Isi nke Iri na Asatọ
“Ha Abụghị Akụkụ nke Ụwa”
1. (a) Tupu ọ nwụọ, gịnị ka Jizọs kpere n’ekpere maka ndị na-eso ụzọ ya? (b) N’ihi gịnị ka abụghị “akụkụ nke ụwa” ji dị oké mkpa?
N’ABALỊ fotere ụbọchị e gburu ya, Jizọs kpere ekpere maka ndị na-eso ụzọ ya. Ebe ọ maara na Setan ga-ewetara ha oké nrụgide, Jizọs sịrị Nna ya: “M na-arịọ gị arịrịọ, ọ bụghị ka ị kpọpụ ha n’ụwa, kama ka i chee ha nche n’ihi ajọ onye ahụ. Ha abụghị akụkụ nke ụwa, dị nnọọ ka m na-abụghị akụkụ nke ụwa.” (Jọn 17:15, 16) N’ihi gịnị ka ịnọpụ iche n’ụwa ji dị oké mkpa? N’ihi na ọ bụ Setan na-achị ụwa a. Ndị Kraịst agaghị achọ ịghọ akụkụ nke ụwa ọ na-achịkwa.—Luk 4:5-8; Jọn 14:30; 1 Jọn 5:19.
2. N’ụzọ dịgasị aṅaa ka Jizọs na-abụghị akụkụ nke ụwa?
2 Abụghị akụkụ nke ụwa apụtaghị na Jizọs ahụghị ndị ọzọ n’anya. Kama nke ahụ, ọ gwọrọ ndị ọrịa, kpọlite ndị nwụrụ anwụ n’ọnwụ, ma kụziere ndị mmadụ banyere Alaeze Chineke. O nyere ọbụna ndụ ya maka ihe a kpọrọ mmadụ. Ma o nweghị mmasị n’omume na n’àgwà asọpụrụghị Chineke nke ndị na-egosipụta mmụọ nke ụwa Setan. N’ihi ya, ọ dọrọ aka ná ntị megide ihe ndị dị ka ọchịchọ rụrụ arụ, ndụ nke ịchụso ihe onwunwe, na ịchọsi ịbụ onye a ma ama ike. (Matiu 5:27, 28; 6:19-21; Luk 20:46, 47) Mgbe ahụ, ọ bụghị ihe ijuanya na Jizọs zeere ndọrọ ndọrọ ọchịchị nke ụwa. Ọ bụ ezie na ọ bụ onye Juu, ọ kwadoghị akụkụ nke ọ bụla n’esemokwu ndọrọ ndọrọ ọchịchị dị n’etiti ndị Rom na ndị Juu.
“Alaeze M Abụghị Akụkụ nke Ụwa A”
3. (a) Ebubo dị aṅaa ka ndị ndú okpukpe ndị Juu boro Jizọs n’ihu Paịlet, n’ihi gịnịkwa? (b) Gịnị na-egosi na Jizọs enweghị mmasị n’ịghọ eze dị ka mmadụ?
3 Tụlee ihe mere mgbe ndị ndú okpukpe ndị Juu mere ka e jide Jizọs ma kpụrụ ya gaa na nke Pọntiọs Paịlet, bụ́ gọvanọ, onye Rom. N’ezie, ahụ́ erughị ndị ndú ahụ ala n’ihi na Jizọs kpughere omume ihu abụọ ha. Iji mee ka gọvanọ ahụ mee ihe megide Jizọs, ha boro ya ebubo site n’ikwu, sị: “Anyị chọpụtara na nwoke a na-ekpu mba anyị ihu ma na-amachibido ịkwụ Siza ụtụ isi, na-ekwukwa na ya onwe ya bụ Kraịst, bụ́ eze.” (Luk 23:2) O doro anya na nke a bụ ụgha n’ihi na otu afọ tupu mgbe ahụ, mgbe ndị mmadụ chọrọ ime Jizọs eze, ọ jụrụ. (Jọn 6:15) Ọ maara na ya gaje ịbụ Eze eluigwe n’ọdịnihu. (Luk 19:11, 12) Ọzọkwa, ọ bụghị ụmụ mmadụ gaje ime ka ọ nọkwasị n’ocheeze, kama ọ bụ Jehova.
4. Gịnị bụ echiche Jizọs n’ihe banyere ịtụ ụtụ isi?
4 Nanị ụbọchị atọ tupu e jide Jizọs, ndị Farisii nwara ime ka Jizọs kwuo ihe a pụrụ iji jide ya n’ihe banyere ịtụ ụtụ isi. Ma ọ sịrị: “Gosinụ m otu mkpụrụ ego dinarịọs [mkpụrụ ego ndị Rom]. Onyinyo na ihe odide ònye ka o nwere?” Mgbe ha sịrị na ọ bụ “nke Siza,” ọ zara, sị: “Ya mere, hụnụ na unu kwụghachiri Siza ihe nke Siza, ma kwụghachinụ Chineke ihe nke Chineke.”—Luk 20:20-25.
5. (a) Olee ihe Jizọs kụziiri ndị na-eso ụzọ ya n’oge e jidere ya? (b) Gịnị ka Jizọs kọwara mere o ji mee ihe o mere? (ch) Gịnị si n’ikpe ahụ pụta?
5 Ee e, Jizọs akụzighị ka a na-enupụrụ ndị ọchịchị ụwa isi. Mgbe ndị agha na ndị ikom ndị ọzọ bịara ijide Jizọs, Pita mịịrị mma agha ya gbuo ya otu n’ime ndị ikom ahụ, bepụ ya ntị. Ma Jizọs sịrị: “Mịghachi mma agha gị n’ọnọdụ ya, n’ihi na ndị nile na-ebu mma agha ga-ala n’iyi site ná mma agha.” (Matiu 26:51, 52) Echi ya, Jizọs kọwaara Paịlet ihe o mere, na-asị: “Alaeze m abụghị akụkụ nke ụwa a. A sị na alaeze m bụ akụkụ nke ụwa a, ndị na-ejere m ozi gaara alụ ọgụ ka a ghara inyefe m n’aka ndị Juu.” (Jọn 18:36) Paịlet kwetara na e nweghị “ihe ndabere ọ bụla maka ebubo” ndị e boro Jizọs. Ma n’ikwenye ná nrụgide nke ìgwè ahụ na-eme ihe ike, Paịlet mere ka a kpọgbuo Jizọs.—Luk 23:13-15; Jọn 19:12-16.
Ndị Na-eso Ụzọ Agbasoo Ihe Nlereanya Jizọs
6. Olee otú Ndị Kraịst oge mbụ si gosi na ha zeere mmụọ nke ụwa ma na ha hụrụ ndị mmadụ n’anya?
6 Ndị na-eso ụzọ Jizọs si otú a ghọta ihe abụghị akụkụ nke ụwa chọrọ. Ọ pụtara izere mmụọ na omume asọpụrụghị Chineke nke ụwa, bụ́ ndị gụnyere ntụrụndụ rụrụ arụ, ndị a na-emekwa ihe ike na ha, bụ́ ndị a na-egosi n’ọgbọ ihe nkiri dị iche iche nke Rom. N’ihi ya, a kpọrọ ndị ahụ na-eso ụzọ, ndị kpọrọ ihe a kpọrọ mmadụ asị. Ma kama ịkpọ ndị mmadụ ibe ha asị, ha rụsiri ọrụ ike inyere ndị ọzọ aka irite uru ná ndokwa ndị Chineke mere maka nzọpụta.
7. (a) N’ihi na ha abụghị akụkụ nke ụwa, ahụmahụ dị aṅaa ka ndị na-eso ụzọ nke oge mbụ nwere? (b) Olee otú ha si were ndị ọchịchị na ịtụ ụtụ isi, n’ihi gịnịkwa?
7 A kpagburu ndị na-eso ụzọ Jizọs dịkwa ka a kpagburu ya, ọtụtụ mgbe site n’aka ndị ọchịchị a gwara ihe ndị na-abụghị eziokwu. Ma, n’ihe dị ka 56 O.A., Pọl onyeozi degaara Ndị Kraịst nọ na Rom akwụkwọ ozi, na-agba ha ume ka ha ‘doo onwe ha n’okpuru ikike ndị ka elu, [ndị ọchịchị] n’ihi na ikike ọ bụla adịghị ma ọ́ bụghị site na Chineke.’ Ọ bụghị na ọ bụ Jehova na-eguzobe ọchịchị dị iche iche nke ụwa, kama ọ hapụrụ ha ka ha dịrị ruo mgbe ọ ga-abụ nanị Alaeze ya ga na-achị ụwa nile. N’ụzọ kwesịrị ekwesị, Pọl dụrụ Ndị Kraịst ọdụ ka ha na-akwanyere ndị ọchịchị ụwa ùgwù na ka ha na-atụ ụtụ isi.—Ndị Rom 13:1-7; Taịtọs 3:1, 2.
8. (a) Ruo n’ókè ha aṅaa ka Ndị Kraịst ga-edo onwe ha n’okpuru ikike ndị ka elu? (b) Olee otú Ndị Kraịst oge mbụ si gbasoo ihe nlereanya Jizọs?
8 Otú ọ dị, ido onwe onye n’okpuru ndị ọchịchị aghaghị ịbụ nke a kpaara ókè, ọ bụghị nke a na-akparaghị ókè. Mgbe iwu Jehova na iwu ụmụ mmadụ na-emegiderịta onwe ha, ndị na-ejere Jehova ozi ga-erube isi n’iwu Ya. Rịba ama ihe akwụkwọ bụ́ On the Road to Civilization—A World History na-ekwu banyere Ndị Kraịst oge mbụ: “Ndị Kraịst jụrụ ikere òkè n’ọrụ ụfọdụ dịịrị ụmụ amala Rom. Ndị Kraịst . . . weere ya na ọ bụ imebi okwukwe ha bụ́ ịbanye n’ozi agha. Ha agaghị anara ọkwá ndọrọ ndọrọ ọchịchị. Ha agaghị efe eze ukwu ofufe.” Mgbe ụlọikpe ukwu ndị Juu “nyesiri [ndị ahụ na-eso ụzọ] iwu ike” ka ha kwụsị ime nkwusa, ha zara, sị: “Anyị aghaghị irubere Chineke isi dị ka onye na-achị achị karịa mmadụ.”—Ọrụ 5:27-29.
9. (a) N’ihi gịnị ka Ndị Kraịst nọ na Jeruselem ji mee ihe ahụ ha mere na 66 O.A.? (b) N’ụzọ dị aṅaa ka nke ahụ si bụrụ ihe nlereanya bara uru?
9 N’ihe banyere esemokwu ndị metụtara ndọrọ ndọrọ ọchịchị na agha, ndị ahụ na-eso ụzọ nọpụrụ iche kpam kpam. Na 66 O.A., ndị Juu nọ na Judia nupụrụ isi megide Siza. Ndị agha Rom gbara Jeruselem gburugburu n’egbughị oge. Gịnị ka Ndị Kraịst nọ n’obodo ahụ mere? Ha chetara ndụmọdụ Jizọs nyere nke bụ́ ka ha si n’obodo ahụ gbapụ. Mgbe ndị Rom nyetụrụ ohere, Ndị Kraịst gbara ọsọ gafere Osimiri Jọdan gaa n’ógbè bụ́ ugwu ugwu na Pella. (Luk 21:20-24) Nnọpụiche ha bụ ihe nlereanya nye Ndị Kraịst ga-ekwesị ntụkwasị obi n’ọdịnihu.
Ndị Kraịst, Bụ́ Ndị Na-anọpụ Iche n’Ụbọchị Ikpeazụ Ndị A
10. (a) Ọrụ dị aṅaa ka Ndịàmà Jehova nọ na-arụsi ike, n’ihi gịnịkwa? (b) Na gịnị ka ha na-anọpụ iche?
10 Akụkọ ihe mere eme ọ̀ na-egosi na ọ dị ìgwè ọ bụla, n’ụbọchị ikpeazụ ndị a, nke nọpụworo iche kpam kpam n’iṅomi Ndị Kraịst oge mbụ? Ee, Ndịàmà Jehova emewo otú ahụ. N’oge a nile, ha anọgidewo na-ekwusa na Alaeze Chineke bụ nanị ihe ga-ewetara ndị hụrụ ezi omume n’anya, udo, ọganihu, na obi ụtọ na-adịgide adịgide. (Matiu 24:14) Ma, a bịa n’ihe banyere esemokwu ndị dị n’etiti mba dị iche iche, ha anọgidewo na-anọpụ iche kpam kpam.
11. (a) Olee otú nnọpụiche nke Ndịàmà si dị iche n’ihe ndị ụkọchukwu na-eme? (b) Gịnị bụ echiche Ndịàmà Jehova banyere ihe ndị ọzọ na-eme n’ihe metụtara ndọrọ ndọrọ ọchịchị?
11 N’ụzọ dị nnọọ iche na nke ahụ, ndị ụkọchukwu nke okpukpe dị iche iche nke ụwa a anọwo na-etinyesi aka ike na ndọrọ ndọrọ ọchịchị. N’ala ụfọdụ, ha achụsiwo nta vootu ike maka ụfọdụ ndị na-azọ ọchịchị ma ọ bụ kwusie okwu ike megide ha. Ndị ụkọchukwu ụfọdụ nọ ọbụna n’ọkwá ọchịchị. Ndị ụkọchukwu ndị ọzọ arụgidewo ndị ndọrọ ndọrọ ọchịchị ịkwado usoro ihe omume ndị ha onwe ha kwadoro. Otú ọ dị, Ndịàmà Jehova adịghị etinye aka na ndọrọ ndọrọ ọchịchị. Ha adịghịkwa egbochi ndị ọzọ isonyere òtù ndọrọ ndọrọ ọchịchị, ma ọ bụ ịzọ ọkwá ọchịchị, ma ọ bụ ịtụnye vootu n’oge ntụli aka. Jizọs kwuru na ndị na-eso ụzọ ya agaghị abụ akụkụ nke ụwa, ya mere, Ndịàmà Jehova adịghị etinye aka na ndọrọ ndọrọ ọchịchị.
12. Gịnị siworo n’anọpụghị iche nke okpukpe dị iche iche nke ụwa a pụta?
12 Dị ka Jizọs buru n’amụma, mba dị iche iche alụwo agha ugboro ugboro. Ọbụna òtù dị iche iche nọ n’otu mba ebusowo ibe ha agha. (Matiu 24:3, 6, 7) Ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ mgbe nile, ndị ndú okpukpe akwadowo otu mba ma ọ bụ otu òtù megide ibe ya, na-agba ụmụazụ ha ume imekwa otú ahụ. Gịnị ka ọ rụpụtaworo? Ndị nọ n’otu okpukpe na-egburịta onwe ha n’agha nanị n’ihi na mba ma ọ bụ agbụrụ ha dị iche. Nke a megidere uche Chineke.—1 Jọn 3:10-12; 4:8, 20.
