“Lezienụ Anya Otú Unu Si Aṅa Ntị”
ỊṄA ntị bụ otu ihe dị mkpa n’ịmụta ihe. Ọ pụkwara inwe mmetụta n’ohere mmadụ nwere ịlanarị. Mgbe Jehova na-akwadebe ịnapụta ndị ya n’agbụ n’Ijipt, o nyere Mozis ntụziaka, bụ́ onye gwara ndị okenye nke Izrel ihe ha na-aghaghị ime iji chebe ụmụ ha buru ụzọ mụọ pụọ n’aka mmụọ ozi nke ga-eweta ọnwụ. (Ọpụ. 12:21-23) Ndị okenye ahụ wee mee ka ezinụlọ ọ bụla mara nke a. E ji ọnụ kwuo nke a. Ndị ahụ aghaghị ịṅa ntị nke ọma. Olee otú ha si meghachi omume? Bible na-akọ, sị: “Ụmụ Israel nile wee mee ya; dị ka Jehova nyere Mozis na Erọn iwu, otú a ka ha mere.” (Ọpụ. 12:28, 50, 51) N’ihi nke a, Izrel nwetara mgbapụta dị ebube.
Taa, Jehova na-akwadebe anyị maka mgbapụta dị ukwuu ọbụna karị. N’ezie, anyị kwesịrị ịṅa ntị nke ọma ná ntụziaka ọ na-enye. A na-enye ntụziaka dị otú ahụ ná nzukọ ọgbakọ. Ị̀ na-erite uru zuru ezu ná nnọkọ ndị dị otú ahụ? Ọ dabeere nke ukwuu n’otú i si aṅa ntị.
Ị̀ na-echeta ihe ndị bụ́ isi ná ntụziaka a na-enye ná nzukọ? Ọ̀ bụ omume gị, site n’izu ruo n’izu, ịchọ ụzọ ndị ị ga-esi tinye ntụziaka a na-enye n’ọrụ ná ndụ nke gị ma ọ bụ soro ndị ọzọ kerịta ya?
Dozie Obi Gị
Iji rite uru zuru ezu ná ntụziaka a na-enye ná nzukọ Ndị Kraịst, ọ dị anyị mkpa idozi obi anyị. E mere ka mkpa ọ dị ime otú ahụ pụta ìhè site n’ihe mere n’oge ọchịchị Eze Jehoshafat nke Juda. Jehoshafat kwadoro ezi ofufe n’atụghị egwu. O “siri na Juda wezụga ebe nile dị elu na Asherim,” họpụtakwa ndị isi, ndị Livaị, na ndị nchụàjà ịkụziri ndị mmadụ Iwu Jehova n’obodo nile nke Juda. N’agbanyeghị nke ahụ, “e wezụgaghị ebe dị elu.” (2 Ihe 17:6-9; 20:33) Ife chi ụgha na ụdị ofufe na-ezighị ezi a na-efe Jehova, bụ́ ndị na-ewere ọnọdụ n’ebe ndị dị elu nke ndị na-ekpere arụsị, gbanyesiri mkpọrọgwụ ike nke na e kpochapụghị ha.
Gịnị mere na izi ihe ahụ Jehoshafat mere ndokwa ya enweghị mmetụta dịtere aka? Ihe ndekọ ahụ gara n’ihu ịsị: “Ruo ugbu a ndị Juda edozighị obi ha nye Chineke nke ndị bụ́ nna ha.” Ha nụrụ ma ha emeghị ihe kwekọrọ n’ihe ha nụrụ. Ma eleghị anya ha chere na ịga n’ụlọ nsọ ahụ dị na Jeruselem ịga chụọ àjà bụ ihe siri ike. Otú o sina dị, okwukwe akwalighị obi ha.
Iji zere ịdabaghachi n’ụzọ ụwa nke Setan, anyị aghaghị idozi obi anyị ịnara ntụziaka nke Jehova na-enye taa. N’ụzọ dị aṅaa? Otu ụzọ dị mkpa bụ site n’ekpere. Anyị kwesịrị ikpe ekpere ka anyị jiri mmụọ inwe ekele na-anara ntụziaka sitere n’aka Chineke. (Ọma 27:4; 95:2) Nke a ga-enyere anyị aka inwe ekele maka mgbalị ụmụnna anyị na-eme bụ́ ndị, ọ bụ ezie na ha ezughị okè, na-ewepụta onwe ha ka Jehova jiri ha na-akụziri ndị ya ihe. Ọ ga-akpali anyị ikele Jehova ọ bụghị nanị maka ihe ọhụrụ ndị anyị na-amụta kamakwa maka ohere anyị nwere ime ka nghọta anyị nwere n’ihe ndị anyị mụtaworo na mbụ mie emi. Ebe anyị nwere ọchịchọ ime uche Chineke n’ụzọ zuru ezu, anyị na-ekpe ekpere, sị: “Zi m ụzọ Gị, Jehova; . . . mee ka obi m dị n’otu ịtụ egwu aha Gị.”—Ọma 86:11.
Mee Ka Uche Gị Dịrị Otu Ebe
E nwere ọtụtụ ihe na-egbochi anyị ịṅa ntị nke ọma. Nchekasị pụrụ irikpu uche anyị. Mkpọtụ na ngagharị nke ndị na-ege ntị ma ọ bụ nke ndị nọ n’èzí ebe ahụ a na-enwe nzukọ pụrụ ịdọpụ uche anyị. Enweghị ntụsara ahụ́ pụrụ ime ka o siere anyị ike ime ka uche anyị dịrị otu ebe. Ndị nwere obere ụmụaka na-achọpụtakarị na uche ha na-abụ nke e kewara ekewa. Gịnị pụrụ inyere anyị aka ime ka uche anyị dịgide n’usoro ihe omume?
Anya na-enwe mmetụta dị ukwuu n’ebe anyị na-atụkwasị uche anyị. Jiri anya gị mee ihe iji nyere onwe gị aka ime ka uche gị dịgide n’otu ebe site n’ilegide ọkà okwu anya. Mgbe ọ kpọtụrụ uche n’otu ebe na Bible—ọbụna nke ị maara nke ọma—sapeta ya ma soro ya mgbe ọ na-agụ ya. Guzogide ọnwụnwa nke ịtụgharị lee anya n’ebe ọ bụla ị nụrụ mkpọtụ ma ọ bụ ụṅara. Ọ bụrụ na anya gị na-eme ka ihe ọmụma ndị na-adọpụ uche na-agbataju gị n’obi, ihe dị ukwuu n’ime ihe a na-ekwu n’elu ikpo okwu ga-efunahụ gị.
Ọ bụrụ na ọ dị “nchegbu” ọ bụla na-eme ka o siere gị ike itinye uche n’ihe omume ahụ, kpegara Jehova ekpere maka ịdị jụụ nke uche na obi bụ́ ndị dị mkpa iji ṅaa ntị. (Ọma 94:19; Fil. 4:6, 7) Mee nke ahụ ugboro ugboro ma ọ dị mkpa. (Mat. 7:7, 8) Nzukọ ọgbakọ bụ ndokwa sitere n’aka Jehova. Ị pụrụ inwe obi ike na ọ chọrọ ka i rite uru na ha.—1 Jọn 5:14, 15.
Ịṅa Ntị n’Okwu
Ma eleghị anya ị pụrụ icheta isi ihe ndị ị kasị nwee mmasị na ha, bụ́ ndị ị nụrụ n’okwu dị iche iche. Otú ọ dị, ịṅa ntị n’okwu gụnyere ihe karịrị nanị ịnụchata isi ihe ndị gbara ọkpụrụkpụ. Okwu yiri njem. Ọ bụ ezie na e nwere ihe ndị na-akpali mmasị a ga-ahụ n’ụzọ, ihe bụ́ isi bụ ebe a na-aga, nke bụ́ ihe e bu n’uche. Ọkà okwu pụrụ inwe nkwubi okwu ọ na-agbalị ime ka ndị na-ege ntị ruo na ya ma ọ bụ nwee ihe ọ na-akpali ha ime.
Tụlee okwu Jọshụa gwara mba Izrel, nke e dekọrọ na Joshua 24:1-15. Ebumnobi ya bụ ime ka ndị ahụ mee mkpebi siri ike ịkwado ezi ofufe site n’ikewapụ onwe ha kpam kpam n’ikpere arụsị nke mba ndị gbara ha gburugburu. N’ihi gịnị ka nke ahụ ji dị oké mkpa? Njupụta ofufe ụgha jupụtara ebe nile yiri ezi nguzo nke mba ahụ nwere n’ebe Jehova nọ egwu nke ukwuu. Ndị ahụ zaghachiri n’arịrịọ Jọshụa rịọrọ site n’ịsị: “Ya bụụrụ anyị ihe arụ ịhapụ Jehova, ife chi ọzọ ofufe; . . . anyị onwe anyị ga-efekwa Jehova ofufe.” Ha mekwara otú ahụ!—Josh. 24:16, 18, 31.
Ka ị na-aṅa ntị n’okwu, gbalịa ịghọta ihe bụ́ ebumnobi ya. Tụlee otú isi ihe ndị ọkà okwu na-ewepụta si enye aka n’imezu ebumnobi ahụ. Jụọ onwe gị ihe ihe ọmụma ahụ chọrọ ka i mee.
Ịṅa Ntị Mgbe A Na-eme Ntụle
A na-eduzi Ọmụmụ Ihe Ụlọ Nche, Ọmụmụ Akwụkwọ Ọgbakọ, na akụkụ ụfọdụ nke Nzukọ Ije Ozi dị ka ntụle ajụjụ na azịza nke ihe ọmụmụ e biri ebi nke dabeere na Bible.
Ịṅa ntị mgbe a na-eme ntụle, n’ọnọdụ ụfọdụ, dị ka ịṅa ntị mgbe a na-eme ntụle yiri ikere òkè ná mkparịta ụka. Iji rite uru zuru ezu, ṅaa ntị nke ọma. Mata ebe ihe a na-atụle na-eche ihu. Rịba ama otú onye nduzi si emesi isiokwu na ihe ndị bụ́ isi ihe ike. Jiri uche gị na-aza ajụjụ ndị ọ na-ajụ. Gee ntị ka ndị ọzọ na-akọwa ma na-egosi otú a pụrụ isi tinye ihe ọmụma ahụ n’ọrụ. Ile ihe ọmụma ahụ anya n’ụzọ ndị ọzọ si ele ihe anya pụrụ ime ka ị ghọta ihe ọhụrụ n’isiokwu ị maara nke ọma. Tụnye ụtụ ná mgbarịta ume dị otú ahụ site n’ime nkwupụta nke okwukwe nke gị.—Rom 1:12.
Ịmụ ihe ọmụmụ e kenyere tupu oge eruo ga-enyere gị aka itinye obi gị dum ná ntụle ahụ na ịghọta azịza ndị ọzọ na-enye. Ọ bụrụ na ọnọdụ gị emee ka o siere gị ike ịmụ ihe a ga-amụ nke ọma, were nkeji ole na ole, ma ọ dịkarịa ala, tụletụ ihe ahụ a ga-amụ tupu nzukọ eruo. Ime nke a ga-eme ka i nwee ike ịmụtakwu ihe ná ntụle ahụ.
Ịṅa Ntị ná Mgbakọ Dị Iche Iche
Ná mgbakọ dị iche iche, o yiri ka a ga-enwe ihe ndọpụ uche karịa otú a na-enwe ná nzukọ ọgbakọ. Nke a pụrụ ime ka ịṅa ntị bụrụ ihe ịma aka ka ukwuu. Gịnị pụrụ inyere anyị aka?
Otu ihe dị mkpa bụ izu ike nke ọma n’abalị. Tupu ihe omume amalite n’ụbọchị nke ọ bụla, mee ka isiokwu dịịrị ụbọchị ahụ bamisie ike n’uche gị. Lee isiokwu nke okwu ọ bụla, gbalịakwa ibu ụzọ chee ihe a ga-ekwu na ya. Jiri Bible gị mee ihe nke ọma. Ọtụtụ ndị na-achọpụta na idetu n’ụzọ dị nkenke ihe ndị bụ́ isi ihe na-enyere ha aka ime ka uche ha dịgide n’ihe omume. Detuo ntụziaka ị na-eme atụmatụ itinye n’ọrụ ná ndụ gị na n’ozi gị. Kwurịtanụ isi ihe ole na ole mgbe unu na-aga ma ọ bụ na-alọta mgbakọ kwa ụbọchị. Nke a ga-enyere gị aka icheta ihe ọmụma ahụ.
Ịzụ Ụmụaka Ịṅa Ntị
Ndị Kraịst mụrụ ụmụ pụrụ inyere ụmụ ha aka—ọbụna ụmụ ọhụrụ—ka ha “mara ihe maka nzọpụta” site n’ịkpọ ha aga nzukọ ọgbakọ na mgbakọ dị iche iche. (2 Tim. 3:15) Ebe ọ bụ na ọnọdụ uche ụmụaka na oge ha na-etinyeru uche n’ihe na-adịgasị iche iche, ọ chọrọ nghọta iji nyere ha aka ịmụta ịdị na-aṅa ntị nke ọma. Aro ndị na-esonụ pụrụ inyere gị aka.
N’ụlọ, dokwaa oge ụmụaka gị ga-eji nọrọ jụụ ma gụọ ihe ma ọ bụ kirie ihe osise ndị dị ná mbipụta Ndị Kraịst anyị. Ná nzukọ, zere iji ihe ụmụaka ji egwuri egwu adọrọ uche ha. Dị ka ọ dị n’Izrel oge ochie, otú ahụ ka ụmụntakịrị na-abịa taa “ka ha wee nụ, ka ha wee mụtakwa” ihe. (Deut. 31:12) N’ebe o kwere omume, ụfọdụ ndị mụrụ ụmụ na-enye ọbụna obere ụmụaka akwụkwọ a na-amụ, ndị ga-abụ ndị nke ha. Ka ụmụaka na-etolitekwu, nyere ha aka ịkwadebe maka ikere òkè n’ihe omume ndị a chọrọ ka ndị na-ege ntị kere òkè na ha.
Akwụkwọ Nsọ na-ekpughe njikọ chiri anya dị n’etiti ịṅa Jehova ntị na irubere ya isi. A pụrụ ịhụ nke a site n’ihe Mozis gwara mba Izrel: “Ọ bụ ndụ na ọnwụ, ngọzi ahụ na nkọcha ahụ, ka m tinyeworo n’ihu gị: gị họrọkwa ndụ . . . ịhụ Jehova, bụ́ Chineke gị, n’anya, na ige ntị olu Ya, na ịrapara n’ahụ́ Ya.” (Deut. 30:19, 20, ọ bụ anyị dere okwu ụfọdụ n’aka akwụkwọ dị iche.) Taa, ịṅa ntị ná ntụziaka Jehova na-enye na iji nrubeisi na-etinye ya n’ọrụ ná ndụ anyị dị oké mkpa iji nweta ihu ọma Chineke na ngọzi nke ndụ ebighị ebi. Ya mere, lee ka o si dị oké mkpa na anyị gere ntị na ndụmọdụ Jizọs, bụ́: “Lezienụ anya otú unu si aṅa ntị”!—Luk 8:18.