Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • wt isi 17 p. 151-158
  • Na-etinye Nsọpụrụ Chineke n’Ọrụ n’Ebe Obibi

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Na-etinye Nsọpụrụ Chineke n’Ọrụ n’Ebe Obibi
  • Fee Onye Nanị Ya Bụ Ezi Chineke ahụ Ofufe
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ogologo Oge Hà Aṅaa Ka Alụmdi na Nwunye Ga-adịru?
  • Onye Ọ Bụla Ime Òkè nke Ya
  • Ebe A Ga-enweta Azịza
  • Otú Di na Nwunye Bụ́ Ndị Kraịst Ga-esi Na-ebi n’Udo
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2016
  • Nwetara Ezinụlọ Gị Ọdịnihu Na-adịgide Adịgide
    Isi Ihe Na-akpata Obi Ụtọ Ezinụlọ
  • Alụmdi na Nwunye Bụ Onyinye Chineke Nwere Ịhụnanya Nyere Anyị
    “Nọrọnụ n’Ịhụnanya Chineke”
  • Mee Alụmdi na Nwunye Gị Njikọ Na-adịgide Adịgide
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1994
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Fee Onye Nanị Ya Bụ Ezi Chineke ahụ Ofufe
wt isi 17 p. 151-158

Isi nke Iri na Asaa

Na-etinye Nsọpụrụ Chineke n’Ọrụ n’Ebe Obibi

1. Olee mmetụta iji nduzi sitere n’Okwu Chineke na-eme ihe nweworo n’alụmdi na nwunye dị iche iche?

JEHOVA bụ Onye Malitere alụmdi na nwunye, Okwu ya na-enyekwa nduzi kasị nnọọ mma maka ezinụlọ. N’ihi iji nduzi ahụ na-eme ihe, ọtụtụ ndị enwewo alụmdi na nwunye na-aga nke ọma. N’ụzọ kwesịrị ịja mma, a kpaliwo ụfọdụ ndị na-ebikọ ọnụ idebanye alụmdi na nwunye ha n’akwụkwọ n’ụzọ iwu kwadoro. Ndị ọzọ akwụsịwo iso onye na-abụghị di ma ọ bụ nwunye ha na-enwe mmekọahụ. Ndị ikom na-eme ihe ike, bụ́ ndị na-agwabu nwunye ha na ụmụ ha okwu ọjọọ ma na-eti ha ihe amụtawo ịdị na-egosi obiọma na ịdị nro.

2. Gịnị ka ndụ ezinụlọ nke Ndị Kraịst gụnyere?

2 Ndụ ezinụlọ nke Ndị Kraịst na-agụnye ọtụtụ ihe, dị ka otú anyị si ele ịdịgide adịgide nke alụmdi na nwunye anya, ihe anyị na-eme iji na-arụzu ọrụ dịịrị anyị n’ime ezinụlọ, na ụzọ anyị si na-emeso ndị òtù ezinụlọ anyị. (Ndị Efesọs 5:33–6:4) Ọ bụ ezie na anyị pụrụ ịma ihe Bible na-ekwu banyere ndụ ezinụlọ, ma itinye ndụmọdụ Bible n’ọrụ dị iche. Ọ dịghị onye ọ bụla n’ime anyị chọrọ iyi ndị ahụ Jizọs katọrọ n’ihi imebi iwu Chineke. Ha chere n’ụzọ na-ezighị ezi na nanị iji okpukpe kpọrọ ihe ezuola. (Matiu 15:4-9) Anyị achọghị inwe ọdịdị nke nsọpụrụ Chineke ma ghara ịdị na-etinye ya n’ọrụ n’ezinụlọ nke anyị. Kama nke ahụ, anyị kwesịrị ịdị na-egosipụta ezi nsọpụrụ Chineke, nke bụ́ “ụzọ isi rite uru dị ukwuu.”—1 Timoti 5:4; 6:6; 2 Timoti 3:5.

Ogologo Oge Hà Aṅaa Ka Alụmdi na Nwunye Ga-adịru?

3. (a) Gịnị na-eme ọtụtụ alụmdi na nwunye, ma gịnị kwesịrị ịbụ mkpebi anyị? (b) Site n’iji Bible gị eme ihe, zaa ajụjụ ndị e depụtara n’okpuru paragraf a.

3 Njikọ alụmdi na nwunye na-aghọwanye nke na-esighị ike. Ụfọdụ di na nwunye bikọworo ọnụ ruo ọtụtụ afọ na-ekpebi ịgba alụkwaghịm ma lụrụ onye ọzọ. Ọzọkwa, ọ bụkwaghị ihe ọhụrụ ịnụ na ndị ka lụrụ di na nwunye ekewawo mgbe ntakịrị oge gasịrị. N’agbanyeghị ihe ndị ọzọ na-eme, anyị kwesịrị ịchọ ime ihe ga-atọ Jehova ụtọ. Ya mere, ka anyị tụlee ajụjụ na akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị na-esonụ iji hụ ihe Okwu Chineke na-ekwu banyere ịdịgide adịgide nke alụmdi na nwunye.

Mgbe nwoke na nwanyị lụrụ di na nwunye, ogologo oge hà aṅaa ka ha ga-atụ anya ibikọ ọnụ? (Mak 10:6-9; Ndị Rom 7:2, 3)

Gịnị bụ nanị ihe ndabere ziri ezi e nwere n’anya Chineke maka ịgba alụkwaghịm ma nwee ike ịlụgharị di ma ọ bụ nwunye? (Matiu 5:31, 32; 19:3-9)

Gịnị bụ echiche Jehova banyere ịgba alụkwaghịm ndị Okwu ya na-akwadoghị? (Malakaị 2:13-16)

Bible ọ̀ na-akwado ime nkewa dị ka ụzọ isi dozie nsogbu alụmdi na nwunye? (1 Ndị Kọrint 7:10-13)

N’ọnọdụ dịgasị aṅaa ka a pụrụ ikewa? (Abụ Ọma 11:5; Luk 4:8; 1 Timoti 5:8)

4. Gịnị mere alụmdi na nwunye ụfọdụ ji adịgide adigide?

4 Ụfọdụ alụmdi na nwunye na-enwe ihe ịga nke ọma ma na-adịgide adịgide. N’ihi gịnị? Ichere ruo mgbe mmadụ abụọ ahụ tozuru okè bụ otu ihe dị mkpa, ma ọ dịkwa mkpa ịchọta onye òtù ọlụlụ nke gị na ya na-enwe mmasị n’otu ihe, onye gị na ya pụkwara ikwurịta okwu n’ezoghị ọnụ. Otú ọ dị, ihe ka mkpa bụ ịchọta di ma ọ bụ nwunye hụrụ Jehova n’anya ma na-asọpụrụ Okwu ya dị ka ebe mgbakwasị ụkwụ iji dozie nsogbu dị iche iche. (Abụ Ọma 119:97, 104; 2 Timoti 3:16, 17) Onye dị otú ahụ agaghị enwe àgwà bụ́ na ọ bụrụ na ihe agaghị otú e si chee ya, na ya pụrụ ikewara ma ọ bụ gbaa alụkwaghịm mgbe ọ bụla. Ọ gaghị eji emezighị emezi nke di ma ọ bụ nwunye ya mere ihe ngọpụ maka ileghara ibu ọrụ ya anya. Kama nke ahụ, ọ ga-eche nsogbu ndị ahụ ihu ma chọta ihe ngwọta ndị ga-adị irè.

5. (a) Olee òkè iguzosi ike n’ihe nye Jehova na-ekere n’alụmdi na nwunye? (b) Ọbụna mgbe e nwere mmegide, olee uru ndị a pụrụ irite n’ịgbaso ụkpụrụ Jehova?

5 Setan na-arụ ụka na mgbe anyị tara ahụhụ, anyị ga-ahapụ ụzọ Jehova. (Job 2:4, 5; Ilu 27:11) Ma ihe ka nnọọ n’ọnụ ọgụgụ ná Ndịàmà Jehova, bụ́ ndị hụsịworo anya n’ihi inwe di ma ọ bụ nwunye na-emegide emegide emebibeghị nkwa alụmdi na nwunye ha. Ha ka na-eguzosi ike n’ihe nye Jehova na iwu ya nile. (Matiu 5:37) Ụfọdụ ndị, bụ́ ndị tachiworo obi enwewo ọṅụ nke ịbụ ndị di ha ma ọ bụ nwunye ha sonyeere n’ijere Jehova ozi—ọbụna mgbe ọtụtụ afọ nke mmegide gasịrị! (1 Pita 3:1, 2) Banyere Ndị Kraịst, bụ́ ndị ndị òtù ọlụlụ ha na-adịghị egosi ihe àmà ọ bụla nke ime mgbanwe ma ọ bụ ndị ndị òtù ọlụlụ ha gbahapụrụ n’ihi na ha na-ejere Jehova ozi, ha onwe ha kwa maara na a ga-agọzi ha maka inye ihe àmà nke nsọpụrụ Chineke n’ebe obibi ha.—Abụ Ọma 55:22; 145:16.

Onye Ọ Bụla Ime Òkè nke Ya

6. Iji nwee alụmdi na nwunye na-aga nke ọma, ndokwa dị aṅaa ka a na-aghaghị ịkwanyere ùgwù?

6 N’ezie, inwe alụmdi na nwunye na-aga nke ọma chọrọ ihe karịrị nanị ibikọ ọnụ. Otu ihe dị mkpa a chọrọ n’aka onye òtù ọlụlụ nke ọ bụla bụ ịkwanyere ndokwa Jehova maka ịbụisi ùgwù. Nke a na-eme ka ihe na-aga n’usoro dị mma nakwa ka e nwee obi iru ala n’ụlọ. Ná 1 Ndị Kọrint 11:3, anyị na-agụ, sị: “Isi nke nwoke ọ bụla bụ Kraịst ahụ; n’aka nke ọzọ isi nke nwanyị bụ nwoke; n’aka nke ọzọ isi nke Kraịst ahụ bụ Chineke.”

7. Olee otú e kwesịrị isi gosipụta ịbụisi n’ime ezinụlọ?

7 Ị̀ chọpụtara ihe mbụ amaokwu ahụ kwuru? Ee, nwoke ọ bụla nwere onye bụ́ Isi ya, Kraịst, bụ́ onye ọ ga-edo onwe ya n’okpuru ya. Nke a pụtara na di kwesịrị ịbụ isi n’ụzọ na-egosipụta àgwà Jizọs. Kraịst na-edo onwe ya n’okpuru Jehova, hụ ọgbakọ ahụ n’anya nke ukwuu, ma na-elekọta ya. (1 Timoti 3:15) O ‘nyefere ọbụna onwe ya maka ya.’ Jizọs adịghị mpako, ọ bụghịkwa onye na-adịghị echebara ndị ọzọ echiche, kama o ‘nwere obi dị nwayọọ, dịkwa umeala n’obi.’ Ndị na-edo onwe ha n’okpuru ịbụisi ya ‘na-enwetakwara mkpụrụ obi ha ume ọhụrụ.’ Mgbe di si otú a na-emeso ezinụlọ ya, ọ na-egosi na ọ na-edo onwe ya n’okpuru Kraịst. Mgbe ahụ, nwunye bụ́ Onye Kraịst kwesịrị ịhụ na ọ bara uru ma na-enye ume ọhụrụ bụ́ ịdị na-akwado di ya na ido onwe ya n’okpuru ịbụisi ya.—Ndị Efesọs 5:25-33; Matiu 11:28, 29; Ilu 31:10, 28.

8. (a) N’ihi gịnị ka ọ pụrụ iji yie ka ime ihe n’ụzọ Ndị Kraịst adịghị arụpụta ihe ndị a chọrọ n’ezinụlọ ụfọdụ? (b) Gịnị ka anyị kwesịrị ime ma ọ bụrụ na anyị echee ọnọdụ dị otú ahụ ihu?

8 Otú ọ dị, a ga-enwe nsogbu. Ọ pụrụ ịbụ na a zụliteworị ruo n’ókè ụfọdụ, àgwà nke enweghị mmasị n’ịbụ onye ndị ọzọ na-eduzi tupu e nwee onye malitere itinye ụkpụrụ Bible n’ọrụ n’ime ezinụlọ. Iji obiọma na-arịọ arịrịọ na inwe omume ịhụnanya nwere ike iyi ka ọ dịghị arụpụta ihe ọ bụla. Anyị maara na Bible kwuru ka anyị wepụ “iwe na ọnụma na iti mkpu na okwu mkparị.” (Ndị Efesọs 4:31) Ma, ọ bụrụ na o yie ka ụfọdụ ndị òtù ezinụlọ amaghị ụzọ ọ bụla ọzọ nke isi na-eme ihe ma ọ bụghị ya, olee ihe e kwesịrị ime? Jizọs eṅomighị ndị yiri ya egwu ma kwujọọ ya, kama ọ dabeere n’ebe Nna ya nọ. (1 Pita 2:22, 23) Ya mere, mgbe e nwere ọnọdụ ndị siri ike n’ezinụlọ, nye ihe àmà na i nwere nsọpụrụ Chineke site n’ikpegara Jehova ekpere maka enyemaka ya kama iṅomi ụzọ nke ụwa.—Ilu 3:5-7.

9. Kama ịdị na-achọ mmejọ, olee ihe ọtụtụ ndị di bụ́ Ndị Kraịst mụtaworo ịdị na-eme?

9 A dịghị eme mgbanwe ngwa ngwa mgbe nile, ma ndụmọdụ Bible na-arụpụta ihe n’ezie mgbe e ji ndidi na ịdị uchu na-etinye ya n’ọrụ. Ọtụtụ ndị bụ́ di achọpụtawo na alụmdi na nwunye ha malitere ịka mma mgbe ha bịara ghọta otú Kraịst si na-emeso ọgbakọ ya. Na ọ bụghị ụmụ mmadụ zuru okè mejupụtara ọgbakọ ahụ. N’agbanyeghị nke ahụ, Jizọs hụrụ ya n’anya, na-esetịpụrụ ya ihe nlereanya ziri ezi ma jiri Akwụkwọ Nsọ na-enyere ya aka imeziwanye ihe. O nyere ndụ ya n’ihi ọgbakọ ahụ. (1 Pita 2:21) Ihe nlereanya o setịpụrụ agbawo ọtụtụ ndị di bụ́ Ndị Kraịst ume ịbụ ezigbo ndị isi ezinụlọ na iji ịhụnanya na-enye aka ka ihe wee ka mma. Nke a na-arụpụta ihe ndị ka mma karịa ịdị na-achọpụta mmejọ ma ọ bụ atụpụghị ọnụ.

10. (a) N’ụzọ dịgasị aṅaa ka di ma ọ bụ nwunye—ọbụna onye na-ekwu na ya bụ Onye Kraịst—pụrụ isi mee ka ihe siere ndị ọzọ ike n’ezinụlọ? (b) Olee ihe a pụrụ ime iji mee ka ọnọdụ ahụ ka mma?

10 Gịnịkwanụ ma ọ bụrụ na di adịghị ajụ ase maka ihe bụ́ mkpa mmetụta uche nke ezinụlọ ya ma ọ bụ ọ bụrụ na ọ dịghị eme ndokwa maka ezinụlọ ya ịtụle Bible na maka ihe omume ndị ọzọ? Ma ọ bụ gịnịkwanụ ma ọ bụrụ na nwunye adịghị enye nkwado ma na-edo onwe ya n’okpuru n’ụzọ Chineke? Ụfọdụ ndị na-arụpụta ihe dị mma site n’ime ka ezinụlọ nwee nkwurịta okwu nkwanye ùgwù dị na ya banyere nsogbu ndị e nwere. (Jenesis 21:10-12; Ilu 15:22) Ma, ọ bụrụgodị na a rụpụtaghị ihe nile a tụrụ anya ha, onye ọ bụla n’ime anyị pụrụ ịtụnye ụtụ n’inwe ọnọdụ ka mma n’ezinụlọ site n’ịmịpụta mkpụrụ nke mmụọ nsọ Chineke ná ndụ anyị, na-egosi nchebara echiche ịhụnanya maka ndị òtù ezinụlọ ndị ọzọ. (Ndị Galeshia 5:22, 23) A ga-enwe ọganihu, ọ bụghị site n’ichere ka onye nke ọzọ mee ihe, kama site n’ime òkè nke anyị, si otú a na-egosi na anyị na-etinye nsọpụrụ Chineke n’ọrụ.—Ndị Kọlọsi 3:18-21.

