Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • wt isi 19 p. 167-174
  • Nọgide Na-ekwu Okwu Chineke n’Atụghị Egwu

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Nọgide Na-ekwu Okwu Chineke n’Atụghị Egwu
  • Fee Onye Nanị Ya Bụ Ezi Chineke ahụ Ofufe
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Adabereghị n’Ike nke Anyị
  • Ihe Ndekọ nke Ịgba Àmà n’Atụghị Egwu
  • Jiri Nkwuwa Okwu Kpọsaa Ozi Ọma
    Ozi Alaeze Anyi—1996
  • Jiri Nkwuwa Okwu Na-ekwusa Ozi Ọma Ka Jizọs
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2009
  • ‘Na-ekwu Okwu Chineke n’Atụghị Egwu’
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2010
  • ‘Ruo n’Ebe Kacha Anya n’Ụwa’
    ‘Ịgba Àmà nke Ọma Banyere Alaeze Chineke’
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Fee Onye Nanị Ya Bụ Ezi Chineke ahụ Ofufe
wt isi 19 p. 167-174

Isi nke Iri na Itoolu

Nọgide Na-ekwu Okwu Chineke n’Atụghị Egwu

1. (a) Olee ozi ọma ndị na-eso ụzọ Jizọs kwusara, ma olee otú ndị Juu ụfọdụ si meghachi omume? (b) Ajụjụ dịgasị aṅaa ka anyị pụrụ ịjụ?

IHE fọrọ nke nta ka ọ bụrụ afọ 2,000 gara aga, e tere Ọkpara Chineke, bụ́ Jizọs Kraịst, mmanụ dị ka Eze ga-achị ụwa nile n’ọdịnihu. Ndị okpukpe bụ́ ndị iro mere ka e gbuo Jizọs, ma Jehova mere ka o si n’ọnwụ bilite. Site n’aka Jizọs, ọ ga-ekwe omume ugbu a inweta ndụ ebighị ebi. Otú ọ dị, mgbe ndị na-eso ụzọ Jizọs kwusara ozi ọma a n’ihu ọha, mkpagbu tiwapụrụ. A tụbara ụfọdụ n’ime ha n’ụlọ mkpọrọ, ọbụna pịa ha ihe ma nye ha iwu ka ha kwụsị ikwu banyere Jizọs. (Ọrụ 4:1-3, 17; 5:17, 18, 40) Gịnị ka ha ga-eme? Gịnị ka ị gaara eme? Ị̀ gaara anọgide na-agba àmà n’atụghị egwu?

2. (a) Ozi dị aṅaa magburu onwe ya ka ọ dị mkpa ka e kwusaa n’oge anyị? (b) Olee ndị ọ bụ ọrụ ha ikwusa ozi ọma ahụ?

2 Na 1914, e mere ka Eze nke Alaeze Chineke, bụ́ Jizọs Kraịst, nọkwasị n’ocheeze n’eluigwe, ịchị ‘n’etiti ndị iro ya.’ (Abụ Ọma 110:2) A chụdaziri Setan na ndị mmụọ ọjọọ ya n’ụwa. (Mkpughe 12:1-5, 7-12) Ụbọchị ikpeazụ nke ajọ usoro ihe dị ugbu a amalitewo. Mgbe oge a bịara ná njedebe, Chineke ga-ebibi usoro ihe Setan dum. (Daniel 2:44; Matiu 24:21) Ndị dị ndụ gabiga ya ga-enwe ohere nke ịdị ndụ ebighị ebi n’ime ụwa nke ga-aghọ paradaịs. Ọ bụrụ na ị nakwerewo ozi ọma a, ị ga-achọ isoro ndị ọzọ kerịta ya. (Matiu 24:14) Ma mmeghachi omume dị aṅaa ka ị pụrụ ịtụ anya ya?

3. (a) Olee otú ndị mmadụ si emeghachi omume n’ozi Alaeze ahụ? (b) Olee ajụjụ anyị na-aghaghị iche ihu?

3 Mgbe ị na-ekwusa ozi ọma Alaeze ahụ, ụfọdụ ndị nwere ike ịnabata ya, ma ihe ka n’ọnụ ọgụgụ mmadụ ga-enwe omume ọ̀ gbasara m. (Matiu 24:37-39) Ụfọdụ pụrụ ịkwa gị emo ma ọ bụ megide gị. Jizọs dọrọ aka ná ntị na ị pụrụ inweta mmegide site n’aka ndị ikwu gị. (Luk 21:16-19) Ọ pụkwara isite n’ebe ị na-arụ ọrụ ma ọ bụ n’ụlọ akwụkwọ. N’ebe ụfọdụ n’ụwa, ndị ọchịchị ọbụna machibidoro Ndịàmà Jehova iwu. Mgbe ọnọdụ ndị dị otú ahụ chere gị ihu, ị̀ ga-anọgide na-ekwusa okwu Chineke n’atụghị egwu ma ‘guzosie ike n’okwukwe’?—1 Ndị Kọrint 16:13.

Adabereghị n’Ike nke Anyị

4. (a) Iji gosi na anyị bụ ndị ohu Chineke na-ekwesị ntụkwasị obi, gịnị bụ otu ihe dị mkpa a chọrọ? (b) N’ihi gịnị ka nzukọ Ndị Kraịst ji dị oké mkpa?

4 Otu ihe dị mkpa iji bụrụ ohu Jehova na-ekwesị ntụkwasị obi bụ ịdabere n’ihe ndị o nyeworo anyị. Otu n’ime ha bụ nzukọ ọgbakọ. Akwụkwọ Nsọ na-agba anyị ume ka anyị ghara ileghara ha anya. (Ndị Hibru 10:23-25) Ndị nọgideworo na-abụ Ndịàmà kwesịrị ntụkwasị obi nke Jehova etinyewo mgbalị siri ike iso ndị ha na ha na-efekọ ofufe na-ezukọchi anya. Ná nzukọ ndị a, ihe ọmụma anyị nwere banyere Akwụkwọ Nsọ na-ebukwu ibu. Ọzọkwa, anyị na-aghọtakwu eziokwu ndị a ma nnọọ ama, anyị na-amatakwukwa ụzọ isi jiri ha na-eme ihe. A na-adọtakwu anyị nso n’ebe ụmụnna anyị Ndị Kraịst nọ n’ife ofufe n’ịdị n’otu, na-ewusikwu anyị ike ime uche Chineke. Mmụọ Jehova na-enye anyị nduzi site n’ọgbakọ, Jizọs na-anọkwa n’etiti anyị site na mmụọ ahụ.—Matiu 18:20; Mkpughe 3:6.

5. Mgbe a machibidoro Ndịàmà Jehova iwu, gịnị ka a na-eme banyere nzukọ?

5 Ị̀ na-agachi nzukọ nile anya, ị̀ na-etinyekwa ihe ndị ị na-anụ a na-atụle n’ọrụ n’onwe gị? Mgbe ụfọdụ, mgbe a machibidoro Ndịàmà Jehova iwu, ọ na-adị mkpa inwe nzukọ n’ìgwè dịgasị nta n’ebe obibi ndị mmadụ. Oge na ebe ndị a na-ezukọ pụrụ ịdị na-agbanwe, o nwekwara ike ọ gaghị abụ mgbe nile ka ha ga-adịchara mmadụ mfe ebe a pụrụ inwe nzukọ ụfọdụ n’ime abalị. Ma n’agbanyeghị ihe isi ike ma ọ bụ ihe ize ndụ ha pụrụ iwetara mmadụ, ụmụnna nwoke na ụmụnna nwanyị kwesịrị ntụkwasị obi na-etinyesi mgbalị ike ịga nzukọ nke ọ bụla.

6. Olee otú anyị si egosipụta na anyị na-adabere n’ebe Jehova nọ, oleekwa otú nke a pụrụ isi nyere anyị aka ịnọgide na-eme nkwusa n’atụghị egwu?

6 A na-amụta ịdabere n’ebe Jehova nọ site n’iji ekpere si n’ala ala obi na-agakwuru ya mgbe nile, na-amata na enyemaka Chineke dị anyị mkpa. Ị̀ na-eme nke ahụ? Jizọs kpere ekpere ugboro ugboro n’oge ọ na-eje ozi n’elu ala. (Luk 3:21; 6:12, 13; 22:39-44) N’abalị ahụkwa fotere ụbọchị a kpọgidere ya n’elu osisi, ọ gbara ndị na-eso ụzọ ya ume, sị: “Nọgidenụ na-eche nche ma na-ekpe ekpere, ka unu wee ghara ịba n’ọnwụnwa.” (Mak 14:38) Ọ bụrụ na anyị ezute ndị nwere omume ọ̀ gbasara m n’ebe ozi Alaeze ahụ dị, a pụrụ ịnwa anyị iselata aka n’ozi anyị. Ọ bụrụ na ndị mmadụ na-akwa anyị emo ma ọ bụ na-akpagbu anyị, ọ pụrụ ịdị anyị ka ọ bụ anyị kwụsị ime nkwusa iji zere nsogbu. Ma ọ bụrụ na anyị ekpesie ekpere ike ka mmụọ Chineke nyere anyị aka ịnọgide na-eme nkwusa n’atụghị egwu, a ga-echebe anyị pụọ n’ịbụ ndị ọnwụnwa ndị ahụ meriri.—Luk 11:13; Ndị Efesọs 6:18-20.

Ihe Ndekọ nke Ịgba Àmà n’Atụghị Egwu

7. (a) N’ihi gịnị ka ihe ndekọ dị n’Ọrụ Ndịozi ji na-adọrọ mmasị anyị n’ụzọ pụrụ iche? (b) Zaa ajụjụ ndị a jụrụ ná ngwụsị paragraf a, na-emesi ike otú ihe ọmụma ahụ pụrụ isi baara anyị uru.

7 Ihe ndekọ dị n’akwụkwọ Ọrụ Ndịozi na-adọrọ mmasị anyị nile n’ụzọ pụrụ iche. Ọ na-akọ otú ndịozi na ndị na-eso ụzọ ndị ọzọ nke oge mbụ—mmadụ ndị nwere ụdị mmetụta ndị anyị na-enwe—si merie ihe isi ike dị iche iche ma gosipụta na ha bụ ndị àmà Jehova na-adịghị atụ egwu, ndị na-ekwesị ntụkwasị obi. Ka anyị jiri ajụjụ ndị na-esonụ nakwa akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị e zoro aka na ha nyochaa otu akụkụ nke ihe ndekọ ahụ. Ka anyị na-eme otú ahụ, tụlee otú gị onwe gị pụrụ isi rite uru n’ihe ị na-agụ.

Ndịozi hà bụ ndị ikom gụrụ oké akwụkwọ? Hà bụ, site n’ọmụmụ, ndị na-adịghị atụ egwu n’agbanyeghị ihe merenụ? (Jọn 18:17, 25-27; 20:19; Ọrụ 4:13)

Gịnị mere ka Pita nwee ike ikwu okwu n’atụghị egwu n’ihu ụlọikpe ndị Juu nke mara Ọkpara Chineke n’onwe ya ikpe? (Matiu 10:19, 20; Ọrụ 4:8)

Gịnị ka ndịozi nọ na-eme n’izu ndị gaferenụ tupu a kpụta ha n’ihu Sanhedrin ahụ? (Ọrụ 1:14; 2:1, 42)

Mgbe ndị ọchịchị nyere ndịozi iwu ka ha kwụsị ime nkwusa n’aha Jizọs, gịnị ka Pita na Jọn zara ha? (Ọrụ 4:19, 20)

Mgbe a tọhapụsịrị ha, ònye ka ndịozi ahụ dabeere ọzọ n’ebe ọ nọ maka enyemaka? Hà kpere ekpere ka mkpagbu ahụ kwụsị, ka ọ̀ bụ gịnị ka ha kpere ekpere maka ya? (Ọrụ 4:24-31)

N’ụzọ dị aṅaa ka Jehova si nyere ha aka mgbe ndị mmegide gbalịrị ịkwụsị ọrụ nkwusa ahụ? (Ọrụ 5:17-20)

Olee otú ndịozi si gosi na ha ghọtara ihe mere e ji napụta ha? (Ọrụ 5:21, 41, 42)

Ọbụna mgbe a chụsasịrị ọtụtụ n’ime ndị ahụ na-eso ụzọ n’ihi mkpagbu, gịnị ka ha nọgidere na-eme? (Ọrụ 8:3, 4; 11:19-21)

8. Olee ihe ndị na-akpali akpali si n’ozi ndị na-eso ụzọ nke oge mbụ jere pụta, oleekwa otú nke a siworo metụta anyị?

8 Ọrụ ikwusa ozi ọma ahụ abụghị n’efu. E mere ihe dị ka ndị na-eso ụzọ 3,000 baptizim na Pentikọst 33 O.A. “A nọgidere na-atụkwasị ndị kwere n’Onyenwe anyị, ìgwè mmadụ, ma ndị nwoke ma ndị nwanyị.” (Ọrụ 2:41; 4:4; 5:14) Ka oge na-aga, ọbụna otu onye nke na-akpagbu ndị Chineke n’ụzọ kpụ ọkụ n’ọnụ, bụ́ Sọl nke Tasọs, ghọrọ Onye Kraịst, malitekwa ịgbara eziokwu ahụ àmà n’atụghị egwu. E mesịrị mara ya dị ka Pọl onyeozi. (Ndị Galeshia 1:22-24) Ọrụ ahụ nke malitere na narị afọ mbụ akwụsịbeghị. O biriwo ọkụ karị n’ụbọchị ikpeazụ ndị a, o ruwokwa n’akụkụ nile nke ụwa. Anyị nwere ihe ùgwù nke ikere òkè na ya, ka anyị na-emekwa otú ahụ, anyị pụrụ ịmụta ihe site n’ihe nlereanya nke ndị àmà na-eguzosi ike n’ihe ndị jere ozi tupu oge anyị setịpụrụ.

9. (a) Olee ohere ndị Pọl ji gbaa àmà? (b) N’ụzọ dịgasị aṅaa ka i si ezisara ndị ọzọ ozi Alaeze ahụ?

9 Mgbe Pọl matara ihe bụ́ eziokwu banyere Jizọs Kraịst, gịnị ka o mere? “Ozugbo . . . ọ malitere ikwusa Jizọs, na Onye a bụ Ọkpara Chineke.” (Ọrụ 9:20) O nwere ekele maka obiọma na-erughịrị ya Chineke gosiri ya, ọ ghọtakwara na ozi ọma ahụ ọ natara dị mmadụ nile mkpa. Pọl bụ onye Juu, dịkwa ka omenala dị n’oge ahụ si dị, ọ gara n’ụlọ nzukọ dị iche iche ịga gbaa àmà. O mekwara nkwusa site n’ụlọ ruo n’ụlọ ma soro ndị mmadụ tụgharịa uche n’ọmà ahịa. Ọ dịkwa njikere ịga n’ókèala ndị ọhụrụ ịga kwusaa ozi ọma ahụ.—Ọrụ 17:17; 20:20; Ndị Rom 15:23, 24.

10. (a) Olee otú Pọl si gosi, ọ bụ ezie na ọ dịghị atụ egwu, na o jikwa nghọta mee ihe n’ụzọ o si gbaa àmà? (b) Olee otú anyị pụrụ isi gosipụta àgwà yiri nke Pọl mgbe anyị na-agbara ndị ikwu, ndị ọrụ ibe anyị, ma ọ bụ ụmụ akwụkwọ ibe anyị àmà?

10 Pọl atụghị egwu kama o jikwa nghọta mee ihe, dị ka anyị kwesịrị ime. O kwuru okwu ruru ndị Juu n’obi, na-agbakwasị ụkwụ ná nkwa Chineke kwere ndị nna nna ha. Ọ gwara ndị Gris okwu na-adabere n’ihe ndị ha maara nke ọma. O ji ahụmahụ ya onwe ya nwere n’ịmụta eziokwu ahụ mee ihe mgbe ụfọdụ dị ka ụzọ isi gbaa àmà. Ọ sịrị: “M na-eme ihe nile n’ihi ozi ọma, ka m wee bụrụ onye ya na ndị ọzọ na-ekerịta ya.”—1 Ndị Kọrint 9:20-23; Ọrụ 22:3-21.

11. (a) Gịnị ka Pọl mere iji zere iso ndị mmegide na-ese okwu ugboro ugboro? (b) Olee mgbe anyị pụrụ iji amamihe ṅomie ihe nlereanya Pọl, n’ụzọ dịkwa aṅaa? (ch) Ebee ka ike iji nọgide na-ekwu okwu n’atụghị egwu si abịa?

11 Mgbe mmegide mere ka o yie ka ọ̀ ka mma ka Pọl gaa mee nkwusa n’ógbè ọzọ ruo oge ụfọdụ, o mere otú ahụ kama iso ndị mmegide na-ese okwu ugboro ugboro. (Ọrụ 14:5-7; 18:5-7; Ndị Rom 12:18) Ma ọ dịghị mgbe ihere ozi ọma ahụ mere ya. (Ndị Rom 1:16) Ọ bụ ezie na mkparị—ọbụna ihe ike—ndị mmegide mesoro Pọl atọghị ya ụtọ, o ‘nwere nkwuwa okwu site na Chineke anyị’ iji nọgide na-eme nkwusa. Ọ sịrị: “Onyenwe anyị guzoro m nso ma nye m ike, ka e wee site na mụ rụọ ọrụ nkwusa ahụ n’ụzọ zuru ezu.” (1 Ndị Tesalonaịka 2:2; 2 Timoti 4:17) Onyeisi nke ọgbakọ Ndị Kraịst, bụ́ Jizọs, ka na-enye anyị ike ahụ dị anyị mkpa iji na-arụ ọrụ o buru n’amụma maka oge anyị.—Mak 13:10.

12. Gịnị bụ ihe àmà na-egosi na Ndị Kraịst adịghị atụ egwu, oleekwa ihe kpatara ya?

12 Anyị nwere ezi ihe mere anyị ga-eji nọgide na-ekwu okwu Chineke n’atụghị egwu, dị nnọọ ka Jizọs na ndị ohu Chineke ndị ọzọ kwesịrị ntụkwasị obi mere na narị afọ mbụ. Nke a apụtaghị ịbụ ndị na-adịghị echebara ndị ọzọ echiche ma ọ bụ ịnwa ịmanye ndị na-achọghị ịnụ ozi ahụ ka ha nụrụ ya. Ma anyị adịghị enwe nkụda mmụọ n’ihi na ndị mmadụ nwere omume ọ̀ gbasara m; mmegide adịghịkwa eme ka anyị kwusị ime nkwusa. Dị ka Jizọs, anyị na-ezo aka n’Alaeze Chineke dị ka ọchịchị kwesịrị ekwesị nke ga-achị ụwa nile. Anyị ji obi ike na-ekwu okwu n’ihi na anyị na-anọchite anya Jehova, bụ́ Eze Eluigwe na Ala, nakwa n’ihi na ozi anyị na-ekwusa esighị anyị n’aka kama o si ya n’aka. Ịhụnanya anyị nwere n’ebe Jehova nọ kwesịkwara ịbụ ihe nkwali kasịnụ anyị nwere iji na-enye ya otuto.—Ndị Filipaị 1:27, 28; 1 Ndị Tesalonaịka 2:13.

Ntụleghachi n’Ụdị Nkwurịta Okwu

• N’ihi gịnị ka o ji dị mkpa iso onye ọ bụla, ruo ókè o kwere mee, na-ekerịta ozi Alaeze ahụ, ma mmeghachi omume dịgasị aṅaa ka anyị pụrụ ịtụ anya ha?

• Olee otú anyị pụrụ isi gosi na anyị adịghị adabere n’ike nke anyị iji na-ejere Jehova ozi?

• Olee ihe ndị bara uru anyị na-amụta site n’akwụkwọ Ọrụ Ndịozi?

[Foto ndị dị na peeji nke 173]

Dị ka ọ dị n’oge gara aga, ndị ohu Jehova taa na-ekwu okwu Chineke n’atụghị egwu

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya