Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • lr isi 5 p. 32-36
  • “Onye A Bụ Ọkpara M”

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • “Onye A Bụ Ọkpara M”
  • Mụta Ihe Site n’Aka Onye Ozizi Ukwu Ahụ
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Olee Otú Anyị Kwesịrị Isi Na-echeta Jizọs Kraịst?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2013
  • A Mụọ Jizọs n’Ụlọ Anụ
    Akwụkwọ M nke Akụkọ Bible
  • Jizọs Mụtara Irube Isi
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2010
  • Otu Mmụọ Ozi Eleta Meri
    Akwụkwọ M nke Akụkọ Bible
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Mụta Ihe Site n’Aka Onye Ozizi Ukwu Ahụ
lr isi 5 p. 32-36

ISI NKE 5

“Onye A Bụ Ọkpara M”

MGBE ụmụaka mere ihe ọma, obi na-adị ndị na-elekọta ha ụtọ. Mgbe nwatakịrị nwanyị mere ihe otú dị mma, obi na-adị nna ya ụtọ ịgwa ndị ọzọ, sị: “Onye a bụ nwa m nwanyị.” Ma ọ bụ, ọ bụrụ na nwatakịrị nwoke na-eme ihe ọma, obi na-adị nna ya ụtọ ịsị: “Onye a bụ nwa m nwoke.”

Jizọs na-eme ihe na-atọ Nna ya ụtọ mgbe nile. N’ihi ya, Nna ya nwere obi ụtọ n’ebe ọ nọ. Ì chetara ihe Nna Jizọs mere otu ụbọchị mgbe Jizọs na mmadụ atọ n’ime ụmụazụ ya nọ?— Ee, Chineke si nnọọ n’eluigwe gwa ha, sị: “Onye a bụ Ọkpara m, onye m hụrụ n’anya, [onye m nwapụtaworo].”—Matiu 17:5.

Jizọs na-enwe obi ụtọ mgbe nile ime ihe na-atọ Nna ya ụtọ. Ị̀ ma ihe kpatara ya? N’ihi na ọ hụrụ Nna ya n’anya n’ezie. Ọ bụrụ na mmadụ na-eme ihe nanị n’ihi na ọ ghaghị ime ya, ọ na-eyi ihe siri ike. Ma, ọ bụrụ na o si ya n’obi, ọ na-adịrị ya mfe karị ime ha. Ị̀ ma ihe ọ pụtara ma a sị na ihe si mmadụ n’obi?— Ọ pụtara mmadụ ịchọ ime ihe n’ezie.

Ọbụna tupu Jizọs abịa n’ụwa, ọ dị njikere ime ihe ọ bụla Nna ya gwara ya mee. Nke a bụ n’ihi na ọ hụrụ Nna ya, bụ́ Jehova Chineke, n’anya. Jizọs nwere ọnọdụ magburu onwe ya n’eluigwe n’ebe Nna ya nọ. Ma, Chineke nwere ọrụ pụrụ iche Jizọs ga-arụ. Iji rụọ ọrụ ahụ, Jizọs aghaghị ịhapụ eluigwe. A ghaghị ịmụ ya dị ka nwa ọhụrụ n’ụwa. Jizọs dị njikere ime nke a n’ihi na Jehova chọrọ ka o mee ya.

[Foto dị na peeji nke 33]

Gịnị ka mmụọ ozi Gebriel gwara Meri?

Iji mụọ ya dị ka nwa ọhụrụ n’ụwa, Jizọs aghaghị inwe nne. Ị̀ ma onye bụ́ nne ya?— Aha ya bụ Meri. Jehova si n’eluigwe zipụ mmụọ ozi ya bụ́ Gebriel ka ọ gaa gwa Meri okwu. Gebriel gwara ya na ọ gaje ịmụ nwa nwoke. A ga-akpọ nwa ọhụrụ ahụ Jizọs. Ònyekwa ga-abụ nna nwa ahụ?— Mmụọ ozi ahụ kwuru na ọ bụ Jehova Chineke ga-abụ Nna nwa ahụ. Ọ bụ ya mere a ga-eji kpọọ Jizọs Ọkpara Chineke.

Olee otú i chere ọ dị Meri n’obi?— Ọ̀ sịrị, “Achọghị m ịbụ nne Jizọs”? Ee e, Meri dị njikere ime ihe Chineke chọrọ. Ma, olee otú a pụrụ isi mụọ Ọkpara Chineke nke nọ n’eluigwe n’ụwa dị ka nwa ọhụrụ? Olee otú ọmụmụ Jizọs si dị iche n’ọmụmụ nke ụmụ ọhụrụ ndị ọzọ nile? Ị̀ ma?—

Chineke kere nne na nna anyị mbụ, bụ́ Adam na Iv, ka ha nwee ike ịnọkọta n’ụzọ magburu onwe ya. Mgbe nke ahụ gasịrị, nwa ọhụrụ pụrụ ịmalite itolite n’akpa nwa nne ya. Ndị mmadụ na-ekwu na ọ bụ ọrụ ebube! Amaara m na ị ga-ekweta na ọ bụ.

Chineke rụziri ọbụna ọrụ ebube ka ukwuu. O weere ndụ Ọkpara ya site n’eluigwe tinye ya n’akpa nwa Meri. Chineke emetụbeghị nke ahụ mbụ, o metụbeghịkwa ya ọzọ kemgbe ahụ. N’ihi ọrụ ebube a, Jizọs malitere itolite n’ime akpa nwa Meri otú ụmụ ọhụrụ ndị ọzọ na-esi etolite n’akpa nwa nne ha. Mgbe nke ahụ gasịrị, Josef lụrụ Meri.

Mgbe oge ruru ka a mụọ Jizọs, Meri na Josef nọ na-aga Betlehem. Ma, obodo ahụ jupụtara na mmadụ. E nweghị ọbụna otu ọnụ ụlọ ebe Meri na Josef ga-anọ, n’ihi ya, ha nọdụrụ n’ebe a na-edebe anụmanụ. N’ebe ahụ ka Meri nọ mụọ nwa, e nyiwekwara Jizọs n’ihe e ji etinyere ehi na anụ ụlọ ndị ọzọ nri, dị ka ị pụrụ ịhụ n’ebe a.

[Foto dị na peeji nke 34]

Gịnị mere e ji na-enyiwe Jizọs n’ihe e ji etinyere anụ ụlọ nri?

Ihe na-adọrọ mmasị mere n’abalị ahụ a mụrụ Jizọs. N’otu ebe nke dịdewere Betlehem, otu mmụọ ozi bịakwutere ndị ọzụzụ atụrụ ụfọdụ. Ọ gwara ha na Jizọs bụ nnukwu mmadụ. Mmụọ ozi ahụ sịrị: ‘Lee! ana m ezi unu ozi ọma nke ga-enye unu obi ụtọ. Taa, a mụwo onye ga-azọpụta ndị mmadụ.’—Luk 2:10, 11.

[Foto dị na peeji nke 35]

Olee ozi ọma otu n’ime ndị mmụọ ozi a ziri ndị ọzụzụ atụrụ ahụ?

Mmụọ ozi ahụ gwara ndị ọzụzụ atụrụ ahụ na ha ga-ahụ Jizọs na Betlehem, ebe o dina n’ihe e ji etinyere anụ ụlọ nri. Mgbe ahụ, na mberede, ndị mmụọ ozi ndị ọzọ nọ n’eluigwe sonyeere mmụọ ozi nke mbụ ahụ n’inye Chineke otuto. Ndị mmụọ ozi ahụ bụrụ abụ, sị: “Otuto dịrị Chineke, . . . udo adịkwa n’elu ụwa n’etiti ndị a nwapụtaworo.”—Luk 2:12-14.

Mgbe ndị mmụọ ozi ahụ pụrụ, ndị ọzụzụ atụrụ ahụ gara Betlehem wee hụ Jizọs. N’ebe ahụ, ha gwara Josef na Meri ihe ọma nile ha nụrụ. Lee obi ụtọ Meri nwetara n’ihi na ọ dị njikere ịbụ nne Jizọs.

Ka e mesịrị, Josef na Meri kpọọrọ Jizọs gaa n’obodo Nazaret. Ọ bụ n’ebe ahụ ka Jizọs nọ tolite. Mgbe o toruru ogo mmadụ, ọ malitere nnukwute ọrụ izi ihe ya. Nke a so n’ọrụ Jehova Chineke chọrọ ka Ọkpara ya rụọ n’ụwa. Jizọs dị njikere ịrụ ọrụ ahụ n’ihi na Jizọs hụrụ Nna ya nke eluigwe n’anya nke ukwuu.

Tupu Jizọs amalite ọrụ ya dị ka Onye Ozizi Ukwu ahụ, Jọn Onye Na-eme Baptizim mere ya baptizim n’Osimiri Jọdan. Mgbe ahụ, otu ihe ijuanya mere! Ka Jizọs si na mmiri na-arịgopụta, Jehova si n’eluigwe kwuo okwu, sị: “Nke a bụ Ọkpara m, onye m hụrụ n’anya, onye m nwapụtaworo.” (Matiu 3:17) Ọ̀ bụ na obi adịghị atọ gị ụtọ mgbe ndị mụrụ gị gwara gị na ha hụrụ gị n’anya?— Anyị pụrụ ijide n’aka na obi tọkwara Jizọs ụtọ.

Jizọs mere ihe ziri ezi mgbe nile. Ọ dịghị mgbe o mere ka ọ bụ ụdị onye ọ na-abụghị. Ọ gwaghị ndị mmadụ na ya bụ Chineke. Mmụọ ozi Gebriel gwara Meri na a ga-akpọ Jizọs, Ọkpara Chineke. Jizọs n’onwe ya kwuru na ya bụ Ọkpara Chineke. Ọ gwaghịkwa ndị mmadụ na ya maara ihe karịa Nna ya. Ọ sịrị: “Nna m ka m ukwuu.”— Jọn 14:28.

Ọbụna mgbe ọ nọ n’eluigwe, mgbe Nna Jizọs nyere ya ọrụ ọ ga-arụ, Jizọs rụrụ ya. Ọ sịghị na ya ga-arụ ya gaa rụwa ihe ọzọ. Ọ hụrụ Nna ya n’anya. Ya mere, o gere ntị n’ihe Nna ya kwuru. Mgbe Jizọs bịakwara n’ụwa, o mere ihe Nna ya nke eluigwe zitere ya ka o mee. O jighị oge ya mee ihe ọzọ. Ka a sịkwa ihe mere Jehova ji nwee obi ụtọ n’ebe Ọkpara ya nọ!

Anyị onwe anyị kwa chọrọ ime ihe ga-atọ Jehova ụtọ, ọ̀ bụ na anyị achọghị?— Mgbe ahụ, anyị aghaghị igosi na anyị na-ege Chineke ntị n’ezie, dị ka Jizọs gere. Chineke na-agwa anyị okwu site na Bible. Ọ gaghị abụ ihe ziri ezi ime ka a ga-asị na anyị na-ege Chineke ntị ma na-ekweta, na-emekwa ihe Bible megidere, ọ̀ ga-abụ?— Chetakwa, anyị ga-enwe obi ụtọ ime ihe ga-atọ Jehova ụtọ ma ọ bụrụ na anyị hụrụ ya n’anya n’ezie.

Ugbu a, gụọ amaokwu ndị ọzọ a dị na Bible, bụ́ ndị na-egosi ihe ọ dị mkpa ka anyị mata ma kwere banyere Jizọs: Matiu 7:21-23; Jọn 4:25, 26; nakwa 1 Timoti 2:5, 6.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya