otú ndị Juu nke oge Jisọs si mee omume ihu abụọ, oleekwa otú ọtụtụ ndị taa si eme otu ihe ahụ?
7 Ndị Juu nọ n’oge Jisọs mekwara ngosi dị otú ahụ nke ibu ọnụ mmeju iwu, ụfọdụ na-emekwa ya ugboro abụọ n’izu! (Matiu 6:16-18; Luk 18:11, 12) Ọtụtụ n’ime ndị ndú okpukpe ṅomikwara ndị dịrị ndụ n’oge Aịsaịa n’inwe obi ọjọọ na ịchị n’aka ike. N’ihi ya, Jisọs ji obi ike gbaa ndị okpukpe ahụ bụ́ ndị ihu abụọ ọtọ, na-agwa ha na ụdị ofufe ha enweghị isi. (Matiu 15:7-9) Taakwa, ọtụtụ nde mmadụ “na-ekwupụta [n’ihu ọha] na ha matara Chineke; ma ọrụ nile ha ka ha ji gọnahụ Ya, ebe ha bụ ihe arụ, ndị na-adịghị ekwenyekwa, bụrụkwa ndị a jụrụ ajụ n’ebe ezi ọrụ nile ọ bụla dị.” (Taịtọs 1:16) Ndị dị otú ahụ pụrụ ịtụ anya ebere Chineke, ma omume ha na-ekpughe enweghị obi eziokwu ha. N’ụzọ dị iche na nke ahụ, Ndịàmà Jehova na-egosipụta ezi nsọpụrụ Chineke na ezi ịhụnanya ụmụnna.—Jọn 13:35.
Ihe Ezi Nchegharị Na-agụnye
8, 9. Omume dịgasị aṅaa doro anya ka a na-aghaghị ijikọta ha na ezi nchegharị?
8 Jehova chọrọ ka ndị ya mee ihe karịrị ibu ọnụ maka mmehie ha; ọ chọrọ ka ha chegharịa. Ọ bụ mgbe ahụ ka ha ga-enweta ihu ọma ya. (Ezikiel 18:23, 32) Ọ na-akọwa na ka o wee nwee isi, a ghaghị ijikọta ibu ọnụ na imezi mmehie ndị e mere n’oge gara aga. Tụlee ajụjụ ndị e ji enyocha obi Jehova jụrụ: “Ọ́ bụghị nke a bụ obubu ọnụ M na-ahọpụta? ịtọpụ agbụ nile nke mmebi iwu, ịtọsa ihe okike nile nke yoke, na izilaga ndị a na-emegbu emegbu ka ha nwere onwe ha, ka unu tijiekwa yoke ọ bụla?”—Aịsaịa 58:6.
9 Agbụ na yoke bụcha ihe atụ dabara adaba nke ịbụ onye e ji eji n’ụzọ obi ọjọọ. Ya mere kama ịdị na-ebu ọnụ ma n’otu mgbe ahụ na-emegbu ndị kwere ekwe ibe ha, ndị ahụ kwesịrị irube isi n’iwu bụ́: “Hụ mmadụ ibe gị n’anya dị ka onwe gị.” (Levitikọs 19:18) Ha kwesịrị ịtọhapụ ndị nile ha megbuworo ma gbaa ohu n’ụzọ na-ezighị ezi.a Ihe omume okpukpe e ji eme ngosi, dị ka ibu ọnụ, abụghị ihe iji dochie anya nsọpụrụ Chineke na omume ndị na-egosi ịhụnanya ụmụnna. Onye ya na Aịsaịa dịkọrọ ndụ, bụ́ Maịka onye amụma, na-ede, sị: “Gịnị ka Jehova na-achọ n’aka gị, ma ọ́ bụghị nanị ime ihe e kpere n’ikpe, na ịhụ ebere n’anya, na iji obi umeala soro Chineke gị na-eje ije?”—Maịka 6:8.
10, 11. (a) Nye ndị Juu, gịnị ga-adị mma karịa ibu ọnụ? (b) Olee otú ndị Kraịst taa pụrụ isi tinye ndụmọdụ Jehova nyere ndị Juu n’ọrụ?
10 Ikpe ziri ezi, obiọma, na ịdị obi umeala na-achọ ka a na-emere ndị ọzọ ihe ọma, nke bụ́ isi ihe dị n’Iwu Jehova. (Matiu 7:12) Ha iso ndị nọ ná mkpa na-ekerịta ihe onwunwe ha dị nnọọ mma karịa ibu ọnụ. Jehova na-ajụ, sị: “Ọ́ bụgḥi ikesara onye agụụ na-agụ nri gị [bụ ibu ọnụ m nwere mmasị na ya karị], ka i meekwa ndị e wedara n’ala ndị na-awagharị awagharị ka ha bata n’ụlọ gị? mgbe ị hụrụ onye gba ọtọ, ka i kpuchie ya: ka ị gharakwa izonahụ onye ahụ gị onwe gị?” (Aịsaịa 58:7) Ee, kama ịdị na-eme ngosi nke ibu ọnụ, ndị nwere ihe kwesịrị inye ndị ha na ha bi na Juda—ndị bụ́ anụ ahụ ha, ndị nọ ná mkpa—ihe oriri, uwe ma ọ bụ ụlọ.
11 Ụkpụrụ ndị a mara mma nke ịhụnanya ụmụnna na ọmịiko, ndị Jehova kwupụtara, abụghị nanị ndị Juu nọ n’oge Aịsaịa ka ọ na-emetụta. Ha bụkwa ihe nduzi nye ndị Kraịst. N’ihi ya, Pọl onyeozi dere, sị: “Ya mere otú a, otú anyị nwere oge, ka anyị na-arụ ezi ihe n’ebe mmadụ nile nọ, ma ka anyị na-arụ ezi ihe karịsịa n’ebe ndị ezinụlọ nke okwukwe anyị nọ.” (Ndị Galetia 6:10) Ọgbakọ ndị Kraịst aghaghị ịbụ ebe ịhụnanya na mmetụta ịhụnanya ụmụnna jupụtara, karịsịa n’ihi oge na-adịwanye egwu anyị na-ebi n’ime ya.—2 Timoti 3:1; Jemes 1:27.
Nrubeisi Na-eweta Ngọzi Bara Ụba
12. Gịnị ka Jehova ga-eme ma ọ bụrụ na ndị ya erubere ya isi?
12 A sị nnọọ na ndị Jehova ga-enwe nghọta wee ṅaa ntị n’ịdọ aka ná ntị ịhụnanya ya! Jehova na-ekwu, sị: “Mgbe ahụ ka ìhè gị ga-awapụta dị ka ụtụtụ, anụ ahụ ọhụrụ ga-ekpuchikwa n’ahụ gị ngwa ngwa: ezi omume gị ga-agakwa n’ihu gị: nsọpụrụ Jehova ga-aga n’azụ gị. Mgbe ahụ ka ị ga-akpọ òkù, Jehova ga-azakwa; ị ga-etiku Ya, Ọ ga-asịkwa, Lekwa m.” (Aịsaịa 58:8, 9a) Lee okwu ịhụnanya, ndị dị ụtọ ha bụ! Jehova na-agọzi ma na-echebe ndị obiọma ịhụnanya na ezi omume na-atọ ụtọ. Ọ bụrụ na ndị Jehova echegharịa n’obi ọjọọ na n’omume ihu abụọ ha ma rubere ya isi, ihe ga-akara ha mma. Jehova ga-eme ka ‘anụ ahụ ọhụrụ kpuchie ahụ ha,’ mgbake anụ ahụ na nke ime mmụọ nye mba ahụ. Ọ ga-echebekwa ha, dị ka o chebere ndị nna nna ha mgbe ha si n’Ijipt na-apụ. Ọ ga-azakwa mkpu enyemaka ha ozugbo.—Ọpụpụ 14:19, 20, 31.
13. Ngọzi dịgasị aṅaa na-echere ndị Juu ma ọ bụrụ na ha ṅaa ntị n’agbamume Jehova?
13 Ugbu a Jehova na-atụkwasị ihe n’agbamume o nyere na mbụ, na-asị: “Ọ bụrụ na i si n’etiti gị wezụga yoke ahụ [nke ịgba ohu na-ezighị ezi, nke obi ọjọọ], na nsetịpụ mkpịsị aka [ikekwe n’ịkwa emo ma ọ bụ n’ebubo ụgha], na ikwu ajọ ihe; ọ bụrụkwa na i wepụtara onye agụụ na-agụ ihe mkpụrụ obi gị chọrọ, ọ bụrụ na i mee ka afọ ju mkpụrụ obi e wedara n’ala; ìhè gị ga-awa n’ime ọchịchịrị, oké ọchịchịrị gị ga-adịkwa ka etiti ehihie.” (Aịsaịa 58:9b, 10) Ịchọ ọdịmma onwe onye nanị na obi ọjọọ na-emebi ihe, na-akpatakwa ọnụma Jehova. Otú ọ dị, obiọma na mmesapụ aka, karịsịa mgbe e gosiri ha ndị agụụ ji na ndị e wedara n’ala, na-eweta ngọzi bara ụba nke Chineke. A sị nnọọ na ndị Juu ga-eburu eziokwu ndị a n’obi! Mgbe ahụ mgbukepụ ha na ọganihu ime mmụọ ha ga-eme ka ha na-enwu dị ka anyanwụ nke etiti ehihie, na-achụpụ ọchịchịrị ọ bụla. Karịsịa, ha ga-ewetara Jehova, bụ́ Isi Iyi nke ebube na ngọzi ha, nsọpụrụ na otuto.—1 Ndị Eze 8:41-43.
Mba E Weghachiri Eweghachi
14. (a) Olee otú ndị ha na Aịsaịa dịkọrọ ndụ si meghachi omume n’ihe ndị o kwuru? (b) Gịnị ka Jehova nọgidere na-enye?
14 N’ụzọ dị mwute, mba ahụ leghaara arịrịọ Jehova anya, ọbụnakwa bamikwuo n’ajọ omume. N’ikpeazụ, ọ dịghị ihe ọzọ Jehova ga-eme ma ọ bụghị ime ka ha jee biri n’ala ọzọ, dị ka ọ dọrọ aka ná ntị. (Deuterọnọmi 28:15, 36, 37, 64, 65) N’agbanyeghị nke ahụ, ihe ọzọ Jehova kwuru site n’ọnụ Aịsaịa nọgidere na-enye olileanya. Chineke na-ebu amụma na ihe fọdụrụnụ, bụ́ ndị naara ịdọ aka ná ntị, ndị chegharịrịnụ, ga-eji ọṅụ laghachi n’ala Juda, ọ bụ ezie na ọ tọgbọrọ chakoo.
15. Mweghachi dị aṅaa na-enye ọṅụ ka Jehova na-ebu amụma banyere ya?
15 N’izo aka ná mweghachi nke ndị ya na 537 T.O.A., Jehova, site n’ọnụ Aịsaịa na-ekwu, sị: “Jehova ga na-edukwa gị mgbe nile, mee ka afọ ju mkpụrụ obi gị n’ebe nile kpọrọ nkụ, Ọ ga-emekwa ka ọkpụkpụ gị nile dị ike; ị ga-adịkwa [ka] ubi a gbara ogige nke dere mmiri nke ọma, dịkwa ka ebe mmiri na-asụpụta [“isi iyi,” The New English Bible] nke mmiri ya na-adịghị ata ata [“agha ụgha,” NW].” (Aịsaịa 58:11) Jehova ga-eme ka ala Israel nke kpọrọ nkụ ghọghachi nke na-emepụta nri n’ụba. N’ụzọ dị ebube karị, ọ ga-agọzi ndị ya nwere nchegharị, mee ka “ọkpụkpụ” ha dị ndụ site n’ịbụ nke nwụrụ anwụ n’ụzọ ime mmụọ gaa n’ịbụ nke nwere ike dị ukwuu. (Ezikiel 37:1-14) Ndị ahụ n’onwe ha ga-adịzi ka “ubi a gbara ogige nke dere mmiri nke ọma,” nke jupụtara ná mkpụrụ ime mmụọ.
16. Olee otú a ga-esi weghachi ala ahụ?
16 Mweghachi ga-agụnye iwughachi obodo dị iche iche ndị Babilọn ahụ wakporo ha bibiri na 607 T.O.A. “Ndị ga-esi n’ahụ gị pụta ga-ewukwa ebe nile bụ́ mkpọmkpọ ebe site na mgbe ebighị ebi gara aga: ntọala nke ọtụtụ ọgbọ ka ị ga-ewuli; a ga-akpọkwa gị Onye mmechi ntipu, Onye nkwazi okporo ụzọ ibi ebi.” (Aịsaịa 58:12) Okwu ndị yiri onwe ha, ndị bụ́ “ebe nile bụ́ mkpọmkpọ ebe site na mgbe ebighị ebi” na “ntọala nke ọtụtụ ọgbọ” (ma ọ bụ, ntọala ndị nọworo na-abụ mkpọmkpọ ebe kemgbe ọtụtụ ọgbọ) na-egosi na ihe ahụ fọdụrụ e mere ka ha laghachi ga-ewughachi obodo Juda ndị e bibiri ebibi, karịsịa Jerusalem. (Nehemaịa 2:5; 12:27; Aịsaịa 44:28) Ha ga-emechi “ntipu”—okwu a na-akapịghị ọnụ nke na-ezo aka ná ntipu dị iche iche dị ná mgbidi Jerusalem, nke ihe ịrụ ụka na-adịghịkwa ya na ọ dị ná mgbidi nke obodo ndị ọzọ.—Jeremaịa 31:38-40; Emọs 9:14.
Ngọzi Ndị Na-abịa Site n’Idebe Ụbọchị Izu Ike Mgbe Nile
17. Olee otú Jehova si rịọ ndị ya ka ha debe iwu Ụbọchị Izu Ike?
17 Ụbọchị Izu Ike bụ ngosipụta nke oké nchegbu Chineke nwere maka ọdịmma anụ ahụ na nke ime mmụọ nke ndị ya. Jisọs kwuru, sị: “E mere ụbọchị izu ike n’ihi mmadụ.” (Mak 2:27) Ụbọchị a nke Jehova doro nsọ nyere ndị Israel ohere pụrụ iche igosipụta ịhụnanya ha n’ebe Chineke nọ. N’ụzọ dị mwute, mgbe ọ na-erule n’oge Aịsaịa ọ ghọọla nanị ụbọchị ime ememe na-enweghị isi na imeju ọchịchọ ọdịmma onwe onye nanị. Ya mere, ọzọkwa, Jehova nwere ihe mere ọ ga-eji baara ndị ya mba. Ọzọkwa, ọ gbalịrị iru n’obi ha. Ọ na-ekwu, sị: “Ọ bụrụ na i mee ka ụkwụ gị si n’ụbọchị izu ike chigharịa, i wee ghara ime ihe na-atọ gị ụtọ n’ụbọchị nsọ m; ọ bụrụkwa na ị kpọọ ụbọchị izu ike ihe ụtọ, ị kpọọkwa ihe nsọ nke Jehova ihe nsọpụrụ; i wee sọpụrụ ya, ghara ime ihe bụ ụzọ gị nile, ghara ịchọpụta ihe na-atọ gị ụtọ ma ọ bụ ikwu okwu nke aka gị: mgbe ahụ ihe Jehova ga-atọ gị ụtọ; M ga-emekwa ka ị nọkwasị ebe nile dị elu nke ụwa dị ka ịnyịnya; M ga-emekwa ka i rie ihe nketa nke Jekọb, bụ́ nna gị: n’ihi na ọnụ Jehova ekwuwo.”—Aịsaịa 58:13, 14.
18. Gịnị ga-esi ná nsọpụrụ Juda na-asọpụrụghị Ụbọchị Izu Ike pụta?
18 Ụbọchị Izu Ike bụ ụbọchị itinye uche n’ihe ime mmụọ, ekpere, na ofufe ezinụlọ. O kwesịrị inyere ndị Juu aka ịtụgharị uche n’oké ọrụ ndị Jehova rụrụ n’ihi ha nakwa n’ikpe ziri ezi na ịhụnanya ndị pụtara ìhè n’Iwu ya. N’ihi ya, idebe ụbọcḥi a dị nsọ mgbe nile kwesịrị inyere ndị ahụ aka ịbịakwu Chineke ha nso. Kama nke ahụ, ha na-emetọ Ụbọchị Izu Ike, n’ihi ya kwa, ha nọ n’ihe ize ndụ nke ịbụ ndị na-agaghị enwetakwa ngọzi Jehova.—Levitikọs 26:34; 2 Ihe E Mere 36:21.
19. Ngọzi dịgasị aṅaa bara ụba na-echere ndị Chineke ma ha malite idebe Ụbọchị Izu Ike ahụ?
19 N’agbanyeghị nke ahụ, ọ bụrụ na ndị Juu amụta ihe site n’ịdọ aka ná ntị ahụ wee malite ịsọpụrụ ndokwa Ụbọchị Izu Ike, ngọzi bara ụba na-echere ha. Ezi ihe ndị ga-esi n’ezi ofufe nakwa ịkwanyere Ụbọchị Izu Ike ùgwù pụta ga-emetụta akụkụ nile nke ndụ ha. (Deuterọnọmi 28:1-13; Abụ Ọma 19:7-11) Dị ka ihe atụ, Jehova ga-eme ka ndị ya “nọkwasị [n’ebe] nile dị elu nke ụwa.” Okwu a na-egosi ịnọ ná nchebe na mmadụ imeri ndị iro ya. Onye ọ bụla ọ bụ ya nwe ebe ndị dị elu—ugwu dị iche iche—bụ ya nwe ala ahụ. (Deuterọnọmi 32:13; 33:29) N’otu oge, Israel rubeere Jehova isi, mba ahụ nwetakwara nchebe ya ma bụrụ nke mba ndị ọzọ kwanyeere ùgwù, ọbụna na-atụ ụjọ. (Joshua 2:9-11; 1 Ndị Eze 4:20, 21) Ọ bụrụ na ha ejiri nrubeisi chigharịkwuru Jehova ọzọ, ha ga-enwetaghachi ụfọdụ n’ime ebube mbụ ahụ. Jehova ga-enye ndị ya òkè zuru ezu ‘n’ihe nketa nke Jekọb’—ngọzi ndị o kwere ná nkwa site n’ọgbụgba ndụ nke Ya na ndị nna nna ha, karịsịa ngọzi nke ijigidesi Ala Nkwa ahụ ike.—Abụ Ọma 105:8-11.
20. Olee “idebe ụbọchị izu ike” nke dịịrị ndị Kraịst?
20 Ọ̀ dị ihe ndị Kraịst pụrụ ịmụta site na nke a? Mgbe Jisọs Kraịst nwụrụ, a kagburu Iwu Mosis, gụnyere iwu Ụbọchị Izu Ike ya. (Ndị Kọlọsi 2:16, 17) Otú ọ dị, mmụọ e kwesịrị ịkpasuworị n’ime Juda site n’idebe Ụbọchị Izu Ike ahụ—ibute ihe ime mmụọ ụzọ na ịbịaru Jehova nso—ka dị oké mkpa nye ndị na-efe Jehova ofufe. (Matiu 6:33; Jemes 4:8) Ọzọkwa, Pọl, n’akwụkwọ ozi o degaara ndị Hibru, kwuru sị: “Idebe ụbọchị izu ike fọdụụrụ ndị nke Chineke.” Ndị Kraịst na-abanye ‘n’ụbọchị izu ike’ a site n’irubere Jehova isi na ime ezi omume nke dabeere n’okwukwe e nwere n’ọbara Jisọs Kraịst a wụsịrị awụsị. (Ndị Hibru 3:12, 18, 19; 4:6, 9-11, 14-16) Nye ndị Kraịst, a na-edebe ụbọchị izu ike dị otú a ọ bụghị nanị otu ụbọchị n’ime izu, kama kwa ụbọchị.—Ndị Kọlọsi 3:23, 24.
Israel Ime Mmụọ ‘Anọkwasị n’Ebe Ndị Dị Elu nke Ụwa’
21, 22. N’ụzọ dị aṅaa ka Jehova siworo mee ka Israel nke Chineke “nọkwasị [n’ebe] nile dị elu nke ụwa”?
21 Kemgbe a tọhapụrụ ha ná ndọrọ n’agha nke Babilọn na 1919, ndị Kraịst e tere mmanụ ejiriwo ikwesị ntụkwasị obi na-edebe ihe Ụbọchị Izu Ike ahụ sere onyinyo ya. N’ihi ya, Jehova emewo ka ha “nọkwasị [n’ebe] nile dị elu nke ụwa.” N’ụzọ dị aṅaa? Laa azụ na 1513 T.O.A., Jehova sooro ụmụ Abraham gbaa ndụ na ọ bụrụ na ha erube isi, ha ga-aghọ alaeze nke ndị nchụàjà na mba dị nsọ. (Ọpụpụ 19:5, 6) N’ime afọ 40 ahụ dum ha nọrọ n’ọzara, Jehova nọ na-ebu ha n’enweghị nsogbu, dị ka ugo si ebu ụmụ ọhụrụ ya, jirikwa ụba ihe onwunwe gọzie ha. (Deuterọnọmi 32:10-12) Otú ọ dị, mba ahụ enweghị okwukwe, n’ikpeazụkwa ihe ùgwù nile ha gaara enweta funahụrụ ha. N’agbanyeghị nke ahụ, Jehova nwere alaeze nke ndị nchụàjà taa. Ọ bụ Israel ime mmụọ nke Chineke.—Ndị Galetia 6:16; 1 Pita 2:9.
22 Na ‘mgbe ọgwụgwụ’ a, mba ime mmụọ a emewo ihe Israel oge ochie na-emeghị. Ha anọgidewo na-enwe okwukwe n’ebe Jehova nọ. (Daniel 8:17) Ka ndị so na ya na-edebesi ụkpụrụ na ụzọ Jehova ndị dị elu ike, Jehova na-ebuli ha elu n’ụzọ ime mmụọ. (Ilu 4:4, 5, 8; Mkpughe 11:12) N’ịbụ ndị e chebere pụọ n’adịghị ọcha ndị gbara ha gburugburu, ha nwere ụzọ ndụ dị elu, kamakwa ịgba isi akwara na-agbaso ụzọ nke aka ha, ihe ‘Jehova [nakwa Okwu ya] na-atọ ha ụtọ.’ (Abụ Ọma 37:4) Jehova echebewo ha n’ụzọ ime mmụọ n’agbanyeghị mmegide siri ike n’ụwa nile. Kemgbe 1919, a wakpobeghị “ala” ime mmụọ ha. (Aịsaịa 66:8) Ha anọgidewo na-abụ ndị dịịrị aha ya dị elu, bụ́ nke ha ji ọṅụ na-akpọsa n’ụwa nile. (Deuterọnọmi 32:3; Ọrụ 15:14) Ọzọkwa, ọnụ ọgụgụ na-ebuwanye ibu nke ndị dị nwayọọ n’obi, ndị sitere ná mba nile, so ha na-ekere òkè ugbu a n’oké ihe ùgwù nke ịbụ ndị a na-akụziri ụzọ Jehova na ịbụ ndị a na-enyere aka ije ije n’ụzọ ya.
23. Olee otú Jehova siworo mee ka ndị ohu ya e tere mmanụ “rie ihe nketa nke Jekọb”?
23 Jehova emewo ka ndị ohu ya e tere mmanụ “rie ihe nketa nke Jekọb.” Mgbe Aịsak gọziri Jekọb kama ịgọzi Isọ, ihe nna ochie ahụ kwuru buru amụma ngọzi nye ndị nile ga-egosi okwukwe ná Mkpụrụ Abraham ahụ e kwere ná nkwa. (Jenesis 27:27-29; Ndị Galetia 3:16, 17) Dị ka Jekọb—n’adịghịkwa ka Isọ—ndị Kraịst e tere mmanụ na ndị ibe ha ‘na-eji ihe ndị dị nsọ akpọrọ ihe,’ karịsịa nri ime mmụọ Chineke na-enye n’ụba. (Ndị Hibru 12:16, 17, NW; Matiu 4:4) Nri ime mmụọ a—nke na-agụnye ịmata ihe Jehova na-arụzu site n’aka Mkpụrụ ahụ e kwere ná nkwa nakwa ndị òtù nke Mkpụrụ ahụ—bụ ihe na-ewusi ike, nke na-enye ume, na nke dị oké mkpa maka ndụ ha n’ụzọ ime mmụọ. N’ihi ya, ọ dị oké mkpa na ha na-eri nri ime mmụọ mgbe nile site n’ịgụ na ịtụgharị uche n’Okwu Chineke. (Abụ Ọma 1:1-3) Ọ dị nnọọ mkpa na ha so ndị kwere ekwe ibe ha na-akpakọrịta ná nzukọ ndị Kraịst. Ọ dịkwa mkpa na ha jigidere ụkpụrụ ndị dị elu nke ofufe dị ọcha ka ha ji ọṅụ soro ndị ọzọ na-ekerịta ihe oriri ahụ.
24. Olee otú ezi ndị Kraịst taa si eme omume?
24 Ka ha ji oké mmasị na-echere mmezu nke nkwa dị iche iche nke Jehova, ka ezi ndị Kraịst nọgide na-ajụ ụdị omume ihu abụọ nile. N’ịbụ ndị ‘na-eri ihe nketa nke Jekọb,’ ka ha nọgide na-enwe nchebe ime mmụọ ‘n’elu ebe nile dị elu nke ụwa.’
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
a Jehova mere ndokwa ka ndị ya bụ́ ndị dabara n’ụgwọ renye onwe ha n’ịbụ ohu—n’ụzọ bụ́ isi na-aghọ ndị ọrụ e goro ego—iji kwụchapụ ụgwọ ha ji. (Levitikọs 25:39-43) Otú ọ dị, Iwu ahụ kwuru ka a na-emeso ndị ohu ihe n’obiọma. A ga-atọhapụ ndị e ji obi ọjọọ mesoo ihe.—Ọpụpụ 21:2, 3, 26, 27; Deuterọnọmi 15:12-15.
[Foto dị na peeji nke 278]
Ndị Juu buru ọnụ ma hudaa isi ha n’ala ná nchegharị na-esighị ha n’obi—ma ha agbanweghị ụzọ ha
[Foto dị na peeji nke 283]
Ndị nwere ihe na-enye ndị nọ ná mkpa ụlọ, uwe, ma ọ bụ ihe oriri
[Foto dị na peeji nke 283]
Ọ bụrụ na Juda echegharịa, ọ ga-ewughachi obodo ya ndị e bibiri ebibi