Isi nke Atọ
Jidesie Okwu Chineke Ike
1. (a) Olee otú Izrel oge ochie si hụ ịbụ eziokwu nke okwu Chineke? (b) N’ihi gịnị ka nke ahụ ji na-adọrọ mmasị anyị?
“UNU amawo n’obi unu nile na n’ime mkpụrụ obi unu nile, na ọ dịghị otu ihe dapụrụ n’ezi ihe nile nke Jehova, bụ́ Chineke unu, kwuru banyere unu; ha nile emeworo unu.” (Joshua 23:14-16) Nke a bụ ihe Jọshụa gwara ndị okenye Izrel mgbe ha birisịwooro n’Ala Nkwa ahụ. Ee, nkwa Jehova mesịrị bụrụ ndị a pụrụ ịtụkwasị obi. E chekwaara anyị ihe ndekọ ahụ—na ihe ndị ọzọ nile e dere na Bible—ka “anyị wee . . . nwee olileanya.”—Ndị Rom 15:4.
2. (a) N’echiche dị aṅaa ka Bible “sitere n’ike mmụọ nsọ Chineke”? (b) Ebe anyị matara na Bible sitere n’ike mmụọ nsọ Chineke, olee ibu ọrụ anyị nwere?
2 Ọ bụ ezie na e ji ihe dị ka mmadụ 40 dee Bible, ọ bụ Jehova n’onwe ya bụ Onye Chepụtara ya. Nke a ọ̀ pụtara na ọ bụ ya duziri kpọmkwem ihe nile e dere n’ime ya? Ee. O ji mmụọ nsọ ya dị ike, bụ́ ike ya nọ n’ọrụ, mee nke a. Pọl onyeozi kwuru n’eziokwu, sị: “Akwụkwọ Nsọ dum sitere n’ike mmụọ nsọ Chineke, . . . ka onye nke Chineke wee ruo eru n’ụzọ zuru ezu, bụrụ onye a kwadebere n’ụzọ zuru ezu maka ezi ọrụ ọ bụla.” Ndị mmadụ nọ n’ebe nile, bụ́ ndị kwetara nke ahụ, na-aṅa ntị n’ihe Bible na-ekwu ma na-ebi ndụ n’ụzọ kwekọrọ n’ihe ndị dị n’ime ya.—2 Timoti 3:16, 17; 1 Ndị Tesalonaịka 2:13.
Nyere Ndị Ọzọ Aka Ịghọta Ya
3. Olee ụzọ kasị mma isi nyere ọtụtụ ndị na-ekweghị na Bible bụ Okwu Chineke aka?
3 Ọtụtụ ndị anyị na-agwa okwu ekweghị na Bible bụ Okwu Chineke dị ka anyị kwere. Olee otú anyị pụrụ isi nyere ha aka? Ọtụtụ mgbe, ụzọ kasị mma bụ imeghe Bible ma gosi ha ihe dị n’ime ya. “Okwu Chineke dị ndụ ma na-akpa ike, dịkwa nkọ karịa mma agha ihu abụọ ọ bụla, . . . o nwekwara ike ịchọpụta echiche na ebumnuche nke obi.” (Ndị Hibru 4:12) “Okwu Chineke” abụghị akụkọ ihe mere eme oge ya gafeworo; ọ ka dị irè! Nkwa ndị dị na Bible na-eru mmezu ha n’enweghị ihe mgbochi. Mmetụta ozi Bible na-enwe ná mkpali mmadụ na-enwe n’ezie n’ime n’obi ya dị ike karịa ihe ọ bụla anyị onwe anyị pụrụ ikwu.
4. Nkọwa dịgasị aṅaa nke eziokwu Bible meworo ka omume ụfọdụ ndị n’ebe Bible dị gbanwee, n’ihi gịnịkwa?
4 Ịhụ aha Chineke n’ime Bible emewo ka ụfọdụ ndị nyobakwuo anya n’ime ya. Ndị ọzọ ekpebiwo ịmụ Bible mgbe e gosiri ha ihe ọ na-ekwu banyere nzube nke ndụ, ihe mere Chineke ji kwere ka ajọ omume dịrị, ihe ihe ndị na-eme ugbu a pụtara, ma ọ bụ olileanya nke ndụ ebighị ebi n’ime ụwa paradaịs. N’ala dị iche iche ebe ihe omume okpukpe meworo ka ndị ajọ mmụọ na-enye ndị mmadụ nsogbu, nkọwa Bible na-enye banyere ihe na-akpata nke a nakwa ụzọ mmadụ pụrụ isi nwere onwe ya akpaliwo mmasị ha. Gịnị mere ihe ndị a ji amasị ndị nwere obi eziokwu? N’ihi na Bible bụ nanị ebe a pụrụ isi nweta ihe ọmụma a pụrụ ịtụkwasị obi banyere ụdị okwu ahụ nile ndị dị oké mkpa.—Abụ Ọma 119:130.
5. (a) Mgbe ndị mmadụ sịrị na ha ekweghị na Bible, gịnị pụrụ ịbụ ihe ndị kpatara ya? (b) Olee otú anyị pụrụ isi nyere ndị dị otú ahụ aka?
5 Otú ọ dị, gịnị ma ọ bụrụ na ndị mmadụ agwa anyị na ha ekweghị na Bible? Nke ahụ ò kwesịrị ime ka mkparịta ụka ahụ kwụsị? O kwesịghị, ma ọ bụrụ na ha dị njikere ịtụgharị uche. Ọ pụrụ ịbụ na ha na-ele Bible anya dị ka akwụkwọ Krisendọm dere. Akụkọ banyere ihu abụọ ya na aka ọ na-etinye na ndọrọ ndọrọ ọchịchị, tinyekwara arịrịọ ego ọ na-arịọ mgbe nile, pụrụ ịbụ ihe kpatara mmeghachi omume ha na-adịghị mma n’ebe Bible dị. Gịnị ma ị jụọ ha ma ọ bụ ihe ndị ahụ kpatara ya? Nkatọ Bible katọrọ ụzọ ụwa nke Krisendọm si eme ihe, tinyere ọdịiche dị n’etiti Krisendọm na ezi Iso Ụzọ Kraịst, pụrụ ịkpali mmasị ha.—Maịka 3:11, 12; Matiu 15:7-9; Jems 4:4.
6. (a) Gịnị mere ka i kweta na Bible bụ Okwu Chineke? (b) Olee ihe ndị ọzọ a pụrụ ikwu iji nyere ndị ọzọ aka ịghọta na Bible sitere n’aka Chineke n’ezie?
6 Nye ndị ọzọ, iso ha kwurịta kpọmkwem ihe àmà ndị na-egosi na Bible sitere n’ike mmụọ nsọ Chineke pụrụ inye aka. Olee ihe ndị mere ka o doo gị anya na Bible sitere n’aka Jehova Chineke? Ọ̀ bụ ihe Bible n’onwe ya na-ekwu banyere ebe o sitere? Ka ọ̀ bụ eziokwu ahụ bụ́ na Bible nwere ọtụtụ amụma ndị na-egosipụta na ọ maara n’ụzọ zuru ezu ihe ọdịnihu ga-abụ, amụma ndị na-aghaghị isiteworị n’aka onye ka mmadụ elu? (2 Pita 1:20, 21) Ọ̀ bụ ma eleghị anya n’ihi na e nwere nkwekọrịta dị ịtụnanya n’ihe ndị e dere n’ime Bible, ọ bụ ezie na ọ bụ mmadụ 40 dere ya n’ime oge dị ihe dị ka afọ 1,600? Ka ọ̀ bụ izi ezi ya ma a bịa na nkà mmụta sayensị n’adịghị ka ihe odide ndị ọzọ e dere n’oge ahụ? Ka ọ̀ bụ ezoghị ọnụ nke ndị dere ya? Ka ọ̀ bụ nchebe e chebere ya n’agbanyeghị mgbalị kpụ ọkụ n’ọnụ e mere iji bibie ya? Ị pụkwara iji ihe ọ bụla masịrị gị onwe gị nyere ndị ọzọ aka.a
Ọgụgụ Bible Anyị
7, 8. (a) Gịnị ka anyị kwesịrị iji Bible na-eme? (b) Gịnị dị anyị mkpa tụkwasị n’ọgụgụ Bible onwe onye? (ch) Olee otú gị onwe gị siworo ghọta nzube Jehova?
7 Tụkwasị n’inyere ndị ọzọ aka ikwere na Bible, ọ dịkwa anyị onwe anyị mkpa iwepụta oge iji na-agụchi ya anya. Ị̀ na-eme nke ahụ? N’ime akwụkwọ nile e bipụtaworo, ọ bụ nke a kachasị mkpa. N’ezie, nke a apụtaghị na ọ bụrụ na anyị na-agụ ya n’onwe anyị, na okwu agwụla. Akwụkwọ Nsọ na-adọ aka ná ntị megide anyị ikewapụ onwe anyị iche. Anyị ekwesịghị iche na anyị pụrụ inweta azịza nke ihe nile site n’ime nnyocha nke onwe anyị. Ma ọmụmụ ihe onwe onye ma ịgachi nzukọ ndị Chineke anya dịcha mkpa ma ọ bụrụ na anyị ga-abụ Ndị Kraịst guzoziri eguzozi.—Ilu 18:1; Ndị Hibru 10:24, 25.
8 Banyere nke a, Bible na-akọ banyere otu onye ọrụ ọchịchị Etiopia bụ́ onye na-agụ amụma Aịzaịa. Otu mmụọ ozi gwara Onye Kraịst na-ezisa ozi ọma bụ́ Filip ka ọ jụọ nwoke ahụ, sị: “Ị̀ maara n’ezie ihe ị na-agụ?” Onye Etiopia ahụ ji obi umeala zaa, sị: “N’ezie, olee nnọọ otú m ga-esi mara, ma ọ́ bụghị ma mmadụ ò duziri m?” Ọ rịọrọ Filip ka ọ kọwaara ya akụkụ Akwụkwọ Nsọ ahụ. Filip abụghị onye na-agụ Bible nanị n’onwe ya, onye kwuru ihe o chere banyere akụkụ Akwụkwọ Nsọ ahụ. O so nzukọ Chineke a na-ahụ anya na-akpachi anya. Ya mere, ọ pụrụ inyere onye Etiopia ahụ aka irite uru site ná ntụziaka nke Jehova na-enye site ná nzukọ ahụ. (Ọrụ 6:5, 6; 8:5, 26-35) N’otu aka ahụ taa, ọ dịghị onye na-enweta nghọta ziri ezi nke nzube Jehova nanị n’onwe ya. Enyemaka Jehova ji ịhụnanya na-enye site ná nzukọ ya a na-ahụ anya dị anyị nile mkpa.
9. Usoro dị aṅaa maka ịgụ Bible pụrụ ịbara anyị nile uru?
9 Iji nyere anyị aka ịghọta Bible, nzukọ Jehova na-ewepụta ihe ọmụma Akwụkwọ Nsọ magburu onwe ha n’ime mbipụta dị iche iche. Tụkwasị na nke ahụ, e depụtaara anyị usoro iji na-agụchi Bible anya n’ihe metụtara Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke nke a na-enwe n’ọgbakọ nile nke Ndịàmà Jehova n’ụwa nile. Mmadụ pụrụ irite uru dị ukwuu site n’inyocha Akwụkwọ Nsọ n’onwe ya. (Abụ Ọma 1:1-3; 19:7, 8) Mee mgbalị pụrụ iche ịdị na-agụchi Bible anya. Ọ bụrụgodị na ị naghị aghọta ihe nile ị na-agụ n’ụzọ zuru ezu, gị ịghọtatụ ihe Akwụkwọ Nsọ na-ekwu ga-aba oké uru. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na ị na-agụ nanị peeji anọ ma ọ bụ ise kwa ụbọchị, ị pụrụ ịgụcha Bible n’ihe dị ka otu afọ.
10. (a) Olee mgbe ị na-eji enwe ọgụgụ Bible gị? (b) Olee ndị ọzọ e kwesịrị ịgụnye mgbe a na-agụ Bible, n’ihi gịnịkwa ka ịgụchi ya anya ji dị mkpa?
10 Olee mgbe ị pụrụ inwe ọgụgụ Bible gị? Ọ bụrụ na ị na-ewepụtara ya ọbụna minit 10 ma ọ bụ minit 15 kwa ụbọchị, ị ga-erite uru dị ukwuu. Ma i nweghị ike ime ya otú ahụ, ma ọ dịghị ihe ọzọ, mee ndokwa oge ị ga na-eji agụ ya mgbe nile kwa izu, mgbe ahụkwa gbasosie usoro ahụ ike. Ọ bụrụ na ị lụọla di ma ọ bụ nwunye, gị na di gị ma ọ bụ nwunye gị pụrụ ịdị na-agụpụtara ibe unu Bible. Ọ bụrụ na e nwere ụmụaka toruru oge ịgụ ihe, ha pụrụ ịdị na-agụpụta ya onye gụọ ibe ya agụọ. Ịgụ Bible kwesịrị ịbụ ihe mmadụ ga na-eme ogologo ndụ ya nile, dị ka ọ dị banyere iri ihe. Dị ka ị maara, ọ bụrụ na mmadụ adịghị eri ihe otú dị mma, ọ ga-emetụta ahụ́ ike ya. N’otu aka ahụkwa, ndụ ime mmụọ anyị, ya bụ, ndụ ebighị ebi anyị, dabeere n’anyị ịdị na-eriju afọ mgbe nile “n’okwu ọ bụla nke na-esi n’ọnụ Jehova apụta.”—Matiu 4:4.
Ebumnobi Anyị
11. Gịnị kwesịrị ịbụ ebumnobi anyị ji na-agụ Bible?
11 Gịnị kwesịrị ịbụ ebumnobi anyị ji na-agụ Bible? Nzube anyị ekwesịghị ịbụ nanị ịgụzu ọnụ ọgụgụ peeji ụfọdụ. Ebumnobi anyị kwesịrị ịbụ ịmatakwu Chineke nke ọma ka anyị wee nwee ike ime ka ịhụnanya anyị nwere n’ebe ọ nọ bukwuo ibu ma fee ya n’ụzọ ọ na-anabata. (Jọn 5:39-42) Omume anyị kwesịrị iyi nke onye ahụ so dee Bible, bụ́ onye sịrị: “Jehova, mee ka m mara ụzọ Gị nile; zi m okporo ụzọ Gị nile.”—Abụ Ọma 25:4.
12. (a) N’ihi gịnị ka inweta “ezi ihe ọmụma” ji dị mkpa, mgbalị dịkwa aṅaa ka a pụrụ ịchọ mgbe a na-agụ ihe iji wee nweta ihe ọmụma ahụ? (b) Site n’iji ụzọ iche echiche anọ dị aṅaa eme ihe ka anyị pụrụ inyocha ihe anyị gụrụ na Bible n’ụzọ bara uru? (Lee igbe dị na peeji nke 30.) (ch) Gosi ihe atụ nke isi ihe ndị a site n’ịza ajụjụ ndị e depụtara na paragraf a. Gụọ akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị e zoro aka na ha bụ́ ndị a na-ehotaghị ihe ha kwuru.
12 Ka Jehova na-ezi anyị ihe, ọchịchọ anyị kwesịrị ịbụ inweta ‘ezi ihe ọmụma.’ Ma ànyị enweghị ya, olee otú anyị pụrụ isi tinye Okwu Chineke n’ọrụ n’ụzọ kwesịrị ekwesị ná ndụ anyị ma ọ bụ kọwaara ya ndị ọzọ n’ụzọ ziri ezi? (Ndị Kọlọsi 3:10; 2 Timoti 2:15) Inweta ezi ihe ọmụma na-achọ ka anyị jiri nlezianya na-agụ ihe, ọ bụrụkwa na otu akụkụ tara akpụ, ọ pụrụ ịdị mkpa ka anyị gụọ ya ihe karịrị otu ugboro iji ghọta isi ihe ọ na-ekwu. Anyị ga-eritekwa uru ma ọ bụrụ na anyị ewepụta oge tụgharịa uche n’ihe ahụ anyị gụrụ, na-echebara ya echiche site n’akụkụ dị iche iche. Na peeji nke 30, e depụtara ụzọ anọ bara uru nke isi chee echiche, bụ́ ndị anyị pụrụ ịnwale. A pụrụ inyocha ọtụtụ akụkụ Akwụkwọ Nsọ n’ụzọ bara uru site n’iji otu ma ọ bụ karịa n’ime ụzọ iche echiche ndị a mee ihe. Ka ị na-aza ajụjụ ndị dị na peeji ndị na-esonụ, ị ga-ahụ otú nke ahụ si bụrụ eziokwu.
(1) Ọtụtụ mgbe, akụkụ Akwụkwọ Nsọ ị na-agụ pụrụ ime ka ị mata ihe ụfọdụ banyere ụdị onye Jehova bụ. Dị ka ihe atụ, n’Abụ Ọma 139:13, 14, anyị na-ahụ nchegbu dị ukwuu Chineke nwere maka ụmụ a na-amụbeghị amụ: “Ị na-akpa m n’afọ nne m dị ka e si akpa ákwà. M ga-ekele Gị; n’ihi na e jiwo ihe dị iche iche dị egwu mee ka m bụrụ oké ọrụ: oké ọrụ ka ọrụ Gị nile dị; mkpụrụ obi m makwaara ya nke ọma.” Lee ka ihe ndị Jehova kere eke si maa mma! Otú e si mee mmadụ na-egosi oké ịhụnanya o nwere n’ebe anyị nọ.
N’ihi ihe e kwuru na Jọn 14:9, 10, mgbe anyị gụrụ otú Jizọs si mesoo ndị ọzọ ihe, anyị na-ahụ n’ezie otú Jehova n’onwe ya ga-esi eme omume. N’iburu nke ahụ n’uche, gịnị ka anyị pụrụ ikwubi banyere Jehova site n’ihe ndị ahụ merenụ bụ́ ndị e dekọrọ na Luk 5:12, 13 nakwa na Luk 7:11-15?
(2) Tụlee otú ihe ndekọ ahụ si atụnye ụtụ n’isiokwu nke Bible: igosi oruru o ruuru Jehova ịbụ eze nakwa ido aha ya nsọ site n’Alaeze ahụ nke dị n’aka Jizọs Kraịst, bụ́ Mkpụrụ ahụ e kwere ná nkwa.
Olee otú Izikiel na Daniel si mesie isiokwu nke Bible ike? (Ezikiel 38:21-23; Daniel 2:44; 4:17; 7:9-14)
Olee otú Bible si mee ka a mata Jizọs n’ụzọ doro anya dị ka Mkpụrụ ahụ e kwere ná nkwa? (Ndị Galeshia 3:16)
Olee otú Mkpughe si kọwaa mmezu dị ebube nke isiokwu ahụ banyere Alaeze? (Mkpughe 11:15; 12:7-10; 17:16-18; 19:11-16; 20:1-3; 21:1-5)
(3) Jụọ onwe gị otú ị pụrụ isi jiri ihe ị na-agụ mee ihe n’onwe gị. Dị ka ihe atụ, anyị na-agụ n’Ọpụpụ ruo na Deuterọnọmi banyere omume rụrụ arụ na nnupụisi nke Izrel. Anyị mụtara na àgwà na omume ndị ahụ rụpụtara ihe ọjọọ. Ya mere, e kwesịrị ịkpali anyị ime ihe na-atọ Jehova ụtọ site n’eṅomighị ihe nlereanya ọjọọ nke ndị Izrel. “Ihe ndị a nọgidekwara na-adakwasị ha dị ka ihe atụ, e dekwara ha ede ka ha bụrụ ihe ịdọ aka ná ntị nye anyị bụ́ ndị ọgwụgwụ nke usoro ihe dị iche iche bịakwasịworo.”—1 Ndị Kọrint 10:11.
Olee ihe anyị na-amụta site n’akụkọ banyere ogbugbu Ken gburu Ebel? (Jenesis 4:3-12; Ndị Hibru 11:4; 1 Jọn 3:10-15; 4:20, 21)
Ndụmọdụ Bible nyere Ndị Kraịst, bụ́ ndị nwere olileanya ịga eluigwe ọ̀ na-emetụtakwu ndị nwere olileanya ịdị ndụ ebighị ebi n’elu ala? (Ọnụ Ọgụgụ 15:16; Jọn 10:16)
Ọ bụrụgodị na ọnọdụ anyị n’ọgbakọ Ndị Kraịst dị mma, n’ihi gịnị ka o ji dị mkpa ka anyị chee echiche banyere ụzọ isi na-etinye ndụmọdụ Bible ndị anyị ma ama n’ọrụ n’ụzọ zuru ezu karị? (2 Ndị Kọrint 13:5; 1 Ndị Tesalonaịka 4:1)
(4) Chee echiche otú ị pụrụ isi jiri ihe ị na-agụ nyere ndị ọzọ aka. Mmadụ nile na-echegbu onwe ha banyere nsogbu ahụ́ ike, ya mere, anyị pụrụ isoro ha gụọ ihe Jizọs mere iji gosi ihe ọ ga-eme n’ọ̀tụ̀tụ̀ ka ukwuu mgbe ọ malitere ịchị n’Alaeze ahụ: “Oké ìgwè mmadụ wee bịakwute ya, na-akpọrọ ndị dara ngwụrọ, ndị nwere nkwarụ, ndị ìsì, ndị ogbi, na ọtụtụ ndị na-arịa ihe ndị ọzọ, . . . o wee gwọọ ha.”—Matiu 15:30.
Ole ndị ka ihe ndekọ nke mbilite n’ọnwụ nke ada Jaịrọs pụrụ inyere aka? (Luk 8:41, 42, 49-56)
13. Ihe ndị dị aṅaa ka anyị pụrụ ịtụ anya ga-esi n’usoro nọgidere na-aga n’ihu nke ịgụ Bible na isoro nzukọ Jehova na-amụ ihe pụta?
13 Lee otú ịgụ Bible si aghọ ihe na-enye ụgwọ ọrụ buru ibu mgbe anyị chebaara isi ihe anọ ahụ e kwuru n’elu echiche! N’ikwu eziokwu, ịgụ Bible bụ ihe ịma aka. Ma ọ pụrụ ịbara anyị uru ná ndụ anyị nile, n’ihi na ka anyị na-agụkwu Akwụkwọ Nsọ, anyị ga na-adị ike karị n’ụzọ ime mmụọ. Ịgụchi Bible anya ga-eme ka anyị bịarukwuo Nna anyị na-ahụ n’anya, bụ́ Jehova, nakwa ụmụnna anyị Ndị Kraịst nso. Ọ ga-enyere anyị aka ịṅa ntị na ndụmọdụ ahụ bụ́ “na-ejidesi okwu nke ndụ ike.”—Ndị Filipaị 2:16.
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
a Maka ntụle nke ihe mere e kwesịrị iji tụlee Bible, lee broshuọ bụ́ Akwụkwọ Dịịrị Mmadụ Nile, nke Ndịàmà Jehova bipụtara.
Ntụleghachi n’Ụdị Nkwurịta Okwu
• N’ihi gịnị ka e ji dee Bible ma chekwaa ya ruo n’oge anyị?
• Olee otú anyị pụrụ isi nyere ndị ọzọ aka ịghọta Bible?
• N’ihi gịnị ka ịgụchi Bible anya n’onwe onye ji baa uru? Site n’iji ụzọ iche echiche anọ dị aṅaa eme ihe ka anyị pụrụ inyocha ihe anyị na-agụ n’ụzọ bara uru?
Igbe/Foto dị na peeji nke 30]
MGBE Ị GỤRỤ OTU AKỤKỤ BIBLE, TỤLEE
Ihe ọ na-eme ka ị mata banyere Jehova dị ka onye
Otú o si metụta isiokwu nke Bible dum
Ụzọ o kwesịrị isi metụta ndụ nke gị
Otú ị pụrụ isi jiri ya nyere ndị ọzọ aka