IHE ỌMỤMỤ NKE 48
Ụzọ E Si Tụgharịa Uche
ANYỊ nwere ekele maka mgbanwe ndị Okwu Chineke meworo ka anyị nwee ná ndụ anyị, anyị chọkwara ka ndị ọzọ rite uru na ya. Ọzọkwa, anyị maara na otú ndị mmadụ si emeghachi omume n’ozi ọma ga-enwe mmetụta n’ihe ọdịnihu ha ga-abụ. (Mat. 7:13, 14; Jọn 12:48) Ọ na-agụsi anyị agụụ ike ka ha nakwere eziokwu ahụ. Otú ọ dị, ọ dị mkpa ka anyị jikọta nkwenyesi ike na ịnụ ọkụ n’obi anyị nwere na nghọta iji rụpụta ihe kasị mma.
Ndị mmadụ adịghị anabatakarị eziokwu nke a na-ejighị akọ kwuo bụ́ nke na-ekpughe ezighị ezi nke nkwenkwe onye ọzọ kwenyesiri ike na ya, ọbụna mgbe e ji ọtụtụ akụkụ Akwụkwọ Nsọ kwadoo ya. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ nanị na a katọọ ememe ndị a ma ama dị ka ihe ndị ọgọ mmụọ malitere, nke a nwere ike ọ gaghị agbanwe ihe ndị ọzọ na-eche banyere ha. Ịtụgharị uche na-akakarị enwe ihe ịga nke ọma. Gịnị ka ịtụgharị uche na-agụnye?
Akwụkwọ Nsọ na-agwa anyị na ‘amamihe nke sitere n’elu na-eme udo, nwee ezi uche.’ (Jems 3:17) Okwu Grik a sụgharịrị ebe a ịbụ “nwee ezi uche” pụtara n’ụzọ nkịtị “ikwenye ekwenye.” Nsụgharị ụfọdụ kpọrọ ya “nchebara echiche,” “ịdị nwayọọ,” ma ọ bụ “inwe ndidi.” Rịba ama na e jikọtara inwe ezi uche na ime udo. Na Taịtọs 3:2, e hotakọtara ya na ịdị nwayọọ, jirikwa ya mee ihe n’ụzọ dị iche na mmụọ ịlụ ọgụ. Ndị Filipaị 4:5 na-agba anyị ume ịbụ ndị e ji “inwe ezi uche” mara. Onye nwere ezi uche na-eburu nzụlite, ọnọdụ, na mmetụta nke onye ọ na-agwa okwu n’uche. Ọ na-adị njikere ikwenye n’ihe mgbe ime otú ahụ kwesịrị ekwesị. Imeso ndị ọzọ otú ahụ na-enye aka emeghe uche ha na obi ha ka ha wee gee ntị karị mgbe anyị so ha na-atụgharị uche n’Akwụkwọ Nsọ.
Ebe A Ga-amalite. Ọkọ akụkọ ihe mere eme bụ́ Luk na-akọ na mgbe Pọl onyeozi nọ na Tesalonaịka, o jiri Akwụkwọ Nsọ mee ihe, “na-akọwa ma na-anwapụta site n’izo aka n’ebe dị iche iche na ọ dị mkpa ka Kraịst taa ahụhụ na ka o si ná ndị nwụrụ anwụ bilie.” (Ọrụ 17:2, 3) Ọ bụ ihe kwesịrị ịrịba ama na Pọl mere nke a n’ụlọ nzukọ ndị Juu. Ndị ọ na-agwa okwu weere Akwụkwọ Nsọ Hibru dị ka o kwuchaa o bie. Ọ bụ ihe kwesịrị ekwesị iji ihe ha nakweere malite.
Mgbe Pọl na-agwa ndị Grik nọ n’Ariopagọs dị n’Atens okwu, o jighị izo aka n’Akwụkwọ Nsọ malite. Kama nke ahụ, o ji ihe ndị ha maara ma kwere na ha malite, o sikwa na ha duru ha banye n’ịtụle banyere Onye Okike na nzube Ya.—Ọrụ 17:22-31.
N’oge a, e nwere ọtụtụ ijeri mmadụ ndị na-ewereghị Bible dị ka o kwuchaa o bie ná ndụ ha. Ma ajọ ọnọdụ ndị e nwere n’usoro ihe dị ugbu a na-emetụta ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ mmadụ nile. Ọ na-agụsi ndị mmadụ agụụ ike inwe ọnọdụ ka mma. Ọ bụrụ na i buru ụzọ gosi na ihe na-echegbu ha na-emetụ gị n’obi, wee gosizie ha otú Bible si kọwaa ya, omume dị otú ahụ ezi uche dị na ya pụrụ ịkpali ha ịṅa ntị n’ihe Bible na-ekwu banyere nzube Chineke maka ihe a kpọrọ mmadụ.
Ọ pụrụ ịbụ na nkwenkwe na ememe ụfọdụ nke okpukpe so n’ihe onye a na-amụrụ Bible ketara site n’aka ndị mụrụ ya. Ugbu a, onye ahụ a na-amụrụ ihe na-amụta na nkwenkwe na ememe ndị ahụ adịghị amasị Chineke, ọ na-ajụkwa ha ma nakwere ihe a kụziri n’ime Bible. Olee otú onye ahụ a na-amụrụ ihe pụrụ isi kọwaara ndị mụrụ ya mkpebi ya? Ha pụrụ iche na site n’ịjụ okpukpe ha nọ na ya mụọ ya na ọ na-ajụ ha. Onye ahụ a na-amụrụ Bible pụrụ ikwubi na tupu ya agbalịa iji Bible kọwaara ha ihe kpatara ya ji mee mkpebi ya, ọ ga-adị mkpa ka ya mesie ndị mụrụ ya obi ike banyere ịhụnanya na nkwanye ùgwù ya nwere n’ebe ha nọ.
Mgbe A Ga-ekwenye n’Ihe. Jehova n’onwe ya, ọ bụ ezie na o nwere ikike zuru ezu inye iwu, na-egosipụta ezi uche dị ịrịba ama. Mgbe ọ na-anapụta Lọt na ezinụlọ ya na Sọdọm, mmụọ ozi Jehova gbara ya ume, sị: “Wepụga onwe gị jee ugwu ahụ, ka e wee ghara ikpochapụ gị.” Ma, Lọt rịọrọ, sị: “Ee e, biko, onyenwe m.” Ọ rịọrọ ka e kwe ka ya gbaga Zoa. Jehova gosiri Lọt nchebara echiche site n’ikwe ka o mee otú ahụ; n’ihi ya, e bibighị Zoa mgbe e bibiri obodo ndị ọzọ. Otú ọ dị, ka e mesịrị, Lọt gbasoro nduzi mbụ ahụ Jehova nyere wee gaa n’ugwu ahụ. (Jen. 19:17-30) Jehova maara na ụzọ o si eme ihe ziri ezi, ma o ji ndidi gosi Lọt nchebara echiche ruo mgbe ọ bịara ghọta nke ahụ.
Iji soro ndị ọzọ na-emekọrịta ihe nke ọma, ọ dịkwa anyị onwe anyị mkpa iji ezi uche na-eme ihe. Anyị nwere ike ikwenyesi ike na ihe onye nke ọzọ na-ekwu ezighị ezi, anyị nwekwara ike ibu n’uche ihe ndị gbara ọkpụrụkpụ ga-egosi ya. Ma mgbe ụfọdụ ọ na-aka mma ịhapụwa okwu ahụ. Inwe ezi uche apụtaghị imebi ụkpụrụ Jehova. O nwere ike ịka mma nanị ikele onye ahụ maka ikwu echiche ya ma ọ bụ ileghara okwu ụfọdụ na-ezighị ezi anya ka i wee nwee ike ime ka nkwurịta okwu ahụ bụrụ n’ihe ga-arụpụta ihe ka mma. Ọ bụrụgodị na ọ katọọ ihe i kwenyere, ewela iwe. Ị pụrụ ịjụ ya ihe mere o ji chee otú ahụ. Ṅaa ntị nke ọma n’azịza ya. Nke a ga-eme ka ị ghọta ihe bụ́ echiche ya. Ọ pụkwara ịtọ ntọala maka mkparịta ụka na-ewuli elu n’ọdịnihu.—Ilu 16:23; 19:11.
Jehova enyewo ụmụ mmadụ ikike ime nhọrọ. Ọ na-enye ha ohere iji ikike ahụ eme ihe, ọ bụ ezie na ha nwere ike ha agaghị eji ya mee ihe n’ụzọ amamihe. Dị ka ọnụ na-ekwuru Jehova, Jọshụa kọrọ otú Chineke si mesoo Izrel. Ma o kwuziri, sị: “Ọ bụrụ na ọ jọọ njọ n’anya unu ife Jehova ofufe, họpụtaranụ onwe unu taa onye unu ga-efe ofufe; ma ọ bụ chi nile nke nna unu hà fere ofufe nke dị n’ofe Osimiri ahụ, ma ọ bụ chi nile nke ndị Amọraịt, ndị unu onwe unu bi n’ala ha: ma mụ onwe m na ụlọ m, anyị ga-efe Jehova ofufe.” (Josh. 24:15) Ọrụ anyị taa bụ ịgba “àmà,” anyị jikwa nkwenye na-ekwu okwu, ma anyị adịghị anwa ịmanye ndị ọzọ ikweta. (Mat. 24:14) Ha aghaghị ime nhọrọ, anyị adịghịkwa anapụ ha ikike ahụ.
Jụọ Ajụjụ. Jizọs setịpụrụ ihe nlereanya kwesịrị ịrịba ama n’iso ndị mmadụ tụgharịa uche. O chebaara nzụlite ha echiche ma jiri ihe atụ ndị ha ga-anakwere ngwa ngwa mee ihe. O jikwa ajụjụ mee ihe n’ụzọ dị irè. Nke a mere ka ndị ọzọ nwee ohere ikwupụta echiche ha nakwa ihe dị ha n’obi. Ọ kpalikwara ha ịtụgharị uche n’ihe a na-atụle.
Otu nwoke nke maara Iwu jụrụ Jizọs, sị: “Onye Ozizi, site n’ime gịnị ka m ga-eji keta ndụ ebighị ebi?” Ọ dịịrị Jizọs mfe ịza ya. Ma ọ gwara nwoke ahụ ka o kwuo uche ya. “Gịnị ka e dere n’Iwu ahụ? Olee otú i si agụ?” Nwoke ahụ zatara ya. Nzata ọ zatara ya ò mere ka nkwurịta okwu ahụ kwụsị? Ọ dịghị ma ọlị. Jizọs nyere nwoke ahụ ohere ịga n’ihu, ajụjụ nwoke ahụ n’onwe ya jụrụ gosikwara na ọ na-achọ igosi na ya bụ onye ezi omume. Ọ jụrụ, sị: “Ònye n’ezie bụ onye agbata obi m?” Kama ịkọwawa ya, bụ́ nke nwoke ahụ gaara agbagha n’ihi omume ndị Juu nwere n’oge ahụ n’ebe ndị Jentaịl na ndị Sameria nọ, Jizọs gwara ya ka ọ tụgharịa uche n’otu ihe atụ. Ọ bụ banyere onye Sameria bụ ezi onye agbata obi bụ́ onye nyeere onye njem e zuru ohi ma tie ihe aka, ebe onye nchụàjà na onye Livaị na-enyereghị ya aka. Site n’ịjụ ajụjụ dị mfe, Jizọs hụrụ na nwoke ahụ ghọtara isi ihe ọ na-ekwu. Ụzọ Jizọs si tụgharịa uche mere ka okwu bụ́ “onye agbata obi” nwee ihe ọzọ ọ pụtara nke nwoke ahụ na-aghọtatụbeghị. (Luk 10:25-37) Lee ihe nlereanya ọma ọ bụ iṅomi! Kama nanị gị ikwu ihe nile, ya bụ, ịdị na-echere onye nwe ụlọ echiche, mụta ụzọ isi jiri ajụjụ na ihe atụ ndị e ji akọ chepụta gbaa onye na-ege gị ntị ume iche echiche.
Kwuo Ihe Ndị Kpatara Ihe. Mgbe Pọl onyeozi kwuru okwu n’ụlọ nzukọ dị na Tesalonaịka, ọ bụghị nanị ịgụ ihe sitere n’akwụkwọ, nke ndị na-ege ya ntị nakweere ka o mere. Luk na-akọ na Pọl kọwara, nwapụta, ma gosi otú a pụrụ isi jiri ihe ọ gụrụ mee ihe. N’ihi ya, “ụfọdụ n’ime ha ghọrọ ndị kwere ekwe wee soro Pọl na Saịlas na-akpakọrịta.”—Ọrụ 17:1-4.
N’agbanyeghị onye anyị pụrụ ịdị na-agwa okwu, isi otú ahụ na-atụgharị uche pụrụ ịba uru. Nke ahụ bụ eziokwu mgbe ị na-agbara ndị ikwu àmà, na-agwa ndị ọrụ ibe gị ma ọ bụ ụmụ akwụkwọ ibe gị okwu, na-agwa ndị ị na-amabughị okwu mgbe ị na-agba àmà n’ihu ọha, na-eduzi ọmụmụ Bible, ma ọ bụ na-ekwu okwu n’ọgbakọ. Mgbe ị gụrụ otu akụkụ Akwụkwọ Nsọ, ihe ọ pụtara nwere ike ido gị anya ma ikekwe ọ gaghị edo onye ọzọ anya. Nkọwa gị ma ọ bụ otú i si jiri ya mee ihe pụrụ ịda ná ntị ka ọ bụ ikwenyesi ike n’echiche gị gabiga ókè. Ịhọrọ na ịkọwa okwu ụfọdụ gbara ọkpụrụkpụ dị n’akụkụ Akwụkwọ Nsọ ahụ ọ̀ pụrụ inye aka? Ị̀ pụrụ inye ihe àmà na-akwado ya, ikekwe site n’ihe e kwuru n’ebe ị gụrụ ma ọ bụ site n’akụkụ Akwụkwọ Nsọ ọzọ nke kwuru okwu n’isiokwu ahụ? Ihe atụ ọ̀ pụrụ igosi ezi uche dị n’ihe i kwuru? Ajụjụ hà ga-enyere ndị na-ege gị ntị aka ịtụgharị uche n’okwu ahụ? Isi otú ahụ na-atụgharị uche na-eme ka e nwee echiche ziri ezi ma na-eme ka ndị ọzọ nwee ọtụtụ ihe ha ga-echebara echiche.