ISI NKE 40
Ụzọ Isi Mee Ka Chineke Nwee Obi Ụtọ
GỊNỊ ka anyị pụrụ ime iji mee ka Chineke nwee obi ụtọ? Ọ̀ dị ihe anyị pụrụ inye ya?— Jehova na-ekwu, sị: “Mụ nwe anụ ọhịa ọ bụla nke oké ọhịa.” Ọ na-ekwukwa, sị: “Mụ nwe ọlaọcha nile, ọ bụkwa Mụ nwe ọlaedo nile.” (Abụ Ọma 24:1; 50:10; Hagaị 2:8) N’agbanyeghị nke ahụ, ọ dị ihe anyị pụrụ inye Chineke. Gịnị?—
Jehova nyere anyị ohere ikpebi ma anyị ga-ejere ya ozi ma ọ bụ na anyị agaghị ejere ya. Ọ dịghị amanye anyị amanye ime ihe ọ chọrọ ka anyị mee. Ka anyị gbalịa ịghọta ihe mere Chineke ji mee anyị ka anyị nwee ike ikpebi ma anyị ga-ejere ya ozi ma ọ bụ na anyị agaghị ejere ya.
Ikekwe, ị ma ihe bụ́ ígwè ọrụ robot. Ọ bụ ígwè ọrụ e mere ka ọ na-eme ihe ọ bụla onye rụrụ ya chọrọ ka o mee. Ya mere ígwè ọrụ robot apụghị ikpebi n’onwe ya ihe ọ ga na-eme. Jehova gaara eme anyị nile ka anyị yie ígwè ọrụ robot. Ọ gaara emeworị anyị ka anyị na-eme nanị ihe ọ chọrọ ka anyị mee. Ma Chineke emeghị otú ahụ. Ị̀ ma ihe kpatara ya?— Ụfọdụ ihe ndị e ji egwuri egwú yiri ígwè ọrụ robot. Mgbe a pịrị aka n’otu bọtịn, ha na-eme nanị ihe onye rụrụ ihe ndị ahụ e ji egwuri egwu mere ha ka ha na-eme. Ị̀ hụtụwo ụdị ihe egwuri egwu ahụ?— Ọtụtụ mgbe, iji ihe e ji egwuri egwu dị otú ahụ nke na-eme nanị ihe a rụrụ ya ka ọ na-eme na-egwuri egwu na-agbụ agbụ. Chineke achọghị ka anyị na-erubere ya isi n’ihi na anyị bụ ígwè ọrụ robot ndị e mere ka ha na-ejere ya ozi. Jehova chọrọ ka anyị na-ejere ya ozi n’ihi na anyị hụrụ ya n’anya nakwa n’ihi na anyị chọrọ irubere ya isi.
Gịnị mere na Chineke emeghị anyị ka anyị yie ígwè ọrụ “robot” a?
Olee otú i chere obi na-adị Nna anyị nke eluigwe mgbe anyị na-erubere ya isi n’ihi na anyị chọrọ irubere ya isi?— Ọ dị mma, gwagodị m, olee otú ụzọ i si akpa àgwà na-adị ndị mụrụ gị?— Bible na-ekwu na nwa maara ihe “na-eme ka nna ya ṅụrịa” ma nwa dị nzuzu “bụ iru újú nne ya.” (Ilu 10:1) Ị̀ chọpụtawo na mgbe i mere ihe nne gị na nna gị gwara gị ka i mee, ọ na-eme ka ha nwee obi ụtọ?— Ma olee otú obi na-adị ha mgbe i nupụụrụ ha isi?—
Olee otú ị pụrụ isi mee ka ma Jehova ma ndị mụrụ gị nwee obi ụtọ?
Ugbu a, ka anyị chee echiche banyere Nna anyị nke eluigwe, bụ́ Jehova. Ọ gwara anyị otú anyị pụrụ isi mee ka o nwee obi ụtọ. Biko weta Bible gị, sapeta Ilu 27:11. N’ebe ahụ, Chineke na-agwa anyị, sị: “Mara ihe, nwa m, wee mee ka obi m ṅụrịa, ka m wee zaghachi onye na-ata m ụta okwu.” Ị̀ ma ihe bụ́ ịta mmadụ ụta?— Mmadụ pụrụ ịta gị ụta site n’ịchị gị ọchị na ikwu na ị gaghị emeli ihe i kwuru na ị ga-eme. Olee otú Setan si taa Jehova ụta?— Ka anyị lee.
Cheta na anyị mụrụ n’Isi nke 8 nke akwụkwọ a na Setan chọrọ ịbụ Onye Kachasịnụ nakwa na ọ chọrọ ka mmadụ nile na-erubere ya isi. Setan kwuru na ndị mmadụ na-efe Jehova nanị n’ihi na Jehova ga-enye ha ndụ ebighị ebi ma ọ bụrụ na ha efee ya ofufe. Mgbe Setan mesịrị ka Adam na Iv nupụrụ Jehova isi, Setan mara Chineke aka. Ọ sịrị Chineke: ‘Ndị mmadụ na-efe gị ofufe nanị n’ihi ihe ndị ha na-enweta site n’aka gị. Nanị nye m ohere, m ga-eme ka mmadụ nile gbahapụ gị.’
Mgbe Adam na Iv mehiesịrị, olee otú Setan si maa Jehova aka?
Ọ bụ eziokwu na e deghị ya otú ahụ n’ime Bible. Ma mgbe anyị gụrụ banyere nwoke ahụ bụ́ Job, ọ na-edo anya na Setan gwara Chineke ihe dị otú ahụ. Ma Job ọ̀ ga-ekwesị ntụkwasị obi nye Chineke ma ọ bụ na ọ gaghị ekwesị dị oké mkpa n’ezie nye ma Setan ma Jehova. Ka anyị sapeta Bible na Job isi 1 na nke 2 iji hụ ihe merenụ.
Rịba ama na Job isi 1 na Setan nọ kpọmkwem n’eluigwe mgbe ndị mmụọ ozi bịara ịhụ Jehova. Ya mere, Jehova jụrụ Setan, sị: “Olee ebe i si bịa?” Setan sịrị na ya anọwo na-elegharị anya gburugburu ụwa. Ya mere Jehova jụrụ ya, sị: ‘Ị̀ hụwo Job, ị̀ hụwo na ọ na-efe m ofufe, ọ dịghịkwa ihe ọjọọ ọ na-eme?’—Job 1:6-8.
Ozugbo ahụ, Setan malitere ikwu ihe ndị kpatara ya. ‘Job na-efe gị nanị n’ihi na ọ dịghị nsogbu ọ bụla o nwere. Ọ bụrụ na ị kwụsị ichebe ya ma kwụsị ịgọzi ya, ọ ga-agbahapụ gị n’ihu gị.’ Ya mere Jehova zaghachiri, sị: ‘Ọ dị mma, Setan, i nwere ike ime ya ihe ọ bụla masịrị gị, ma emerụla Job n’onwe ya ahụ́.’—Job 1:9-12.
Gịnị ka Setan mere?— O mere ka ndị mmadụ gaa zuru ehi na ịnyịnya ibu Job ma gbuo ndị na-elekọta ha. Ọzọkwa, àmụ̀mà sere, gbuo atụrụ ya na ndị na-elekọta ha. Ka oge na-aga, ndị mmadụ bịara zuru kamel ya ma gbuo ndị na-elekọta ha. N’ikpeazụ, Setan mere ka e nwee oké ifufe nke kwaturu ụlọ ebe ụmụ iri Job nọ ma gbuo ha nile. N’agbanyeghị ihe a nile, Job nọgidere na-efe Jehova.—Job 1:13-22.
Mgbe Jehova hụrụ Setan ọzọ, Jehova gwara ya na Job ka na-ekwesịkwa ntụkwasị obi. Setan kwuru ihe ndị kpatara ya, na-asị: ‘Ọ bụrụ nnọọ na i kwe ka m mee ya ihe ga-eru ya n’ahụ́, ọ ga-agbakụta gị azụ n’ihu gị.’ Ya mere, Jehova kwere ka Setan mee Job ihe ga-eru ya n’ahụ́ ma ọ dọrọ ya aka ná ntị ka ọ ghara igbu Job egbu.
Gịnị ka Job diri, gịnịkwa mere nke a ji mee ka Chineke nwee obi ụtọ?
Setan mere ka Job daa ọrịa nke na ahụ́ ya nile bụ ọnyá ọnyá. Ọnyá ndị a na-esi ísì ọjọọ nke na ọ dịghị onye na-achọ ịbịa ya nso. Ọbụna nwunye Job sịrị ya: “Gbakụta Chineke azụ, nwụọ!” Ndị na-eme ka a ga-asị na ha bụ ndị enyi Job bịara ileta ya, ha mekwara ka o nwee mwute karị site n’ikwu na ọ ghaghị ịbụ na o meworị ihe ọjọọ ndị jọgburu onwe ha nke mere nsogbu a nile ga-eji na-adakwasị ya. Otú ọ dị, n’agbanyeghị nsogbu ahụ nile na ihe mgbu ahụ nile Setan kpataara Job, Job nọgidere na-efe Jehova n’ikwesị ntụkwasị obi.—Job 2:1-13; 7:5; 19:13-20.
Olee otú i chere ikwesị ntụkwasị obi Job mere ka obi dị Jehova?— O mere ka o nwee obi ụtọ n’ihi na Jehova gwara Setan, sị: ‘Lee Job! Ọ na-efe m n’ihi na ọ chọrọ ife m.’ Ị̀ ga-adị ka Job, bụ́ onye Jehova pụrụ ịtụ aka dị ka ihe atụ iji gosi na Setan bụ onye ụgha?— N’ezie, ọ bụ ihe ùgwù ime ka Jehova nwee ihe ọ ga-azaghachi n’ihe Setan kwuru nke bụ́ na ya pụrụ ime ka mmadụ nile kwụsị ife Jehova. N’ezie, Jizọs weere ya dị ka ihe ùgwù.
Onye Ozizi Ukwu ahụ enyeghị Setan ohere ọ ga-eji mee Ya ka o mee ihe na-ezighị ezi. Cheedị nnọọ echiche otú ihe nlereanya ya na-aghaghị isiworị mee ka Nna ya nwee obi ụtọ! Jehova pụrụ izo aka n’ebe Jizọs nọ ma zaa Setan, sị: ‘Lee Ọkpara m! O gosipụtawo ikwesị ntụkwasị obi zuru okè nye m n’ihi na ọ hụrụ m n’anya!’ Cheekwa echiche banyere ọṅụ Jizọs nwere n’ime ka obi Nna ya ṅụrịa. N’ihi ọṅụ ahụ, Jizọs ọbụna tachiri obi nwụọ n’elu osisi ịta ahụhụ.—Ndị Hibru 12:2.
Ị̀ chọrọ ịdị ka Onye Ozizi Ukwu ahụ ma mee ka Jehova nwee obi ụtọ?— Mgbe ahụ nọgide na-amụ banyere ihe Jehova chọrọ ka ị na-eme, na-emekwa ka o nwee obi ụtọ site n’ime ya!
Gụọ banyere ihe Jizọs mere iji mee ka Chineke nwee obi ụtọ nakwa ihe ọ dị mkpa ka anyị meekwa, n’Ilu 23:22-25; Jọn 5:30; 6:38; 8:28 nakwa na 2 Jọn 4.