Isi nke Iri na Isii
“Nweenụ Ịhụnanya Siri Ike Maka Ibe Unu”
1. Olee ihe na-amasịkarị ndị ọhụrụ bịara nzukọ Ndịàmà Jehova?
MGBE mbụ ndị mmadụ bịara nzukọ Ndịàmà Jehova, ịhụnanya a na-egosi n’ebe ahụ na-amasịkarị ha. Ha na-ahụ ya site n’ụzọ a na-esi anabata ha nakwa ná mkpakọrịta ịhụnanya a na-enwe n’ebe ahụ. Ndị ọbịa na-abịa mgbakọ anyị na-ahụkwa ịhụnanya a. Otu onye nta akụkọ dere banyere otu mgbakọ, sị: ‘Ọ dịghị onye ọgwụ ọjọọ ma ọ bụ mmanya na-egbu. Ọ dịghị onye na-eti mkpu. Ọ dịghị onye na-akwa ibe ya aka. Ọ dịghị onye na-enupụ ibe ya n’ụzọ. Ọ dịghị onye na-ekwu okwu ọjọọ ma ọ bụ na-akpọ ibe ya iyi. Ọ dịghị onye na-ama njakịrị na-adịghị mma ma ọ bụ na-ekwu okwu rere ure. Ọ dịghị onye na-ese siga. Ọ dịghị onye zuru ohi. Ọ dịghị onye tụsara kom kom n’èzí. N’ezie, ọ bụ ihe a na-adịghị ahụkebe.’ Ihe a nile bụ ihe àmà nke ịhụnanya, ụdị nke “[na-adịghị] akpa àgwà na-ekwesịghị ekwesị, ọ dịghị achọ ọdịmma nke ya.”—1 Ndị Kọrint 13:4-8.
2. (a) Ka oge na-aga, gịnị kwesịrị ịpụta ìhè ma a bịa n’anyị igosipụta ịhụnanya? (b) N’iṅomi Kraịst, olee ụdị ịhụnanya ọ dị mkpa ka anyị zụlite?
2 Ịhụnanya ụmụnna bụ ihe e ji amata ezi Ndị Kraịst. (Jọn 13:35) Ka anyị na-eto n’ụzọ ime mmụọ, anyị na-amụta igosipụtakwu ịhụnanya. Pọl onyeozi kpere ekpere ka ịhụnanya nke Ndị Kraịst ibe ya “na-amụbawanye.” (Ndị Filipaị 1:9) Jọn onyeozi gosiri na ịhụnanya anyị kwesịrị ịbụ nke ịchụ onwe onye n’àjà. O dere, sị: “Anyị esitewo na nke a mara ịhụnanya, n’ihi na [Ọkpara Chineke] tọgbọrọ mkpụrụ obi ya maka anyị; anyị jikwa ụgwọ ịtọgbọ mkpụrụ obi anyị maka ụmụnna anyị.” (1 Jọn 3:16; Jọn 15:12, 13) Ànyị ga-enye ndụ anyị n’ezie maka ụmụnna anyị? Ọ bụ ezie na ọ naghị adị mkpa ime otú ahụ n’ọnọdụ ka ukwuu, ruo n’ókè ha aṅaa ka anyị na-etinyekwu mgbalị iji nyere ha aka ugbu a, ọbụna mgbe ọ na-adịghịrị anyị mfe?
3. (a) N’ụzọ dị aṅaa ka anyị pụrụ isi na-egosipụtakwu ịhụnanya anyị? (b) Gịnị mere o ji dị oké mkpa ka anyị nwee ịhụnanya siri ike maka ibe anyị ugbu a?