Ebe A Ga-enweta Azịza

11, 12. Gịni ka Jehova nyeworo iji nyere anyị aka inwe ndụ ezinụlọ na-enwe ihe ịga nke ọma?

11 E nwere ọtụtụ ebe ndị mmadụ na-eche ihu iji nweta ndụmọdụ maka okwu ndị metụtara ezinụlọ ha. Ma anyị maara na Okwu Chineke nwere okwu ndụmọdụ kasị mma, anyị nwekwara ekele na site ná nzukọ ya a na-ahụ anya, Chineke na-enyere anyị aka itinye ya n’ọrụ. Ị̀ na-erite uru zuru ezu site n’enyemaka ahụ?—Abụ Ọma 119:129, 130; Maịka 4:2.

12 Tụkwasị n’ịga nzukọ ọgbakọ, ì wepụtawo oge maka ọmụmụ Bible ezinụlọ chiri anya? Ezinụlọ ndị na-eme otú ahụ pụrụ ịrụ ọrụ iji bụrụ ndị dị n’otu n’ofufe ha. Ndụ ezinụlọ ha na-aka mma ka ha na-etinye Okwu Chineke n’ọrụ n’ọnọdụ ha.—Deuterọnọmi 11:18-21.

13. (a) Ọ bụrụ na anyị enwee ajụjụ n’okwu ndị metụtara ezinụlọ, n’ebee ka anyị pụrụ inweta enyemaka dị mkpa ọtụtụ mgbe? (b) Gịnị kwesịrị ịpụta ìhè ná mkpebi nile anyị na-eme?

13 Ị pụrụ inwe ajụjụ dị iche iche n’okwu metụtara ezinụlọ. Dị ka ihe atụ, olee banyere nchịkwa ọmụmụ? Ọ̀ dị mgbe a pụrụ iwere nsikwopụ afọ ime dị ka ihe ziri ezi? Ọ bụrụ na nwatakịrị enwekebeghị mmasị n’ihe ime mmụọ, ruo n’ókè ha aṅaa ka a ga-achọ ka o soro ezinụlọ na-efe ofufe? A tụlewo ọtụtụ n’ime ajụjụ ndị dị otú ahụ n’akwụkwọ dị iche iche Ndịàmà Jehova bipụtara. Mụta ụzọ isi jiri ihe ndị e ji amụ Bible, gụnyere index dị iche iche, achọta azịza. Ọ bụrụ na i nweghị mbipụta ndị e zoro aka na ha n’index, chọọ ha n’ọ́bá akwụkwọ dị n’Ụlọ Nzukọ Alaeze. Ma ọ bụ i nwere ike inweta mbipụta ndị a na kọmputa gị. Ị pụkwara iso ndị ikom na ndị inyom bụ́ Ndị Kraịst tozuru okè tụlee ajụjụ gị. Ma atụla anya ịnụ ee ma ọ bụ ee e mgbe nile n’ajụjụ ọ bụla. Ọtụtụ mgbe ị ghaghị ime mkpebi n’onwe gị ma ọ bụ dị ka di na nwunye. Mgbe ahụ mee mkpebi ndị na-egosi na ị na-etinye nsọpụrụ Chineke n’ọrụ ọ bụghị nanị n’ihu ọha kamakwa n’ebe obibi.—Ndị Rom 14:19; Ndị Efesọs 5:10.

Ntụleghachi n’Ụdị Nkwurịta Okwu

• Olee otú ikwesị ntụkwasị obi nye di ma ọ bụ nwunye mmadụ sị emetụta iguzosi ike n’ihe nye Jehova?

• Mgbe a na-enwe nrụgide n’ihi nsogbu ezinụlọ, gịnị ga-enyere anyị aka ime ihe na-atọ Chineke ụtọ?

• Ọ bụrụgodị na ndị ọzọ nọ n’ime ezinụlọ adịghị eme ihe ha kwesịrị ime, gịnị ka anyị pụrụ ime iji mee ka ọnọdụ ahụ ka mma?

[Foto dị na peeji nke 155]

Ịbụisi nke onye bụ́ di kwesịrị ịdị na-egosipụta àgwà Jizọs

[Foto dị na peeji nke 157]

Isoro ezinụlọ na-enwe ọmụmụ Bible chiri anya na-enye aka n’ime ka ọ dị n’otu

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya