Isi nke Iri Abụọ
Aka Jehova Adịghị Mkpụmkpụ
1. Olee ọnọdụ dị na Juda, gịnịkwa ka ọtụtụ ndị na-eche?
MBA Juda na-ekwu na ha na Jehova nọ ná mmekọrịta ọgbụgba ndụ. N’agbanyeghị nke ahụ, nsogbu juru ebe nile. Ikpe ziri ezi adịghị, mpụ na mmegbu juru ebe nile, olileanya e nwere na ihe ga-aka mma na-akụkwa afọ n’ala. Ọ dị nnọọ ihe na-agahie agahie. Ọtụtụ ndị na-eche ma Jehova ọ̀ ga-anọkatakwa dozie ọnọdụ ahụ. Nke a bụ ọnọdụ dị n’oge Aịsaịa. Ma ihe ndekọ Aịsaịa banyere oge a abụghị nanị akụkọ ihe ndị mere n’oge ochie. Ihe ndị o kwuru nwere ịdọ aka ná ntị amụma nye onye ọ bụla nke na-ekwu na ya na-efe Chineke ma na-eleghara iwu Ya anya. Amụma ahụ nke sitekwara n’ike mmụọ nsọ, nke e deturu n’Aịsaịa isi 59 na-enye ndị nile na-agbalịsi ike ijere Jehova ozi n’agbanyeghị na ha na-ebi n’oge ndị siri ike, ndị dịkwa ize ndụ, agbamume obiọma.
Ndị E Kewapụrụ n’Ebe Ezi Chineke ahụ Nọ
2, 3. N’ihi gịnị ka Jehova na-ejighị echebe Juda?
2 Cheedị nnọọ echiche—ndị ha na Jehova nọ n’ọgbụgba ndụ esiwo n’ezi ofufe dapụ! Ha agbakụtawo Onye Mere ha azụ, si otú a wezụga onwe ha n’okpuru aka nchebe ya. N’ihi nke a, ha nọ ná nnukwute nsogbu. Hà na-ekwu, ma eleghị anya, na ọ bụ Jehova kpatara ihe isi ike ha? Aịsaịa gwara ha, sị: “Lee, aka Jehova adịghị mkpụmkpụ karị ịzọpụta; ntị Ya adịghịkwa arọ karị ịnụ ihe: kama ajọ omume nile unu aghọwo ihe na-akpa ókè n’etiti unu na Chineke unu, mmehie nile unu ezonahụwokwa unu ihu Ya, O wee ghara ịnụ.”—Aịsaịa 59:1, 2.
3 E kwuru okwu ndị ahụ n’ezoghị ọnụ ma ha bụ eziokwu. Jehova ka bụ Chineke nke nzọpụta. Dị ka “Onye na-anụ ekpere,” ọ na-ege ntị n’ekpere nke ndị ohu ya kwesịrị ntụkwasị obi. (Abụ Ọma 65:2) Otú ọ dị, ọ dịghị agọzi ndị ajọ omume. Ọ bụ ndị ahụ n’onwe ha kpatara nkewapụ e kewapụrụ ha n’ebe Jehova nọ. Ajọ omume ha emewo ka o zonahụ ha ihu ya.
4. Ebubo dịgasị aṅaa ka e boro Juda?
4 Nke bụ́ eziokwu bụ na Juda enweela ihe ndekọ jọgburu onwe ya. Amụma Aịsaịa kwupụtara ụfọdụ n’ime ebubo ndị e boro ha: “E jiwo ọbara merụọ aka unu, e jiwokwa ajọ omume merụọ mkpịsị aka unu; egbugbere ọnụ unu ekwuwo okwu ụgha, ire unu na-atamu ajọ ihe.” (Aịsaịa 59:3) Ndị ahụ na-agha ụgha, na-ekwukwa okwu ọjọọ. Aka ahụ e zoro ‘n’aka e ji ọbara merụọ’ na-egosi na ụfọdụ ọbụna egbuwo ọchụ. Lee asọpụrụghị Chineke ọ bụ, bụ́ onye Iwu ya machibidoro, ọ bụghị nanị igbu ọchụ, kama ọ machibidokwara ‘ịkpọ nwanne gị asị n’ime obi gị’! (Levitikọs 19:17) Ime mmehie a na-achịkwaghị achịkwa nke ndị bi na Juda na ihe a na-apụghị izere ezere si na ya pụta kwesịrị ichetara onye ọ bụla n’ime anyị taa na ọ dị anyị mkpa ịchịkwa echiche na mmetụta ọjọọ. Ma ọ́ bụghị ya, anyị pụrụ ime ihe ọjọọ ndị ga-ekewapụ anyị n’ebe Chineke nọ.—Ndị Rom 12:9; Ndị Galetia 5:15; Jemes 1:14, 15.
5. N’ókè ha aṅaa ka ịrụ arụ nke Juda ruworo?
5 Ọrịa mmehie ejidewo mba ahụ dum. Amụma ahụ na-ekwu, sị: “Ọ dịghị onye na-akpọ mmadụ eje ikpe n’ezi omume, ọ dịghịkwa onye na-eji ikwesị ntụkwasị obi eje ikpe: ha na-atụkwasị obi n’ihe tọgbọrọ n’efu, ha na-ekwukwa okwu ụgha; ha na-atụrụ ime ọnọdụ ọjọọ, mụọ ajọ ihe.” (Aịsaịa 59:4) Ọ dịghị onye na-ekwu okwu ezi omume. Ọbụna n’ụlọikpe, o siri ike ịhụ onye a pụrụ ịdabere n’ebe ọ nọ ma ọ bụ onye kwesịrị ntụkwasị obi. Juda agbakụtawo Jehova azụ ma tụkwasị obi ná njikọ aka nke ya na mba ndị ọzọ, ọbụna n’arụsị ndị na-adịghị ndụ. Ihe ndị a nile bụ ‘ihe tọgbọrọ n’efu,’ nke na-abaghị uru ọ bụla. (Aịsaịa 40:17, 23; 41:29) N’ihi ya, ha na-agba ọtụtụ izu, ma ha nile adịghị nke nwere isi. Ha na-eme atụmatụ dị iche iche, ma ihe na-esi na ha apụta bụ nsogbu na mmegbu.
6. Olee otú ihe ndekọ Krisendọm si yie nke Juda?
6 Ajọ omume na ime ihe ike nke dị na Juda yiri nnọọ nke dị na Krisendọm. (Lee “Jerusalem nke Si n’Ezi Ofufe Dapụ—Ihe Ya na Krisendọm Yiri,” na peeji nke 294.) A lụwo agha ụwa abụọ kpụ ọkụ n’ọnụ, na-agụnye mba ndị a sị na ha bụ ndị Kraịst. Ruo ugbu a, ụdị okpukpe nke Krisendọm enwebeghị ike ịkwụsị n’etiti ndị òtù ya mkpocha agbụrụ nakwa agbụrụ dị iche iche igburịta onwe ha. (2 Timoti 3:5) Ọ bụ ezie na Jisọs kụziiri ụmụazụ ya ka ha tụkwasị obi n’Alaeze Chineke, mba dị iche iche nke Krisendọm anọgidewo na-adabere ná ngwá agha nakwa ná njikọ aka ọchịchị maka nchebe. (Matiu 6:10) N’ezie, ihe ka ukwuu ná ndị kasị akpụpụta ngwá agha n’ụwa nọ ná mba ndị nke Krisendọm! Ee, mgbe Krisendọm tụkwasịrị obi ná mgbalị nakwa n’òtù dị iche iche nke ụmụ mmadụ maka ọdịnihu e ji n’aka, ya onwe ya kwa na-atụkwasị obi “n’ihe tọgbọrọ n’efu.”
Inweta Ajọ Ihe Ndị Si na Ya Pụta
7. N’ihi gịni ka atụmatụ dị iche iche nke Juda ji na-arụpụta nanị ihe ọjọọ?
7 Ikpere arụsị na emeghị ihe n’eziokwu apụghị ime ka e nwee ọha mmadụ dị mma. N’ihi itinye aka n’ụdị ihe ndị ahụ, ugbu a ndị Juu ahụ na-ekwesịghị ntụkwasị obi na-aghọrọ nsogbu ndị ha ji aka ha kụọ, dị ka mkpụrụ. Anyị na-agụ, sị: “Àkwá ubí ka ha bụworo, ọ bụkwa ụlọ ududo ka ha na-atụ: onye ahụ nke na-eri àkwá ha ga-anwụ, ọzọ, nke a na-azọpịa ga-agbawapụta ajụala.” (Aịsaịa 59:5) Malite mgbe e chepụtara ya ruo mgbe e mezuru ya, atụmatụ dị iche iche nke Juda enweghị oké ihe ha na-arụpụta. Echiche ha na-ezighị ezi na-arụpụta nanị ihe ọjọọ, dị nnọọ ka àkwá ubí si ewepụta nanị ubí. Mba ahụ na-atakwa ahụhụ.
8. Gịnị na-egosipụta ụzọ iche echiche gbagọrọ agbagọ nke Juda?
8 Ụfọdụ n’ime ndị bi na Juda pụrụ imewe ihe ike ná mgbalị iji chebe onwe ha, ma ha ga-akụ afọ n’ala. A pụghị iji ime ihe ike dochie ịtụkwasị Jehova obi na ọrụ ezi omume dị ka ihe nchebe dịkwa ka a na-apụghị iji ọnyà ududo dochie ezigbo ákwà dị ka ihe nchebe pụọ n’ihu igwe. Aịsaịa na-ekwu, sị: “Ụlọ ududo ha agaghị aghọ uwe, ha agaghị ejikwa ọrụ dị iche iche ha kpuchie onwe ha: ọrụ nile ha bụ ọrụ ajọ ihe, omume nke ihe ike dịkwa n’aka ha. Ụkwụ ha na-agba ọsọ ime ihe ọjọọ, ha na-emekwa ngwa ịwụsị ọbara na-emeghị ihe ọjọọ: echiche nile ha bụ echiche ajọ ihe; mbibi na ntipịa dị n’okporo ụzọ nile nke ha.” (Aịsaịa 59:6, 7) Ụzọ Juda si eche echiche gbagọrọ agbagọ. Site n’ime ihe ike iji dozie nsogbu ya, ọ na-egosipụta àgwà asọpụrụghị Chineke. Ọ dịghị ya ka ihe ọ bụla na ọtụtụ n’ime ndị ihe ike ọ na-eme na-emetụta bụ ndị aka ha dị ọcha nakwa na ụfọdụ n’ime ha bụ ezigbo ndị ohu Chineke.
9. N’ihi gịnị ka ndị ndú Krisendọm na-apụghị iji nweta ezi udo?
9 Okwu ndị a e dere site n’ike mmụọ nsọ na-echetara anyị ihe ndekọ nkwafu ọbara nke Krisendọm. N’ezie, Jehova ga-eme ka ọ zaa ajụjụ maka echiche na-ezitụghị ezi o nyere banyere Iso Ụzọ Kraịst! Dị ka ndị Juu nke oge Aịsaịa, Krisendọm agbasowo ụzọ omume rụrụ arụ n’ihi na ndị ndú ya kwenyere na ọ bụ nanị ya bụ ụzọ pụrụ ịdị irè. Ka ha nọ na-ekwu maka udo, ha na-eme ihe n’ụzọ ikpe na-ezighị ezi. Lee omume ihu abụọ ọ bụ! Ebe ndị ndú Krisendọm nọgidere jiri ụzọ a na-eme ihe, ha apụghị inweta ezi udo. Ọ bụ dị ka amụma ahụ gara n’ihu ikwu, sị: “Ụzọ udo ka ha na-amaghị; ọ dịghịkwa ikpe ziri ezi dị n’ụzọ nile ha: ha emewo ka okporo ụzọ nile ha gbagọọrọ ha agbagọ; onye ọ bụla nke na-azọ ije na ya adịghị ama udo.”—Aịsaịa 59:8.
Ịwagharị n’Ọchịchịrị Ime Mmụọ
10. Olee nkwupụta Aịsaịa mere n’ihi Juda?
10 Jehova apụghị ịgọzi ụzọ aghụghọ, nke na-eweta mbibi, nke Juda. (Abụ Ọma 11:5) Ya mere n’ikwu okwu n’ihi mba ahụ dum, Aịsaịa kwupụtara mmehie nke Juda, sị: “Ikpe nke ziri ezi adịwo anya n’ebe anyị nọ, ezi omume adịghị erukwa anyị ahụ: anyị na-ele anya ìhè, ma lee, ọ bụ ọchịchịrị; anyị na-ele anya onwunwu ọkụ, ma ọ bụ n’oké ọchịchịrị ka anyị na-ejegharị. Anyị na-asọgharị ìsì ná mgbidi dị ka ndị ìsì, ee, anyị na-asọgharị ìsì dị ka ndị na-enweghị anya: anyị asụwo ngọngọ n’etiti ehihie dị ka ọ bụ chi ojiji; n’etiti ndị nwere ezi ndụ anyị nọ ka ndị nwụrụ anwụ. Anyị na-agbọ ụja dị ka bear, anyị nile, ọ bụkwa dị ka nduru ka anyị na-ekwosi ákwá ike.” (Aịsaịa 59:9-11a) Ndị Juu ekwebeghị ka Okwu Chineke bụrụ oriọna dịịrị ụkwụ ha na ìhè nke dịịrị okporo ụzọ ha. (Abụ Ọma 119:105) N’ihi ya, olileanya adịghị. Ọbụna n’etiti ehihie, ha na-asọgharị ìsì dị ka a ga-asị na ọ̀ bụ n’abalị. O yiri ka ha nwụrụ anwụ. N’ọchịchọ ha na-achọsi ahụ efe ike, ha na-agbọsi ụja ike dị ka anụ ọhịa bear agụụ ji ma ọ bụ nke e merụrụ ahụ. Ụfọdụ na-ekwosi ákwá ike n’ụzọ kwesịrị imere ebere, dị ka nduru nọ nanị ya.
11. N’ihi gịnị ka olileanya Juda maka ikpe ziri ezi na nzọpụta ji bụrụ n’efu?
11 Aịsaịa maara nnọọ nke ọma na ihe kpatara ajọ ọnọdụ nke Juda bụ nnupụisi megide Chineke. Ọ na-ekwu, sị: “Anyị na-ele anya ikpe ziri ezi, ma ọ dịghị: anyị na-ele anya nzọpụta, ma ọ dị anya n’ebe anyị nọ. N’ihi na njehie anyị bara ụba n’ihu Gị, mmehie nile nke anyị azawokwa megide anyị: n’ihi na anyị na njehie nile anyị nọkọ n’otu; ọzọ, ajọ omume nile anyị, anyị maara ha: njehie, na ịgọ Jehova, na isi n’iso Chineke anyị laghachi azụ, na ikwu okwu mmegbu na mwezụga, na ime okwu ụgha nile site n’obi anyị, na ikwupụta ha.” (Aịsaịa 59:11b-13) Ebe ọ bụ na ndị bi na Juda echegharịbeghị, a gbagharabeghịrị ha mmehie ha. Ikpe ziri ezi apụwo n’ala ahụ n’ihi na ndị ahụ ahapụwo Jehova. Ha aghọwo ndị na-ekwesịghị ntụkwasị obi n’ụzọ nile, ọbụna na-emegbu ụmụnna ha. Lee ka ha si yie ndị nọ na Krisendọm taa! Ọ bụghị nanị na ọtụtụ mmadụ na-eleghara ikpe ziri ezi anya kamakwa ha na-akpagbusi Ndịàmà Jehova na-ekwesị ntụkwasị obi ike, bụ́ ndị na-achọ ime uche Chineke.
Jehova Emee Ihe E Kpere n’Ikpe
12. Gịnị bụ omume nke ndị na-ahụ maka ikpe ziri ezi na Juda?
12 O yiri ka e nweghị ikpe ziri ezi, ezi omume, ma ọ bụ eziokwu na Juda. “E mewokwa ka ikpe ziri ezi laghachi azụ, ezi omume na-eguzokwa n’ebe dị anya: n’ihi na eziokwu asụwo ngọngọ n’ámá, izi ezi apụghịkwa ịbata.” (Aịsaịa 59:14) N’azụ ọnụ ụzọ ámá dị iche iche nke Juda, e nwere ámá ebe ndị okenye na-ezukọta maka ikpe ikpe. (Rut 4:1, 2, 11) Ndị ikom dị otú ahụ kwesịrị ikpe ikpe n’ezi omume ma gbasoo ikpe ziri ezi, ghara ịnara ihe iri ngo. (Deuterọnọmi 16:18-20) Kama nke ahụ, ha na-ekpe ikpe dị ka echiche ọdịmma onwe ha nanị si dị. Ọbụna nke ka njọ, ha na-ewere onye ọ bụla ji ezi obi na-agbalị ime ihe ọma dị ka onye dị mfe inweta. Anyị na-agụ, sị: “Eziokwu aghọwo ihe a na-ahụghị; ọzọ, onye na-esi n’ihe ọjọọ wezụga onwe ya na-eme onwe ya ihe nkwata”—Aịsaịa 59:15a.
13. Ebe ndị ikpe nke Juda na-adịghị arụ ọrụ ha, gịnị ka Jehova ga-eme?
13 Ndị jụrụ ịkatọ omume rụrụ arụ na-echefu na Chineke ekpughị ìsì, na ọ ma ihe na-emenụ, ma ọ bụ na ọ dị ike. Aịsaịa na-ede, sị: “Jehova wee hụ ya, ọ jọọ njọ n’anya Ya na ikpe ziri ezi adịghị. O wee hụ na ọ dịghị onye ọ bụla dị, ibobo wee nwụọ Ya n’ahụ na ọ dịghị onye na-arịọrọ anyị arịrịọ: ogwe aka Ya wee wetara Ya nzọpụta; ezi omume Ya kwa, nke ahụ na-akwagide Ya.” (Aịsaịa 59:15b, 16) Ebe ndị ikpe a họpụtara na-adịghị arụ ọrụ ha, Jehova ga-etinye aka n’okwu ahụ. Mgbe o tinyere aka, ọ ga-eme ihe n’ezi omume nakwa n’ike.
14. (a) Olee omume ọtụtụ ndị taa nwere? (b) Olee otú Jehova si akwadebe onwe ya maka ime ihe?
14 E nwere ọnọdụ yiri ya taa. Anyị na-ebi n’ime ụwa ebe “mmehie [ọtụtụ ndị] na-adịghị ewute ha ọzọ.” (Ndị Efesọs 4:19) Ọ bụ mmadụ ole na ole kwenyere na Jehova ga-anọkata mee ihe iji kpochapụ ihe ọjọọ n’ụwa. Ma amụma Aịsaịa na-egosi na Jehova na-eleru nnọọ anya n’ihe omume ụmụ mmadụ. Ọ na-ekpe ikpe, n’oge nke ya kwa, ọ ga-eme ihe dị ka ikpe ndị ahụ si dị. Ikpe ya hà ziri ezi? Aịsaịa na-egosi na ha ziri ezi. N’ihe banyere mba Juda, ọ na-ede, sị: “[Jehova] wee yiri ezi omume dị ka uwe agha, [kpurukwa] okpu agha nzọpụta n’isi Ya; O yirikwa uwe nile nke ịbọ ọ́bọ̀ ka ha bụrụ uwe oyiyi Ya, O were ekworo kpuchie Onwe ya dị ka uwe mwụda.” (Aịsaịa 59:17) Okwu amụma ndị a na-akọwa Jehova dị ka onye agha nke na-eke onwe ya ekike agha. O zubesiri ike inye ‘nzọpụta’ n’echiche nke na ọ ga-ahụ na o mezuru ihe ọ na-aga ime. O ji ezi omume nke ya zuru okè, nke a na-apụghị imerụ emerụ n’aka. Ọ ga-anụkwa ọkụ n’obi n’ọrụ ikpe ikpe ya n’atụghị ụjọ. Ihe ịrụ ụka adịghị ya na ezi omume ga-emeri.
15. (a) Olee ihe ezi ndị Kraịst ga na-eme mgbe Jehova ga-emezu ihe e kpere n’ikpe? (b) Gịnị ka a pụrụ ikwu banyere ikpe Jehova?
15 N’ala ụfọdụ taa, ndị iro nke eziokwu na-anwa igbochi ọrụ nke ndị ohu Jehova site n’ịgbasa akụkọ na-abụghị eziokwu nakwa nke nkatọ. Ezi ndị Kraịst adịghị egbu oge n’ịkwado eziokwu, ma ọ dịghị mgbe ha na-achọ ịbọrọ onwe ha ọ́bọ̀. (Ndị Rom 12:19) Ọbụna mgbe Jehova na Krisendọm si n’ezi ofufe dapụ ga-eme mpịazi, ndị na-efe ya ofufe nọ n’ụwa agaghị ekere òkè ná mbibi ya. Ha maara na Jehova edebeworo onwe ya ọ́bọ̀ nakwa na ọ ga-eme ihe kwesịrị ekwesị mgbe oge ruru. Amụma ahụ na-emesi anyị obi ike, sị: “Dị ka mmeso nile ha si dị, otú a ka Ọ ga-akwụghachi, ọnụma ka Ọ ga-akwụghachi ndị na-emegide Ya, mmeso ha ka Ọ ga-akwụghachi ndị iro Ya; Ọ ga-akwụghachi àgwàetiti nile mmeso ha.” (Aịsaịa 59:18) Dị ka ọ dị n’oge Aịsaịa, ọ bụghị nanị na ikpe Chineke ga-abụ ikpe ziri ezi kama ha ga-ezukwa ezu. Ha ga-eru ọbụna ‘n’àgwàetiti dị iche iche,’ n’akụkụ ndị dị anya. Ọ dịghị onye ga-anọ n’ebe dị anya ma ọ bụ nọpụ anọpụ nke na ikpe Jehova agaghị erute ya.
16. Olee ndị ga-alanarị ikpe Jehova, gịnịkwa ka ha ga-amụta site ná nlanarị ha?
16 Jehova ga-ekpe ndị na-adọgbu onwe ha n’ọrụ ime ihe ọma ikpe n’ezi omume. Aịsaịa na-ebu amụma na site n’otu nsọtụ ụwa ruo n’ọzọ—n’ụwa nile—ndị dị otú ahụ ga-alanarị. Ha inweta nchebe Jehova ga-emekwa ka nsọpụrụ na nkwanye ùgwù ha nye ya sie ike nke ukwuu. (Malakaị 1:11) Anyị na-agụ, sị: “Ha ga-atụkwa egwu aha Jehova site n’Ọdịda anyanwụ, tụọkwa egwu ebube Ya site n’ọwụwa anyanwụ: mgbe onye mkpagbu ga-abata dị ka mmiri iyi, Mmụọ nke Jehova ga na-ebuli ọkọlọtọ imegide ya.” (Aịsaịa 59:19) Dị ka ifufe dị ike nke bu nnukwu mmiri na-ebibi ihe na-aga ma na-ebukọrọ ihe nile nọchiri ya ụzọ, mmụọ Jehova ga-ekpochapụ ihe nile na-anọchiri mmezu nke uche ya ụzọ. Mmụọ ya dị ike karịa ikike ọ bụla mmadụ nwere. Mgbe ọ ga-eji ya mezuo ihe o kpere n’ikpe n’ahụ ụmụ mmadụ na mba dị iche iche, ọ ga-enweriri ihe ịga nke ọma n’ụzọ zuru ezu.
Olileanya na Ngọzi Maka Ndị Nwere Nchegharị
17. Ònye bụ Onye Mgbapụta nke Zaịọn, oleekwa mgbe ọ gbapụtara Zaịọn?
17 N’oge Iwu Mosis dị irè, onye mgbapụta pụrụ ịzụtaghachi onye Israel nke rere onwe ya gaa n’ịbụ ohu ka ọ ghara ịbụkwa ohu. N’akwụkwọ amụma Aịsaịa, a kọwawo Jehova na mbụ dị ka Onye Mgbapụta nke ndị nwere nchegharị. (Aịsaịa 48:17) Ugbu a a na-akọwa ya ọzọ dị ka Onye Mgbapụta nke ndị nwere nchegharị. Aịsaịa deturu nkwa Jehova, sị: “Otu onye mgbapụta ga-abịarukwa Zaịọn, bịakwute ndị na-esi ná njehie chigharịa n’ime Jekọb; ọ bụ ihe si n’ọnụ Jehova pụta.” (Aịsaịa 59:20) E mezuru nkwa a na-emesi obi ike na 537 T.O.A. Ma o nwere mmezu ọzọ. Pọl onyeozi hotara okwu ndị a site ná nsụgharị Septuagint ma jiri ha mee ihe n’ebe ndị Kraịst nọ. O dere, sị: “Otú a a ga-azọpụtakwa Israel nile: dị ka e deworo ya n’akwụkwọ nsọ, sị, Onye ndọpụta ahụ ga-esi na Zaịọn pụta; Ọ ga-echigharị asọpụrụghị Chineke nile ka ọ pụọ na Jekọb: nke a bụkwa ọgbụgba ndụ ga-adịrị ha site n’ebe M nọ, mgbe ọ bụla M ga-ewepụ mmehie nile ha.” (Ndị Rom 11:26, 27) N’ezie, amụma Aịsaịa nwere mmezu sara mbara nke ukwuu—nke dịgidere rute n’oge anyị ma gafere ya. N’ụzọ dị aṅaa?
18. Olee mgbe, ọ bụkwa n’ụzọ dị aṅaa ka Jehova si mee ka “Israel nke Chineke” malite ịdị?
18 Na narị afọ mbụ, ntakịrị ndị fọdụrụ ná mba Israel nakweere Jisọs dị ka Mesaịa ahụ. (Ndị Rom 9:27; 11:5) N’ụbọchị Pentikọst 33 O.A., Jehova wụkwasịrị ihe dị ka mmadụ 120 n’ime ndị ahụ kwere ekwe mmụọ nsọ ya ma webata ha n’ọgbụgba ndụ ọhụrụ ya nke Jisọs Kraịst bụ onye ogbugbo ya. (Jeremaịa 31:31-33; Ndị Hibru 9:15) N’ụbọchị ahụ, “Israel nke Chineke” malitere ịdị, bụ́ mba ọhụrụ nke ndị so na ya na-abụghị ụmụ Abraham n’anụ ahụ, kama ndị e ji mmụọ Chineke mụọ. (Ndị Galetia 6:16) Malite na Kọniliọs, mba ọhụrụ ahụ gụnyere ndị Jentaịl a na-ebighị ùgwù. (Ọrụ 10:24-48; Mkpughe 5:9, 10) Jehova Chineke si otú a doo ha dị ka ụmụ, ha ghọọkwa ụmụ ime mmụọ ya, ndị ha na Jisọs ga-eketakọ ihe.—Ndị Rom 8:16, 17.
19. Ọgbụgba ndụ dị aṅaa ka Jehova so Israel nke Chineke gbaa?
19 Ugbu a, Jehova so Israel nke Chineke gbaa ndụ. Anyị na-agụ, sị: “Ma Mụ onwe m, nke a bụ ọgbụgba ndụ m nke dị n’etiti Mụ na ha, ka Jehova sịrị: Mmụọ m nke dị n’ahụ gị, na okwu m nile nke M tinyeworo n’ọnụ gị, agaghị apụ n’ọnụ gị, na n’ọnụ mkpụrụ gị, na n’ọnụ mkpụrụ nke mkpụrụ gị, ka Jehova sịrị, site n’ugbu a wee ruo mgbe ebighị ebi.” (Aịsaịa 59:21) Ma okwu ndị a hà mezuru n’ahụ Aịsaịa n’onwe ya ma ha emezughị, ha mezuru n’ezie n’ahụ Jisọs, bụ́ onye e mesiri obi ike na “ọ ga-ahụ mkpụrụ ya.” (Aịsaịa 53:10) Jisọs kwuru ihe ndị ọ mụtara site n’aka Jehova, mmụọ Jehova dịkwa n’ahụ ya. (Jọn 1:18; 7:16) N’ụzọ dabara adaba, ụmụnna ya na ndị nketa ibe ya, bụ́ ndị òtù nke Israel nke Chineke, na-enwetakwa mmụọ nsọ Jehova ma na-ekwusa ozi ha mụtaworo site n’aka Nna ha nke eluigwe. Ha nile bụ “ndị mmụta Jehova.” (Aịsaịa 54:13; Luk 12:12; Ọrụ 2:38) Site n’aka Aịsaịa ma ọ bụ site n’aka Jisọs, bụ́ onye Aịsaịa sere onyinyo ya n’ụzọ amụma, Jehova na-ekwe nkwa ugbu a na ya agaghị edochi ha edochi kama na ya ga-eji ha mee ihe ruo mgbe ebighị ebi dị ka ndị àmà ya. (Aịsaịa 43:10) Otú ọ dị, olee ndị bụ “mkpụrụ” ha, ndị na-eritekwa uru site n’ọgbụgba ndụ a?
20. Olee otú e si mezuo nkwa Jehova kwere Abraham na narị afọ mbụ?
20 N’oge ochie Jehova kwere Abraham nkwa, sị: “Ọ bụkwa ná mkpụrụ gị ka mba nile nke ụwa ga-agọzi onwe ha.” (Jenesis 22:18) N’ikwekọ na nke a, ntakịrị ihe ahụ fọdụrụ n’Israel anụ ahụ, bụ́ ndị nakweere Mesaịa ahụ gbasara gaa n’ọtụtụ mba, na-ekwusa ozi ọma banyere Kraịst. Malite na Kọniliọs, ọtụtụ ndị Jentaịl a na-ebighị ùgwù ‘gọziri onwe ha’ site na Jisọs, bụ́ Mkpụrụ Abraham. Ha ghọrọ akụkụ nke Israel nke Chineke na akụkụ nke abụọ nke mkpụrụ Abraham. Ha so ná “mba dị nsọ” nke Jehova, ndị ọrụ e nyere ha bụ ‘ikwusa ịdị mma nile nke Onye ahụ Onye kpọpụtara ha n’ọchịchịrị ahụ baa n’ìhè Ya dị ebube.’—1 Pita 2:9; Ndị Galetia 3:7-9, 14, 26-29.
21. (a) “Mkpụrụ” dị aṅaa ka Israel nke Chineke mụpụtaworo n’oge a? (b) Olee otú ọgbụgba ndụ, ma ọ bụ nkwekọrịta, nke Jehova na Israel nke Chineke mere si akasi “mkpụrụ” ahụ obi?
21 Taa o yiri ka a chịkọtazuwo ọnụ ọgụgụ nke Israel nke Chineke. Ma, a ka nọ na-agọzi mba dị iche iche—n’ụzọ bakwara ụba. N’ụzọ dị aṅaa? N’ụdị na Israel nke Chineke enwewo “mkpụrụ,” ndị na-eso ụzọ Jisọs, bụ́ ndị olileanya ha bụ ndụ ebighị ebi n’ụwa paradaịs. (Abụ Ọma 37:11, 29) Jehova na-ezikwa “mkpụrụ” ndị a ihe, a na-akụzikwara ha ụzọ ya. (Aịsaịa 2:2-4) Ọ bụ ezie na e jighị mmụọ nsọ mee ha baptism ma ọ bụ gụọ ha ná ndị so n’ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ, mmụọ nsọ Jehova na-ewusi ha ike imeri ihe mgbochi nile Setan na-edochi n’ụzọ nke ime nkwusa ha. (Aịsaịa 40:28-31) Ọnụ ọgụgụ ha eruwo ọtụtụ nde ugbu a, ha nọgidekwara na-amụba ka ha na-amụpụta mkpụrụ nke ha. Ọgbụgba ndụ, ma ọ bụ nkwekọrịta, nke Jehova na ndị ahụ e tere mmanụ mere na-eme ka “mkpụrụ” ndị a nwee obi ike na Jehova ga-anọgide jirikwa ha na-eme ihe dị ka ọnụ na-ekwuchitere ya ruo mgbe ebighị ebi.—Mkpughe 21:3, 4, 7.
22. Obi ike dị aṅaa ka anyị pụrụ inwe n’ebe Jehova nọ, oleekwa otú nke a kwesịrị isi metụta anyị?
22 Mgbe ahụ, ka anyị nile nọgide na-enwe okwukwe n’ebe Jehova nọ. Ọ dị njikere ma nwee ike ịzọpụta! Ọ dịghị mgbe aka ya ga-adị mkpụmkpụ; ọ ga na-anapụta ndị ya na-ekwesị ntụkwasị obi mgbe nile. Ndị nile na-atụkwasị ya obi ga-anọgide na-ekwu okwu ọma ya “site n’ugbu a wee ruo mgbe ebighị ebi.”
Igbe dị na peeji nke 294]
Jerusalem nke Si n’Ezi Ofufe Dapụ—Ihe Ya na Krisendọm Yiri
Jerusalem, nke bụ́ isi obodo nke mba Chineke họọrọ, na-ese onyinyo nzukọ eluigwe nke Chineke nke ndị mmụọ e kere eke mejupụtara nakwa òtù ndị Kraịst e tere mmanụ a kpọlitere n’ọnwụ gaa n’eluigwe dị ka nwunye ọhụrụ nke Kraịst. (Ndị Galetia 4:25, 26; Mkpughe 21:2) Otú ọ dị, ndị bi na Jerusalem ekwesịghị ntụkwasị obi nye Jehova ọtụtụ mgbe, a kọwakwara obodo ahụ dị ka nwanyị na-akwa iko na akwụna. (Ezikiel 16:3, 15, 30-42) N’ọnọdụ dị otú ahụ, Jerusalem bụ nnọọ ihe atụ dabara adaba nke Krisendọm si n’ezi ofufe dapụ.
Jisọs kpọrọ Jerusalem, “[ogbu] ndị amụma, nke na-ewerekwa nkume atụ ndị e zitewooro ya.” (Luk 13:34; Matiu 16:21) Dị ka Jerusalem na-ekwesịghị ntụkwasị obi, Krisendọm na-azọrọ na ya na-ejere ezi Chineke ozi ma o siwo n’ụzọ ezi omume Ya nile kpafuo kpam kpam. Anyị pụrụ inwe obi ike na Jehova ga-ejikwa otu ụkpụrụ ezi omume ndị ahụ o ji kpee Jerusalem si n’ezi ofufe dapụ ikpe kpee Krisendọm ikpe.
[Foto dị na peeji nke 296]
Onyeikpe kwesịrị ikpe ikpe n’ezi omume, chọọ ikpe ziri ezi, ma ghara ịnara ihe iri ngo
[Foto dị na peeji nke 298]
Dị ka osimiri nke rubigara ókè, ikpe Jehova ga-ekpochapụ ihe nile na-egbochi ime uche ya
[Foto dị na peeji nke 302]
Jehova kwere nkwa na ọ dịghị mgbe ihe ùgwù nke ịbụ ndị àmà ya ga-efunahụ ndị ya