13. Gịnị ka ihe ndị mere eme na-egosi banyere nnọpụiche nke Ndịàmà Jehova?
13 Otú ọ dị, Ndịàmà Jehova anọpụwo iche kpam kpam n’agha nile. Ụlọ Nche (Bekee) nke November 1, 1939, kwuru, sị: “Ndị nile nọ n’akụkụ nke Onyenwe anyị ga-anọpụ iche n’ebe mba ndị na-ebu agha nọ.” Ndịàmà Jehova ná mba nile anọgidewo na-eme nke a n’ọnọdụ nile. Ha adịghị ekwe ka ndọrọ ndọrọ ọchịchị na agha nke ụwa bụ́ nke na-akpata nkewa tisaa òtù ụmụnna ha zuru ụwa ọnụ. Ha ‘na-akpụgharị mma agha ha nile ka ha bụrụ mma ogè, na ube ha nile ka ha bụrụ mma ịkwa osisi.’ Ebe ha nọpụrụ iche, ha adịghị amụta agha ọzọ.—Aịsaịa 2:3, 4; 2 Ndị Kọrint 10:3, 4.
14. N’ihi ịnọgide na-anọpụ iche n’ụwa, gịnị ka e meworo Ndịàmà Jehova?
14 Gịnị bụ otu ihe siworo ná nnọpụiche ha pụta? Jizọs sịrị: “N’ihi na unu abụghị akụkụ nke ụwa, . . . ụwa na-akpọ unu asị.” (Jọn 15:19) A tụwo ọtụtụ Ndịàmà Jehova mkpọrọ n’ihi ịbụ ndị ohu Chineke. E mekpọwo ụfọdụ n’ime ha ọnụ, ọbụna gbuo ha, n’ụzọ yiri ihe e mere Ndị Kraịst narị afọ mbụ. Nke a bụ n’ihi na Setan, bụ́ “chi nke usoro ihe a,” na-emegide ndị ohu Jehova, bụ́ ndị na-abụghị akụkụ ya.—2 Ndị Kọrint 4:4; Mkpughe 12:12.
15. (a) Na gịnị ka mba nile na-azọ ije aga, gịnịkwa ka Ndịàmà Jehova ga-elezi anya izere? (b) N’ihi gịnị ka ịnọpụ iche n’ụwa ji bụrụ okwu dị oké mkpa otú a?
15 Obi dị ndị ohu Jehova ụtọ na ha abụghị akụkụ nke ụwa, n’ihi na mba nile dị n’ime ya na-azọ ije aga ná njedebe ha n’Amagedọn. (Daniel 2:44; Mkpughe 16:14, 16; 19:11-21) Anyị ga-ezere ihe ahụ ga-adakwasị ya n’ihi na anyị na-anọpụ iche n’ụwa. Dị ka ndị dị n’otu n’ụwa nile, anyị na-eguzosi ike n’ihe nye Alaeze eluigwe nke Chineke. N’eziokwu, n’ihi abụghị akụkụ nke ụwa, ọ na-akwa anyị emo ma na-akpagbu anyị. Otú ọ dị, nke ahụ ga-akwụsị n’isi nso, ebe ọ bụ na a ga-ebibi ajọ ụwa a dị ugbu a nke Setan na-achịkwa ruo mgbe ebighị ebi. N’aka nke ọzọ, ndị na-ejere Jehova ozi ga-adị ndụ ruo mgbe ebighị ebi n’ime ụwa ọhụrụ ya nke ezi omume n’okpuru Alaeze Chineke.—2 Pita 3:10-13; 1 Jọn 2:15-17.
Ntụleghachi n’Ụdị Nkwurịta Okwu
• Olee otú Jizọs si gosi ihe “abụghị akụkụ nke ụwa” na-agụnye?
• Gịnị bụ echiche nke Ndị Kraịst oge mbụ banyere (a) mmụọ nke ụwa, (b) ndị ọchịchị ụwa, na (ch) ịtụ ụtụ isi?
• N’ụzọ dịgasị aṅaa ka Ndịàmà Jehova n’oge a siworo nye ihe àmà nke nnọpụiche ha dị ka Ndị Kraịst?
[Foto dị na peeji nke 165]
Jizọs kọwara na ya na ndị na-eso ụzọ ya “abụghị akụkụ nke ụwa”