Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • lr isi 7 p. 42-46
  • Nrubeisi Na-echebe Gị

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Nrubeisi Na-echebe Gị
  • Mụta Ihe Site n’Aka Onye Ozizi Ukwu Ahụ
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • “Ndị Bụ́ Ụmụ, Na-eruberenụ Ndị Mụrụ Unu Isi”
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2007
  • Ị̀ ‘Na-eji Obi Gị Niile Erube Isi’?
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2023
  • “Ọ Mụtara Nrubeisi”
    ‘Bịa Bụrụ Onye Na-eso Ụzọ M’
  • Jizọs Na-erube Isi Mgbe Niile
    Kụziere Ụmụ Gị Ihe
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Mụta Ihe Site n’Aka Onye Ozizi Ukwu Ahụ
lr isi 7 p. 42-46

ISI NKE 7

Nrubeisi Na-echebe Gị

Ọ̀ GA-AMASỊ gị ma ọ bụrụ na ị ga-enwe ike ime ihe ọ bụla ị chọrọ ime? Ò nwere mgbe ọ na-adị gị ka ya bụrụ na ọ dịghị onye ga na-agwa gị ihe ị ga-eme? Kwuo eziokwu, gịnị ka i chere?—

[Foto dị na peeji nke 42]

Gịnị mere i kwesịrị iji na-ege ndị okenye ntị?

Ma, olee nke kaara gị mma? Ọ̀ bụ ihe amamihe dị na ya n’ezie ime ihe ọ bụla ị chọrọ? Ka ihe ọ̀ na-akara gị mma mgbe i rubeere nne gị na nna gị isi?— Chineke sịrị na i kwesịrị irubere ndị mụrụ gị isi, ya mere, ọ ghaghị inwe ezi ihe mere ị ga-eji mee ya. Ka anyị lee ma ànyị ga-achọpụtali ya.

Ị̀ dị afọ ole?— Ị̀ ma afọ ole nna gị dị?— Afọ ole ka nne gị ma ọ bụ nne gị ochie ma ọ bụ nna gị ochie dị?— Ha adịtewo ndụ aka karịa gị. Ka mmadụ na-adịkwu ndụ, otú ahụ ka ọ na-enwekwu oge iji mụta ihe. Ọ na-anụkwu ọtụtụ ihe, na-ahụkwu ọtụtụ ihe, na-emekwa ọtụtụ ihe karị kwa afọ. Ya mere, ndị na-eto eto pụrụ ịmụta ihe n’aka ndị okenye.

Ọ̀ dị onye ị ma ị tọrọ?— Ị̀ ma ihe karịa ya?— Gịnị mere i ji mara ihe karịa ya?— Ọ bụ n’ihi na ị dịtewo ndụ aka karịa ya. I nwewo oge ka ukwuu iji mụta ihe karịa onye na-erughị afọ ole ị dị.

Olee onye dịteworo ndụ aka karịa mụ ma ọ bụ gị ma ọ bụ onye ọ bụla ọzọ?— Ọ bụ Jehova, Chineke. Ọ ma ihe karịa gị, ọ makwaara ihe karịa m. Mgbe ọ gwara anyị mee ihe ọ bụla, anyị pụrụ ijide n’aka na ọ bụ ihe ziri ezi ime, ọ bụ ezie na ọ pụrụ isi ike omume. Ị̀ ma na ọ dị mgbe o siiri ọbụna Onye Ozizi Ukwu ahụ ike irube isi?—

N’otu oge, Chineke gwara Jizọs ka o mee ihe siri nnọọ ike omume. Jizọs kpere ekpere banyere ya, dị ka anyị na-ahụ n’ebe a. O kpere ekpere, sị: “Ọ bụrụ na ị chọọ, wepụ iko a n’ebe m nọ.” Site n’ikpe nke a n’ekpere, Jizọs gosiri na ọ naghị adị mfe mgbe nile ime uche Chineke. Ma, gịnị ka Jizọs ji mechie ekpere ya? Ị̀ ma?—

[Foto dị na peeji nke 43]

Gịnị ka anyị pụrụ ịmụta site n’ekpere Jizọs kpere?

Jizọs mechiri ya site n’ikwu, sị: “Ka uche gị mee, ọ bụghị nke m.” (Luk 22:41, 42) Ee, ọ chọrọ ka uche Chineke mee, ọ bụghị nke ya. Ọ gakwara n’ihu mee ihe Chineke chọrọ kama ime ihe o chere ga-akasị mma.

Gịnị ka anyị pụrụ ịmụta na nke a?— Anyị na-amụta na ọ bụ ihe ziri ezi mgbe nile ime ihe Chineke kwuru, ọ bụ ezie na o nwere ike ọ gaghị adị mfe omume. Ma, ọ dịkwa ihe ọzọ anyị na-amụta. Ị̀ ma ihe ọ bụ?— Anyị na-amụta na Chineke na Jizọs abụghị otu onye ahụ, dị ka ụfọdụ ndị na-ekwu. Jehova Chineke tọrọ Ọkpara ya bụ́ Jizọs, ọ makwaara ihe karịa ya.

Mgbe anyị na-erubere Chineke isi, anyị na-egosi na anyị hụrụ ya n’anya. Bible na-ekwu, sị: “Nke a bụ ihe ịhụ Chineke n’anya pụtara, ka anyị debe ihe ndị o nyere n’iwu.” (1 Jọn 5:3) Ị hụlanụ na ọ dị anyị nile mkpa irubere Chineke isi. Ị chọrọ ịdị na-erubere ya isi, ọ́ bụghị ya?—

Ka anyị sapee Bible anyị ma lee ihe Chineke gwara ụmụaka ka ha mee. Anyị ga-agụ ihe Bible kwuru ná Ndị Efesọs isi 6, amaokwu nke 1, nke 2, na nke 3. Ọ na-ekwu, sị: “Ụmụ, na-eruberenụ ndị mụrụ unu isi n’ihe metụtara Onyenwe anyị, n’ihi na nke a bụ ezi omume: ‘Sọpụrụ nna gị na nne gị’; nke bụ ihe mbụ e nyere n’iwu nke nwere nkwa: ‘Ka o wee gaara gị nke ọma, ka i wee nọọkwa ogologo oge n’elu ụwa.’”

Ị hụlanụ, ọ bụ Jehova Chineke n’onwe ya na-agwa gị ka ị na-erubere nne gị na nna gị isi. Gịnị ka ọ pụtara bụ́ ‘ịsọpụrụ’ ha? Ọ pụtara na ị ga na-akwanyere ha ùgwù. Chineke na-ekwekwa nkwa na ọ bụrụ na ị na-erubere ndị mụrụ gị isi, ọ ‘ga-agara gị nke ọma.’

Ka m kọọrọ gị otu akụkọ banyere ụfọdụ ndị, bụ́ ndị a zọpụtara ndụ ha n’ihi na ha rubere isi. Ndị a biri ndụ ogologo oge gara aga n’obodo ukwu bụ́ Jeruselem. Ihe ka n’ọnụ ọgụgụ ná ndị bi n’obodo ahụ egeghị Chineke ntị, n’ihi ya, Jizọs dọrọ ha aka ná ntị na Chineke gaje ibibi obodo ha. Jizọs gwakwara ha otú ha pụrụ isi gbapụ ma ọ bụrụ na ha hụrụ ihe ziri ezi n’anya. Ọ sịrị: ‘Mgbe unu hụrụ usuu ndị agha ka ha gbara Jeruselem gburugburu, maranụ na mbibi ya adịwo nso. Mgbe ahụ bụ oge isi na Jeruselem gbapụ gbaga n’ugwu.’—Luk 21:20-22.

[Foto dị na peeji nke 45]

Olee otú irube isi n’iwu Jizọs si zọpụta ndị a?

Dị nnọọ ka Jizọs kwuru, usuu ndị agha bịara ibuso Jeruselem agha. Ndị agha Rom mara ụlọikwuu gburugburu ya. Mgbe ahụ, n’ihi ihe ụfọdụ, ndị agha ahụ lawara. Ihe ka n’ọnụ ọgụgụ n’ime ndị ahụ chere na nsogbu adịkwaghị. Ya mere, ha nọgidere n’obodo ahụ. Ma, gịnị ka Jizọs kwuru na ha kwesịrị ime?— Gịnị ka ị gaara eme ma a sị na i bi na Jeruselem?— Ndị kweere okwu Jizọs n’ezie hapụrụ ụlọ ha wee gbaga n’ugwu, n’ebe dị anya site na Jeruselem.

Ruo otu afọ zuru ezu, ọ dịghị ihe mere Jeruselem. N’afọ nke abụọ, ọ dịghị ihe mere. N’afọ nke atọ kwa, ọ dịghị ihe mere. Ụfọdụ ndị pụrụ icheworị na ndị ahụ si n’obodo ahụ gbapụ dị nzuzu. Ma, mgbe o ruziri n’afọ nke anọ, ndị agha Rom bịaghachiri. Ha mara ụlọikwuu ọzọ gburugburu Jeruselem. Ugbu a, oge agafeela maka ịgbapụ. Na nke ugbu a, usuu ndị agha ahụ bibiri obodo ahụ. Ihe ka n’ọnụ ọgụgụ ná ndị nọ n’ime ya nwụrụ, a dọọrọ ndị fọrọ afọ n’agha.

Ma, gịnị mere ndị ahụ rubeere Jizọs isi?— Ọ dịghị ihe mere ha. Ha nọ n’ebe dị anya site na Jeruselem. Ya mere, ọ dịghị ọkọ kọrọ ha. Nrubeisi chebere ha.

Ọ bụrụ na ị na-erube isi, ọ̀ ga-echebekwa gị?— Ndị mụrụ gị pụrụ ịgwa gị ka ị ghara igwuri egwu ma ọlị n’okporo ámá. Gịnị mere ha ji kwuo otú ahụ?— Ọ bụ n’ihi na ụgbọala pụrụ ịkụtu gị. Ma, otu ụbọchị, i nwere ike iche, sị: ‘Ọ dịghị ụgbọala na-agafe ugbu a. Ọ dịghị ihe ga-eme m. Ụmụaka ndị ọzọ na-egwuri egwu n’okporo ámá, ọ dịbeghịkwa mgbe m hụrụ ihe ọ bụla mere ha.’

[Foto ndị dị na peeji nke 46]

N’ihi gịnị ka i kwesịrị iji na-erube isi mgbe ị na-ahụghị ihe ize ndụ ọ bụla?

Nke ahụ bụ ihe ihe ka n’ọnụ ọgụgụ ná ndị bi na Jeruselem chere. Mgbe ndị agha Rom lasịrị, o yiri ka ọ dịghị nsogbu ọ bụla dịnụ. Ndị ọzọ nọ n’obodo ahụ. Ya mere, ha onwe ha kwa nọgidere. A dọrọ ha aka ná ntị, ma ha egeghị ntị. N’ihi ya, ha nwụrụ.

A boy plays with matches and starts a fire

Ka anyị tụlee ihe atụ ọzọ. Ọ̀ dịtụwo mgbe i ji mkpá ọkụ gwurie egwu?— Ọ pụrụ iyi ihe na-atọ ụtọ bụ́ ikiri ọkụ ahụ mgbe ị kpara mkpá ọkụ. Ma, iji mkpá ọkụ na-egwuri egwu dị ize ndụ. Ọ pụrụ ịgba ụlọ ọkụ, ị pụkwara ịnwụ!

Cheta, irube isi nanị mgbe ụfọdụ ezughị ezu. Ma, ọ bụrụ na ị na-erube isi mgbe nile, ọ ga-echebe gị n’ezie. Ọ̀ bụkwa onye na-asị gị, “Ụmụ, na-eruberenụ ndị mụrụ unu isi”?— Ọ bụ Chineke. Chetakwa, ọ na-ekwu ya n’ihi na ọ hụrụ gị n’anya.

Ugbu a, gụọ akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị a na-egosi mkpa nrubeisi dị: Ilu 23:22; Eklisiastis 12:13; Aịsaịa 48:17, 18; nakwa Ndị Kọlọsi 3:20.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya