Isi nke Iri Abụọ
Buru Ụbọchị Jehova n’Uche
1. Mgbe mbụ ị matara na nnapụta pụọ n’ihe mgbu dị iche iche nke usoro ihe ochie a dị nso, olee otú ọ dị gị?
OTU n’ime ihe ndị mbụ ị mụtara na Bible bụ na nzube Jehova bụ ka ụwa nile ghọọ paradaịs. N’ime ụwa ọhụrụ ahụ, agha, mpụ, ịda ogbenye, ọrịa, nhụjuanya, na ọnwụ agaghị adịkwa. Ọbụna ndị nwụrụ anwụ ga-adị ndụ ọzọ. Lee atụmanya magburu onwe ya ọ bụ! A na-emesi ịdị nso nke mmezu nke ihe ndị ahụ ike site n’ihe àmà na-egosi na ọnụnọ a na-adịghị ahụ anya nke Kraịst dị ka Eze na-achị achị malitere na 1914, nakwa na kemgbe ahụ, anyị anọwo na-ebi n’ụbọchị ikpeazụ nke ajọ ụwa a. Mgbe ụbọchị ikpeazụ ndị a bịara ná njedebe, Jehova ga-ebibi usoro ihe dị ugbu a ma weta ụwa ọhụrụ ahụ e kwere ná nkwa!
2. Gịnị bụ “ụbọchị Jehova”?
2 Bible kpọrọ oge mbibi a na-abịanụ “ụbọchị Jehova.” (2 Pita 3:10) Ọ bụ ‘ụbọchị iwe Jehova’ megide ụwa Setan dum. (Zefanaịa 2:3) Ọ ga-eru ná njedebe ya “n’agha nke oké ụbọchị nke Chineke Onye Pụrụ Ime Ihe Nile . . . [nke] a na-akpọ Ha-Magedọn [Amagedọn] n’asụsụ Hibru,” bụ́ nke a ga-anọ na ya bibie “ndị eze nke elu ụwa dum mmadụ bi.” (Mkpughe 16:14, 16) Ụzọ i si ebi ndụ ọ̀ na-egosipụta nkwenye gị na “ụbọchị Jehova” a dị nso?—Zefanaịa 1:14-18; Jeremaịa 25:33.
3. (a) Olee mgbe ụbọchị Jehova ga-abịa? (b) Olee otú o siworo baa uru na Jehova ekpugheghị “ụbọchị ahụ ma ọ bụ awa ahụ”?
3 Bible agwaghị anyị ụbọchị Jizọs Kraịst ga-abịa kpọmkwem dị ka Onye Mmezu nke ihe Jehova kpere n’ikpe megide usoro ihe Setan. “Ọ dịghị onye maara banyere ụbọchị ahụ ma ọ bụ awa ahụ, ndị mmụọ ozi nọ n’eluigwe amaghị, Ọkpara ahụ amaghịkwa, kama nanị Nna m maara,” ka Jizọs kwuru. (Mak 13:32) Ọ bụrụ na mmadụ ahụghị Jehova n’anya n’ezie, ọ ga-achọ ịdị na-eyigharị ụbọchị Ya n’uche ya ma tinye isi n’ịchụso ihe nke ụwa. Ma ndị hụrụ Jehova n’anya n’ezie ga-eji mkpụrụ obi ha dum jeere ya ozi, n’agbanyeghị mgbe ọgwụgwụ nke ajọ usoro ihe a ga-abịa.—Abụ Ọma 37:4; 1 Jọn 5:3.
4. Gịnị ka Jizọs kwuru dị ka ịdọ aka ná ntị?
4 N’okwu ịdọ aka ná ntị ọ gwara ndị hụrụ Jehova n’anya, Jizọs kwuru, sị: “Nọgidenụ na-ele anya, nọgidenụ na-amụ anya, n’ihi na unu amaghị mgbe oge ahụ a kara aka bụ.” (Mak 13:33-37) Ọ na-agba anyị ume ka anyị ghara ikwe ka iri ihe na ịṅụ ihe ọṅụṅụ ma ọ bụ “nchegbu nke ndụ” dọrọ uche anyị nke na anyị agakwaghị ama ịdị mkpa nke oge a.—Luk 21:34-36; Matiu 24:37-42.
5. Dị ka Pita kọwara, gịnị ka ụbọchị Jehova ga-arụpụta?
5 N’otu aka ahụ, Pita na-adụ anyị ọdụ ka anyị buru “ọnụnọ nke ụbọchị Jehova n’uche, bụ́ nke a ga-esite na ya gbazee eluigwe nke na-ere ọkụ, ihe ndị dị n’ígwé bụ́ ndị dị oké ọkụ ga-agbazekwa.” A ga-ebibi ọchịchị nile nke ụmụ mmadụ—“eluigwe”—nakwa ọha mmadụ na-eme ajọ omume n’ozuzu ha—“ụwa”—tinyere “ihe ndị dị” n’ime ya, bụ́ echiche na ihe omume dị iche iche nke ajọ ụwa a, dị ka àgwà ya nke adabereghị n’ebe Chineke nọ na ụzọ ndụ ya rụrụ arụ na nke ịhụ ihe onwunwe n’anya. A ga-eji “eluigwe ọhụrụ [Alaeze eluigwe nke Chineke] na ụwa ọhụrụ [ọha mmadụ ọhụrụ ndị ga-ebi n’ụwa],” bụ́ ndị ‘ezi omume gaje ibi n’ime ha,’ dochie ha. (2 Pita 3:10-13) Ihe omume ndị a, bụ́ ndị ga-etisasị ụwa ga-amalite na mberede, n’ụbọchị nakwa n’oge awa a na-atụghị anya ya.—Matiu 24:44.
Mụrụ Anya Iji Chọpụta Ihe Ịrịba Ama Ahụ
6. (a) Ruo n’ókè ha aṅaa ka azịza Jizọs nyere n’ajụjụ ndị na-eso ụzọ ya jụrụ ya metụtara ọgwụgwụ nke usoro ihe ndị Juu? (b) Akụkụ dịgasị aṅaa n’azịza Jizọs zara lekwasịrị anya n’ihe omume na n’àgwà ndị dị malite na 1914 gaa n’ihu?
6 N’ihi oge anyị bi n’ime ya, anyị kwesịrị ịmara nke ọma ihe ndị so n’ihe ịrịba ama ahụ nke ọtụtụ ihe mejupụtara, bụ́ nke e ji amata ụbọchị ikpeazụ—“ngwụsị nke usoro ihe a.” Buru n’uche na mgbe Jizọs zara ajụjụ ahụ ndị na-eso ụzọ ya jụrụ ya, bụ́ nke e dekọrọ na Matiu 24:3, ụfọdụ n’ime ihe ndị ọ kọwara n’amaokwu 4 ruo nke 22 nwere mmezu dị nta n’usoro ihe ndị Juu n’agbata afọ 33 na 70 O.A. Ma amụma ahụ nwere mmezu ya ka ukwuu kemgbe 1914, bụ́ oge “ọnụnọ [Kraịst] nakwa nke ngwụsị nke usoro ihe a.” Matiu 24:23-28 kwuru ihe ga-ewere ọnọdụ malite na 70 O.A. ruo n’oge ọnụnọ Kraịst. Ihe omume ndị a kọwara na Matiu 24:29–25:46 ga-ewere ọnọdụ na mgbe ọgwụgwụ.
7. (a) N’ihi gịnị ka anyị onwe anyị kwesịrị iji mụrụ anya banyere otú ọnọdụ ndị dị ugbu a si emezu ihe ịrịba ama ahụ? (b) Zaa ajụjụ ndị dị ná ngwụsị paragraf a, na-egosi otú ihe ịrịba ama ahụ siworo mezuo kemgbe 1914.
7 Anyị onwe anyị kwesịrị ịmụrụ anya iji hụ ihe omume na àgwà ndị na-emezu ihe ịrịba ama ahụ. Ijikọta ihe ndị a na amụma Bible ga-enyere anyị aka iburu ụbọchị Jehova n’uche. Ọ ga-emekwa ka anyị nwee ike ime ka ndị ọzọ kwenye mgbe anyị na-adọ ha aka ná ntị banyere ịdị nso nke ụbọchị ahụ. (Aịsaịa 61:1, 2) N’iburu nzube ndị a n’uche, ka anyị tụlee ajụjụ ndị na-esonụ bụ́ ndị na-eme ka akụkụ dị iche iche nke ihe ịrịba ama ahụ, dị ka e dekọrọ ha na Matiu 24:7 nakwa na Luk 21:10, 11, pụta ìhè.
Olee otú mbili ahụ e buru n’amụma na ‘mba ga-ebili imegide mba, alaeze ebiliekwa imegide alaeze’ si mezuo n’ụzọ dị ịrịba ama malite na 1914? N’ihe banyere agha, gịnị meworo kemgbe ahụ?
Na 1918, olee ọrịa nke gburu mmadụ karịa Agha Ụwa Mbụ? N’agbanyeghị ihe ọmụma ụmụ mmadụ nwere banyere nkà ọgwụ na ahụ́ ike, olee ọrịa ndị ka na-egbu ọtụtụ nde mmadụ?
Ruo n’ókè ha aṅaa ka ụnwụ nri metụtaworo ụwa n’agbanyeghị ọganihu ndị e nweworo na nkà mmụta sayensị na narị afọ gara aga?
Olee ihe ndị mere ka i kwenye na 2 Timoti 3:1-5, 13 adịghị akọwa otú e siworo na-adị ndụ eri oge, kama otú ọnọdụ ọjọọ siworo ka njọ ka anyị na-eru ná ngwụsị nke ụbọchị ikpeazụ?
Ikewa Ndị Mmadụ
8. (a) Olee ihe ọzọ, bụ́ nke a kọwara na Matiu 13:24-30, 36-43, nke Jizọs jikọtara ya na ngwụsị nke usoro ihe a? (b) Gịnị ka ihe atụ Jizọs pụtara?
8 E nwere ihe omume ndị ọzọ dị ịrịba ama Jizọs jikọtara ha na ngwụsị nke usoro ihe a. Otu n’ime ha bụ ikewapụ “ụmụ nke alaeze ahụ” n’ebe “ụmụ nke ajọ onye ahụ” nọ. Jizọs kwuru banyere nke a n’ihe atụ ya banyere ubi a kụrụ ọka wit na ya, bụ́ nke onye iro gara kụnye ata n’ime ya. “Ọka wit” nke dị n’ihe atụ ya na-anọchite anya ezi Ndị Kraịst e tere mmanụ. “Ata” ahụ bụ ndị na-ekwu na ha bụ Ndị Kraịst ma ha na-egosipụta na ha bụ “ụmụ nke ajọ onye ahụ” n’ihi na ha na-arapagidesi ike n’ụwa nke Ekwensu na-achị. A na-ekewapụ ndị a n’ebe “ụmụ nke alaeze” Chineke nọ ma na-aka ha akara maka mbibi. (Matiu 13:24-30, 36-43) Nke a ò werewo ọnọdụ n’ezie?
9. (a) Mgbe Agha Ụwa Mbụ gasịrị, nnukwu ọrụ nkewa dị aṅaa nke ndị nile na-ekwu na ha bụ Ndị Kraịst weere ọnọdụ? (b) Olee otú Ndị Kraịst e tere mmanụ si nye ihe àmà na ha bụ ndị na-ejere Alaeze ahụ ozi n’ezie?
9 Mgbe Agha Ụwa Mbụ gasịrị, e kewara ndị nile na-ekwu na ha bụ Ndị Kraịst gaa n’òtù abụọ: (1) Ndị ụkọchukwu nke Krisendọm na ụmụazụ ha, bụ́ ndị nyere Njikọ Mba Nile (nke bụ́zi Mba Ndị Dị n’Otu) nkwado siri ike, ma n’otu mgbe ahụkwa, na-akwadosi mba ha dị iche iche ike, na (2) ezi Ndị Kraịst, ndị nọ n’oge ahụ agha bisịrị, ndị ji obi ha nile kwadoo Alaeze Mezaịa nke Chineke, ọ bụghị mba dị iche iche nke ụwa a. (Jọn 17:16) Ndị a gosipụtara na ha bụ ndị na-ejere Alaeze Chineke ozi n’ezie site n’ịmalite ọrụ ikwusa “ozi ọma nke a nke alaeze” n’ụwa nile. (Matiu 24:14) Gịnị si na ya pụta?
10. Olee ihe mbụ si n’ọrụ nkwusa Alaeze ahụ pụta?
10 Nke mbụ, a chịkọtara ihe fọdụrụ ná ndị e ji mmụọ nsọ Chineke tee mmanụ, bụ́ ndị nwere olileanya isonyere Kraịst dị ka ndị so n’Alaeze eluigwe ahụ. Ọ bụ ezie na ndị ahụ nọ ná mba dịgasị iche iche, a chịkọtara ha ịbụ ndị dị n’otu n’ime otu nzukọ. Ịkazu ndị a e tere mmanụ akara na-eru nso.—Mkpughe 7:3, 4.
11. (a) Olee ọrụ nchịkọta nke nọgidere na-aga n’ihu, ọ̀ bụkwa n’ikwekọ n’amụma dị aṅaa? (b) Gịnị ka mmezu nke amụma a na-egosi?
11 Ka e mesịrị, n’ịgbaso nduzi Kraịst, a malitere ịchịkọta “oké ìgwè mmadụ . . . si ná mba na ebo na ndị na asụsụ nile pụta.” Ndị a mejupụtara “atụrụ ọzọ” ahụ, bụ́ ndị ga-adị ndụ gafere ‘oké mkpagbu ahụ’ banye n’ime ụwa ọhụrụ Chineke. (Mkpughe 7:9, 14; Jọn 10:16) Ọrụ a nke ikwusa banyere Alaeze Chineke tupu ọgwụgwụ eruo nọgidere na-aga n’ihu ruo n’oge a. Oké ìgwè mmadụ nke atụrụ ọzọ ahụ, bụ́ ndị dị ọtụtụ nde ugbu a, ji iguzosi ike n’ihe na-enyere ihe ahụ fọdụrụ e tere mmanụ aka ịkpọsa ozi ahụ dị oké mkpa banyere Alaeze ahụ. A na-anụ ozi a ná mba nile.
Gịnị Ga-eme n’Ọdịnihu?
12. Ruo ókè ha aṅaa ka a ga-emekwu nkwusa tupu ụbọchị Jehova abịa?
12 Ihe a nile e kwuru n’elu na-egosi na anyị na-abịaru nso n’ọgwụgwụ nke ụbọchị ikpeazụ nakwa na ụbọchị Jehova dị nso. Ma ọ̀ dị amụma ndị ka ga-emezu tupu ụbọchị ahụ dị oké egwu amalite? Ee. Otu ihe bụ na e kewachabeghị ndị mmadụ n’okwu metụtara Alaeze ahụ. N’ebe ụfọdụ e nwere mmegide kpụ ọkụ n’ọnụ ruo ọtụtụ afọ, e nweela ugbu a, mmụba n’ọnụ ọgụgụ ndị ọhụrụ na-eso ụzọ. Ọbụna n’ebe ndị mmadụ na-ajụ ozi ọma ahụ, a na-egosipụta ebere Jehova site n’anyị ịgba àmà. Ya mere, gaa n’ihu n’ọrụ ahụ! Jizọs na-emesi anyị obi ike na mgbe a rụsịrị ọrụ ahụ, ọgwụgwụ ga-abịa.
13. Dị ka e dekọrọ ná 1 Ndị Tesalonaịka 5:2, 3, olee ihe omume dị ịrịba ama nke ka ga-ewere ọnọdụ, gịnịkwa ka ọ ga-apụtara anyị?
13 Amụma ọzọ dị oké mkpa nke Bible, na-ekwu, sị: “Mgbe ọ bụla ha na-asị: ‘Udo na ịnọ ná ntụkwasị obi!’ mgbe ahụ mbibi mberede gaje ịbịakwasị ha n’otu ntabi anya dị nnọọ ka ihe ụfụ nke nhụjuanya na-abịakwasị nwanyị dị ime; ha agaghịkwa agbanahụ ya ma ọlị.” (1 Ndị Tesalonaịka 5:2, 3) Anyị amabeghị otú a ga-esi mee mkpọsa ahụ banyere “udo na ịnọ ná ntụkwasị obi.” Ma o doro anya na ọ gaghị apụta na ndị ndú ụwa agwọtala nsogbu nke ihe a kpọrọ mmadụ n’ezie. Mkpọsa ahụ agaghị eduhie ndị bu ụbọchị Jehova n’uche. Ha maara na ngwa ngwa mgbe ọ gasịrị, mbibi mberede ga-abịa.
14. Olee ihe omume ndị ga-ewere ọnọdụ n’oké mkpagbu ahụ, n’usoro dịkwa aṅaa?
14 Ná mmalite nke oké mkpagbu ahụ, ndị ọchịchị ga-echigharị megide Babilọn Ukwu ahụ, bụ́ alaeze ụwa nke okpukpe ụgha, ha ga-ebibikwa ya. (Matiu 24:21; Mkpughe 17:15, 16) Mgbe nke ahụ gasịrị, mba dị iche iche ga-echigharị imegide ndị na-akwado ọbụbụeze Jehova, si otú a kpasuo Jehova iwe megide ọchịchị dị iche iche nke ụwa na ndị na-akwado ha ma kpata ibibi ha kpam kpam. Nke ahụ ga-abụ njedebe nke oké mkpagbu ahụ n’Amagedọn. Mgbe ahụ, a ga-atụba Setan na ndị mmụọ ọjọọ ya n’abis, ọ gaghị enwekwa ike ịdị na-achịkwa ihe a kpọrọ mmadụ. Nke a ga-eweta ụbọchị Jehova ná njedebe, mgbe a ga-ebuli aha ya elu.—Ezikiel 38:18, 22, 23; Mkpughe 19:11–20:3.
15. N’ihi gịnị ka ọ ga-eji bụrụ ihe amamihe na-adịghị na ya iche na ụbọchị Jehova ka dị anya?
15 Ọgwụgwụ nke usoro ihe a ga-abịa kpọmkwem n’oge ya, dị ka usoro nke Chineke si dị. Ọ gaghị anọ ọdụ. (Habakuk 2:3) Cheta na mbibi nke Jeruselem na 70 O.A. bịara ngwa ngwa, mgbe ndị Juu na-atụghị anya ya, mgbe ha chere na e nwekwaghị ihe ize ndụ dịnụ. Oleekwa banyere Babilọn oge ochie? Ọ dị ike, nwee obi ike, ma bụrụ nke e ji nnukwute mgbidi chebe. Ma ọ dara n’otu abalị. N’otu aka ahụkwa, mbibi ga-abịakwasị ajọ usoro ihe nke dị ugbu a na mberede. Mgbe nke a ga-eme, ka anyị bụrụ ndị ga-adị n’otu n’ezi ofufe, ebe anyị nọgideworo na-eburu ụbọchị Jehova n’uche.
Ntụleghachi n’Ụdị Nkwurịta Okwu
• Gịnị mere o ji dị oké mkpa iburu ụbọchị Jehova n’uche? Olee otú anyị pụrụ isi mee nke ahụ?
• Olee otú nkewa na-aga n’ihu nke a na-ekewa ndị mmadụ si emetụta anyị n’otu n’otu?
• Olee ihe ndị ka ga-eme tupu ụbọchị Jehova amalite? Ya mere, gịnị ka anyị kwesịrị ịdị na-eme?
[Foto ndị dị na peeji nke 180, 181]
N’oge na-adịghị anya, ụbọchị ikpeazụ a ga-abịa ná njedebe mgbe a ga-ebibi usoro ihe Setan