3 Tụkwasị n’omume anyị ndị na-egosipụta mmụọ ịchụ onwe onye n’àjà, ọ dị anyị mkpa inwe ezi mmetụta ịhụnanya n’ebe ụmụnna anyị nọ. Okwu Chineke na-agba anyị ume, sị: “N’ịhụnanya ụmụnna, na-enwenụ mmetụta dị nro maka ibe unu.” (Ndị Rom 12:10) Anyị nile na-enwe ụdị mmetụta ahụ n’ebe ndị ụfọdụ nọ. Ma ànyị pụrụ ịmụta inwe ụdị mmetụta ịhụnanya ahụ n’ebe ndị ọzọ nọ? Ka ọgwụgwụ nke usoro ihe ochie a na-eru nso, ọ dị oké mkpa na anyị na Ndị Kraịst ibe anyị ga na-akpachikwu anya. Bible na-ekwu, sị: “Ọgwụgwụ nke ihe nile eruwo nso. . . . Karịsịa ihe nile, nweenụ ịhụnanya siri ike maka ibe unu, n’ihi na ịhụnanya na-ekpuchi ọtụtụ mmehie.”—1 Pita 4:7, 8.
Mgbe E Nwere Nsogbu
4. (a) N’ihi gịnị ka a pụrụ iji nwee nsogbu n’etiti ndị nọ n’ọgbakọ? (b) Ọ bụ ezie na e nwere ike anyị agaghị achọ itinye ndụmọdụ Bible n’ọrụ mgbe nile, olee ihe ọma pụrụ isi na ya pụta ma ọ bụrụ na anyị mee otú ahụ?
4 N’ezie, ọ bụrụhaala na anyị ka bụ ndị na-ezughị okè, a ga-enwe mgbe anyị ga-eme ihe ga-akpasu ndị ọzọ iwe. Ụmụnna anyị kwa pụrụ imehie anyị n’ụzọ dịgasị iche iche. (1 Jọn 1:8) Ọ bụrụ na i nweta onwe gị n’ụdị ọnọdụ ahụ, gịnị ka i kwesịrị ime? Akwụkwọ Nsọ na-enye nduzi dị mkpa. Ma ihe ọ na-ekwu nwere ike ọ gaghị adaba n’ihe anyị, dị ka mmadụ na-ezughị okè, na-achọ ime. (Ndị Rom 7:21-23) Ka o sina dị, anyị iji ịdị uchu na-etinye ndụmọdụ dị n’ime Bible n’ọrụ ga-enye ihe àmà nke ọchịchọ si anyị n’obi ime ihe na-atọ Jehova ụtọ. Ime otú ahụ ga-emekwa ka ịhụnanya anyị nwere n’ebe ndị ọzọ nọ bukwuo ibu.
5. Ọ bụrụ na mmadụ akpasuo anyị iwe, n’ihi gịnị ka anyị na-ekwesịghị iji megwara?
5 Mgbe a kpasuru ndị mmadụ iwe, mgbe ụfọdụ ha na-achọ ụzọ isi megwara onye ahụ nke mejọrọ ha. Ma nanị ihe nke ahụ na-eme bụ ime ka ọnọdụ ahụ ka njọ. Ọ bụrụ na ọ dị mkpa ịkwụghachi ya onye ahụ, anyị kwesịrị ịhapụrụ ya Chineke. (Ilu 24:29; Ndị Rom 12:17-21) Ndị ọzọ pụrụ ịnwa izere iso onye ahụ mejọrọ ha mekọọ ihe. Ma anyị ekwesịghị imeso ndị anyị na ha na-efekọ ofufe otú ahụ, n’ihi na ofufe anyị ịbụ nke a ga-anabata na-adabere ruo n’ókè ụfọdụ n’anyị ịhụ ụmụnna anyị n’anya. (1 Jọn 4:20) N’ihi ya, Pọl dere, sị: “Nọgidenụ na-anagiderịta ibe unu ma na-agbaghara ibe unu kpam kpam ma ọ bụrụ na onye ọ bụla nwere ihe mere ọ ga-eji mee mkpesa megide ibe ya. Ọbụna dị ka Jehova gbaghaara unu kpam kpam, na-emekwanụ otú ahụ.” (Ndị Kọlọsi 3:13) Ị̀ ga-emeli nke ahụ?
6. (a) Ugboro ole ka anyị kwesịrị ịgbaghara nwanna anyị? (b) Ịghọta gịnị ga-enyere anyị aka ime ihe banyere mmehie e mehiere anyị?
6 Gịnị ma ọ bụrụ na mmadụ emejọọ anyị ugboro ugboro ma o meghị mmehie dị oké njọ nke a pụrụ iji n’ihi ya chụpụ ya n’ọgbakọ? Maka ụdị mmehie ndị ahụ dị nta karị, Pita onyeozi tụrụ aro ịgbaghara “ruo ugboro asaa.” Ma Jizọs sịrị: “Ọ bụghị, Ruo ugboro asaa, kama, Ruo ugboro iri asaa na asaa.” O mere ka otú ụgwọ anyị ji Chineke bururu n’ibu pụta ìhè ma e jiri ya tụnyere ụgwọ mmadụ ọ bụla pụrụ iji anyị. (Matiu 18:21-35) Anyị na-emehie Chineke kwa ụbọchị n’ọtụtụ ụzọ—mgbe ụfọdụ site n’ime omume na-egosi ịchọ ọdịmma onwe onye nanị, site n’ihe anyị na-ekwu ma ọ bụ na-eche, ma ọ bụ site n’ihe anyị na-emeghị—n’amaghịdị na anyị na-eme mmehie. (Ndị Rom 3:23) Ma, Chineke nọgidere na-emere anyị ebere. (Abụ Ọma 103:10-14; 130:3, 4) Ọ chọrọ ka anyị si otú ahụ na-emeso ibe anyị. (Matiu 6:14, 15; Ndị Efesọs 4:1-3) Mgbe ahụ anyị ga na-egosi ụdị ịhụnanya ahụ nke ‘na-adịghị agụkọ ihe ọjọọ.’—1 Ndị Kọrint 13:4, 5; 1 Pita 3:8, 9.
7. Gịnị ka anyị kwesịrị ime ma ọ bụrụ na nwanna buuru anyị iwe n’obi?
7 Mgbe ụfọdụ, anyị pụrụ ịchọpụta na n’agbanyeghị na anyị ebughịrị nwanna anyị iwe n’obi, na o buuru anyị iwe n’obi. Anyị pụrụ ikpebi ileghara àgwà nwanna ahụ anya ma ‘jiri ịhụnanya kpuchie ya,’ dị ka 1 Pita 4:8 tụrụ n’aro. Ma ọ bụ anyị pụrụ ibu ụzọ gakwuru ya ma soro ya kwurịta okwu ma gbalịa ime ka anyị na ya dịghachi n’udo.—Matiu 5:23, 24.
8. Ọ bụrụ na onye kwere ekwe ibe anyị na-eme ihe na-ewe anyị iwe, gịnị ka a pụrụ ime maka ya?
8 Ọ pụrụ ịbụ na onye kwere ekwe ibe gị na-eme ihe na-ewe ma gị ma ndị ọzọ iwe. Ọ̀ bụ na ọ gaghị adị mma ịgwa ya okwu? Ma eleghị anya. Ọ bụrụ na gị onwe gị ejiri obiọma kọwaara ya nsogbu ahụ, nke a pụrụ ịrụpụta ihe dị mma. Ma i kwesịrị ibu ụzọ jụọ onwe gị, sị: ‘Ọ̀ na-eme ihe Akwụkwọ Nsọ na-akwadoghị n’ezie? Ka nsogbu ahụ ọ̀ bụ, n’ụzọ ka ukwuu, n’ihi na ebe m nọ tolite na otú e si zụlite m dị iche na nke ya?’ Lezie anya ka ị ghara isetịpụ ụkpụrụ nke gị ma jiri ya na-ekpe ikpe. (Jems 4:11, 12) Jehova na-anakwere ndị si n’ụdị ọnọdụ dị iche iche n’eleghị mmadụ anya n’ihu, ọ na-enwekwara ha ndidi ka ha na-eto n’ụzọ ime mmụọ.
9. (a) Olee ndị na-elebara okwu ndị metụtara mmehie ndị dị oké njọ anya n’ọgbakọ? (b) Olee mgbe ọ bụ ọrụ onye e mejọrọ ibu ụzọ mee ihe, n’ebumnobi dịkwa aṅaa?
9 Ọ bụrụ na onye nọ n’ọgbakọ etinye aka ná mmehie dị oké njọ, dị ka omume rụrụ arụ, e kwesịrị ilebara ya anya ozugbo. Olee ndị ga-elebara ya anya? Ọ bụ ndị okenye. (Jems 5:14, 15) Otú ọ dị, ọ bụrụ na e mee mmehie megide mmadụ, ikekwe n’okwu achụmnta ego ma ọ bụ site n’ikwu okwu n’ụzọ na-adịghị mma, mgbe ahụ, onye ahụ e mehiere kwesịrị ibu ụzọ mee mgbalị ịgakwuru onye ahụ mehiere ya, nanị ya na ya. (Matiu 18:15) Ọ bụrụ na nke ahụ edozighị nsogbu ahụ, ọ ga-adị mkpa imekwu ihe dị ka e depụtara na Matiu 18:16, 17. Ịhụnanya anyị nwere n’ebe nwanna anyị na-agahie agahie nọ na ọchịchọ ‘irite ya n’uru’ ga-enyere anyị aka ime nke a n’ụzọ iji ruo ya n’obi.—Ilu 16:23.
10. Mgbe nsogbu dapụtara, gịnị ga-enyere anyị aka ile okwu ahụ anya n’ụzọ kwesịrị ekwesị?
10 Mgbe nsogbu dapụtara, ma ò buru ibu ma ọ dị ntakịrị, ọ na-abara anyị uru ma ọ bụrụ na anyị agbalịa ịghọta otú Jehova si ele ya anya. Ọ dịghị akwado mmehie n’ụdị ọ bụla, n’oge nke ya kwa, a na-achụpụ ndị na-eme mmehie dị oké njọ, bụ́ ndị na-enweghị nchegharị ná nzukọ ya. Otú ọ dị, ka anyị ghara ichefu na anyị nile na-emehie n’ụzọ ndị dị nta karị, ogologo ntachi obi na ebere ya dịkwa anyị mkpa. Jehova si otú a na-esetịpụrụ anyị ụkpụrụ anyị ga-eṅomi mgbe ndị ọzọ mehiere anyị. Mgbe anyị bụ ndị na-eme ebere, anyị na-egosipụta ịhụnanya ya.—Ndị Efesọs 5:1, 2.
Chọọ Ụzọ Isi ‘Gbasapụ’
11. Gịnị mere Pọl ji gbaa ndị Kọrint ume ka ha ‘gbasapụ’?
11 Pọl nọrọ ọtụtụ ọnwa na-ewuli ọgbakọ dị na Kọrint, Gris elu. Ọ rụsiri ọrụ ike iji nyere ụmụnna nọ n’ebe ahụ aka, ọ hụkwara ha n’anya. Ma ụfọdụ n’ime ha enweghị mmetụta ịhụnanya n’ebe ọ nọ. Ha na-akatọ ya nke ukwuu. Ọ gbara ha ume ka ha ‘gbasapụ’ n’igosipụta mmetụta ịhụnanya. (2 Ndị Kọrint 6:11-13; 12:15) Ọ ga-adị mma ka anyị nile tụlee ókè anyị na-egosiru ndị ọzọ ịhụnanya ma chọọ ụzọ isi gbasapụ.—1 Jọn 3:14.
12. Olee otú anyị pụrụ isi mee ka ịhụnanya anyị nwere n’ebe ndị nile nọ n’ọgbakọ nọ bukwuo ibu?
12 È nwere ụfọdụ ndị nọ n’ọgbakọ, ndị ọ na-esiri anyị ike ịkpa nso? Ọ bụrụ na anyị emee mgbalị pụrụ iche iji leghara ọdịiche ọ bụla e nwere n’ụdị mmadụ ha bụ anya—dị ka anyị ga-achọ ka ha leghara nke anyị anya—nke a pụrụ inye aka mee ka e nwee ịhụnanya ná mmekọrịta anyị na ha. Mmetụta anyị nwere n’ebe ha nọ pụkwara ịka mma ma ọ bụrụ na anyị achọpụta àgwà ha ndị dị mma ma lekwasị anya na ha. Nke a ga-eme n’ezie ka ịhụnanya anyị nwere n’ebe ha nọ bukwuo ibu.—Luk 6:32, 33, 36.
13. Olee otú anyị pụrụ isi gbasapụ n’igosi ndị nọ n’ọgbakọ anyị ịhụnanya?
13 N’eziokwu, e nwere ókè anyị ga-eru n’imere ndị ọzọ ihe. Ọ pụrụ ịbụ na anyị agaghị enwe ike ikele mmadụ nile ná nzukọ nke ọ bụla. E nwere ike ọ gaghị ekwe omume ịkpọ mmadụ nile mgbe anyị na-akpọ ndị enyi anyị iso anyị rie ihe. Ma ànyị pụrụ ịgbasapụ site n’iwepụta nanị minit ole na ole wee matakwuo onye nọ n’ọgbakọ anyị nke ọma? Ànyị pụrụ ịkpọ onye anyị na-amachaghị nke ọma ka anyị na ya rụọ n’ozi ubi mgbe ụfọdụ?
14. Mgbe anyị na Ndị Kraịst anyị na-ezutetụbeghị nọ, olee otú anyị pụrụ isi gosi ịhụnanya siri ike maka ibe anyị?
14 Mgbakọ Ndị Kraịst bụ ohere magburu onwe ha iji gbasapụ n’ịhụnanya anyị. Ọtụtụ puku mmadụ pụrụ ịbịa. Anyị agaghị enwe ike ịhụ ha nile, ma anyị pụrụ ịkpa àgwà n’ụzọ na-egosi na anyị na-ebute ọdịmma ha ụzọ tupu ntụsara ahụ́ nke onwe anyị. N’oge nkwụsịtụ, anyị pụrụ igosi mmasị onwe onye site n’ibute ụzọ n’ịgakwuru ụfọdụ n’ime ndị nọ anyị gburugburu. Otu ụbọchị, ndị nile bi n’ụwa ga-abụ ụmụnna nwoke na ụmụnna nwanyị, ndị dị n’otu n’ofufe nke ezi Chineke ahụ na Nna nke mmadụ nile. Lee ihe ọṅụ ọ ga-abụ ịmata ibe anyị! Ịhụnanya siri ike ga-akwali anyị ịchọ ime nke ahụ. Gịnị ma ị malite ugbu a?
Ntụleghachi n’Ụdị Nkwurịta Okwu
• Mgbe e nwere nsogbu n’etiti Ndị Kraịst, olee otú e kwesịrị isi dozie ha, n’ihi gịnịkwa?
• Ka anyị na-eto n’ụzọ ime mmụọ, n’ụzọ dịgasị aṅaa ka ịhụnanya anyị kwesịkwara isi na-ebukwu ibu?
• Olee otú ọ ga-esi kwe omume igosi ịhụnanya siri ike maka ndị ọzọ ma e wezụga nanị ezi ndị enyi anyị?
[Foto dị na peeji nke 148]
A na-egosipụta ịhụnanya Ndị Kraịst n’ọtụtụ ụzọ, dị ka ná nzukọ ọgbakọ