Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • lr isi 15 p. 82-86
  • Ihe Mmụta Banyere Inwe Obiọma

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ihe Mmụta Banyere Inwe Obiọma
  • Mụta Ihe Site n’Aka Onye Ozizi Ukwu Ahụ
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Onye Sameria Emee Ihe Gosiri na Ọ Bụ Ezigbo Onye Agbata Obi
    Jizọs Bụ Ụzọ, Eziokwu, na Ndụ
  • Ụzọ Jizọs Si Akụzi Ihe
    Akwụkwọ M nke Akụkọ Bible
  • Onye Sameria Abụrụ Ezi Onye Agbata Obi
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1998
  • Onye Sameria nke Mere Omume Onye Agbata Obi
    Nwoke Kasị Ukwuu nke Dịworo Ndụ
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Mụta Ihe Site n’Aka Onye Ozizi Ukwu Ahụ
lr isi 15 p. 82-86

ISI NKE 15

Ihe Mmụta Banyere Inwe Obiọma

Two little girls

Ị̀ MA ihe bụ́ ajọ mbunobi?— Ajọ mbunobi bụ enweghị mmasị n’ebe mmadụ nọ nanị n’ihi na otú onye ahụ dị dị iche ma ọ bụ n’ihi na ọ na-asụ asụsụ ọzọ. Ya mere, inwe ajọ mbunobi bụ inwe echiche na-adịghị mma banyere mmadụ tupu ị mata onye ọ bụ n’ezie.

Ì chere na ọ bụ ihe ziri ezi ịghara inwe mmasị n’ebe mmadụ nọ tupu ị mata n’ezie ụdị mmadụ ọ bụ ma ọ bụ nanị n’ihi na ọ dị iche?— Ee e, ajọ mbunobi adịghị mma, ọ naghịkwa egosi obiọma. Anyị ekwesịghị inwe obi ọjọọ n’ebe mmadụ nọ nanị n’ihi na onye ahụ adịghị otú anyị dị.

Cheedị echiche. Ọ̀ dị onye ọ bụla ị ma akpụkpọ ahụ́ ya na-adịghị acha otú nke gị na-acha ma ọ bụ onye na-asụ asụsụ dị iche na nke ị na-asụ?— Ma eleghị anya, ị ma ọbụna ndị na-adịghị otú ị dị n’ihi na ha merụrụ ahụ́ ma ọ bụ n’ihi na ha na-arịa ọrịa. Ị̀ na-egosi ndị na-adịghị otú ị dị obiọma na ịhụnanya?—

[Foto ndị dị na peeji nke 83]

Olee otú anyị kwesịrị isi na-emeso ndị ọ pụrụ ịbụ na ha adịghị otú anyị dị?

Ọ bụrụ na anyị na-ege Onye Ozizi Ukwu ahụ, bụ́ Jizọs Kraịst, ntị, anyị ga-enwe obiọma n’ebe mmadụ nile nọ. Mba mmadụ si bịa ma ọ bụ otú akpụkpọ ahụ́ ya na-acha ekwesịghị inwe ihe o mere nye anyị. Anyị kwesịrị ịdị na-emeso ya ihe n’obiọma. Ọ bụ ezie na nke a abụghị ihe mmadụ nile kwere, ọ bụ ihe mmụta Jizọs kụziri. Ka anyị kwuo banyere ya.

Otu onye Juu nke nwere ajọ mbunobi n’ebe ndị ọzọ nọ bịakwutere Jizọs jụọ ya sị, ‘Olee ihe m na-aghaghị ime iji dị ndụ ebighị ebi?’ Jizọs ma na ma eleghị anya nwoke ahụ na-achọ ka ya kwuo na anyị kwesịrị inwe obiọma nanị n’ebe ndị anyị na ha si n’otu agbụrụ ma ọ bụ otu mba nọ. Ya mere, kama ịza ajụjụ ahụ n’onwe ya, Jizọs jụrụ nwoke ahụ, sị: ‘Olee ihe Iwu Chineke kwuru na anyị aghaghị ime?’

Nwoke ahụ zara, sị: ‘Ị ghaghị iji obi gị dum hụ Jehova bụ́ Chineke gị n’anya, ị ghaghịkwa ịhụ onye agbata obi gị n’anya dị ka onwe gị.’ Jizọs sịrị ya: ‘Ị zatara ya. Nọgide na-eme nke a, ị ga-enwetakwa ndụ ebighị ebi.’

Otú ọ dị, nwoke ahụ achọghị inwe obiọma ma ọ bụ ịhụnanya n’ebe ndị na-adịghị otú ọ dị nọ. Ya mere, ọ gbalịrị ịchọta ihe ngọpụ. Ọ jụrụ Jizọs, sị: “Ònye n’ezie bụ onye agbata obi m?” O nwere ike ịbụ na ọ chọrọ ka Jizọs sị ya: “Ndị agbata obi gị bụ ndị enyi gị” ma ọ bụ, “Ha bụ ndị dị otú ị dị.” Iji zaa ajụjụ ahụ, Jizọs kọọrọ ya otu akụkọ banyere otu onye Juu na otu onye Sameria. Ọ kọrọ, sị:

Otu nwoke nọ na-agbada n’ụzọ si Jeruselem gaa Jeriko. Nwoke a bụ onye Juu. Ka ọ nọ na-aga, ndị ohi jidere ya. Ha tituru ya n’ala, narakwa ya ego ya na uwe ya. Ndị ohi ahụ tikasịrị ya ahụ́ wee hapụ ya ọdị ndụ ọnwụ ka mma n’akụkụ ụzọ.

Ntakịrị oge mgbe nke ahụ mesịrị, otu onye nchụàjà gafetara n’ụzọ ahụ. Ọ hụrụ nwoke ahụ e merụsịrị ahụ́. Ọ bụrụ gị, gịnị ka ị gaara eme?— Onye nchụàjà ahụ si n’akụkụ nke ọzọ gafeere onwe ya. Ọ kwụsịtụdịghị akwụsị. Ọ dịghị ihe o mere ma ọlị iji nyere nwoke ahụ aka.

A priest and a Levite pass by a man who lies half dead on the road; a Samaritan approaches

Onye ọzọ nke ji okpukpe kpọrọ ihe nke ukwuu sikwa n’ụzọ ahụ gbadata. Ọ bụ onye si n’ebo Livaị, onye na-eje ozi n’ụlọ nsọ dị na Jeruselem. Ọ̀ ga-akwụsịnụ nyere nwoke a aka?— Ee e. O mere otu ihe ahụ onye nchụàjà ahụ mere.

N’ikpeazụ, otu onye Sameria gafetara. Ị̀ na-ahụ ya ka o si n’ebe ụzọ ahụ gbagọrọ agbagọ na-agbadata?— Ọ hụrụ onye Juu ahụ e merụsịrị ahụ́ ka ọ tọgbọ n’ebe ahụ. Ma, ihe ka n’ọnụ ọgụgụ ná ndị Sameria na ndị Juu enweghị mmasị n’ebe ibe ha nọ ma ọlị. (Jọn 4:9) Ya mere, onye Sameria a ọ̀ ga-ahapụ nwoke a n’enyereghị ya aka? Ọ̀ ga-asị onwe ya: ‘Gịnị mere m ga-eji nyere onye Juu a aka? Ọ gaghị enyere m aka ma ọ bụrụ na e merụrụ m ahụ́’?

[Foto ndị dị na peeji nke 85

Gịnị mere onye Sameria ahụ ji bụrụ ezi onye agbata obi?

Ma, onye Sameria ahụ lere nwoke ahụ tọgbọ n’akụkụ ụzọ anya, wee nwee ọmịiko n’ahụ́ ya. Ọ gaghị enwe ike ịhapụ ya n’ebe ahụ ka ọ nwụọ. Ya mere, o si n’elu anụmanụ ya rịdata, gaa n’ebe nwoke ahụ tọgbọ, malite ihichasị ebe ndị e merụrụ ya ahụ́. Ọ wụsara mmanụ na mmanya n’ebe ndị ahụ. Nke a ga-enye aka mee ka ọnyá ndị ahụ laa. O jiziiri ákwà kechie ọnyá ndị ahụ.

Onye Sameria ahụ ji nwayọọ kuru nwoke ahụ kukwasị n’elu anụmanụ ya. Ha jizi nwayọọ nwayọọ na-agbada n’ụzọ ahụ ruo mgbe ha rutere n’otu ụlọ ndị njem, ma ọ bụ n’otu obere họtel. Onye Sameria ahụ kwụrụ ụgwọ maka ebe nwoke ahụ ga-anọ, o lekọtakwara ya nke ọma.

Jizọs jụziri nwoke ahụ ọ na-agwa okwu, sị: ‘Ònye n’ime mmadụ atọ a ka i chere bụ́ ezigbo onye agbata obi?’ Gịnị ka ị ga-aza? Ọ̀ bụ onye nchụàjà ahụ, ka ọ̀ bụ onye Livaị ahụ, ka ọ̀ bụ onye Sameria ahụ?—

Nwoke ahụ zara, sị: ‘Ọ bụ onye ahụ kwụsịrị ma lekọta onye ahụ e merụrụ ahụ́ bụ ezigbo onye agbata obi.’ Jizọs sịrị ya: ‘Ị zatara ya. Gawa, gị onwe gị na-emekwa otú ahụ.’—Luk 10:25-37.

Nke ahụ ọ́ bụghị akụkọ magburu onwe ya? O mere ka anyị mata n’ụzọ doro anya ndị bụ́ ndị agbata obi anyị. Ọ bụghị nanị ezigbo ndị enyi anyị. Ọ bụghịkwa nanị ndị akpụkpọ ahụ́ ha na-acha ka nke anyị ma ọ bụ ndị anyị na ha na-asụ otu asụsụ. Jizọs kụziiri anyị ka anyị na-enwe obiọma n’ebe ndị mmadụ nọ n’agbanyeghị ebe ha si, otú ha dị, ma ọ bụ asụsụ ha na-asụ.

Ọ bụ otú a ka Jehova Chineke na-eme. Ọ naghị enwe ajọ mbunobi. Jizọs sịrị: ‘Nna unu nke nọ n’eluigwe na-eme ka anyanwụ ya wakwasị ndị ọma na ndị ọjọọ. Ọ na-emekwa ka mmiri na-ezokwasị ndị ezi mmadụ na ndị na-abụghị ezi mmadụ.’ Ya bụrụ otú ahụ, anyị kwesịrị inwe obiọma n’ebe mmadụ nile nọ, otú Chineke na-enwe.—Matiu 5:44-48.

[Foto dị na peeji nke 86]

Olee otú ị pụrụ isi bụrụ ezi onye agbata obi?

Ya mere, ọ bụrụ na ị hụ onye e merụrụ ahụ́, gịnị ka ị ga-eme?— Ọ bụrụkwanụ na onye ahụ si ná mba ọzọ ma ọ bụ na akpụkpọ ahụ́ ya adịghị acha ka nke gị? Ọ ka bụkwa onye agbata obi gị, i kwesịkwara inyere ya aka. Ọ bụrụ na i chere na ị dị ntakịrị nke na ị gaghị enwe ike inyere ya aka, ị pụrụ ịrịọ onye meworo okenye ka o nye aka. Ma ọ bụ, ị pụrụ ịkpọ onye uwe ojii ma ọ bụ onye nkụzi. Nke ahụ bụ inwe obiọma, dị ka onye Sameria ahụ.

Onye Ozizi Ukwu ahụ chọrọ ka anyị na-enwe obiọma. Ọ chọrọ ka anyị na-enyere ndị ọzọ aka, n’agbanyeghị ndị ha bụ. Ọ bụ ya mere o ji kọọ akụkọ banyere onye Sameria ahụ nke nwere obiọma.

N’ihe mmụta a banyere inwe obiọma n’ebe ndị mmadụ nọ n’agbanyeghị agbụrụ ma ọ bụ mba ha si, gụọ Ilu 19:22; Ọrụ 10:34, 35; nakwa Ọrụ 17:26.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya