Ị Pụrụ Imeziwanye Ikike Icheta Ihe Gị
JEHOVA CHINEKE kenyere ikike dị egwu nke icheta ihe n’ime ụbụrụ mmadụ. O mere ya ka ọ bụrụ ebe ichekwa ihe nke a pụrụ isi na ya were ihe, n’enweghị nke ọ bụla n’ime ihe ndị dị oké ọnụ ahịa e tinyere na ya ga-efu efu. Otú e si mee ụbụrụ kwekọrọ ná nzube Chineke na ụmụ mmadụ ga-adị ndụ ebighị ebi.—Ọma 139:14; Jọn 17:3.
Ma ị pụrụ iche na ihe ka ọtụtụ n’ime ihe ị na-ewebata n’uche gị na-efu. Ọ naghị eyi ka ha dị ya ma ị chọọ ha. Gịnị ka ị pụrụ ime iji mee ka ikike icheta ihe gị dịwanye nkọ?
Nwee Mmasị
Mmasị bụ ihe dị mkpa n’ime ka ikike icheta ihe dịwanye nkọ. Ọ bụrụ na anyị emee ka ọ bụrụ omume anyị ileru anya ala, inwe mmasị n’ebe ndị mmadụ nọ na n’ihe ndị na-eme gburugburu anyị, uche anyị na-abụ nke a kpaliri akpali. Mgbe ahụ ọ na-adịrị anyị mfe karị igosi mmasị yiri nke ahụ mgbe anyị gụrụ ihe ma ọ bụ nụ ihe nwere abamuru na-adịte aka.
Ọ bụ ihe a na-ahụkarị bụ́ ịhụ ka ọ na-esiri mmadụ ike icheta aha ndị mmadụ. Ma dị ka Ndị Kraịst, anyị maara na ndị mmadụ dị mkpa—Ndị Kraịst ibe anyị, ndị anyị na-agbara àmà, na ndị ọzọ anyị na ha na-emekọ ihe ka anyị na-eme ihe ndị dị mkpa ná ndụ. Gịnị pụrụ inyere anyị aka icheta aha ndị anyị kwesịrị icheta n’ezie? Pọl onyeozi depụtara aha mmadụ 26 n’ime ndị nọ n’otu ọgbakọ o degaara akwụkwọ. Mmasị o nwere n’ebe ha nọ pụtara ìhè site n’eziokwu ahụ bụ́ na ọ bụghị nanị na ọ maara aha ha, kamakwa o kwuru ihe ụfọdụ kpọmkwem banyere ọtụtụ n’ime ha. (Rom 16:3-16) Ụfọdụ ndị nlekọta na-ejegharị ejegharị nke Ndịàmà Jehova n’oge a na-eme nnọọ nke ọma n’icheta aha, ọ bụ ezie na ha na-esi n’otu ọgbakọ aga n’ọzọ kwa izu. Gịnị na-enyere ha aka? Ọ pụrụ ịbụ na ha na-eme ka ọ mara ha ahụ́ ịkpọ mmadụ aha ọtụtụ ugboro na mgbe mbụ ha kwurịtara okwu. Ha na-etinye mgbalị ijikọta ihu na aha onye ahụ. Ọzọkwa, ha na ndị dịgasị iche iche na-anọ n’ozi ubi, na-erikọkwa nri. Mgbe i zutere mmadụ, ị̀ ga-echeta aha onye ahụ? Malite site n’inwe ezi ihe mere ị ga-eji echeta aha ya; mgbe ahụ, nwalee ụfọdụ n’ime aro ndị a tụrụ n’elu.
Icheta ihe ị gụrụ dị mkpa n’otu aka ahụ. Gịnị pụrụ inyere gị aka imeziwanye ihe na nke a? Ma mmasị ma nghọta na-ekerecha òkè. Ọ dị gị mkpa inwe mmasị buru ibu n’ihe ị na-agụ iji tinye uche gị nile na ya. Ị gaghị echeta ihe ma ọ bụrụ na uche gị dị n’ebe ọzọ mgbe ị na-anwa ịgụ ihe. Ị na-aghọta ihe karị mgbe i jikọtara ihe ọmụma ahụ na ihe ndị ị maara nke ọma ma ọ bụ ihe ị mabu ama. Jụọ onwe gị, sị: ‘N’ụzọ dị aṅaa, oleekwa mgbe m pụrụ itinye ihe ọmụma a n’ọrụ ná ndụ nke m? Olee otú m pụrụ isi jiri ya nyere onye ọzọ aka?’ Ị na-aghọtakwa ihe karị ma ọ bụrụ na ị na-agụkọta nkebi ahịrịokwu ụfọdụ ọnụ kama ịgụ mkpụrụ okwu mkpụrụ okwu. Ị ga-aghọta ihe a na-ekwu ngwa ngwa, matakwa echiche ndị bụ́ isi, nke na-eme ka ọ ka mfe icheta ha.
Wepụta Oge Mee Ntụleghachi
Ndị ọkachamara ná mmụta na-emesi uru ntụleghachi bara ike. N’otu nnyocha e mere, otu prọfesọ mahadum gosipụtara na otu minit e ji mee ntụleghachi n’egbughị oge na-amụba ihe a ga-echeta okpukpu abụọ. Ya mere ozugbo ị gụsịrị ihe ị na-agụ—ma ọ bụ akụkụ ka ukwuu na ya—jiri uche gị tụleghachi echiche ndị bụ́ isi ka ha wee bamie n’uche gị. Chee echiche banyere otú ị ga-esi jiri okwu nke aka gị kọwaa isi ihe ọhụrụ ọ bụla ị mụtara. Site n’ichetaghachiri onwe gị ihe ngwa ngwa ị gụsịrị ya, ị pụrụ ime ka ị nọgide na-echeta ihe ahụ ruo ogologo oge karị.
Mgbe ahụ n’ụbọchị ole na ole na-esonụ, chọta ohere iji tụleghachi ihe ị gụrụ site n’ịgwa onye ọzọ ihe ahụ. Ị pụrụ ịgwa ya onye ezinụlọ gị, onye nọ n’ọgbakọ gị, onye ọrụ ibe gị, nwa akwụkwọ ibe gị, onye agbata obi gị, ma ọ bụ onye i zutere n’ozi ubi. Gbalịa ikwughachi, ọ bụghị nanị ihe ndị bụ́ isi kamakwa echiche sitere n’Akwụkwọ Nsọ bụ́ ndị na-akwado ha. Ime nke a ga-abara gị uru, na-enye aka ịkụnye ihe ndị dị mkpa n’uche gị; ọ ga-abakwara ndị ọzọ uru.
Tụgharịa Uche n’Ihe Ndị Dị Mkpa
Tụkwasị n’ịtụleghachi ihe ị gụworo na ịgwa ndị ọzọ banyere ya, ị ga-achọpụta na ịtụgharị uche n’ihe ndị dị mkpa ị mụtaworo bara uru. Esaf na Devid, bụ́ ndị so dee Bible, mere otú ahụ. Esaf sịrị: “M ga-ehota omume nile nke Jaa; n’ihi na m ga-echeta oké ọrụ Gị nile site na mgbe ochie. M ga-atụgharịkwa uche n’ọrụ Gị nile, ọ bụkwa n’omume Gị nile ka m ga-atụgharị obi.” (Ọma 77:11, 12) Devid dekwara n’otu aka ahụ, sị: “N’ime nche abalị nile ka m na-atụgharị uche m na Gị,” nakwa na “echetawo m ụbọchị nile nke mgbe ochie; atụgharịwo m uche n’omume Gị nile.” (Ọma 63:6; 143:5) Ị̀ na-eme nke ahụ?
Ichemi echiche dị otú ahụ n’enweghị ndọpụ uche, nke ị na-anọ na ya atụgharị uche n’ihe dị iche iche Jehova na-eme, àgwà ya, na nkwupụta nke uche ya, na-eme ihe karịrị inyere gị aka icheta ihe. Ọ bụrụ na i mee ka ọ mara gị ahụ́ iche ụdị echiche ahụ, ọ ga-emesi ihe ndị dị mkpa n’ezie ike n’obi gị. Ọ ga-akpụzi ụdị mmadụ ị bụ n’ime. Ihe ndị ị ga na-echeta ga-egosipụta ihe ị na-eche n’ime obi gị.—Ọma 119:16.
Ọrụ Mmụọ Chineke Na-arụ
A dịghị ahapụ nanị anyị mgbe anyị na-achọ icheta eziokwu ndị metụtara ọrụ ndị Jehova na-arụ na ihe ndị Jizọs Kraịst kwuru. N’abalị ikpeazụ tupu ọnwụ ya, Jizọs gwara ụmụazụ ya, sị: “Agwawo m unu ihe ndị a mgbe mụ na unu ka nọ. Ma ihe inyeaka ahụ, bụ́ mmụọ nsọ, nke Nna ahụ ga-ezite n’aha m, nke ahụ ga-akụziri unu ihe nile ma chetara unu ihe nile m gwara unu.” (Jọn 14:25, 26) Matiu na Jọn so ná ndị nọ ya mgbe ahụ. Mmụọ nsọ ọ̀ bụụrụ ha ihe inyeaka dị otú ahụ? Otú ahụ ka ọ dị! Ihe dị ka afọ asatọ ka e mesịrị, Matiu dechara ihe ndekọ mbụ sara mbara banyere ndụ Kraịst, gụnyere ihe na-enweghị atụ ndị o chetara dị ka Ozizi Elu Ugwu na ihe ịrịba ama sara mbara nke ọnụnọ Kraịst na nke ngwụsị nke usoro ihe a. Iri afọ isii na ise mgbe Jizọs nwụsịrị, Jọn onyeozi dere Oziọma ya, gụnyere ihe nile Jizọs kwuru n’abalị ikpeazụ ndịozi ahụ na Onyenwe anyị nọkọrọ tupu ọ tọgbọ ndụ ya. Ihe ịrụ ụka adịghị ya na ma Matiu ma Jọn chetara nnọọ nke ọma ihe ndị Jizọs kwuworo ma mee mgbe ha na ya nọ, ma mmụọ nsọ rụrụ ọrụ gbara ọkpụrụkpụ n’ịhụ na ha echezọghị ụmụ irighiri ihe dị mkpa Jehova chọrọ n’Okwu ya e dere ede.
Mmụọ nsọ ọ̀ na-arụ ọrụ dị ka ihe inyeaka nye ndị na-ejere Chineke ozi taa? Otú a ka ọ dị! Ma, mmụọ nsọ adịghị etinye n’uche anyị ihe anyị na-amụtụbeghị, kama ọ na-arụ ọrụ dị ka ihe inyeaka ichetaghachiri anyị ihe ndị dị mkpa anyị mụworo n’oge gara aga. (Luk 11:13; 1 Jọn 5:14) Mgbe ahụ, n’oge ọ dị mkpa, a na-akpali ikike iche echiche anyị ‘icheta okwu ndị e kwuworo na mbụ site n’ọnụ ndị amụma dị nsọ na ihe Onyenwe anyị na Onye Nzọpụta nyere n’iwu.’—2 Pita 3:1, 2.
‘Unu Echezọla’
Jehova dọrọ ụmụ Izrel aka ná ntị ugboro ugboro, sị: ‘Unu echezọla.’ Ọ bụghị na ọ tụrụ anya n’aka ha icheta ihe nile n’ụzọ zuru okè. Kama ha agaghị etinye uche ha kpam kpam ná nchụso ihe onwe onye nke na ha ga-eleghara icheta otú Jehova siri mesoo ha anya. Ha gaje ịnọgide na-echeta mgbapụta Jehova gbapụtara ha mgbe mmụọ ozi ya tigburu ụmụ nile ndị Ijipt bu ụzọ mụọ nakwa mgbe Jehova meghere Oké Osimiri Uhie ma mechiekwa ya, mee ka mmiri rie Fero na usuu ndị agha ya. Ụmụ Izrel kwesịrị icheta na Chineke nyere ha Iwu ya n’Ugwu Saịnaị nakwa na o duuru ha gabiga ọzara ma banye n’Ala Nkwa ahụ. Ha agajeghị ichezọ ha n’echiche nke bụ́ na icheta ihe ndị a ga-anọgide na-enwe mmetụta dị ukwuu ná ndụ ha na-adị kwa ụbọchị.—Deut. 4:9, 10; 8:10-18; Ọpụ. 12:24-27; Ọma 136:15.
Anyị onwe anyị kwesịkwara ilezi anya ka anyị ghara ichezọ. Ka anyị na-anagide nrụgide nke ndụ, ọ dị anyị mkpa icheta Jehova, na-eburu n’uche ụdị Chineke ọ bụ nakwa ịhụnanya o gosipụtara n’inye Ọkpara ya, bụ́ onye nyere ihe mgbapụta maka mmehie anyị ka anyị wee nwee ndụ zuru okè ruo mgbe ebighị ebi. (Ọma 103:2, 8; 106:7, 13; Jọn 3:16; Rom 6:23) Ịgụchi Bible anya na ikeresi òkè ike ná nzukọ ọgbakọ na n’ozi ubi ga-eme ka eziokwu ndị a dị oké ọnụ ahịa dịgide n’ime anyị.
Mgbe ị nwere mkpebi ndị ị ga-eme, ma hà dị oké mkpa ma hà dị ntakịrị, cheta eziokwu ndị ahụ dị mkpa, kwekwa ka ha metụta ike iche echiche gị. Echezọla. Legara Jehova anya maka nduzi. Kama ile ihe anya n’ụzọ kwekọrọ nanị n’anụ ahụ́ ma ọ bụ ịtụkwasị obi ná mkpali nke obi mmadụ na-ezughị okè, jụọ onwe gị, sị, ‘Olee ndụmọdụ ma ọ bụ ụkpụrụ sitere n’Okwu Chineke nke kwesịrị imetụta mkpebi m?’ (Ilu 3:5-7; 28:26) Ị pụghị icheta ihe ndị ị na-agụtụbeghị ma ọ bụ nụ. Ma ka ị na-enwekwu ezi ihe ọmụma na ịhụnanya maka Jehova, ihe ọmụma mmụọ Chineke pụrụ inyere gị aka icheta ga-ebuwanye ibu, ịhụnanya i nwere maka Jehova bụ́ nke na-ebuwanye ibu ga-akpalikwa gị ime ihe n’ụzọ kwekọrọ na ya.