Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • be ihe ọmụmụ 1 p. 83-p. 85 para. 3
  • Ịgụzi Ihe Agụzi

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ịgụzi Ihe Agụzi
  • Rite Uru ná Mmụta A Na-enweta n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Tinyesie Mgbalị Ike n’Ịgụ Ihe
    Rite Uru ná Mmụta A Na-enweta n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke
  • Nkwụsịtụ Kwesịrị Ekwesị
    Rite Uru ná Mmụta A Na-enweta n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke
  • Irite Uru Site n’Ọgụgụ Bible Kwa Ụbọchị
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1995
  • Ọgụgụ Bible—Ihe Bara Uru Ma Na-atọ Ụtọ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2000
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Rite Uru ná Mmụta A Na-enweta n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke
be ihe ọmụmụ 1 p. 83-p. 85 para. 3

IHE ỌMỤMỤ NKE 1

Ịgụzi Ihe Agụzi

Gịnị ka ọ dị mkpa ka i mee?

Gụpụta kpọmkwem ihe dị n’akwụkwọ. Amafela okwu ụfọdụ, elegharala mkpụrụ akwụkwọ ụfọdụ dị n’okwu anya, ma ọ bụ kpọọ otu okwu n’ọnọdụ okwu ọzọ. Kpọzie okwu akpọzi. Rịba akara edemede na akara ụda olu ama.

Gịnị mere o ji dị mkpa?

Iji nlezianya gụzie ihe agụzi bụ ihe dị mkpa n’ime ka a mata ezi ihe ọmụma nke eziokwu Bible.

AKWỤKWỌ Nsọ na-ekwu na ọ bụ uche Chineke ka ụdị mmadụ nile “bịaruo ezi ihe ọmụma nke eziokwu.” (1 Tim. 2:4) N’ikwekọ na nke ahụ, mgbe anyị na-agụpụta ihe site na Bible, ọchịchọ anyị ime ka e nweta ezi ihe ọmụma kwesịrị imetụta otú anyị si agụ ya.

Ikike ịgụpụta ihe site na Bible nakwa ná mbipụta ndị na-akọwa Bible dị ma ndị ntorobịa ma ndị meworo okenye mkpa. Dị ka Ndịàmà Jehova, anyị nwere ibu ọrụ nke ime ka ndị ọzọ mata Jehova na ụzọ ya. Nke ahụ na-agụnyekarị ịgụrụ otu onye ma ọ bụ ìgwè dị nta ihe. Anyị na-agụkwa ihe n’ụzọ dị otú ahụ n’ime ezinụlọ. N’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke, ụmụnna nwoke na ụmụnna nwanyị, ndị na-eto eto na ndị meworo okenye nwere ohere ndị kwesịrị ekwesị iji nata ndụmọdụ iji wee mee ka ịgụ ihe ha ka mma.

Ịgụpụta Bible n’ihu ọha, ma ọ̀ bụ ịgụrụ ya otu onye ma ọ bụ ọgbakọ, bụ ihe e kwesịrị iji kpọrọ ihe. Bible sitere n’ike mmụọ nsọ Chineke. Tụkwasị na nke ahụ, “okwu Chineke dị ndụ ma na-akpa ike . . . o nwekwara ike ịchọpụta echiche na ebumnuche nke obi.” (Hib. 4:12) Okwu Chineke nwere ihe ọmụma dị oké ọnụ ahịa nke ọ na-enweghị ebe ọzọ a pụrụ isi nweta ya. Ọ pụrụ inyere mmadụ aka ịmata nanị ezi Chineke ahụ na iso ya na-enwe ezi mmekọrịta nakwa inwe ike ịnagide nsogbu nke ndụ. Ọ na-akọwa ụzọ na-eduga ná ndụ ebighị ebi n’ime ụwa ọhụrụ nke Chineke. Ihe mgbaru ọsọ anyị kwesịrị ịbụ ịgụ Bible ruo n’ókè anyị nwere ike.—Ọma 119:140; Jer. 26:2.

Ụzọ Isi Gụzie Ihe Agụzi. E nwere ọtụtụ ihe dị n’ịgụ ihe n’ụzọ dị irè, ma ịmụta ịgụzi ihe agụzi bụ nzọụkwụ mbụ. Nke ahụ pụtara ịgba mbọ ịgụ kpọmkwem ihe dị n’akwụkwọ. Lezie anya ka ị ghara ịmafe okwu ụfọdụ, ịhapụ ịgụ mkpụrụ akwụkwọ ụfọdụ dị ná ngwụsị okwu, ma ọ bụ gụhie okwu n’ihi na ha yiri okwu ndị ọzọ.

Iji gụpụta okwu n’ụzọ ziri ezi, ọ dị gị mkpa ịghọta ihe ndị ọzọ gbara ya gburugburu. Nke ahụ ga-achọ iji nlezianya mee nkwadebe. Ka oge na-aga, ka ị na-azụlitekwu ikike ilepụ anya n’ihu ma na-atụle otú echiche okwu si na-apụta, ị ga na-agụzi ihe agụzi karị.

Akara edemede na akara ụda olu bụcha akụkụ dị mkpa n’asụsụ a na-ede ede. Akara edemede pụrụ igosi ebe a ga-akwụsịtụ, ogologo oge a ga-akwụsịru, nakwa ma eleghị anya mkpa ọ dị ịgbanwe ụda olu. N’asụsụ ụfọdụ, agbanweghị ụda olu mgbe akara edemede chọrọ ka a gbanwee ya pụrụ ime ka ajụjụ ghọọ okwu nkịtị, ma ọ bụ ọ pụrụ ịgbanwe ihe ọ pụtara kpam kpam. Otú ọ dị, mgbe ụfọdụ, ọrụ akara edemede na-arụ na-abụkarị ihe metụtara ụtọ asụsụ. N’ọtụtụ asụsụ, ọ gaghị ekwe omume ịgụzi ihe agụzi ma ọ bụrụ na e jighị nlezianya na-eleru anya n’akara ụda olu—ma ndị a na-ede ede ma ndị a na-aghọta site n’ihe a na-ekwu. Ha na-enwe mmetụta n’ụda mkpụrụ akwụkwọ ndị e dekọtara ha na ha. Hụ na ị maara otú e si eji akara edemede na akara ụda olu eme ihe n’asụsụ gị. Nke a bụ isi ihe dị mkpa n’ịgụ ihe nke ọma. Cheta na ebumnobi gị kwesịrị ịbụ iwepụta echiche dị n’okwu, ọ bụghị nanị ikwupụta mkpụrụ okwu ndị dị na ya.

A chọrọ mmụgharị ihe ma ọ bụrụ na ị ga-azụlite ikike ịgụzi ihe agụzi. Gụọ nanị otu paragraf, mgbe ahụ gụgharịa ya ọtụtụ ugboro ruo mgbe ị pụrụ ịgụ ya n’agụhieghị ihe ọ bụla. Mgbe ahụ gafee na paragraf na-esonụ. N’ikpeazụ, gbalịa ịgụ ọtụtụ peeji nke ihe e dere ede n’amafeghị okwu, n’agụghachighị ma ọ bụ gụhie okwu ọ bụla. Mgbe i mesịworo ihe ndị ahụ, gwa mmadụ ka ọ na-elere gị anya n’ihe ị na-agụ ma gwa gị ebe ọ bụla ị gụhiere ihe.

N’akụkụ ụfọdụ nke ụwa, ahụghị ụzọ nke ọma na enweghị ìhè zuru ezu na-eso eme ka ịgụ ihe sie ike. Ọ bụrụ na ọ ga-ekwe mee ime ihe banyere ọnọdụ ndị a, ihe ịrụ ụka adịghị ya na ọ ga-arụpụta ịgụ ihe nke ọma karị.

Ka oge na-aga, a pụrụ ịgwa ụmụnna nwoke na-agụ ihe nke ọma ka ha soro n’ịgụpụta akwụkwọ a na-amụ n’Ọmụmụ Akwụkwọ Ọgbakọ na n’Ọmụmụ Ihe Ụlọ Nche n’ihu ọha. Ma iji lekọta ihe ùgwù dị otú a nke ọma, a chọrọ ihe karịrị nanị inwe ike ịkpọpụta okwu n’ụzọ ziri ezi. Iji bụrụ onye na-agụ ihe n’ụzọ dị irè n’ihu ọha n’ọgbakọ, ọ ga-adị gị mkpa ịzụlite ezi àgwà n’ọgụgụ ihe onwe onye. Nke a na-agụnye ịghọta na mkpụrụ okwu ọ bụla dị n’ahịrịokwu nwere ọrụ ọ na-arụ. Ị pụghị ileghara ụfọdụ n’ime ha anya ma ghọta ihe a na-ekwu nke ọma. Ọ bụrụ na ị gụhie okwu, ọbụna mgbe ị na-agụrụ onwe gị ihe, ihe ahịrịokwu ahụ pụtara ga-agbanwe. A pụrụ ịgụhie ihe n’ihi ileghara akara ụda olu ma ọ bụ ọnọdụ ndị e ji okwu mee ihe na ha anya. Tinye mgbalị iji ghọta ihe okwu ọ bụla pụtara n’ọnọdụ e ji ya mee ihe. Tụleekwa otú akara edemede si emetụta ihe ahịrịokwu ahụ pụtara. Cheta na ọ bu okwu dị n’ìgwè n’ìgwè na-ewepụtakarị echiche dị n’okwu. Rịba ihe ndị a ama ka i wee na-agụ okwu n’ìgwè n’ìgwè—ná nkebi ahịrịokwu ná nkebi ahịrịokwu—mgbe ị na-agụpụta ihe kama ịdị na-agụ nanị mkpụrụ okwu mkpụrụ okwu. Ịghọta ihe ị na-agụ nke ọma bụ nzọụkwụ dị mkpa iji nwee ike isite n’ịgụ ihe n’ihu ọha mee ka ndị ọzọ nweta ezi ihe ọmụma.

Ọ bụ Onye Kraịst bụ́ okenye nke nweworo ahụmahụ ka Pọl onyeozi degaara akwụkwọ, sị: “Nọgide na-etinyesi mgbalị ike n’ịgụ ihe n’ihu ọha.” (1 Tim. 4:13) O doro anya na nke a bụ ebe anyị nile pụrụ imeziwanye ihe.

AKARA EDEMEDE

Kpọm (.) na-egosi nkwụsị.

Rịkọm (,) na-achọkarị ka a kwụsịtụ nke nta, ebe ọ bụ na okwu ndị ọzọ ga-esochi.

Semikolọn (;) na-egosi nkwụsịtụ na-eruchaghị ka nke kpọm ma ọ karịrị nke rịkọm.

Kolọn (:) na-egosi mmalite ndepụta nke ihe dị iche iche ma ọ bụ nhota okwu; ọ chọrọ nkwụsịtụ n’ahapụghị mgbanwe ụda olu.

Akara iti mkpu (!) na-egosi oké mmetụta n’ụda olu.

Akara ajụjụ (?) na-achọkarị ka e jiri olu dịtụ elu karị ma ọ bụ mgbanwe ụda olu dị elu gụọ ahịrịokwu.

Akara nhota okwu (“ ” ma ọ bụ ‘ ’) pụrụ igosi na e kwesịrị iji nkwụsịtụ mee ka okwu ndị ha malitere na ndị ha mechiri guzopụ iche (nkwụsịtụ ga-adị ntakịrị ma ọ bụrụ na okwu ndị ahụ bụ akụkụ nke ihe odide; ọ ga-ebu ibu karị ma ọ bụrụ na ọ bụ okwu zuru ezu).

Akara ùhiè (—), mgbe e ji ya mee ka okwu guzopụ iche, ọ na-achọkarị ntakịrị mgbanwe n’ụda olu ma ọ bụ n’otú e si na-agụ ihe ngwa ngwa.

Akara ngebichi ( ) na braket [ ] pụrụ ido okwu ndị a ga-eji olu dịtụ ala gụọ iche. Ọ dịghị mkpa ịgụ ebe ndị e zoro aka na ha bụ́ ndị e ji akara ngebichi gebichie, okwu ndị e jikwa braket gebichie bụ́ ndị dị mkpa iji mee ka echiche nke ihe a na-agụ zuo ezu adịghị achọ ka a gbanweere ha ụda olu.

ỤZỌ ISI META YA

  • Mụgharịa ya! Mụgharịa ya! Mụgharịa ya! Gụpụtakwa ya agụpụta.

  • Gwa mmadụ ka ọ na-elere gị anya n’ihe ị na-agụ ma gwa gị ebe ọ bụla ị gụhiere ihe

  • Mgbe ị na-enwe ọmụmụ ihe onwe onye, zụọ onwe gị iji nlezianya na-agụ ihe.

  • Kama ịgụ nanị mkpụrụ okwu, mụta ịgụ okwu n’ìgwè n’ìgwè.

IHE OMUME: Mgbe ị kwadosịworo nke ọma, gwa enyi gị ma ọ bụ onye ezinụlọ gị ka ọ na-ele anya na Bible ka ị na-agụpụta otu ebe na Matiu isi 5 ruo 7. Gwa ya ka ọ kwụsị gị mgbe ọ bụla (1) ị mafere okwu, (2) ị kpọhiere okwu ma ọ bụ gbanwee usoro e ji dee okwu, ma ọ bụ (3) leghara akara ụda olu ma ọ bụ akara edemede ụfọdụ anya bụ́ ndị chọrọ nkwụsịtụ ma ọ bụ mgbanwe ụda olu. Ọ ga-adị mma iji minit iri, ma ọ dịkarịa ala, mee nke a ugboro abụọ ma ọ bụ atọ.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya